Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 6/8 p. 4-7
  • Gịnị Na-akpụzi Omume Gị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Na-akpụzi Omume Gị?
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ndị Na-akpali Mmekọahụ Na-agbagọ Mmekọahụ
  • Ụwa Ntụrụndụ Na-eji Mmekọahụ Eme Ihe
  • Ọrụ Na-agbanwe Agbanwe Agbagọọ Omume
  • Mmụta Mmekọahụ n’Ụlọ Akwụkwọ
  • Gịnị Bụ Ịhụnanya na Nraranye
  • Omume Na-agbanwe Agbanwe Akpalite Ajụjụ Ndị Ọhụrụ
    Teta!—1997
  • Mmekọahụ—Olee Ndụmọdụ nke Dị Irè n’Ezie?
    Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
  • Mmadụ Inwe Mmekọahụ Tupu Ọ Lụọ Di Ma Ọ Bụ Nwunye
    Teta!—2013
  • Iche Ihe Ịma Aka ahụ Ihu
    Teta!—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1997
g97 6/8 p. 4-7

Gịnị Na-akpụzi Omume Gị?

IHE dị ka afọ 2,700 gara aga, otu onye edemede e nyere ike mmụọ nsọ deturu ilu na-akpali echiche: “Ọ dịịrị onye nzuzu dị ka igwuri egwu, bụ́ ime ihe nzube ọjọọ.” (Ilu 10:23) Eziokwu dị na nke a apụtawo ìhè karịsịa kemgbe oké mgbanwe mmekọahụ ahụ. Tupu ụjọ nke ọrịa AIDS, omume zuru ebe nile bụ na mmekọahụ bụ ‘egwuregwu mmadụ na ibe ya’ nakwa na a ghaghị imejụ ọchịchọ mmekọahụ ‘n’agbanyeghị ihe ga-esi na ya pụta.’ Omume a ọ̀ gbanweela? Ọ gbanwechabeghị.

Iri isi nke mmekọahụ taa ka na-emepụta “ndị ihe ndọrọ na-atọgbu atọgbu,” ‘ndị a lụọ a chụọ,’ na “ndị nrigbu mmekọahụ,” bụ́ ndị na-arụ ụka na omume ọma bụ okwu dịịrị onwe onye nakwa na iso ọtụtụ ndị na-enwe mmekọahụ n’efu dị otú o kwesịrị. (Lee igbe bụ́ “Ụzọ Ndụ Mmekọahụ,” na peji nke 6.) Ha na-azọrọ na ‘ọ dịghị onye a na-emerụ ahụ’ site n’isoro onye ọ bụla masịrị mmadụ nwee mmekọahụ, ọ bụrụhaala na ọ bụ n’etiti ndị toruworo ogo mmadụ kwekọrịtaranụ. Na 1964, ọkà ná mmụta mmekọrịta ọha na eze nke Mahadum Steeti nke Iowa bụ́ Ira Reiss kpọrọ nke a “ime otú masịrị mmadụ n’ihe banyere mmetụta ịhụnanya.”

Bishọp Anglịkan nke Edinburgh, Scotland, chekwara otú ahụ dị ka o yiri, n’ihi na o kwuru na a mụrụ mmadụ inwe ọtụtụ ndị ọyị. N’otu okwu o kwuru banyere mmekọahụ na Iso Ụzọ Kraịst, o kwuru, sị: “Chineke maara mgbe o mere anyị na o nyewo anyị ọchịchọ mmekọahụ dị anyị n’ime nke ịpụ gaa kụọ mkpụrụ anyị. O nyewo anyị mkpụrụ ndụ ihe nketa inwe mmekọahụ aghara aghara. Echere m na ọ ga-abụ ihe na-ezighị ezi ka chọọchị katọọ ndị gbasoworo amamihe ebumpụta ụwa ha.”

Echiche dị otú ahụ ò ziri ezi? Gịnị ka inwe mmekọahụ n’efu na-ewe? Iso ọtụtụ ndị na-enwe mmekọrịta mmekọahụ na-adịru nwa oge ọ̀ na-eweta afọ ojuju na obi ụtọ?

Ntiwapụ nke ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ n’ụwa nile na ịbụ eziokwu nke ọtụtụ nde afọ ime mkpuke, karịsịa n’etiti ndị nọ n’afọ iri na ụma, bụ ihe àmà ọdịda nke ụdị echiche ahụ. Dị ka magazin Newsweek si kwuo, na United States nanị, ihe e mere atụmatụ ya ịbụ nde atọ nke ndị nọ n’afọ iri na ụma na-arịa ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ kwa afọ. Ọzọkwa, ọtụtụ n’ime ndị a “toruworo ogo mmadụ kwekọrịtaranụ” yiri ka ha bụ “ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ” ma ọ bụ ndị na-enweghị echiche nke ibu ọrụ n’ebe nwa ahụ e bu n’afọ nke ọ na-arụpụtakarị nọ, ha na-achọkwa nsikwopụ afọ ime ngwa ngwa. (2 Timoti 3:3) Nke a na-anapụ nwa ahụ e bu n’afọ ndụ ya, ka a na-eji obi ọjọọ dọkapụ ya n’ahụ nne ya. Ihe ọ na-akpatara nne ahụ na-eto eto pụrụ ịbụ oké ịda mbà n’obi na obi amamikpe nke pụrụ inye ya nsogbu ná ndụ ya nile fọrọ afọ.

N’etiti afọ ndị 1990 na Britain nanị, ihe mmetụta nke oké mgbanwe mmekọahụ na-efu n’ụzọ ego bụ ijeri $20 na-ebu isi kwa afọ, ka Dr. Patrick Dixon gbakọtara. N’akwụkwọ ya bụ́ The Rising Price of Love, Dr. Dixon nwetara ọnụ ọgụgụ a site n’idetu ihe ọ na-efu iji gwọọ ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ, gụnyere ọrịa AIDS; ihe ndakpọ nke mmekọrịta ndị na-adịte anya na-efu; ihe ịbụ nne ma ọ bụ nna nanị ya na-azụ nwa na-efu ọha mmadụ; na ihe ọgwụgwọ ezinụlọ na ụmụaka na-efu. Dị ka a kọrọ na The Globe and Mail, bụ́ akwụkwọ akụkọ Canada a na-ebipụta kwa ụbọchị, Dr. Dixon na-ekwubi, sị: “Oké mgbanwe ná mmekọrịta mmekọahụ ndị kwere anyị nkwa nnwere onwe emewo ka ọtụtụ ndị nọrọ n’agbụ, n’ime ụwa nke ọgba aghara mmekọahụ, ọdachi, owu ọmụma, ihe mgbu mmetụta uche, ime ihe ike na mmetọ bibiworo.”

Ma gịnị kpatara iri isi nke mmekọahụ nke nọgidere na-aga n’ihu, inwe mmasị karị ná mmekọrịta na-adịru nwa oge, na isi ọnwụ ná mmekọahụ n’efu nke na-enweghị ibu ọrụ? Ebe e nwere ajọ mkpụrụ ndị a pụtara ìhè n’ime iri afọ atọ gara aga, gịnị na-akwanye ọkụ n’ihe iri isi a na-ebibi ihe?

Ihe Ndị Na-akpali Mmekọahụ Na-agbagọ Mmekọahụ

E hotawo ihe ndị na-akpali mmekọahụ dị ka otu ihe so na-akwanye ọkụ n’iri isi nke mmekọahụ. Otu onye mmekọahụ riri ahụ nke ji aka ya mee nkwupụta na-ede n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The Toronto Star, sị: “Akwụsịrị m siga afọ ise gara aga, mmanya na-aba n’anya afọ abụọ gara aga, ma ọ dịbeghị ihe siiri m ike ịkwụsị ná ndụ nke karịrị oriri mmekọahụ na ihe ndị na-akpali mmekọahụ riri m ahụ.”

O kwenyesikwara ike na ndị nọ n’afọ iri na ụma e kpughere mgbe nile nye ihe ndị na-akpali mmekọahụ na-azụlite echiche gbagọrọ agbagọ banyere àgwà mmekọahụ. Ha na-eme n’omume ha echiche efu nke mmekọahụ ma na-achọta mmekọrịta ndị bụ ezie ịbụ ndị dị ma mgbagwoju anya ma ndị siri ike. Nke a na-eduje na nkewapụ iche na nsogbu ndị ọzọ, nke otu n’ime ndị kasịnụ bụ ihe isi ike n’ịzụlite ihe nkekọ ịhụnanya na-adịgide adịgide.

Ụwa Ntụrụndụ Na-eji Mmekọahụ Eme Ihe

Ụzọ ndụ inwe mmekọahụ aghara aghara nke e so ọtụtụ ndị na-enwe, na-enwe ma ọ bụ ghara inwe nkwado iwu, abụrụwo nke a na-eme ebe nile na nke ụwa ntụrụndụ na-egosipụta n’ihu ọha. Ngosi mmekọahụ n’ụzọ enweghị ịhụnanya na n’ụzọ mweda n’ala na TV na-akwanye ọkụ ná mmekọahụ iri isi, na-enye ọgbọ a echiche gbagọrọ agbagọ nke ọchịchọ inwe mmekọahụ ụmụ mmadụ. Usoro mgbasa ozi ntụrụndụ na-eji mmekọahụ ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye atụnyere ịhụnanya n’ụzọ na-abụghị eziokwu ọtụtụ mgbe. Ndị ọ na-amasị bụ́ ndị na-efe ndị na-eme ntụrụndụ yiri ka ha enweghị ike ịmata ihe dị iche n’agbata oké agụụ mmekọahụ na ịhụnanya, n’agbata mmekọahụ nkịtị na-adịru nwa oge na nkwekọrịta na-adịte aka, ma ọ bụ n’agbata echiche efu na ihe bụ ezie.

