Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 11/8 p. 5-10
  • Mkpọtụ—Ihe Ị Pụrụ Ime Banyere Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mkpọtụ—Ihe Ị Pụrụ Ime Banyere Ya
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Bụ Mkpọtụ Na-emerụ Ahụ?
  • Mmetụta nke Mkpọtụ
  • Ihe Ị Pụrụ Ime
  • Ụzọ Isi Nweta Nchebe Pụọ ná Mkpọtụ
  • Mkpọtụ—Ihe Mkpasu Iwe Ọgbara Ọhụrụ
    Teta!—1997
  • Ọ̀ Dị Mgbe A Ga-enwe Udo na Ịdị Jụụ?
    Teta!—1997
  • Ha Nọ Na Jeruselem Na-echere
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Ikiri Ụwa
    Teta!—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1997
g97 11/8 p. 5-10

Mkpọtụ—Ihe Ị Pụrụ Ime Banyere Ya

NÁ NGWỤSỊ nke ụbọchị na-agwụ ike, ị dara n’oké ụra. Na mberede, ịgbọ ụja nke nkịta ndị agbata obi gị kpọtere gị n’ike. Ị tụgharịa n’àkwà gị wee na-enwe olileanya na mkpọtụ ahụ na-agbakasị ahụ ga-akwụsị n’isi nso. Ma ọ gara n’ihu. Ugboro ugboro, nkịta ndị ahụ nọgidere na-agbọ. N’ịbụ onye iwe ji, onye ehighị ụra na-agbakasị ahụ, na onye mụ nnọọ anya ugbu a, ị na-eche otú ndị agbata obi gị pụrụ isi nagide ajọ mkpọtụ dị otú ahụ.

Ndị mmadụ dị n’iche n’iche nke ukwuu n’ụzọ ha si anagide mkpọtụ. Ụzụ ụgbọelu na-enye ndị ọrụ ọdụ ụgbọelu bi nso n’ụzọ ụgbọelu si agba nsogbu dị ala karịa ndị ọrụ ha na-emetụtaghị ụgbọelu. Nwunye na-adịghị arụ ọrụ ego bụ́ onye na-eji ígwè eletrik e ji akwọri nri eme ihe na-anagide ụzụ ya n’ụzọ ka nnọọ mma karịa onye bi n’ọnụ ụlọ na-esonụ bụ́ onye na-anwa ịgụ akwụkwọ ma ọ bụ ikiri TV.

Gịnị Bụ Mkpọtụ Na-emerụ Ahụ?

Mba dị n’iche n’iche n’ụzọ ha si akọwa mkpọtụ na-emerụ ahụ. Na Mexico, mkpọtụ bụ “ụda ọ bụla a na-achọghị nke na-akpasu iwe ma ọ bụ na-emerụ mmadụ ahụ.” New Zealand na-ewere mkpọtụ dị ka nke gabigara ókè mgbe ọ bụ “ụdị nke na-emebi udo, ntụsara ahụ na ahụ efe nke onye ọ bụla n’ụzọ ezi uche na-adịghị na ya.”

E jikọtara ndị ọkà mmụta sayensị abụọ a ma ama, bụ́ Alexander Graham Bell, onye chepụtara telifon, na Heinrich Hertz, ọkà n’ihe ọmụmụ physics bụ́ onye Germany, n’ụzọ chiri anya n’ịtụ ụda n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. Bel, ma ọ bụ decibel (otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu bel) a ka mara, na-atụ nkezi nke ịda ụda, ebe hertz na-atụ ịdị elu ma ọ bụ ịdị ala nke ụda. Mgbe a tụrụ mkpọtụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, akụkọ na-ezokarị aka n’ọ̀tụ̀tụ̀ decibel nke ụda ahụ.a

Ma ònye na-ekpebi otú nsogbu nke ụda na-akpata hà? Gị, onye na-anụ ya! “Maka ọ̀tụ̀tụ̀ mkpasu iwe, ntị mmadụ ka bụ ihe nchọpụta kasị mma,” ka The Independent nke London na-ekwu.

Mmetụta nke Mkpọtụ

Ebe ntị bụ “ihe nchọpụta kasị mma” nke mkpọtụ, o doro anya na ọ bụ akụkụ ahụ kasị yie ka ọ ga-enweta mmerụ ahụ site na ya. Mbibi nke akwara nzirịta ozi ndị dị mfe mmetụta nke ime ntị gị pụrụ ịkpata ntị ichi n’ụzọ na-adịgide adịgide. Ndị mmadụ dị n’iche n’iche n’ụzọ ha si emeghachi omume n’ụda na-adasi ike, n’eziokwu. Ma ịnụrụ ụda ndị gafere decibel 80 ruo 90 ugboro ugboro pụrụ iduga n’iji nwayọọ nwayọọ nwee ntị ochichi. N’ezie, ka ọ̀tụ̀tụ̀ mkpọtụ na-arịwanye elu, otú ahụ ka oge ị pụrụ ịnọ kwa ụbọchị na gburugburu ebe ahụ tupu ịnụ ihe gị emebie ga-adịwanye ala.

Magazin New Scientist na-akọ na ọtụtụ ntakịrị stereo a na-ere na France nwere ụda kasị elu nke decibel 113. N’ihota otu ihe ọmụmụ, o kwuru na “egwú rock a kpọrọ mgbe a gbalisịrị ya elu ruo otu hour ná ntakịrị ngwá egwú compact disc gafere decibel 100 n’oge ka ukwuu ma ruo ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu nke ihe dị ka decibel 127.” Ọbụna nke ka njọ bụ mmetụta nke mkpọtụ e mere n’oge ihe nkiri iti egwú. Otu onye nchọpụta hụrụ ka ndị mmadụ gbakọtara nso n’ígwè na-ewepụta okwu n’ọnọdụ amaghị onwe ha. “Ihe ndị m na-ahụ dị inyoghị inyoghị, ụda bass ahụ na-eru n’oghere ime ahụ,” ka ọ na-akọ, “mkpọtụ ahụ na-afụkwa m ụfụ ná ntị.”

Olee mmetụta mkpọtụ pụrụ inwe n’ahụ gị? Otu akwụkwọ kwuru, sị: “Mkpọtụ dị n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị mma ruo na nke dị elu nke a nọgidere na-enwe na-akpata nrụgide, ike ọgwụgwụ, na ahụ mgbakasị.” “Ịbụ onye mkpọtụ na-emekpa ahụ abụghị nanị na ọ na-anapụ ọṅụ ná ndụ, ọ pụrụ ịgwụ mmadụ ike n’ụzọ anụ ahụ na n’ụzọ mmetụta uche,” ka Prọfesọ Gerald Fleischer, nke Mahadum Giessen, Germany, na-ekwu. Mgbe e nwere mkpọtụ n’elu ọnọdụ ndị ọzọ na-akpata nrụgide, dị ka Prọfesọ Makis Tsapogas si kwuo, ọ pụrụ ịkpali ịda mbà n’obi nakwa ọrịa ahụ.

Mkpughepụ ruo ogologo oge nye mkpọtụ pụrụ imetụta ụdị mmadụ gị. Mgbe ndị nchọpụta gọọmenti Britain jụrụ ndị mkpọtụ na-emerụ ahụ metụtara ihe ha chere banyere ndị kpatara ya, ha kwuru banyere ịkpọasị, ịbọ ọ́bọ̀, na ọbụna igbu ọchụ. N’aka nke ọzọ, ndị na-eme mkpọtụ na-ewekarị iwe mgbe a na-eme mkpesa ugboro ugboro banyere ha. “Mkpọtụ na-ebelata ịchọ ọdịmma ndị ọzọ, na-akpatakwa iwe iwe na ibu iro,” ka otu onye na-emegide mkpọtụ na-azọrọ.

Ihe ka ọtụtụ ná ndị taworo ahụhụ site ná mkpọtụ na-emerụ ahụ chọpụtara ndalata nwayọọ nwayọọ nke nguzogide ha nye nsogbu ahụ. Ha na-ekwughachi echiche nke otu nwanyị ndị agbata obi ya na-eme mkpọtụ na-akpọ egwú na-ada ụda oge nile: “Mgbe a manyere gị ige ihe ị na-achọghị ige, ọ na-agwụkasị gị ike ahụ. . . . Ọbụna mgbe mkpọtụ ahụ kwụsịrị, anyị nọ na-echere ya ka ọ malite ọzọ.”

Mgbe ahụ, é nweghị ụzọ ọ bụla isi mee ihe maka mkpọtụ na-emerụ ahụ?

Ihe Ị Pụrụ Ime

Ebe mkpọtụ jupụtara nnọọ ebe nile, ọtụtụ ndị adịghị nnọọ amata mgbe ha na-enye ndị ọzọ nsogbu. Ọ bụrụ na ha maara, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ụfọdụ ga-akwụsị ihe ahụ na-akpasu iwe. Ọ bụ n’ihi nke a ka ijekwuru onye agbata obi na-eme mkpọtụ n’omume enyi pụrụ iji dị irè. Otu onye were iwe n’ihi mkpesa ndị agbata obi ya mere n’aka ndị ọchịchị na ọ na-eme mkpọtụ. Ọ sịrị: “Echere m na ha gaara abịa gwa m ihu na ihu ma ọ bụrụ na mkpọtụ ahụ na-ewute ha.” Otu nne nke haziri otu oriri maka ụmụntakịrị ụfọdụ kwupụtara ijuanya mgbe otu onye ọrụ ọchịchị na-eme nchọpụta banyere mkpesa maka mkpọtụ bịakwutere ya. “Ọ gaara adị m mma ma a sị na ndị mere mkpesa ahụ kụrụ aka n’ọnụ ụzọ m wee gwa m ma ọ bụrụ na obi adịghị ha ụtọ,” ka o kwuru. Mgbe ahụ, ka a sịkwa ihe mere o jiri ju otu onye ọrụ ahụ ike gburugburu ebe obibi Britain anya ịchọpụta na 80 pasent nke ndị na-eme mkpesa banyere mkpọtụ ebe obibi adịbeghị mgbe ha gwara ndị agbata obi ha ka ha kwụsịtụ ime mkpọtụ.

Ịgba nkịtị nke ndị mmadụ n’ịgwa ndị agbata obi na-eme mkpọtụ okwu na-egosipụta enwerịtaghị nkwanye ùgwù. ‘M chọọ ịkpọ egwú m, apụrụ m. Ọ bụ ihe ruuru m!’ bụ nzaghachi ha na-atụ anya ya ma na-enwetakarịkwa. Ha na-atụ egwu na aro obiọma nke ịgbadatatụ ụda ya pụrụ iduga n’esemokwu ka onye agbata obi ahụ na-eme mkpọtụ na-ewere mkpesa ha dị ka nke na-adịghị mkpa. Lee ngosipụta dị mwute nke a bụ n’ọha mmadụ nke taa! Lee ka o si yie okwu Bible na ‘n’oge ndị a dị oké egwu,’ ndị mmadụ n’ozuzu ha ga-abụ ‘ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị mpako, ndị dị ka anụ ọhịa, na ndị isi ike’!—2 Timoti 3:1-4.

Ihe dị ukwuu na-adabere n’ụzọ onye ahụ ọ dakwasịrị si mee ihe. Magazin Woman’s Weekly nyere ọnọdụ ihe atụ na-esonụ nke ụzọ isi dozie ọnọdụ siri ike mgbe mkpesa obi iwe kpaliri mkpasu iwe gasịrị: “‘Lee, ewela iwe—oké iwe were m ma ike gwụkasịrị m ahụ mgbe m na-apụghị ihi ụra’ e kwuru n’ụzọ na-ekpo ọkụ, nke na-egosikwa mmetụta pụrụ ịbụ nanị ihe ọ ga-ewe iji mee ka obi jụrụ [ndị agbata obi na-agọchitere onwe ha].” Ikekwe ha ga-eji ọṅụ bupụ ngwá egwú ha n’ahụ ụlọ kewara ha ma gbadatatụ ụda ya.

N’ụzọ ezi uche dị na ya, ọ baara gị uru ịnọgide na-enwe mmekọrịta dị mma gị na ndị agbata obi gị. Ndị ọchịchị ógbè ụfọdụ na-arụ ọrụ ogbugbo iji kpeziere ndị agbata obi na-ese okwu. N’ihi mmetụta ndị siri ike ime mkpesa n’aka ndị ọchịchị na-akpalite, e kwesịrị ile ịkpọbata onye na-ahụ na e debere iwu anya dị ka “ihe ikpeazụ a ga-eme.”

Ọ bụrụ na ị na-atụ anya ịkwaga n’ebe obibi ọhụrụ, ị ga-achọpụta na ọ bụ ihe amamihe ileba anya n’ihe ndị pụrụ ịdị na-eweta nsogbu nke mkpọtụ tupu i mee nkwekọrịta. Ndị ọrụ ịchọta ala na ụlọ na-atụ aro ka i leta ụlọ ị na-achọ inweta n’oge dị iche iche n’ụbọchị iji mee nchọpụta banyere mkpọtụ. Ị pụrụ ịjụ ndị agbata obi ajụjụ banyere nchọpụta ha. Ọ bụrụ na i zute nsogbu mgbe ị kwabasịrị n’ụlọ ọhụrụ gị, gbalịa idozi ya n’ụzọ ịbụ onye agbata obi. Ịgba akwụkwọ na-akwalitekarị ibu iro.

Ma gịnị ma ọ bụrụ na i bi n’agbata obi mkpọtụ juru, o nweghịkwa otú ị ga-esi akwaga n’ebe ọzọ? À mawo gị ikpe ịta ahụhụ ruo ebighị ebi? Ọ bụchaghị ya.

Ụzọ Isi Nweta Nchebe Pụọ ná Mkpọtụ

Leba anya n’ihe ị pụrụ ime iji gbochie mkpọtụ si n’èzí ịbata n’ụlọ gị. Leruo ahụ ụlọ na ala ụlọ anya iji hụ ma e nwere oghere ọ bụla a pụrụ itechi. Rịba ama karịsịa ebe e nwere ihe nkwụnye eletrik. Hà rapadoro nke ọma?

Mkpọtụ na-abatakarị n’ụlọ site n’ọnụ ụzọ na window. Itinye ibe ugegbe ọzọ na window (itinye ugegbe abụọ) pụrụ inye aka ibelata mkpọtụ. Ọbụna ịgbakwụnye otu ibe fom na-ebughị ibu n’ibo ụzọ gị ga-eme ka ọnụ ụzọ ahụ na-emechi nke ọma. Ikekwe iwu ụlọ mbata na itinye ọnụ ụzọ nke abụọ ga-echebe ime ụlọ gị pụọ ná mkpọtụ ụgbọ ndị na-agba n’ụzọ nke na-enye nsogbu.

Ọ bụ ezie na mkpọtụ ụgbọ ndị na-agba n’ụzọ na-arị ajọ elu, ndị na-emepụta ụgbọala nọgidere na-emepụta ihe na ụzọ ndị ọhụrụ iji belata ọ̀tụ̀tụ̀ nke ụda n’ime ụgbọ gị. Taya ndị na-eme ụzụ dị ala karị n’ụgbọala gị na-enyekwa aka. N’ọtụtụ mba nnwale ndị e ji ụdị elu ụzọ dị iche iche mee ewepụtawo ihe ndị dị ka “kọnkrị na-adịghị eme mkpọtụ,” nke a na-ahapụ ájá ụfọdụ ya n’elu, n’ihi ya kwa taya na-emetụ na ya nanị ná ndaba. A kọrọ na iji elu ụzọ nke a eme ihe na-eji ihe ruru decibel abụọ ebelata ọ̀tụ̀tụ̀ ụzụ maka ụgbọ ndị na-adịghị arọ na otu decibel maka gwongworo ndị dị arọ. Ọ bụ ezie na nke a pụrụ iyi ihe na-ebughị ibu, ndalata nke decibel atọ ná nkezi bụ ihe ruru iji ọkara belata mkpọtụ ụgbọ na-agba n’ụzọ!

Ugbu a ndị na-arụ ụzọ na-atụ ụkpụrụ ụzọ awara awara ndị e wuliri ájá n’akụkụ ha, si otú ahụ na-ebelata mkpọtụ n’ụzọ dị irè. Ọbụna ebe a na-enweghị ohere maka nke a, ogige ndị a rụrụ n’ụzọ pụrụ iche, dị ka otu dị n’ọwụwa anyanwụ London nke ihe mejupụtara ya bụ alaka osisi willow na-akwụ akwụ na ihe ọkụkụ ndị na-adịghị akpọnwụ akpọnwụ, na-echebe ndị bidewere ụzọ awara awara ahụ pụọ ná mkpọtụ a na-achọghị.

Iji ihe a na-akpọ mkpọtụ ọcha zochie ụda ndị na-adọpụ uche—dị ka ihe atụ, ụzụ eletrik ma ọ bụ ikuku na-efesi ike—pụrụ ịba uru n’ebe ụfọdụ, dị ka n’ọfịs.b Na Japan piano ndị na-adịghị eme mkpọtụ apụtala n’ahịa. Kama ịkụta eriri ya, ígwè bọtịn ya na-akpake usoro eletrik nke na-emepụta ụda ya n’ígwè a na-akwụnye ná ntị nke onye na-akpọ ya.

Ndị ọkà mmụta sayensị etinyeworị ọtụtụ hour n’ime nchọpụta banyere mmepụta nke ihe ha na-akpọ mgbochi mkpọtụ. N’ụzọ bụ isi, nke a na-agụnye iji ihe ọzọ na-ewepụta ụda mepụta mkpatụ ndị na-ewepụ mmetụta nke mkpọtụ. Otú ọ dị, nke a na-agụnye ngwá ọrụ ọzọ na mmefu ka ukwuu, n’ezie ọ dịghịkwa ewepụ isi iyi nke nsogbu ahụ. “Ruo mgbe ndị mmadụ malitere ile mkpọtụ anya dị ka unyi n’ụdị ụda,” ka U.S.News & World Report na-ekwu, “mgbochi mkpọtụ pụrụ ịbụ nanị ụzọ isi nweta oge nke enweghị mkpọtụ.” Ikekwe ọ ga-adị otú ahụ, ma enweghị mkpọtụ ọ̀ bụ ihe ngwọta nye mkpọtụ na-emerụ ahụ?

È nwere atụmanya ọ bụla n’ezie maka udo na ịdị jụụ maka ụlọ gị na agbata obi gị? Isiokwu anyị na-esonụ na-enye ezigbote olileanya.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a A na-achọpụtakarị ọ̀tụ̀tụ̀ mkpọtụ site n’iji ígwè ịtụ ihe nke na-atụ ụda na decibel. Ebe ntị na-anụ ịdị elu ma ọ bụ ịdị ala nke ụda ụfọdụ nke ọma karịa ndị ọzọ, a haziri ígwè ịtụ ihe ahụ ịzaghachi n’ụzọ yiri ya.

b Dị nnọọ ka ìhè ọcha bụ ngwakọta nke ọ̀tụ̀tụ̀ nile dị n’usoro ìhè, mkpọtụ ọcha bụ ụda nke nwere ịdị elu ma ọ bụ ịdị ala nile a na-anụ anụ, n’ihe dị ka ọ̀tụ̀tụ̀ ịda ụda ndị ha nhata.

[Igbe dị na peeji nke 6]

Ụzọ Ị Pụrụ Isi Zere Ịbụ Onye Agbata Obi Na-eme Mkpọtụ

● Chee banyere ndị agbata obi gị mgbe ị na-eme ihe na-eme mkpọtụ, burukwa ụzọ gwa ha.

● Mee ihe mgbe onye agbata obi gị gwara gị belata mkpọtụ.

● Mata na ihe ụtọ gị ekwesịghị iduba ná nsogbu nke ndị agbata obi gị.

● Cheta na mkpọtụ na mkpatụ na-agafe na paseji na ala ụlọ n’ụzọ dị mfe.

● Tụkwasị arịa ụlọ na-eme mkpọtụ n’elu ihe.

● Jide n’aka na a pụrụ ịkpọ mmadụ ka o mee ihe banyere mgbịrịgba mgbaàmà kụrụ mgbe ọ na-adịghị mkpa site n’ụlọ na ụgbọala.

● Arụla ọrụ na-eme mkpọtụ ma ọ bụ jiri arịa ụlọ na-eme mkpọtụ mee ihe n’ime abalị.

● Akpọla egwú n’ọ̀tụ̀tụ̀ na-akpasu ndị agbata obi gị iwe.

● Ahapụla nkịta nanị ha ruo ogologo oge.

● Ekwela ka ụmụaka na-awụgharị n’ala ụlọ wee si otú ahụ na-enye ndị bi n’okpuru nsogbu.

● Egbula opi ụgbọala, kwachie ụzọ n’ike, ma ọ bụ nyesie injin ọkụ ike n’abalị.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 7]

Mkpọtụ na Gị

“Mkpọtụ bụ ihe ize ndụ kasị ju ebe nile nke ụlọ ọrụ mmepụta ihe na Britain taa,” ka The Times na-ekwu, “ntị ochichi bụkwa ihe ọ na-akpatakarị.” Ihe ọmụmụ ụfọdụ banyere ọrụ na ahụ ike na-egosi na mkpọtụ gafere decibel 85 pụrụ imerụ nwa e bu n’afọ ahụ. A na-emebi ịnụ ihe nke nwa ahụ, nwa ahụ pụkwara inwe nsogbu mmiri ọgwụ ahụ bụ́ hormone tinyekwara nkwarụ site n’ọmụmụ.

Ịnụrụ mkpọtụ na-adasi ụda ike na-ejikọlata akwara ma na-ebelata nrugharị nke ọbara gaa n’akụkụ ahụ gị. N’akụkụ nke ya, ahụ gị na-azaghachi site n’imepụta mmiri ọgwụ ahụ bụ́ hormone ndị na-eweli mgbali ọbara ma mụbaa obi otiti gị, mgbe ụfọdụ na-eduga n’ume ọkụ ma ọ bụ ọbụna ahụ mgbu.

Mgbe mkpọtụ kpaghasịrị usoro ihe ị na-eme, nsogbu ndị ọzọ pụrụ ibilite. Ehighị ụra nke ọma pụrụ imetụta mmeghachi omume gị n’ehihie. Mkpọtụ nwere ike ọ gaghị agbanwe otú i si arụ ọrụ ngwa ngwa, ma ọ pụrụ imetụta ọnụ ọgụgụ mmejọ ndị ị ga-eme.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 9]

Nchebe n’Ọrụ

Ọ bụrụ na mkpọtụ n’ọrụ na-abụrụ gị nsogbu, chee banyere iyi ụdị ihe nchebe ntị ụfọdụ.* Ihe nkwụchi ntị na-anọ gburugburu isi gị dị ka ígwè a na-akwụnye ná ntị, ha na-adịkarịkwa irè n’ebe ọ̀tụ̀tụ̀ mkpọtụ dị elu. Ha nwere abamuru bụ na ị ka pụrụ ịnụ okwu ọnụ na ihe mgbaàmà ịdọ aka ná ntị nke ígwè ọrụ, ọ bụ ezie na ha pụrụ ime ka o siere gị ike ịmata kpọmkwem ebe ụda ahụ sitere. Ihe nrụchi ntị aghaghị ịbụ ndị hà otú ha kwesịrị maka gị, ha adịghịkwa mma ma ọ bụrụ na i nwere ọrịa ntị ma ọ bụ ọkọ ime ntị.

Ezigbo nlekọta nke ígwè ọrụ pụrụ ibelata ime mkpatụ. Ịtụkwasị ngwá ọrụ ahụ n’elu ụkwụ rọba ga-ebelata mkpọtụ na-emerụ ahụ, dịkwa ka idebe ígwè ọrụ na-eme mkpọtụ iche ga-eme.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

Iwu dị n’ọtụtụ mba na-achọ ka ndị were ndị mmadụ n’ọrụ jide n’aka na ndị ọrụ ha na-eyi ihe nchebe ịnụ ihe kwesịrị ekwesị.

[Foto dị na peeji nke 8]

Olee otú ị pụrụ isi chebe onwe gị pụọ ná mkpọtụ ọha mmadụ na-anya ụgbọ na-eme?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya