Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 6/8 p. 8-10
  • Iche Ihe Ịma Aka ahụ Ihu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iche Ihe Ịma Aka ahụ Ihu
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Mụrụ Ụmụ Ndị Na-enwe Mmetụta Dị Mma
  • Iche Ihe Ịma Aka ahụ Ihu n’Ụzọ Gara nke Ọma
  • Nakwere Ndokwa Jehova Maka Ndụ
  • Gịnị Na-akpụzi Omume Gị?
    Teta!—1997
  • Omume Na-agbanwe Agbanwe Akpalite Ajụjụ Ndị Ọhụrụ
    Teta!—1997
  • Mmadụ Inwe Mmekọahụ Tupu Ọ Lụọ Di Ma Ọ Bụ Nwunye
    Teta!—2013
  • Olee Otú M Pụrụ Isi Zere Mmekọahụ Tupu Alụmdi na Nwunye?
    Teta!—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1997
g97 6/8 p. 8-10

Iche Ihe Ịma Aka ahụ Ihu

MWAKPO nke ụkpụrụ omume mmekọahụ na-amalite n’oge ná ndụ ebe e nwere telivishọn, akwụkwọ, magazin, ihe nkiri sịnịma, na egwú ndị na-ekwu maka mmekọahụ. A na-akwanye ndị ntorobịa n’inwe mmekọahụ nke ndị toruworo ogo mmadụ n’enweghị nchebe nke nguzosi ike nke mmetụta uche. Ụfọdụ ndị mụrụ ụmụ ọbụna na-atụkwasị ihe ná nrụgide mmekọahụ ahụ site n’ikwere ka a na-eyi oge mkpapụ mgbe a ka bụ nwata. Nrụgide ndị ọgbọ na-agba ume iyi oge mkpapụ, ọtụtụ ndị ntorobịa kwa ndị nwere ndị enyi nwoke ma ọ bụ enyi nwanyị ha na ha na-akpachi anya na-akwụsị ịnọ na nche n’oge na-adịghị anya ma ghọọ ndị na-enwe mmekọahụ. “Ọ bụ nnọọ ihe a na-ahụkebe . . . bụ nwa agbọghọ na-eto eto nọ n’afọ iri na ụma nke na-eche na ndị mụrụ ya ahụghị ya n’anya . . . ịdaba n’ibi ọmà mmekọahụ ya na enyi ya nwoke ná nkweta hiere ụzọ na ọ ga-eweta ịhụnanya na ichi anya,” ka Luther Baker, bụ́ prọfesọ n’ihe ọmụmụ ezinụlọ, kwuru.

Ndị ntorobịa yiri ka ha na-ebi ndụ afọ uto ha dị ka oge obi ụtọ ikpeazụ ha ná ndụ kama ịbụ dị ka nkwadebe maka ndụ. “N’ịbụ ndị ikike ọhụrụ ha masịrị nke ukwuu na ịbụ ndị ndị ọgbọ ha mere ka ha kwenyesie ike na inwe ike mmekọahụ bụ ụzọ isi bụrụ nwoke, ọtụtụ ndị ntorobịa na-aghọ ndị nrigbu mmekọahụ” n’oge uto ha, ka Prọfesọ Baker kwuru. Ihe dị ka afọ 30 gara aga, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Arnold Toynbee kwupụtara oké mwute banyere nghọgbu a a ghọgburu ndị ntorobịa anyị, ebe o kwenyere na akụkọ ihe mere eme egosipụtawo na akụkụ nke ike nchepụta ihe nke Ebe Ọdịda Anyanwụ esitewo n’ikike ya iyigharị ‘ntụte mmekọahụ’ nke ndị nọ n’oge uto iji nye ha ohere ịtụkwasị uche n’inweta ihe ọmụma.

Ndị Mụrụ Ụmụ Ndị Na-enwe Mmetụta Dị Mma

Ndị mụrụ ụmụ, ndị na-adịghị ekwe ka ndị nọ n’oge uto yie oge mkpapụ n’ihi ntụrụndụ, na-egosi ezi nchegbu maka ahụ ike na obi ụtọ ọdịnihu nke ụmụ ha. Site n’inwe ụkpụrụ omume ndị dị elu na ịnọgide na-enwe ezi nkwurịta okwu, ha pụrụ inwe mmetụta ná ndụ nke ụmụ ha. Nnyocha e mere n’àgwà mmekọahụ nke ndị ntorobịa na-egosi na “mmetụta a pụrụ iduje ụmụaka n’ịdọla inwe mmekọahụ azụ,” dị ka Journal of Marriage and the Family si kwuo.

