Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 5/8 p. 9-10
  • Nkuchi—Olee Otú M Si Kwekọọ na Ya?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nkuchi—Olee Otú M Si Kwekọọ na Ya?
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Ókè Ha Kwụsiri Ike?
  • Ihe Ndị Mere A Ga-eji Kpachara Anya
  • Iche Ihe Bụ́ Eziokwu Ihu
  • Olee Otú M Pụrụ Isi Nagide Nsogbu Ndị Na-adị n’Ịbụ Nwa E Kuchiri Ekuchi?
    Teta!—2003
  • Nkuchi—n’Ihi Gịnị, n’Ụzọ Dịkwa Aṅaa?
    Teta!—1996
  • Nkuchi—Ọ̀ Bụ Maka Gị?
    Teta!—1996
  • N’ihi Gịnị Ka M Ga-eji Bụrụ Nwa E Kuchiri Ekuchi?
    Teta!—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 5/8 p. 9-10

Nkuchi—Olee Otú M Si Kwekọọ na Ya?

Ọ PỤTARA ìhè na nsogbu pụrụ ibilite ma ọ bụrụ na ndị nne na nna kuchiri mmadụ agbaa alụkwaghịm ma ọ bụ ọ bụrụ na otu onye òtù ọlụlụ anwụọ. Ma ọ bụ nwa ahụ e kuchiri ekuchi pụrụ inwe mmetụta ka ukwuu. N’ihi gịnị?

Ọnụ ọgụgụ ka ọtụtụ n’ime anyị maara ndị nne na nna mụrụ anyị bụ. Ọbụna ọ bụrụ na ha nwụnahụrụ anyị mgbe anyị bụ ụmụaka, anyị nwere ihe ncheta dị iche iche, ma ọ bụ ma eleghị anya foto ụfọdụ, iji mee ka njikọ ahụ zuo ezu. Otú ọ dị, gịnị banyere nwa ọhụrụ e kupụtara maka nkuchi ozugbo a mụsịrị ya? Òtù na-ahụ maka nkuchi na-ejide ihe ndekọ banyere nne ya, ma mgbe mgbe a dịghị enye nwa ahụ ihe ọmụma ahụ ruo mgbe o tolitere. N’ọnọdụ ndị ọzọ, nne ahụ na-edenye aha nke ya na satifiket ọmụmụ ma hapụ idenye nke nna nwa ya. Ụmụ ọhụrụ ụfọdụ bụ ndị a gbahapụrụ agbahapụ—ndị a na-achọpụta mgbe nne na nna ha a na-amaghị ndị ha bụ gbahapụworo ha. Ụmụaka ndị nọ n’ọnọdụ ndị a nile adịghị enwe nkekọ nke ịhụnanya—ha pụrụ inwe echiche nke ịbụ ndị e kewapụrụ site ná nzụlite ma ọ bụ n’ebe ndị mụrụ ha nọ.

Olee Ókè Ha Kwụsiri Ike?

Osisi nwere mkpa mkpọrọgwụ dị mma iji kwụsie ike. Ome ọhụrụ a nyakudoro n’ógwè kara aka pụrụ itolite nke ọma, ma ọ pụkwara ịkpọnwụ, n’amịghịkwa mkpụrụ. N’otu aka ahụ, ọ bụ ezie na nne na nna kuchiri nwa pụrụ inye nlekọta nile na nraranye ịhụnanya kwere omume, ụfọdụ ụmụaka agaghị agbake mgbe ọ bụla site n’oké ịda mbà n’obi nke ịbụ ndị e kewapụrụ na mkpọrọgwụ mbụ ha.

Tụlee ihe banyere Kate.a Ịbụ onye nne na nna ya sitere Ọdịda Anyanwụ India, otu di na nwunye bụ́ ndị ọcha na-ahụ n’anya ma na-enye nlekọta kuchiri Kate mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ, ma ọ pụghị ịnakwere ọnọdụ ọhụrụ ya. Mgbe ọ dị afọ 16, ọ hapụrụ ụlọ, n’alọtakwaghị ma ọlị. Iwe na-ewe ya mgbe ahụ gbanwere ghọọ ịkpọasị ezi uche na-adịghị na ya. “Gịnị mere nne m jiri nyefee m n’aka unu?” ka ọ jụrụ. N’ụzọ dị mwute, ezinụlọ a enweghị ike imeri nsogbu ahụ.

E nyefere Mervyn n’aka ụlọ ọrụ gọọmenti ógbè ahụ mgbe a mụrụ ya nakwa n’aka nne na nna zụlitere ya, ka ha lekọta ya. Mgbe ọ dị ọnwa itoolu, e kuchiri ya. Ọnọdụ nzụlite mbụ ya nke enweghị nchebe, tinyere oké iwe na-ewe ya n’ihi ịbụ onye sitere n’agbụrụ gwara ọgwa, rụpụtara àgwà nnupụisi nke wetaara ya ọtụtụ nsogbu, na-ewetakwara nne na nna kuchiri ya, bụ́ ndị meere ya ihe dị ukwuu, mwute dị ukwuu. “Ọ bụrụ na onye ọ bụla ga-achọ ndụmọdụ m banyere nkuchi,” ka nne ya kwuru, “m ga-asị ugbu a, ‘Chebara ya echiche nke ọma.’”

N’ụzọ dị iche, tụlee ahụmahụ Robert na Sylvia. Ha nwere otu nwa nwoke, ha enweghịkwa ike inwekwu ụmụ. “Ì chewo echiche banyere nwatakịrị sitere ná mba ọzọ?” ka a jụrụ ha. N’oge na-adịghị anya ha kuchiri Mak-Chai, obere nwa nwanyị dị ọnwa itoolu nke sitere Hong Kong. “M na-eche mgbe mgbe banyere ihe mere e ji gbahapụ m,” ka Mak-Chai na-ekwu, “ma m̀ nwere ụmụnne ndị ikom ma ọ bụ ụmụnne ndị inyom ọ bụla. Ma echere m na m dị mama na papa kuchiri m nso karịa ka ọtụtụ ụmụaka dị nne na nna mụrụ ha. A sị na amatara m ndị nne na nna mụrụ m bụ, ọ gaghị adịcha iche, e wezụga na m gaara aghọtatụ ụfọdụ n’ime njimara m karị, ma eleghị anya.” Nne na nna kuchiri ya hà na-akwado nkuchi? “Ee,” ka ha na-ekwu, “n’ihi na ọ bụrụworo ahụmahụ magburu onwe ya nye anyị!”

Ihe Ndị Mere A Ga-eji Kpachara Anya

Graham na Ruth kuchiri ụmụaka abụọ mgbe ha bụ ụmụ ọhụrụ, otu nwa nwoke na otu nwa nwanyị, iji wee jikọta ha n’ebe nwa ha nwoke na nwa ha nwanyị nọ. A zụlitere ụmụ anọ ahụ dum dị ka otu ezinụlọ dị n’otu na gburugburu ebe obibi obi ụtọ. “Ụmụ anyị nile hapụrụ ụlọ ọtụtụ afọ gara aga ma biri na nke ha. Anyị na-emekọrịta ihe mgbe nile, hụkwa ha nile n’anya,” ka Ruth na-ekwu. Ma n’ụzọ dị mwute, ụmụ abụọ ahụ e kuchiri ekuchi nwechara nsogbu siri ike. N’ihi gịnị?

“Dọkịta anyị gwara anyị na gburugburu ebe obibi nwatakịrị nọ n’ime ya dị oké mkpa,” ka Graham na-ekwu, onye na-eche ugbu a na àgwà ndị e ketara eketa bụ otu ihe bụ isi so kpata ya. Ọ na-ekwukwa, sị: “Ọzọ, gịnị banyere ahụ ike nne mgbe ọ dị ime nwa ya? Anyị maara ugbu a na ọgwụ, ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya, na ụtaba, pụrụ imetụta nwa nọ n’afọ. Ana m atụ aro ka e nyochaa nne na nna ahụ nke ọma, na ọbụna nne na nna ochie ma ọ bụrụ na o kwetụrụ omume, tupu e tinye aka ná nkuchi.”

Nne Peter lụgharịrị di, nna lụgharịrị nne ya tikwara Peter ihe ma metọọkwa ya n’ụzọ mmetụta uche. Mgbe ọ dị afọ atọ, a kpọtara ya maka nkuchi. “Ajụrụ m nne na nna kuchiri m ozugbo m si n’ụlọikpe zọpụ ụkwụ,” ka Peter kwuru. O kwukwara, sị: “Ebibiri m ihe nile aka m pụrụ iru. Mgbe m na-ehi ụra, m na-arọ nrọ ndị na-atụ oké egwu. Ileghachi anya azụ ugbu a, apụrụ m ịhụ oké nchekasị m nwere. Mgbe nne na nna kuchiri m gbasịkwara alụkwaghịm, ihe jọwanyere njọ nye m—ọgwụ ọjọọ, izu ohi, imebisi ihe, ịṅụbiga mmanya ókè kwa ụbọchị.

“Mgbe m dị 27 afọ, apụghị m ịhụ ihe ọ bụla mere m ga-eji nọgide na-adị ndụ, echekwara m echiche igbu onwe m. Mgbe ahụ, otu ụbọchị onye m na-amaghị onye ọ bụ nyere m otu traktị dabeere na Bible, nke kwuru na n’isi nso ụwa a ga-aghọ paradaịs. Ozi ahụ masịrị m. Ọ dara ụda ka eziokwu. Amalitere m ịgụ na ịmụ Bible, malitekwa ime mgbanwe ná ndụ m na n’àgwà m, ma ugboro ugboro adalagara m azụ ọzọ n’ụzọ ochie m. Mgbe m nwesịrị agbamume na mkpakọrịta na-enye aka nke ndị Kraịst, m na-enwekwu obi ụtọ na mmetụta nke ịnọ ná nchebe karịa ka m gaara echewo n’echiche inwe afọ ole na ole gara aga. Enwewokwa m ike ịtụteghachi mmekọrịta ịhụnanya n’ebe nne m nọ, bụ́ nke na-enye obi ụtọ.”

Iche Ihe Bụ́ Eziokwu Ihu

Mgbe a bịara ná nkuchi, mmetụta uche na-arị elu. A na-enwe ịhụnanya na ekele gabigara ókè n’otu akụkụ, na-enwekwa iwe na enweghị ekele n’akụkụ nke ọzọ. Edgar Wallace, dị ka ihe atụ, agbagharaghị nne ya ma ọlị maka ịgbahapụ ya, bụ́ otú o siri lee omume nne ya anya. Ọ gara ịhụ ya n’afọ ikpeazụ nke ndụ ya, jiri enweghị mmasị na-achọ enyemaka ego site n’aka ya, ma Edgar, n’agbanyeghị na ọ bara ọgaranya n’oge ahụ, ji iwe jụ inyere ya aka. Oge na-adịghị anya ka e mesịrị, mgbe ọ nụrụ na a gaara eliwo nne ya n’ebe a na-eli ndị a na-amaghị ndị ha bụ ma e wezụga obi ọma nke ndị enyi kwụrụ ụgwọ maka olili ozu ya, ọ kwara ụta n’ụzọ dị omimi n’ihi omume egosighị mmetụta ya.

Ndị na-atụle nkuchi aghaghị ịdị njikere iji ezi obi chee nsogbu na ihe ịma aka ndị pụrụ ibilite ihu. Ọ bụghị mgbe nile ka ụmụaka na-enwe ekele maka ihe ndị nne na nna—ndị kuchiri ha ma ọ bụ ndị mụrụ ha—na-emere ha, ọbụna n’ọnọdụ kasị mma. N’ezie, Bible na-ekwu banyere ndị mmadụ n’ụbọchị anyị dị ka “ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ” na “ndị na-enweghị ekele” na “ndị na-adịghị ọcha n’obi.”—2 Timoti 3:1-5.

N’aka nke ọzọ, imeghe ebe obibi gị—na obi gị—nye nwatakịrị nwere mkpa nne na nna pụrụ ịbụ ahụmahụ dị mma, na-akwụghachikwa ụgwọ. Cathy, dị ka ihe atụ, nwere ekele dị omimi n’ebe nne na nna kuchiri ya nọ maka inye ya ebe obibi ndị Kraịst na igbo mkpa anụ ahụ na nke ime mmụọ ya.—Lee igbe bụ́ “Ọ Gaara Anyị nke Ọma,” peji nke 8.

Mgbe ha na-akọwa echiche ha banyere ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị ha kuchiri ekuchi, nne na nna nke ụmụaka dị otú ahụ pụrụ icheta okwu nke onye ọbụ abụ ahụ: “Ụmụaka bụ onyinye sitere n’aka Onyenwe anyị; ha bụ ngọzi n’ezie.”—Abụ Ọma 127:3, Today’s English Version.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a A gbanwewo aha ụfọdụ ka e wee ghara ịmara ndị ahụ kpọmkwem.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya