Ike nke Mkpọsa Ngwá Ahịa
N’OGE dị anya gara aga, a na-ewebata mkpọsa ngwá ahịa nke telivishọn mgbe ihe omume na-aga n’ihu site n’okwu bụ́, “Ugbu a, ka anyị were okwu ole na ole sitere n’ọnụ ndị nkwado anyị.” Ndị nkwado bụ ụlọ ọrụ ndị na-akwụ ụgwọ iji mee ka a kpọsaa ngwá ahịa ha. Ọ bụ ezie na “okwu ole na ole sitere n’ọnụ ndị nkwado anyị” aghọwo ihe bara ụba, ndị nkwado ka na-akwado ụlọ ọrụ mgbasa ozi na ntụrụndụ—telivishọn, magazin, akwụkwọ akụkọ, na redio—n’ụzọ ego. N’ihi ya, ndị nkwado na-anwa ịchịkwa ihe na-apụta na ihe na-adịghị apụta n’usoro mgbasa ozi.
Iji maa atụ: Na 1993, otu ụlọ ọrụ na-emepụta ụgbọala okomoko ndị Germany degaara magazin 30 akwụkwọ, na-enye ha iwu ka mkpọsa ngwá ahịa ndị na-egosi ụgbọala ha pụta “nanị na peji na-adọrọ adọrọ nke magazin ndị ahụ.” Akwụkwọ ozi ahụ kọwara na mbipụta nke magazin ndị ahụ bu mkpọsa ngwá ahịa ha agaghị ebu ihe odide ọ bụla na-akatọ ụgbọala ha, ngwá ahịa e mere na Germany, ma ọ bụ Germany n’onwe ya. N’ezie, ọ bụghị ihe ijuanya na ụlọ ọrụ a, nke na-emefu nde $15 n’ịkpọsa ngwá ahịa na magazin, ga-atụ anya nanị “peji na-adọrọ adọrọ nke magazin ndị ahụ.”
Ọ bụghịkwa ihe ijuanya mgbe magazin ndị na-akpọsa uwe agbamakwụkwọ ndị ọhụrụ na-anabataghị mkpọsa ngwá ahịa maka uwe agbamakwụkwọ ndị e jiworo mee ihe ma ọ bụ mgbe akwụkwọ akụkọ na-edepụta ndị na-agba mgbere ala na ụlọ na-agwaghị gị ụzọ ị ga-esi zụta ụlọ n’agakwurughị otu n’ime ha. N’otu aka ahụ, o kwesịghị iju anyị anya mgbe usoro mgbasa ozi nke na-akpọsa siga ma ọ bụ lọtrị na-adịghị akatọ ise siga ma ọ bụ ịgba chaa chaa.
Omume Ndị Ji Ngwá Ahịa Eme Ihe
Ya mere, ike nke mkpọsa ngwá ahịa karịrị ire ngwá ahịa. Ọ na-akwalite ụzọ ndụ nke ndị ji ngwá ahịa eme ihe, àgwà zuru ụwa ọnụ nke hiwere isi n’ihe onwunwe.
È nwere ihe dị njọ na nke ahụ? Ọ na-adabere n’onye ị jụrụ. Ndị na-akpọsa ngwá ahịa na-ekwu na ọ na-amasị ndị mmadụ ịzụ na inwe ihe dị iche iche; mkpọsa ngwá ahịa na-emezu ọchịchọ ha. Ọzọkwa, ha na-asị, ịkpọsa ngwá ahịa na-eme ka e nwee ọrụ, na-akwado egwuregwu na nkà ise ihe, na-enye aka ime ka e nwee usoro mgbasa ozi aka pụrụ iru, na-akwado ịsọ mpi, na-eme ka ngwá ahịa ka mma, na-eme ka ọnụ ahịa dị ala, na na-eme ka ndị mmadụ nwee ike ime ezi nhọrọ n’ịzụrụ ihe.
Ndị ọzọ na-azọrọ na ịkpọsa ngwá ahịa na-eme ndị mmadụ ahụ erughị ala na enweghị afọ ojuju n’ihe ha nwere, na-azụlite ma na-akpali ọchịchọ na-adịghị agwụ agwụ. Onye nchọpụta bụ́ Alan Durning na-ede, sị: “Mkpọsa ngwá ahịa, dị ka n’oge anyị, na-agbanwe ngwa ngwa, na-akwalite ịchụso ihe ụtọ, na-ejupụta n’echiche na-ewu ewu, ma na-akpali ichuso ụdị ejiji na-ewu ewu; ha na-enye mmadụ otuto, na-eme ka iji ngwá ahịa eme ihe bụrụ ụzọ isi nweta afọ ojuju onwe onye, ma na-akwado ọganihu nkà na ụzụ ịbụ isi ihe na-akpụzi ọdịnihu.”
Ike Ya n’Ebe Ị Nọ
Mkpọsa ngwá ahịa ọ̀ na-enye aka akpụzi ihe anyị bụ na ihe anyị chọrọ? Ikekwe. Otú ọ dị, ma mmetụta ahụ ọ dị ukwuu ma ọ dị nta na-adabere ná mmetụta ndị ọzọ dịnụ.
Ọ bụrụ na ụkpụrụ Bible na-eduzi anyị, anyị ga-aghọta na e nweghị ihe dị njọ n’inwe ihe onwunwe. E kwuwerị, Chineke jiri nnukwu akụ̀ na ụba gọzie Abraham, Job, Solomọn, na ndị ọzọ.
N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na anyị etinye ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ, anyị ga-ezere ahụ erughị ala nke ndị na-achọ afọ ojuju na obi ụtọ ná nchụso na-adịghị agwụ agwụ nke ihe onwunwe. Ozi Bible abụghị “Zụwa ruo mgbe ike gwụrụ gị.” Kama, ọ na-agwa anyị, sị:
Tụkwasị Chineke obi. “Na-enye ndị bụ ọgaranya n’oge dị ugbu a iwu, ka ha ghara ịtụkwasị uche ha n’ihe dị elu, gharakwa ịtụkwasị obi n’ihe ahụ a na-ejighị aka, bụ́ akụ̀, kama ka ha tụkwasị obi na Chineke, Onye na-ewere akụ̀ Ya nye anyị ihe nile ka ha bụrụ ihe ga-atọ anyị ụtọ.”—1 Timoti 6:17.
Na-enwe afọ ojuju. “Anyị ewetaghị ihe ọ bụla n’ụwa, ọ bụkwa n’ihi na anyị apụghị iwere ihe ọ bụla pụọ n’ime ya; ma ebe anyị nwere ihe oriri na ihe igbokwasị n’ahụ, afọ ga-eju anyị n’ihe ndị a.”—1 Timoti 6:7, 8.
Na-emeru ihe n’ókè. “Ezubere m ka ndi inyom were ihe ịchọ mma kwesịrị ekwesị chọọ onwe ha mma, ya na nsọpụrụ na uche zuru okè; ọ bụghị isi a kpara akpa, na ọlaedo ma ọ bụ pearl ma ọ bụ uwe dị oké ọnụ ahịa; kama (nke kwesịrị ndi inyom na-ekwupụta egwu Chineke) ka ha sitere n’ezi ọrụ chọọ onwe ha mma.”—1 Timoti 2:9, 10.
Mara na amamihe Chineke karịrị akụ̀ na ụba. “Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ nke chọtaworo amamihe bụ, ya na mmadụ nke na-enwepụta nghọta. N’ihi na ọzụzụ ahịa ya dị mma karịa ọzụzụ ahịa ọlaọcha, uru ya dị mma karịa ọlaedo ọma. Ihe dị oké ọnụ ahịa ka ọ bụ karịa ruby: ihe nile kwa nke na-atọ gị ụtọ, ha agaghị aha ka ya. Ụbọchị ndụ dị ogologo dị n’aka nri ya; n’aka ekpe ya ka akụ̀ na nsọpụrụ dị. Ụzọ ya nile bụ ụzọ nke ịdị ụtọ, okporo ụzọ ya nile bụkwa udo. Osisi na-enye ndụ ka ọ bụụrụ ndị na-ejide ya aka: ee, onye ọ bụla nke na-ejisi ya aka ike bụ onye ihe na-agara nke ọma.”—Ilu 3:13-18.
Na-enye ihe. “Ọ dị ngọzi inye ihe karịa ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35.
Mmadụ pụrụ ịrụ ụka na usoro isiokwu a bụ n’onwe ya otu ụdị nke mkpọsa ngwá ahịa, nke “na-akwalite” echiche nke bụ na e kwesịghị iji ihe onwunwe kwazụga ihe ime mmụọ n’akụkụ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-ekwenyere nkwubi okwu ahụ.
[Igbe dị na peeji nke 17]
Ịkpọsa Alaeze Chineke
Gịnị bụ otu n’ime ụzọ ndị kasị mma isi jiri ozi na-arụgide arụgide jekwuru ndị mmadụ? Akwụkwọ bụ́ Advertising: Principles and Practice na-asị: “N’ime ụwa nke zuru okè, onye ọ bụla na-emepụta ihe ga-enwe ike ịgwa onye ọ bụla ji ya eme ihe okwu ihu na ihu banyere ngwá ahịa ọ na-ere ma ọ bụ ozi ọ na-eje n’ego.” Ezi ndị Kraịst anọwo na-eji afọ ofufo na-akpọsa Alaeze Chineke n’ụzọ dị otú a eri ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000. (Matiu 24:14; Ọrụ 20:20) Gịnị kpatara na ọtụtụ ụlọ ọrụ ndị achụmnta ego ndị ọzọ adịghị eji ụzọ a nke e ji erute ndị mmadụ eme ihe? Akwụkwọ ahụ na-akọwa, sị: “Ọ dị nnọọ oké ọnụ. Nleta nke ndị na-erere ụlọ ọrụ ahịa mere pụrụ iwe ihe karịrị $150 maka nleta nke ọ bụla.” N’ezie, ndị Kraịst “na-akpọsa” Alaeze Chineke n’afọ ofufo. Ọ bụ otu akụkụ nke ofufe ha.
[Foto ndị dị na peeji nke 16]
Ozi Bible abụghị “zụwa ruo mgbe ike gwụrụ gị”