Chebe Ịnụ Ihe Gị!
OTU nnyocha e mere ndị ntorobịa 400 na nso nso a na France kpughere na 1 n’ime 5 ọ bụla n’ime ha na-anụ ntị ike. Otu nnyocha yiri nke ahụ n’afọ iri gara aga gosiri na nanị 1 n’ime ndị na-eto eto 10 ọ bụla na-anụ ntị ike. N’ime ihe banyere mmụba dị egwu ná ndị na-eto eto na-anụ ntị ike, n’afọ gara aga Nzukọ Mba nke France kpebiri ibelata ọ̀tụ̀tụ̀ ụda na-esi ná ngwá egwú ụlọ apụta ruo 100 decibel.
A na-ata ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke ụda na-esi n’ihe a na-akwụnye ná ntị nke ngwá egwú ụlọ apụta ụta dị ukwuu maka ịnụ ntị ike. Onye na-awa ahụ ná ntị bụ́ Jean-Pierre Cave na-ekwu na ụda karịrị 100 decibel pụrụ ịkpata mbibi na-adịgide adịgide mgbe hour ole na ole gasịrị. Ọ na-ewe nanị minit ole na ole ka mbibi dị otú ahụ wee were ọnọdụ mgbe ụda ahụ karịrị 115 decibel. FNAC, ụlọ ọrụ kasị ere ngwá egwú na France, na-ekwu na ihe ka ọtụtụ ná ngwá egwú ụlọ ya na-ewepụta ihe karịrị 100 decibel. Ụfọdụ ngwá egwú ụlọ pụrụ iwepụta ihe karịrị 126 decibel, bụ́ nke nwere ikike ruru ugboro 400 dị ka nke 100 decibel!
Iti egwú rock n’ihu ọha pụrụ ịdị na-emerụ ọbụna ndị na-eto eto ndị ọzọ ahụ karịa otú ngwá egwú ụlọ si emerụ, dị ka Christian Meyer-Bisch, onye France bụ́ ọkachamara n’ịnụ ihe, si kwuo. N’ezie, ndị na-agachi ebe a na-eti egwú rock anya na-enwe oké ịnụ ntị ike ma e jiri ha tụnyere ndị dị afọ 18 ahụ siri ike. Ka a sịkwa ihe mere osote onye isi Nzukọ Mba nke France bụ́ Jean-François Mattei ji dọọ aka ná ntị, sị: “Anyị na-amụ ọgbọ nke ndị ntị chiri.”
Ya mere iji chebe ịnụ ihe gị, kpachara anya maka ụda ahụ!