Achọkwala Ihe Ga-abara Naanị Gị Uru Otú Ọtụtụ Ndị Na-eme n’Ụwa Taa
Ị̀ CHỌPỤTALA na ọtụtụ ndị nọ n’ụwa taa na-eche na e kwesịrị iwere ha ka ndị pụrụ iche, nyekwa ha ihe a na-enyeghị ndị ọzọ? N’agbanyeghị ihe ha nwetara, ha na-eche na ha kwesịrị inwetakwu ihe. Ndị na-eche otú a na-achọ ihe ga-abara naanị ha uru. Obi anaghịkwa adị ha ụtọ maka ihe ndị ha nwere. Baịbụl kwuru na ndị mmadụ ga na-akpa àgwà ndị a n’oge ikpeazụ.—2 Tim. 3:2.
Nke bụ́ eziokwu bụ na mmadụ ịchọ ihe ga-abara naanị ya uru ebidoghị taa. Adam na Iv họọrọ iji aka ha na-ekpebiri onwe ha ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ọ kpatakwaara ha ezigbo nsogbu. Mgbe ọtụtụ afọ gachara, Ọzaya bụ́ eze Juda chere na ya kwesịrị ịmụnyere Jehova insens ọkụ n’ụlọ nsọ. Mana, ọ dara ya. (2 Ihe 26:18, 19) Ndị Farisii na ndị Sadusii chekwara na Chineke kwesịrị iwere ha ka ndị pụrụ iche naanị n’ihi na ha bụ ụmụ Ebreham.—Mat. 3:9.
Ndị anyị na ha bi n’ụwa taa bụ ndị na-achọ ihe ga-abara naanị ha uru nakwa ndị onwe ha na-ebu isi. Anyị nwekwara ike ịmụta àgwà ha. (Gal. 5:26) Anyị nwere ike ịmalite iche na e kwesịrị iwere anyị ka ndị dị ezigbo mkpa ma ọ bụ nye anyị ọrụ ụfọdụ pụrụ iche. Gịnị ga-enyere anyị aka ka anyị ghara isi otú a na-eche echiche? Ihe mbụ anyị ga-eme bụ ịchọpụta ihe bụ́ uche Chineke n’okwu a. E nwere ihe abụọ Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka.
Ọ bụ Jehova na-ekpebi ihe anyị kwesịrị inweta. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ha.
N’ezinụlọ, Jehova chọrọ ka nwunye na-akwanyere di ya ùgwù nakwa ka di hụ nwunye ya n’anya. (Efe. 5:33) Jehova chọkwara ka di na nwunye jiri obi ha niile hụ ibe ha n’anya, gharakwa ịna-agba n’èzí. (1 Kọr. 7:3) Ndị nne na nna na-atụ anya ka ụmụ ha na-erubere ha isi. Ụmụaka na-atụkwa anya ka nne na nna ha hụ ha n’anya ma na-elekọta ha.—2 Kọr. 12:14; Efe. 6:2.
N’ọgbakọ, e kwesịrị ịna-akwanyere ndị okenye na-arụsi ọrụ ike ùgwù. (1 Tesa. 5:12) Ma, ndị okenye ekwesịghị ịna-atụrụ ụmụnna ha ụka.—1 Pita 5:2, 3.
Chineke nyere ndị ọchịchị ikike ịna ndị ha na-achị ụtụ isi, chọọkwa ka ha na-akwanyere ha ùgwù.—Rom 13:1, 6, 7.
Jehova hụrụ anyị n’anya, na-enyekwa anyị ihe karịrị ihe anyị kwesịrị inweta. Ebe anyị bụ ndị mmehie, naanị ihe anyị kwesịrị inweta bụ ọnwụ. (Rom 6:23) N’agbanyeghị ya, Jehova na-enye anyị ọtụtụ ihe ọma n’ihi otú o si hụ anyị n’anya. (Ọma 103:10, 11) Ihe ọma ọ bụla Jehova meere anyị ma ọ bụ ọrụ ọ bụla o nyere anyị bụ amara ka o meere anyị.—Rom 12:6-8; Efe. 2:8.
IZERE ỊNA-ACHỌ IHE GA-ADỊ NAANỊ ANYỊ MMA NA ONWE ANYỊ IBU ANYỊ ISI
Kpachara anya ka ị ghara ichewe echiche ka ndị nọ n’ụwa Setan. Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, anyị nwere ike ịmalite iche na anyị kwesịrị inweta ihe karịrị nke ndị ọzọ. Jizọs gosiri na ọ dị mfe mmadụ ichewe otú ahụ n’ihe atụ o mere gbasara ndị ọrụ a kwụrụ otu dinarịọs. Ụfọdụ n’ime ha malitere ọrụ n’isi ụtụtụ, rụgidekwa ọrụ ruo uhuruchi, ezigbo anwụ achaa ha. E nwekwara ndị nke rụrụ ọrụ naanị otu awa. Ndị nke ahụ malitere n’isi ụtụtụ chere na e kwesịrị ịkwụ ha ego ka nke ndị ọzọ n’ihi ọrụ ha rụrụ. (Mat. 20:1-16) Jizọs ji ihe atụ ahụ gosi ndị na-eso ụzọ ya na obi kwesịrị ịdị ha ụtọ maka ihe ọ bụla dị Chineke mma imere ha.
Ụmụ nwoke ndị rụrụ ọrụ malite n’isi ụtụtụ ruo uhuruchi chere na e kwesịrị ịkwụ ha ụgwọ ka nke ndị ọzọ
Na-ekele ekele maka ihe e meere gị. Atụkwala anya ka a na-emere gị ihe. (1 Tesa. 5:18) Na-eme ka Pọl onyeozi. Ọ gwaghị ụmụnna ya nọ na Kọrịnt ka ha nye ya ihe ndị dị ya mkpa, ọ bụ eziokwu na o nwere ikike ịgwa ha ka ha mee otú ahụ. (1 Kọr. 9:11-14) Obi kwesịrị ịdị anyị ụtọ maka ihe ọma ọ bụla ndị mmadụ meere anyị. Anyị ekwesịghịkwa ịna-atụ anya ka ndị mmadụ meere anyị ihe.
Pọl onyeozi agwaghị ụmụnna ya ka ha nye ya ego
Dịrị umeala n’obi. Onye onwe ya na-ebu isi na-echekarị na ya kwesịrị inweta ihe karịrị ihe o nwere. Ọ bụ ịdị umeala n’obi ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ịna-eche otú ahụ.
Otú Daniel si dịrị umeala n’obi mere ka Jehova hụ ya n’anya
Daniel onye amụma mere ihe anyị kwesịrị ime ma a bịa n’ịdị umeala n’obi. O si n’ezinụlọ a ma ama. Ọ mara mma. Ụbụrụ na-aghọ ya nkọ. E nwekwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ ọ na-emeta. N’ihi ya, o nwere ike iche na otú e si were ya ka onye pụrụ iche na ọrụ ndị pụrụ iche e nyere ya ruuru ya. (Dan. 1:3, 4, 19, 20) Mana, Daniel dị umeala n’obi. Àgwà a mere ka Jehova hụ ya n’anya.—Dan. 2:30; 10:11, 12.
Ka anyị ghara ịna-achọ ihe ga-abara naanị anyị uru, gharakwa ikwe ka onwe anyị na-ebu anyị isi, nke bụ́ àgwà e ji mara ụwa ochie a. Kama, ka obi na-adị anyị ụtọ maka ihe ọma ọ bụla Jehova nyere anyị n’ihi amara ọ na-emere anyị.