N’otu aka ahụ, ọtụtụ mgbe ụlọ ọrụ mkpọsa ngwá ahịa ejiriwo mmekọahụ mee ihe dị ka ụzọ isi repụ ahịa. Ọ ghọwo “ngwá ahịa obi ịta mmiri nke nzube ya bụ ịdọrọ uche gaa n’otu ngwá ahịa,” ka otu onye na-agwọ nsogbu mmekọahụ kwuru. Ndị mkpọsa ngwá ahịa ejiriwo mmekọahụ mee ihe ma jikọta inwe mmekọahụ na ndụ ọma, ma nke a bụ ọzọ n’ime “mgbagọ nke echiche banyere mmekọahụ” na narị afọ nke 20, dị ka magazin bụ́ Family Relations si kwuo.

Ọrụ Na-agbanwe Agbanwe Agbagọọ Omume

Ọdịdị mmekọrịta ọha na eze nke na-agbanwe agbanwe na mwebata nke ọgwụ nchịkwa ọmụmụ n’ime ahịa n’afọ 1960 gbanwere àgwà mmekọahụ nke ọtụtụ nde ndị inyom. Ọgwụ mgbochi afọ ime ahụ nyere ndị inyom echiche ịha nhata n’ụzọ mmekọahụ ha na ndị ikom, nnwere onwe mmekọahụ ma ọ bụ adabereghị n’onye ọzọ a na-enwetatụbeghị. Dị ka ndị ikom, ugbu a ha pụrụ ịnwale mmekọrịta ndị na-adịru nwa oge, na-abụghị ndị egwu nke afọ ime a na-achọghị gbochiri. N’inwe oké ọṅụ ná ntọhapụ ha n’ụzọ mmekọahụ, ma ndị ikom ma ndị inyom nugara ibu ọrụ ezinụlọ na nke mmekọahụ ndị kwesịrị ekwesị n’ọnụ ọnụ nke mkpochapụ.

Otu onye so dee Bible na narị afọ mbụ kwuru banyere ndị dị otú ahụ, sị: “Ha bụ ndị nwere anya nke jupụtara n’ahụ nwanyị na-akwa iko, anya nke na-apụghịkwa ịghara imehie . . . ha nwekwara obi a nwapụtaworo n’anyaukwu . . . ha hapụrụ ụzọ guzoziri eguzo, wee jehie.”—2 Pita 2:14, 15.

Mmụta Mmekọahụ n’Ụlọ Akwụkwọ

Otu ihe ọmụmụ e mere na United States nke ihe dị ka 10,000 ndị inyom na-alụtụbeghị di nọ n’afọ ndụ ije ụlọ akwụkwọ dị elu kpughere na “ihe ọmụma, dị ka e gosiri site n’ihe ọmụmụ mmụta mmekọahụ na ihe ọmụma onwe onye banyere nchịkwa ọmụmụ,” enweghị mmetụta ọ bụla n’ọ̀tụ̀tụ̀ ntụrụ ime nke ndị nọ n’afọ iri na ụma na-alụghị di. Ka o sina dị, ụfọdụ ụlọ akwụkwọ ọha na eze na-emeghachi omume n’ebe ntiwapụ ahụ dị site n’inye ụmụ akwụkwọ ha condom n’efu, ọ bụ ezie na a na-arụsi ụka ike banyere omume a.

Otu nwa akwụkwọ dị afọ 17 nke nọ n’ụlọ akwụkwọ dị elu, onye akwụkwọ akụkọ bụ́ Calgary Herald gbara ajụjụ ọnụ kwuru, sị: “Ọ bụ eziokwu na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị nọ n’afọ iri na ụma nọ n’ụlọ akwụkwọ dị elu na-enwe mmekọahụ . . . , ọbụna ụfọdụ ndị dị afọ 12.”

Gịnị Bụ Ịhụnanya na Nraranye

Ịhụnanya, ntụkwasị obi, na ịnọkọ ọnụ nke dị oké ọnụ ahịa abụghị ihe ndị na-abịa ozugbo site ná ndọrọ mmekọrịta mmekọahụ bịara na mberede ma ọ bụ mmejụ nke mkpali mmekọahụ. Nanị inwe mmekọahụ apụghị ime ka e nwee ezi ịhụnanya. Ịhụnanya na ichi anya na-esite n’obi nke mmadụ abụọ na-eche banyere ibe ha ndị raara onwe ha nye n’iwulite mmekọrịta na-adịgide adịgide.

Mmekọrịta ndị na-adịru nwa oge na-emesịa mee ka mmadụ ghara ịnọ ná nchebe, nọrọ nanị ya, na ikekwe bute ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ dị ka ọrịa AIDS. Ndị na-akwado mmekọahụ n’efu pụrụ ịbụ ndị okwu ndị dị na 2 Pita 2:19 kọwara nke ọma: “Ha na-ekwekwa ha nkwa na ha ga-enwe onwe ha, ọ bụ ezie na ha onwe ha bụ ohu nke mmebi; n’ihi na ihe meriworo mmadụ, ihe a ka e mewokwara ka onye ahụ bụrụ ohu ya.”

Òtù na-ahụ maka ibu ọrụ ọha nke Chọọchị England wepụtara akụkọ ya na June 1995, nke a kpọrọ “Ihe A Ga-emere Oriri.” N’ụzọ dị nnọọ iche na ndụmọdụ Bible òtù ahụ gbara chọọchị ume “iwepụ nkebi ahịrị okwu ahụ bụ́ ‘ibi n’ime mmehie’ ma wepụ omume nkatọ ya n’ebe ndị na-ebikọ ọnụ n’alụghị di na nwunye nọ,” dị ka The Toronto Star si kwuo. Akụkọ ahụ tụrụ aro na “ọgbakọ kwesịrị ịnabata ndị na-ebikọ ọnụ, gee ha ntị, mụta ihe site n’aka ha, . . . ka mmadụ nile wee nwee ike ịchọpụta ọnụnọ Chineke ná ndụ ha.”

Gịnị ka Jisọs gaara akpọworị ụdị ndị ndú okpukpe ahụ? N’enweghi ihe ịrụ ụka ọ bụla “ndị ndú kpuru ìsì.” Gịnịkwanụ banyere ndị na-agbaso ndị ndú dị otú ahụ? O kwuru, sị: “Ọ bụrụ na onye ìsì eduo onye ìsì, ha abụọ ga-adaba n’olulu.” Enwela obi abụọ ọ bụla banyere ya, Jisọs kwuru n’ụzọ doro anya na “ịkwa iko nile nke ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di” na “ịkwa iko nile” so ‘n’ihe na-emerụ mmadụ.’—Matiu 15:14, 18-20.

Ebe e nwere ihe ndị a na-agbagọ ma na-eji mmekọahụ eme ihe, olee otú mmadụ, karịsịakwa ntorobịa, pụrụ isi nwere onwe ha pụọ n’ịbụ ndị mmekọahụ riri isi? Gịnị bụ isi ihe na-eme ka e nwee mmekọrịta ọṅụ, nke na-adịte anya? Isiokwu na-esonụ ga-elekwasị anya n’ihe ndị mụrụ ụmụ pụrụ ime iji nyere ndị ntorobịa aka ịkwadebe maka ọdịnihu.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

Na United States nanị, ihe e mere atụmatụ ya ịbụ nde atọ nke ndị nọ n’afọ iri na ụma na-arịa ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ kwa afọ

[Igbe dị na peeji nke 6]

Ụzọ Ndụ Mmekọahụ

Ndị ihe ndọrọ na-atọgbu atọgbu: Ha na-enwe mmasị ịbanye ná mmekọrịta ịhụnanya, ya mere ha na-aga site n’otu mmekọrịta ịhụnanya gaa n’ọzọ ozugbo oké mkpali nke ịhụnanya efu kwụsịrị. Ọ bụ Dr. Michael Liebowitz, nke Ụlọ Ọrụ Ọrịa Uche nke New York State, wepụtara okwu ahụ.

Ndị a lụọ a chụọ: Ndị ọkà ná mmụta mmekọrịta ọha na eze si otú a akọwa ndị na-aga site n’otu mmekọrịta ịhụnanya gaa n’ọzọ bụ́ ndị na-agụnye usoro iwu nke alụmdi na nwunye, ịgba alụkwaghịm, na nlụgharị di ma ọ bụ nwunye.

Ndị nrigbu mmekọahụ: Ha na-achọ igosipụta ike mmekọahụ ha site n’inwe ọtụtụ ndị ha so enwe mmekọahụ, ka Luther Baker, bụ́ prọfesọ n’ihe ọmụmụ ezinụlọ na onye e nyere ikike ịgwọ nsogbu mmekọahụ, kwuru. E jikwa okwu ahụ eme ihe ugbu a maka ndị na-emetọ ụmụaka.

[Foto dị na peeji nke 7]

Ihe na-akpali mmekọahụ na-eri ahụ ma na-eduga n’echiche gbagọrọ agbagọ banyere àgwà mmekọahụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya