Nkuchi—n’Ihi Gịnị, n’Ụzọ Dịkwa Aṅaa?
N’IHI gịnị ka ọnụ ọgụgụ ụmụaka a na-ekuchi na Britain jiworo dalata nke ukwuu n’ime 20 afọ gara aga? E kwuwo ihe abụọ kpatara ya—onwunwe e nwere nsikwopụ afọ ime iwu kwadoro na nnakwere na-arị elu nke onye bụ nne na-enweghị di ịzụlite nwa ya. A hụwo ezinụlọ nwere nanị nne ma ọ bụ nna ugbu a dị ka ihe ịma aka nke a pụrụ imeri nke ọma n’ọha mmadụ nke oge a.
Otú ọ dị, n’ime ihe ji nke nta karịa 100 afọ gara aga, ihe dị iche. Mgbe Polly, nne Edgar Wallace, bụ́ onye England na-ede akwụkwọ ọgụgụ banyere mpụ, tụụrụ ime site n’aka nwa onye were ya n’ọrụ, ọ pụrụ ma mụọ nwa ahụ na nzuzo. Edgar dị ụbọchị itoolu mgbe nwanyị na-ele ime dokwara ka nwunye George Freeman, onye oburu n’ahịa azụ Billingsgate nke London, lekọta ya. Ezinụlọ Freeman enweworị ụmụ iri nke ha, Edgar tolitekwara ma bụrụ onye a maara dị ka Dick Freeman. Polly kwụrụ ụgwọ ugboro ugboro iji nye aka n’ilekọta nwa ya, ọ dịghịkwa mgbe nna ya maara na ya nwere nwa nwoke.
Taa, mgbe a na-achọghị ụmụ ọhụrụ, ọtụtụ mgbe ndị ọchịchị na-eburu ha ibu ọrụ ahụ. A na-akpọga ọtụtụ ụmụaka n’ebe nlekọta n’ihi na nchebe pụọ ná mmetọ dị ha mkpa ma ọ bụ n’ihi na ha nwere nkwarụ ahụ ma ọ bụ nke uche. Ndị agha na-awụ akpata oyi mere ka ha ghara inwekwa nne na nna na ụmụaka a mụrụ n’ihi ndina n’ike na-amụba mgbe nile n’ọnụ ọgụgụ ụmụaka na-ebe ákwá maka ịhụnanya na nchebe nne na nna—n’otu okwu, nkuchi.
Ikuchi Ka Ọ̀ Bụ Ịghara Ikuchi?
Ikuchi nwa adịghị mfe ma ọlị, amamihe adịghịkwa ya ma ọlị ime mkpebi oké ngwa ngwa mgbe a na-atụle ya. Ọ bụrụ na nwa ọhụrụ nwụnahụrụ gị, ọ pụrụ ịkasị mma ichere iji gabiga oké ịda mbà n’obi ma ọ bụ iru újú ahụ tupu i mee mkpebi ikpeazụ banyere nkuchi. Otu ihe ahụ pụrụ ịbụ eziokwu maka di na nwunye a gwara na ha apụghị ịmụ nwa.
Nwa ọ bụla na-eketa usoro mkpụrụ ndụ ebumpụta ụwa pụrụ iche. Echiche ebumpụta ụwa ụmụ ha na-ejukarị ndị mụrụ ụmụ anya, ma o siri ike ịtụ ikike ụbụrụ na mmetụta uche nke nwa ọhụrụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ma ọ bụrụ na a maghị ndị mụrụ ya.
Ị̀ na-ewere ime nke ọma n’agụmakwụkwọ dị ka ihe dị oké mkpa? Ọ bụrụ otú ahụ, olee otú ọ ga-adị gị ma ọ bụrụ na nwa i kuchiri ekuchi adịghị eru atụmanya gị? Ị̀ ga-ewere nwa isi na-ezuchaghị okè ma ọ bụ nke nwere nkwarụ n’ahụ dị ka ihe ịma aka nke ị pụrụ ịnagide?
Onye ọrụ a zụrụ azụ n’ụlọ ọrụ nkuchi ma ọ bụ ndị ọrụ ebere gọọmenti ga-ajụ gị ajụjụ ndị dị otú a tupu i mee mkpebi ikpeazụ gị. Oké nchegbu ha aghaghị ịbụ maka nchebe na obi ụtọ nke nwa ahụ.
Ọ Bụrụ na I Kpebie Ikuchi . . .
