Oké Mkpọsa Ngwá Ahịa Na-enweghị Nduzi
“PAPA, gịnị ka e bu n’obi na ọnwa ga-akpọsa?” Ajụjụ a na-eju anya, nke otu nwatakịrị jụrụ, pụtara n’otu uri nke Carl Sandburg dere n’ihe dị ka afọ 50 gara aga. N’ọdịnihu, ajụjụ dị otú ahụ nwere ike ọ gaghị eyi oké ihe ijuanya. Dị ka New Scientist magazin si kwuo, ndị isi abụọ nke ndị na-akpọsa ngwá ahịa na London na-arụ ọrụ n’atụmatụ a na-eme iji ìhè anyanwụ mee ka mkpọsa ngwá ahịa pụta n’ihu ọnwa.
Cheedị iji ọnwa mee ihe dị ka bọọdụ mkpọsa! Chee echiche banyere ịkpọsa ozi azụmahịa nye ndị na-ekiri ya n’ụwa nile, ozi nke ndị na-ekiri ya na-apụghị ịgbanyụ, ịkwụsị, ịtụbanye n’ime ihe mkpofu, ma ọ bụ jiri obere ígwè remote control gbanyụọ ụda ya. Echiche ahụ nwere ike ọ gaghị amasị gị, ma nye ndị ọzọ, ọ ga-abụ mmezu nke ihe ha chọrọ.
Ọ bụ ezie na mkpọsa ngwá ahịa erubeghị n’ọnwa, o rikpuwo ụwa. Ihe ka ọtụtụ na Magazin na akwụkwọ akụkọ ndị America na-ewepụta pasent 60 nke peji ha maka mkpọsa ngwá ahịa. Nanị mbipụta Sunday nke New York Times pụrụ inwe peji 350 nke mkpọsa ngwá ahịa. Ụfọdụ ụlọ ọrụ redio na-etinye minit 40 nke hour ọ bụla ná mkpọsa ngwá ahịa.
Mgbe ahụ e nwere telivishọn. Dị ka otu atụmatụ e mere si gosi, ndị na-eto eto bụ́ ndị America na-eji hour atọ ekiri mkpọsa ngwá ahịa ndị a na-egosi na telivishọn kwa izu. Ka ọ na-erule oge ha ji agụsị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ dị elu, ha ga-ahụworị mkpọsa ngwá ahịa TV dị 360,000. Telivishọn na-akpọsa ngwá ahịa n’ọdụ ụgbọelu, n’ọnụ ụlọ nchere nke ụlọ ọgwụ, na n’ụlọ akwụkwọ.
Ihe omume egwuregwu ndị bụ isi bụ ugbu a ihe omume ndị e ji akpọsa ngwá ahịa ndị gbara ọkpụrụkpụ. Ụgbọala ndị e ji agba ọsọ na-eje ozi dị ka bọọdụ mkpọsa ndị na-agba oké ọsọ. Ụfọdụ ndị na-eme egwuregwu na-enweta ihe ka ukwuu n’ego ha site n’aka ndị na-akpọsa ngwá ahịa. Otu onye kasịnụ n’ịtụ basketball ritere ijeri $3.9 site n’ịtụ bọl. Ndị na-akpọsa ngwá ahịa kwụrụ ya okpukpu itoolu nke ego ahụ iji kwalite ngwá ahịa ha.
A pụghị ịgbanahụ ya. A na-amapanye mkpọsa ngwá ahịa n’ahụ ájá, bọs, na gwongworo. Ha na-achọ ime tagzi na ụzọ okpuru ala dị iche iche mma—ọbụna ibo ụzọ ụlọ mposi ọha. Anyị na-anụ mkpọsa ngwá ahịa n’ụlọ ahịa dị iche iche, n’ígwè mbugo—nakwa na telifon mgbe a kwụsịtụrụ anyị ikwu okwu. Ná mba ụfọdụ, ọtụtụ mkpọsa ngwá ahịa na-esite n’usoro ịnata akwụkwọ ozi abịa nke na ọtụtụ ndị na-anata ha na-esite kpọmkwem n’ebe ahụ igbe akwụkwọ ozi dị gaa na nkata ihe mkpofu dịkarịsịrị ha nso, iji tufuo ozi ndị ahụ na-abaghị uru.
Dị ka Insider’s Report, nke McCann-Erickson, bụ́ ụlọ ọrụ zuru ụwa ọnụ na-ahụ maka mkpọsa ngwá ahịa bipụtara si kwuo, ego e mere atụmatụ na e mefuru ná mkpọsa ngwá ahịa na 1990 bụ ijeri $275.5. Kemgbe ahụ, ọnụ ọgụgụ ahụ agbagowo ruo ijeri $411.6 maka 1997, e mekwara atụmatụ ijeri $434.4 maka 1998. Ego buru nnọọ ibu!
Gịnị ka ihe a nile na-arụpụta? Otu onye na-eme nnyocha kwuru ya otú a: “Mkpọsa ngwá ahịa bụ otu n’ime ihe ndị kasị na-emetụta mmekọrịta mmadụ na ibe ya n’ụzọ e si ebi ndụ. . . . Mkpọsa ngwá ahịa na-ere ihe karịrị ngwá ahịa. Ha na-ere ụzọ echiche a ma ama, ụkpụrụ, ihe mgbaru ọsọ, echiche nke ndị anyị bụ na ndị anyị kwesịrị ịbụ . . . Ha na-akpụzi omume anyị, omume anyị na-akpụzikwa akparamàgwà anyị.”
Ebe ị na-apụghị ịgbanarị mkpọsa ngwá ahịa, gịnị ma ị chọpụta otú o si arụ ọrụ na otú ọ pụrụ isi metụta gị?