Nkuchi—Ọ̀ Bụ Maka Gị?
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA BRITAIN
“NKUCHI bụ ndokwa e mere maka ụmụaka, ọ bụghị ndokwa iji nye ndị di na nwunye na-enweghị ụmụ nwa,” ka otu onye ọrụ ebere sitere Britain na-ekwusi ike. Ọbụna otú ahụ, ikike hà aṅaa ka nwatakịrị na-enwekarị ná nkuchi ya?
Ị̀ na-atụle ikuchi nwa? Mgbe ahụ ị na-eche mkpebi ihu, nke na-abụghị nanị nke mmetụta uche kamakwa nke a na-apụghị ịgbanwe agbanwe. Olee ókè nwa ahụ ga-enwe ihe ịga nke ọma n’ijikọta onwe ya n’ezinụlọ gị?
Ọ bụrụ na ị bụ nwa e kuchiri ekuchi, ị̀ maara ndị nne na nna mụrụ gị bụ? Ọ bụrụ na ị maghị, ọdịiche dị aṅaa ka i chere na ọ gaara eme ma a sị na ị maara?
Ị̀ bụ nne na-atụle ma ị̀ ga-enye nwa ọhụrụ gị ka e kuchie? Nkuchi ọ̀ bụ n’ezie nanị ngwọta dịnụ, bụrụkwa maka ọdịmma kasị mma nke nwa gị?
Na 1995, e kuchiri ihe karịrị 50,000 ụmụaka na United States, ihe dịkwa ka 8,000 n’ime ha bụ ndị a mụrụ n’ofesi. N’ụzọ na-arị elu, ndị mmadụ na-ekuchi ụmụaka a mụrụ ná mba ofesi. Dị ka magazin bụ́ Time si kọọ, n’ime 25 afọ gara aga, ezinụlọ dị iche iche na United States ekuchiwo ihe karịrị 140,000 ụmụaka a mụrụ n’ofesi. Ọnụ ọgụgụ ndị ọzọ yiri nke ahụ maka Europe bụ Sweden 32,000, Holland 18,000, Germany 15,000, na Denmark 11,000.
Ò nwere ka i si kwekọọ n’ọnọdụ a? Ikuchi nwa pụtara na ndụ gị—ọ bụghị nanị ndụ nke nwa ahụ—enweghị mgbe ọ ga-abụ otu ihe ahụ ọzọ. Nne na nna na-ekuchi nwa nwere ezi ihe mere ha ga-eji atụ anya ọtụtụ ihe na-enye obi ụtọ, ma ha aghaghịkwa ịdị njikere maka ọtụtụ nsogbu na ndakpọ olileanya. N’otu aka ahụ, ọ pụrụ ịbụ na ọ dịghị mgbe a pụrụ ịgwọtazu obi mgbu nke nne na-enwe n’inyefe nwa ya maka nkuchi.
Ọnọdụ nke ọ bụla na-eweta ihe ịma aka nke iji ịhụnanya kpụgharịa ma ọ bụ wugharịa ndụ obere nwa. Isiokwu ndị na-esonụ ga-ewepụta ụfọdụ n’ime ọṅụ—na ihe ịma aka—nke ikuchi nwa.