Mba nke ọ bụla nwere iwu na iwu nduzi nkuchi nke ya ndị dị mkpa ka a mụọ. Na Britain, e nwere ọtụtụ narị òtù nkuchi, ha na-esokarịkwa gọọmenti ógbè dị iche iche arụkọ ọrụ. Ọha mmadụ nile nwere ụkpụrụ nduzi nke ha.
Òtù ndị na-eme nkuchi bụ ndị a ma ama karịsịa na Britain, ebe ọtụtụ ndị gaje ịbụ ndị nne na nna pụrụ isoro ụmụaka e nwere maka nkuchi na-akpakọrịta, n’enweghị ụdị mmetụta uche a na-enwekarị ná nzụlite otu onye na ibe ya. Ọnọdụ ntụsara ahụ ahụ na-eme ka ọ dịrị ndị ahụ gaje ịbụ nne na nna nwa ahụ mfe ịjụ, ma na-eme ka ọ ghara iyi ihe kwere omume na nwa ahụ ga-enwe ndakpọ olileanya, ebe ọ bụ na a dịghị ekewapụ nwa nke ọ bụla iche dị ka nanị onye a na-elekwasị anya.
A na-ekwukarị na ndị na-ekuchi nwa ga-eru afọ ndụ a kpaara ókè, eleghị anya ihe dị ka 35 ma ọ bụ 40 afọ ndụ—ọ bụ ezie na nke a na-abụkarị maka nkuchi nke ụmụ ọhụrụ, ọ dịghị abụcha maka ụmụaka tolitetụworo. Òtù ndị na-eme nkuchi na-ekwu na afọ ndụ a kpaara ókè na-atụle afọ ndụ nke ndị gaje ịbụ nne na nna. Otú ọ dị, ha maara na ahụmahụ bara uru na-eso afọ ndụ abịa.
Ọtụtụ afọ gara aga, a pụrụ nanị isoro ndị di na nwunye mee ndokwa nkuchi. Taa, ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’igosi mmasị ikuchi ụmụaka ụfọdụ. Ọzọ, enweghị ọrụ na nkwarụ abụkebeghị ihe mere a ga-eji jụ ndị gaje ịbụ nne na nna. Ajụjụ bụ isi bụ, Gịnị ka ndokwa ahụ pụrụ inye nwa ahụ?
Ọbụna mgbe e mesịworo mee ihe nile banyere nkuchi a pụrụ ịdị na-eleru nne na nna ahụ anya nke ọma iji jide n’aka na ihe nile na-aga nke ọma.
Ọ̀ Bụ Site n’Agbụrụ Ọzọ?
Afọ 30 gara aga, o siri ike ịkpọnye ụmụaka isi ojii na Britain n’ezinụlọ isi ojii maka nkuchi, n’ihi nke ahụkwa, e nyefere ọtụtụ n’aka nne na nna bụ́ ndị ọcha. Kemgbe 1989, ọ bụrụwo usoro zuru mba na Britain ịkpọnye ụmụaka ndị nne na nna ga-ekuchi ha, bụ́ ndị ha na ha si n’otu nzụlite agbụrụ. A na-eche na n’ụzọ dị otú a, nwatakịrị ga-ekwekọ n’agbụrụ ma ọ bụ n’ọdịbendị ya n’ụzọ dị mfe karị. Otú ọ dị, nke a edugawo n’ọnọdụ ụfọdụ dị mgbagwoju anya.
Na nso nso a, akwụkwọ akụkọ bụ́ The Sunday Times kọrọ na ụfọdụ ndị nne na nna bụ́ ndị ọcha abụrụwo ndị e “nyegharịrị ọnọdụ dị ka ‘ndị isi ojii’” ka ha wee nwee ike ikuchi nwatakịrị isi ojii. Ugboro ugboro ndị nne na nna bụ ndị ọcha na-azụlite nwatakịrị isi ojii, nke pụtara na ha na-elekọta ya ruo nwa oge. Ma ọ bụrụ na e mesịrị ghara inye ha ikike ikuchi nwa ahụ kpam kpam, ọ na-arụpụtara ma nwa ma nne na nna mkpaghasị uche.
Otu di na nwunye sitere Scotland, ndị ji afọ isii zụlite ụmụaka ndị India abụọ, chere nsogbu a na-enwekarị ná nkuchi agbụrụ gwara ọgwa ihu na nso nso a. Ụlọikpe kwere ka nkuchi ahụ were ọnọdụ ná nghọta nke bụ ka nne na nna ahụ “mee ihe nile ha pụrụ ime iji jide n’aka na e mere ka ụmụaka ahụ mara [agbụrụ] ebe a mụrụ ha, jirikwa nghọta nke agbụrụ ebe a mụrụ ha na ọdịnala ha zụlite ha,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Times na-akọ. N’ọnọdụ a, ndị nne na nna kuchiri ha anọworị na-eme otú ahụ. A na-akụziri ụmụaka ndị ahụ asụsụ Punjabi, a na-ejikwa ha ejiji obodo ha mgbe ụfọdụ.
Ọtụtụ ga-ekwenyere ihe otu nwanyị na-ekwuchitere ndị ọrụ ebere na Britain kwuru, bụ́ onye sịrị na e kwesịrị ikwe ka a na-enwekwu nkuchi agbụrụ gwara ọgwa n’akpaghị ókè. “Anyị bi n’ọha mmadụ nwere ọtụtụ ọdịbendị,” ka ọ sịrị, “nzụlite na nkuchi kwesịkwara igosi nke ahụ.”
Ọ̀ Bụ Site n’Ofesi?
Ikuchi ụmụaka a mụrụ ná mba ofesi bụ ‘ahịa na-enye nnukwu ego,’ dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Independent si kọọ. Ọ bụ ezie na akụkọ na-egosi na ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ n’ime mkpọbata ahụ bụ ndị iwu na-akwadoghị, Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe bụ ebe bụ isi e si akpọbata ha na Britain.
Dị ka ihe atụ, a gbahapụwo ụfọdụ ụmụaka a mụrụ n’ihi ndina n’ike n’oge nkewasị ahụ nke ebe bụbu Yugoslavia. A na-ekwu na a gaara esikwopụ ndị ọzọ ma ọ́ bụghị na ‘onye na-agba mgbere ụmụaka’ tinyere aka, bụ́ onye kwere nkwa nkuchi ma ọ bụrụ na a hapụ nwa ahụ ka o buzuo n’ime afọ. Otú ọ dị, gọọmenti nke mba Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa na-enwe nchegbu banyere ụgwọ a na-akwụ iji nweta ụfọdụ n’ime nkuchi ndị a.
Ihe na-akpata nchegbu ka ukwuu bụ banyere ebubo ahụ a na-ebo ndị dọkịta na ha na-edejupụta akwụkwọ ụgha n’oge ọmụmụ. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The European kọrọ banyere ebubo na a gwara ụfọdụ ndị nne na Ukraine na ụmụ ọhụrụ ha nwụrụ n’ime afọ. E kwukwara na e mesịrị ree ụmụ ọhụrụ a. Ọ pụkwara ịbụ na a gwawo ndị nne ndị ọzọ na isi ezuchaghị ụmụ ha okè. N’okpuru nrụgide dị otú ahụ, ọ na-adị mfe karị inunye ndị nne nọ ná mgbagwoju anya ịgbahapụ ụmụ ha ka e wee kuchie ha. Ọ pụkwara ịbụ na ụmụaka ndị ọzọ adịghị mgbe ha ruru ebe a na-elekọta ụmụaka na-enweghị nne ma ọ bụ nna, kama bụrụ ndị e mesịrị kpọga mba ndị dị n’ofesi.
Mkpasu iwe na-apụta ná mba ndị ka na-emepe emepe. Ha na-ekwu na Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa bara ọgaranya kwesịrị ịdị na-emekwu ihe iji nyere ezinụlọ ụmụ amaala aka ilekọta ụmụ ha n’ime gburugburu ebe obibi mba ha kama ịkpọpụ ha gaa maka nkuchi n’ọdịbendị mba ọzọ.
Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa aghaghịkwa ịghọta ọdịnala oge gboo ahụ bụ́ ezinụlọ gbasapụrụ agbasapụ, ihe nkwado bụ́ isi nke obodo n’ọtụtụ ọdịbendị. A dịghị egbochikarị inye nwatakịrị nlekọta mgbe ọ na-ebi n’ìgwè dị iche iche nke agbụrụ, ọbụna ọ bụrụ na ndị mụrụ ya nwụrụ anwụ. E wezụga ndị òtù nke ezinụlọ a mụrụ mmadụ n’ime ya, dị ka nne na nna ochie, ezinụlọ gbasapụrụ agbasapụ nke ụmụnne nne na nna mmadụ ga-ewere nwa ahụ dị ka nke ha, a pụkwara ịghọtahie ọchịchọ ọ bụla ndị nọ n’èzí chọrọ ikuchi nwa ahụ dị ka ntinye aka a na-apụghị ịnakwere.a
Idokwa maka nkuchi adịghị mfe, ọbụnakwa mgbe e kpebisịworo ya, ịrụsi ọrụ ike dị mkpa iji mee ka ọ gaa nke ọma. Ma dị ka anyị ga-ahụ, e nwekwara ọṅụ ndị dị ukwuu.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Maka ntụle sara mbara nke omume nke ịkpọnye ndị òtù ọzọ nke ezinụlọ ụmụaka maka nlekọta, lee Ụlọ Nche nke September 1, 1988, peji nke 28-30, nke Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania bipụtara.
[[Igbe dị na peeji nke 5]
Nwa M Nwoke Ọ̀ Ga-achọ M?
NNE na nna m gbara alụkwaghịm mgbe m dị afọ 11. Achọsiri m ịhụnanya ike. Mgbe m nọ na kọleji, etinyere m aka ná mmekọrịta ịhụnanya; ọ bụ ụzọ nke m isi nweta ịhụnanya. Mgbe ahụ o juru m anya ịchọpụta na m dị ime. Ọ bụ nnọọ ihe na-ekwesịghị ekwesị. Mụ na nwa akwụkwọ ibe m etozughị okè ma ọlị. Ejitụbeghị m ọgwụ ọjọọ, ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya, ma ọ bụ ụtaba mee ihe, ma enyi m nwoke enwewo oké nkwarụ n’oge o ji ọgwụ LSD mee ihe.
A tụụrụ m aro isikwopụ afọ ime ahụ, ma nna m gwara m ihe gbanwere obi m. Achọghị m ịdị ime, ma achọghị m ibibi ndụ n’otu aka ahụ. Mgbe m mụrụ nwa m nwoke na 1978, m kpebiri na m gaghị edenye aha nna ya na satifiket ọmụmụ ya iji jide n’aka na nna ya agaghị enwe ike iru nso ebe ọ nọ. N’ezie, ekwere m ka e kuchie nwa ọhụrụ ahụ site n’ọmụmụ; ya mere a kpọpụrụ ya ozugbo n’ebe m nọ ma tinye ya ná nlekọta nke ndị ọrụ ebere steti. Ahụghịdị m ya anya. Ma mgbe ahụ a gbanwere m obi m. Akpọpụtara m nwa m site n’ebe nlekọta ahụ ma gbalịsie ike ịzụlite ya n’onwe m. Ma enweghị m ike, ọ fọkwara nke nta ka m nwee ọrịa uche.
Nwa m nwoke dị ihe dị ka ọnwa isii mgbe e nwetasịrị akwụkwọ ikike maka nkuchi ahụ, aghaghịkwa m inyefe ya. M chetara inwe mmetụta ka a ga-asị na mmadụ mayere mma n’ahụ m. Anwụrụ m n’ụzọ mmetụta uche. Ọ bụ nanị mgbe m natasịrị ndụmọdụ ndị ọkachamara n’ime afọ abụọ gara aga ka m nwere ike iwulite mmekọrịta ndị bara uru. Apụghị m iru újú—nwa m nwoke anwụghị anwụ. Ma apụghị m iche echiche banyere ya n’otu aka ahụ—ajụrụ m inye onwe m ohere ime otú ahụ. Ọ jọgburu onwe ya.
Ihe kasị na-akpasu iwe bụ ịnụ ka ndị mmadụ na-asị: “Ọ bụrụ na ị kpọnye nwa gị maka nkuchi, ị hụghị nwa gị n’anya.” Ma nke ahụ abụghị eziokwu n’ebe m nọ! Ọ bụ n’ihi na m hụrụ nwa m n’anya mere m ji nyefee ya! Ruo na minit ikpeazụ, m nọgidere na-ajụ onwe m, sị: ‘Gịnịdị ka m ga-eme? Gịnị ka m pụrụ ime?’ E nweghị ihe ọzọ a ga-eme. Amaara m na apụghị m nnọọ ịnagide ya, nakwa na nwa m ga-ata ahụhụ ma ọ bụrụ na mụ anwaa ịkpọrọ ya.
N’England, ọha mmadụ na-anakwere ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna ugbu a—ma ọ dịghị otú ahụ mgbe m mụrụ nwa. Ọ dị m ka ya bụrụ na m nwere ike ilekọta nwa m nwoke n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ndụmọdụ m nataworo n’oge na-adịghị anya gaara enye aka, dị ka m na-eche, ma oge agafewo gabiga ókè ugbu a. Nwa m ọ̀ ka dị ndụ? Nwa okoro dị aṅaa ka o toliteworo ịghọ? N’afọ nke 18, ụmụaka e kuchiri ekuchi nwere ikike iwu kwadoro ịchọ nne na nna ha. M na-ajụ onwe m mgbe mgbe ma nwa m nwoke ọ̀ ga-achọ m.—Ọ bụ onye ọzọ dere ya.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 8]
Ọ Gaara Anyị nke Ọma
TINYERE ụmụ okoro abụọ anyị ndị nọ n’afọ iri na ụma, anyị bụ otu ezinụlọ England nwere afọ ojuju ma dị n’otu. Echiche nke inwe nwa nwanyị—nke sikwa n’agbụrụ dị iche—adịbeghị ọbụna mgbe ọ batara n’uche anyị. Mgbe ahụ Cathy batara ná ndụ anyị. A mụrụ Cathy na London, England. A zụlitere ya dị ka onye Roman Katọlik, ma dị ka nwatakịrị, o sooro nne ya gaa nzukọ ole na ole n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova. Otú ọ dị, mgbe ọ dị afọ 10, a kpọgara ya n’ogige a na-elekọta ụmụaka.
Ọ bụ ezie na ihe sikwuuru ya ike n’ebe ahụ, ọ ka jisiri ike na-aga nzukọ dị iche iche n’onwe ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, bụ́ ebe anyị zutere ya. Cathy bụ nwa agbọghọ na-eche echiche. Mgbe mụ na nwunye m letara ya n’ogige a na-elekọta ụmụaka, anyị chọpụtara na a mapawara foto anụmanụ na ebe dị iche iche nke ime obodo n’ahụ ájá dị n’akụkụ àkwà ya, n’adịghị ka foto ndị ọkà n’egwú pop, ndị ụmụ agbọghọ ndị ọzọ mapawara.
Ka oge ụfọdụ gasịrị Cathy aghaghị ịpụta n’ihu kọmitii nnyocha, bụ́ ndị jụrụ ma ọ ga-achọ ịhapụ ebe nlekọta ahụ wee soro otu ezinụlọ biri. “M ga-ebinyere nanị ezinụlọ nke Ndịàmà Jehova!” ka ọ zara. Mgbe Cathy gwara anyị banyere nke a na ihe o kwuworo, o mere ka anyị chee echiche. Anyị nwere otu ọnụ ụlọ a na-ebighị ebi. Ànyị pụrụ iburu ụdị ibu ọrụ a? Dị ka ezinụlọ, anyị kwurịtara ma kpee ekpere banyere ya. Ọ bụ nanị mgbe ọtụtụ oge gasịworo ka anyị chọpụtara na ụzọ nke a—ịjụta echiche nwatakịrị—bụ usoro ọhụrụ nke ndị ọrụ ebere malitere, bụ́ nnwale a na-achịkọba mgbe ahụ.
Ndị ọrụ ebere chọpụtara n’aka ndị uwe ojii na dọkịta anyị banyere nzụlite anyị, chọpụtakwa iru eru onwe onye dị iche iche. N’oge na-adịghị anya e nwere nkwekọrịta. A gwara anyị na anyị pụrụ ịkpọrọ Cathy ná ndabere nke nnwale, na anyị pụkwara ịkpọghachi ya ma ọ bụrụ na omume ya amasịghị anyị! Nke a tụrụ anyị egwu, anyị kwụsikwara ike n’ikwu na ọ dịghị mgbe anyị ga-eme nke ahụ. Cathy dị afọ 13 mgbe anyị kpọọrọ ya n’ụzọ iwu kwadoro laa n’ebe obibi anyị.
Nkekọ ịhụnanya pụrụ iche nke dị n’etiti anyị nile nọgidere na-esiwanye ike. Cathy na-esoro otu ọgbakọ French nke Ndịàmà Jehova eje ozi ugbu a dị ka onye ọsụ ụzọ (onye nkwusa oge nile) n’ebe ugwu London. Afọ ọ hapụrụ ụlọ iji wee sụọ ụzọ, o detaara anyị obere akwụkwọ ozi na-emetụ n’ahụ: “E nwere ilu bụ́ na ‘ị pụghị ịhọrọ ezinụlọ nke gị.’ Otú ọ dị, achọrọ m ikele unu site n’obi m maka ịhọrọ m.”
Obi dị anyị ụtọ nke ukwuu na Cathy bịara! Ime ya otu akụkụ nke ezinụlọ anyị mere ka ndụ anyị ka mma. Ọ gaara anyị nke ọma!—Ọ bụ onye ọzọ dere ya.
[Foto]
Cathy na nne na nna kuchiri ya, na ụmụnne ya ndị nwoke
[Foto dị na peeji nke 7]
Ọtụtụ ụmụaka na-ebe ákwá maka ịhụnanya na nchebe nne na nna