Ndị mụrụ ụmụ bụ́ ndị na-akụbanye n’ime ụmụ ha echiche siri ike nke ọzụzụ onwe onye na ibu ọrụ na-arụpụta ihe ndị kasị mma. “Mgbe ndị nọ n’oge uto na ndị mụrụ ha nwere ụkpụrụ omume ndị na-emesi ibu ọrụ ike, ohere ndị ahụ nọ n’oge uto nwere ịmụ nwa n’alụghị di bụ nke a na-egbubilata nke ukwuu,” ka otu ihe ọmụmụ na-agba akaebe ya. Nke a na-achọ ntinye aka dị mma n’ihe omume ụmụaka—inyocha ihe omume e kenyere ha ime n’ụlọ; ịmata ebe ha nọ na ndị ha na ha na-akpakọrịta; isetịpụ ihe mgbaru ọsọ agụmakwụkwọ ndị a pụrụ iru eru; na ikerịta ụkpụrụ ime mmụọ. Ụmụaka ndị ji mmekọrịta a chiri anya nke ha na ndị mụrụ ha na-eto ga-enwe mmetụta ka mma banyere onwe ha, ha ga-enwekwa ahụ iru ala banyere ọchịchọ mmekọahụ ha.

Okwu ndụmọdụ kasị mma maka ma ndị mụrụ ụmụ ma ụmụaka bụ amamihe ahụ a na-achọta n’ime Bible. E nyere ndị mụrụ ụmụ n’Israel iwu ịkụziri ụmụ ha ụkpụrụ omume ndị kwesịrị ekwesị. Jehova jụrụ ha, sị: “Olee mba ukwu dịkwa, nke nwere ụkpụrụ na ikpe ziri ezi dị ka iwu a nile, nke Mụ onwe m na-etinye n’ihu unu taa?” Ọ bụ “ụkpụrụ” ndị a ka ha gaje ịkụziri ụmụ ha n’ikpo ọkụ na ichi anya nke ọnọdụ ezinụlọ. “Ị ga-ejisikwa ike izi ha ụmụ gị, ị ga-ekwukwa okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.” A dụrụ ụmụaka ọdụ, sị: “Chebe ihe nna gị nyere n’iwu, ahapụkwala iwu nne gị.” Ụdị nkwurịta okwu na izi ihe dị otú ahụ na-ekpo ọkụ, nke chiri anya site n’aka ma nna ma nne bụ ihe ndị e ji ewulite omume ziri ezi n’ebe ndụ na ọchịchọ mmekọahụ dị, bụ́ nke “ga na-eche” onye ntorobịa ná ndụ ya nile.—Deuterọnọmi 4:8; 6:7; Ilu 6:20, 22.

Ndị ntorobịa, n’ihi gịnị ka unu ga-eji mebie ọdịnihu unu site n’ikwenyere ọchịchọ mmekọahụ? Agbata afọ iri na atọ ruo afọ iri na itoolu dị ihe dị ka afọ asaa n’ọnụ ọgụgụ. E kwesịrị iji ha too n’uche, ná mmetụta uche, n’ime mmụọ, na ịzụlite omume ziri ezi banyere ọchịchọ mmekọahụ, ná nkwadebe maka afọ 50 ma ọ bụ 60 na-esonụ nke ndụ. Ndị mụrụ ụmụ, jirinụ ibu ọrụ Chineke nyere unu kpọrọ ihe ma chebe ụmụ unu pụọ ná mkpasu iwe nke obi nke ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ na afọ ime mkpuke ọ na-eweta. (Eklisiastis 11:10) Mee ka ụmụ gị hụ n’ime ndụ unu na-adị kwa ụbọchị otú ịhụnanya na nchebara echiche maka ndị ọzọ si ewulite mmekọrịta ndị na-adịte anya.

Iche Ihe Ịma Aka ahụ Ihu n’Ụzọ Gara nke Ọma

Ekwela ka ihe iri isi oge a banyere mmekọahụ gbagọọ echiche gị banyere ndụ ma mebie ohere i nwere maka ọdịnihu na-eju afọ na nke obi ụtọ. Tụgharịa uche n’ọtụtụ ihe atụ nke mmekọrịta ụmụ mmadụ ndị dị n’ime Bible. Jide n’aka na ndụ na ịhụnanya na-anọgide bụrụ nke na-akpali akpali na nke na-eju afọ ọtụtụ afọ mgbe afọ iri na ụma gasịrị. Mgbe e chebasiiri eziokwu a echiche ike n’ikwekọ n’uche Chineke maka ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị Kraịst, mgbe ahụ a tọwo ntọala maka njikọ chiri anya, na-adịte anya nke mmadụ abụọ hụrụ onwe ha n’anya.

Ka ị na-enyocha di na nwunye ndị a kọrọ akụkọ ha na Bible dị ka Jekọb na Rechel, Boaz na Rut, na nwa okoro ahụ na-azụ atụrụ na nwa agbọghọ Shunem, ị ga-ahụ ntakịrị ndọrọ mmekọahụ ná mmekọrịta ha. Otú ọ dị, ka i ji nlezianya na-agụ Jenesis isi nke 28 na nke 29, akwụkwọ Rut, na Abụ nke Abụ, ị ga-ahụ na e nwere ihe ndị ọzọ dị mkpa ndị na-eme ka mmekọrịta ndị dị otú ahụ maa mma karị.a

Nakwere Ndokwa Jehova Maka Ndụ

Jehova, bụ́ Onye Okike nke agbụrụ mmadụ, ghọtara ọchịchọ mmekọahụ ụmụ mmadụ na mkpali ndị ọ gụnyere. N’ịhụnanya, o kewo anyị n’onyinyo ya, o kenyeghị anyị “mkpụrụ ndụ ihe nketa inwe mmekọahụ aghara aghara,” kama ikike ịchịkwa mmetụta uche anyị n’ikwekọ n’uche Chineke. “Nke a bụ ihe Chineke na-achọ, . . . ka unu ghara ịkwa iko; ka onye ọ bụla n’ime unu mata otú ọ ga-enwe nwunye nke aka ya n’odido nsọ na nsọpụrụ, ọ bụghị n’ọchịchọ ọjọọ nke agụụ ihe ọjọọ, ọbụna dị ka ndị mba ọzọ ndị na-amataghị Chineke; ka onye ọ bụla ghara ịghọgbu na irigbu nwanna ya n’ihe a.”—1 Ndị Tesalọnaịka 4:3-6.

Ndịàmà Jehova na-egosipụta nke a n’ụwa nile. Ha na-akwanyere ụkpụrụ dị elu nke Chineke maka ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị Kraịst ùgwù. A na-elekwasị ndị ikom mere okenye karị anya dị ka ndị nna, “ụmụ okorobịa dị ka ụmụnne: ndị inyom, ndị bụ́ okenye, dị ka ndị bụ́ nne; ụmụ agbọghọ dị ka ụmụnne nwanyị, n’ịdị ọcha nile.” (1 Timoti 5:1, 2) Lee ọnọdụ dị mma ọ bụ nye ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ ikpori ndụ ka ha na-eru n’ọ̀tụ̀tụ̀ ha zuru ezu, n’abụghị ndị nrụgide nke iyi oge mkpapụ na ịlụchu di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ dọghachiri azụ! Ezinụlọ ndị Kraịst na-arụsi ọrụ ike, nke ọgbakọ ndị Kraịst na-ewusi ike, bụ ebe nchebe n’ime ụwa nke ara mmekọahụ na-agba.

N’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ná ndụ ha, ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst nweere onwe ha pụọ n’ihe iri ahụ nke mmekọahụ ma na-achọta ọṅụ n’ịṅa ntị na ndụmọdụ e nyere n’Okwu Chineke, sị: “Ṅụrịa, nwa okorobịa, na nwata ị bụ; ka obi gị meekwa gị mma n’ụbọchị nile nke okorobịa ị bụ, jeekwa ije n’ụzọ nile nke obi gị, na n’ọhụhụ ụzọ nke anya gị abụọ: ma mara na n’ihi ihe ndị a nile Chineke ga-eme ka ị baa n’ikpe. Ma wezụga mkpasu iwe n’obi gị, meekwa ka ihe ọjọọ si n’anụ ahụ gị gabiga: n’ihi na okorobịa na mgbe dimkpa bụ ihe efu.”—Eklisiastis 11:9, 10.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee peji nke 247 nke akwụkwọ bụ́ Questions Young People Ask—Answers That Work, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 10]

Ekwela ka iri isi nke mmekọahụ mebie ohere i nwere maka ọdịnihu na-eju afọ na nke obi ụtọ

[Foto ndị dị na peeji nke 9]

Ndị ntorobịa ndị ha na ezinụlọ ha na-emekọ ihe omume eyikebeghị ka ha ga-achọ inwe mmekọahụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya