Omume Na-agbanwe Agbanwe Akpalite Ajụjụ Ndị Ọhụrụ
“OKÉ MGBANWE MMEKỌAHỤ,” “ntiwapụ mmekọahụ,” “oké mgbanwe omume.” Ụdị okwu ndị ahụ kpọsara omume na-agbanwe agbanwe n’ebe mmekọahụ dị, karịsịa n’etiti afọ ndị 1960 na mgbe ọ gasịrị. Ọtụtụ ndị nakweere okwu njimara “mmekọahụ n’efu,” nke kara ụzọ ndụ ebe ndị mmadụ jụrụ alụmdi na nwunye na amaghị nwoke ma ọ bụ nwanyị akara.
Nkwupụta echiche nke onye na-ede akwụkwọ bụ́ Ernest Hemingway bụ́ “Ihe bụ omume ọma bụ ihe ị na-enwe obi ụtọ na ya mgbe ọ gasịrị, ihe bụkwa omume rụrụ arụ bụ ihe ị na-enwe mwute na ya mgbe ọ gasịrị,” pụrụ ịchịkọta nnọọ nke ọma omume nke ndị nkwa nnwere onwe na afọ ojuju mmekọahụ nwụdere. Ịnakwere echiche a nyere ihe ngọpụ maka iso ọtụtụ ndị na-enwe mmekọrịta mmekọahụ ndị na-adịru nwa oge, bụ́ nke ndị ahụ, nwoke na nwanyị, na-anọ na ya nwalee ọchịchọ mmekọahụ ha. A kparaghị “afọ ojuju” mmekọahụ ókè. Ọgwụ mgbochi ime, nke e webatakwara n’otu afọ iri ahụ, tụnyere ụtụ n’imekwu nnwale mmekọahụ a na-akparaghị ókè.
Otú ọ dị, ọrịa AIDS na ọrịa ndị ọzọ a na-ebute site ná mmekọahụ ghọrọ ihe nketa sitere n’ụzọ ndụ inwe mmekọahụ aghara aghara nke a. A kpara omume mmekọahụ nke ọgbọ na-enweghị njide onwe onye aka ọjọọ. Afọ ụfọdụ gara aga, magazin bụ́ Time buru isi akụkọ bụ́ “Mmekọahụ n’Afọ Ndị 1980—Oké Mgbanwe ahụ Agafeela.” Mkpọsa a dabeere n’ụzọ bụ isi n’ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ juru ebe nile ndị metụtaworo ọtụtụ ndị America. Ruo taa, ngụkọta ọnụ ọgụgụ nke ndị bu ọrịa AIDS n’ụwa nile eruwo ọnụ ọgụgụ na-ebu isi nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde 30!
Egwu maka ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ kpaliri inwekwu mgbanwe n’omume nke ọtụtụ ndị n’ebe mmekọrịta mmekọahụ ndị na-adịru nwa oge dị. Otu mbipụta 1992 nke US, bụ́ magazin na-akọ banyere ntụrụndụ, n’ịkọ banyere otu nnyocha gọọmenti, kwuru, sị: “Ihe dị ka nde 6.8 ụmụ nwanyị na-alụghị di emewo mgbanwe n’àgwà mmekọahụ ha n’imeghachi omume n’ebe ọrịa AIDS na ọrịa ndị ọzọ a na-ebute site ná mmekọahụ dị.” Dị ka isiokwu ahụ si kwuo, ozi ya doro anya: “Mmekọahụ bụ okwu siri ike. Ihe i kotere i buru.”
Olee ụzọ ọtụtụ afọ iri ndị a nọ n’oké ọgba aghara siworo metụta omume e nwere n’ebe mmekọrịta mmekọahụ dị? À mụtawo ihe ọ bụla site ná mmejụ ọchịchọ ebumpụta ụwa n’ajụghị ase nke ihe e ji mara ya bụ mmekọahụ n’efu nke ọtụtụ afọ iri ndị na-adịbeghị anya na site n’eziokwu na-akpata iche echiche nke ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ nke afọ ndị 1980? Mwebata nke mmụta mmekọahụ n’ụlọ akwụkwọ ọha na eze ò nyeworo ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ aka ịnagide ọchịchọ mmekọahụ ha n’ụzọ gara nke ọma? Olee ụzọ kasị mma isi chee ihe ịma aka nke omume gbanwere agbanwe nke taa n’ebe ọchịchọ mmekọahụ dị ihu?