Nkà nke Ịrụgide Mmadụ
GỊNỊ bụ nzube nke mkpọsa ngwá ahịa? Ụlọ ọrụ ndị na-achụ nta ego na-asị na mkpọsa ngwá ahịa ha na-ejere ọha na eze ozi, n’ihi na ọ na-enye anyị ihe ọmụma banyere ngwá ahịa ha. Òtù Mkpọsa Ngwá Ahịa nke Mba Nile na-ekwu, sị: “Iji nweta ezi ihe ọmụma, ịkpọsa ngwá ahịa dị Onye Ji Ya Eme Ihe mkpa. Ezi nhọrọ na-adabere n’ihe ọmụma. Mkpọsa ngwá ahịa—n’echiche ya kasị saa mbara—bụ ụzọ dị mkpa e si enyefe ihe ọmụma ahụ dị n’etiti Onye Na-emepụta Ihe na Onye Na-eji Ya Eme Ihe.”
N’ezie, anyị nile maara na ime mkpọsa dị otú ahụ na-eme ihe karịrị nanị inye ihe ọmụma—ọrụ ya bụ ire ihe. Ọ dịghị eji eziokwu eme ihe ma ọ bụ ghara inwe ebe ọ kwụ. Mkpọsa ngwá ahịa ndị na-aga nke ọma na-eji nkà dọrọ uche onye na-eji ya eme ihe ma kwalie ya ịzụ ngwá ahịa ahụ a kpọsara.
Ọzọkwa, ịkpọsa ngwá ahịa na-ere ihe karịrị ngwá ahịa; ọ na-ere aha e ji mara ngwá ahịa ahụ. Ọ bụrụ na ị bụ onye na-emepụta ncha nke ukwuu, ị gaghị emefu ọtụtụ nde dollar n’ịkpọsa ngwá ahịa iji gbaa ndị mmadụ ume ịzụrụ nnọọ ncha ọ bụla. Ị chọrọ ka ha zụrụ ncha gị. Ị chọrọ mkpọsa ngwá ahịa nke ga-esi n’ụzọ ụfọdụ mee ka ọha na eze kwenye na ụdị ncha nke gị ka nke ọ bụla ọzọ mma.
Ndị A Na-elekwasị Anya
Iji nwee atụmatụ dị irè, a na-eji nlezianya na-elekwasị otu ndị anya mgbe a na-eme mkpọsa ngwá ahịa, ma hà bụ ụmụaka, ndị odozi akụ̀, ndị ọchụ nta ego, ma ọ bụ ìgwè ndị ọzọ. A na-eji nkà mee ka ozi ahụ kwekọọ n’ihe kasị echegbu ndị ahụ. Mgbe ahụ a na-akpọsa ngwá ahịa ahụ n’usoro mgbasa ozi nke ga-akasị dị irè n’irute ha.
Tupu e wepụta otu mkpọsa ngwá ahịa, a na-eme nchọpụta dị ukwuu banyere ìgwè ndị mmadụ o yikarịrị ka ha ga-azụ ma jiri ngwá ahịa ahụ a na-akpọsa mee ihe. Ọ dị ndị na-akpọsa ngwá ahịa mkpa ịmara ndị ndị a bụ, otú ha si eche echiche ma na-eme omume, ihe ndị ha na-achọ na ihe na-agụsị ha ike. Otu onye ji ịkpọsa ngwá ahịa mere aka ọrụ dere, sị: “Anyị na-agbalịsi ike ịmara kpọmkwem ndị anyị na-edegara ihe. Ndị ha bụ, ebe ha bi, ihe ha na-azụ. Na ihe mere ha ji azụ ya. Ịmara ihe a nile na-enye anyị ngwá ọgụ iji dee ozi ire ahịa na-arụgide arụgide. Ndị anyị na-elekwasị anya ga-anabata nrụgide; ha agaghị anabata okwu itu ọnụ, ọdịmma onwe anyị, ma ọ bụ akụ́ na-akpali ndị mmadụ a gbanyere aghara aghara n’ikuku.”
Ihe Ndị Ịrụgide Mmadụ Gụnyere
N’ichepụta mkpọsa ngwá ahịa, iji nlezianya hazie okwu dị mkpa. Oké ịja mma ma ọ bụ otuto gabigara ókè bụ ihe a na-ahụkarị. A na-ekwu na otu ụdị ọka e ji eme nri ụtụtụ bụ “ọkasị mma,” otu ụlọ ọrụ na-emepụta kaadị ozi ekele na-azọrọkwa na ndị mmadụ na-azụrụ kaadị ya mgbe ha “chọrọ izije nke kasị nnọọ mma.” Ọ bụ ezie na ọ naghị adịkebe mfe ịchọpụta ọdịiche dị n’etiti oké ịja mma na nduhie a kpachara anya hazie, ọ dị ndị na-akpọsa ngwá ahịa mkpa ilezi anya ka ha ghara ime nzọrọ nke eziokwu a pụrụ ịnwapụta anwapụta pụrụ igosipụta na o zighị ezi. Ụfọdụ gọọmenti nwere iwu ndị machibidoro emeghị ihe n’eziokwu ndị dị otú ahụ, ụlọ ọrụ achụmnta ego na-adịkwa ngwa ịgba akwụkwọ ma ọ bụrụ na mkpọsa ngwá ahịa ndị na-eduhie eduhie nke ndị ha na ha na-ama aka eyie ọdịmma ha egwu.
Mgbe otu ngwá ahịa fọrọ nke nta ka o yie ndị ọzọ, nzọrọ nke ndị na-akpọsa ngwá ahịa pụrụ ime na-adị nta, ya mere ozi ahụ na-ekwukarị ihe dị nta ma ọ bụ ghara ikwu ihe ọ bụla. Ọtụtụ na-eji okwu na-adọrọ mmasị akọwa ngwá ahịa ha. Ihe atụ ụfọdụ: “Zụrụ ya nnọọ” (otu ụdị nke akpụkpọ ụkwụ e ji agba ọsọ), “Nri ụtụtụ nke ndị mmeri” (otu ụdị ọka e ji eme nri ụtụtụ), “Ọ bụ ego gị, zụrụ ihe ka mma” (otu ụdị obere ụgbọala), na “Ị nọ n’aka ndị ma nke a na-akọ” (otu ụlọ ọrụ inshọransị).
Ozi ndị a na-ahụ anya, ma ọ bụ na magazin ma ọ bụ na telivishọn, nwere aro ndị dị ike karị ihe a na-ekwu n’ezie banyere ngwá ahịa ahụ. Otú e si egosi ngwá ahịa pụrụ inye echiche dị ka, ‘Ọ bụrụ na ị zụrụ elekere mgbanaka a, ndị mmadụ ga-akwanyere gị ùgwù’ ma ọ bụ ‘Ụdị ákwà jeans a ga-eme ka ị na-adọrọkwu mmasị ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị’ ma ọ bụ ‘Obere ụgbọala a ga-eme ndị agbata obi gị anyaụfụ.’ N’otu n’ime mkpọsa ngwá ahịa ndị a kasị mara na nke kasị aga nke ọma, otu ụlọ ọrụ na-emepụta siga na-ejikọta ndị na-elekọta ịnyịnya na ngwá ahịa ya. A na-egosi ndị ahụ na-elekọta ịnyịnya dị ka ndị siri ike, ndị gbasiri ike, ndị na-akpa ike. Ozi a na-adịghị ekwupụta ekwupụta: See siga anyị, ị ga-adịkwa ka ndikom ndị a na-akpa ike a na-asọpụrụ.
Tụkwasị n’okwu ndị e ji akọ kwuo na ihe osise a na-ahụ anya, egwú dị mkpọsa ngwá ahịa ndị a na-eme na redio na na telivishọn mkpa. Ọ na-ewebata mmetụta uche, na-emekwu ka a nọrọ n’ọnọdụ mkpọsa ngwá ahịa, na-enye aka eme ka e cheta ya, na-emekwa ka omume onye na-eji ngwá ahịa eme ihe nwere n’ebe ngwá ahịa ahụ dị ka mma.
Magazin bụ́ World Watch na-ekwu, sị: “Mkpọsa ngwá ahịa ndị a haziri nke ọma na-abụ ọrụ nkà pụrụ iche—na-ejikọta onyonyo ndị dị ịtụnanya, ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ na-enye ume, na ụdị asụsụ na-arụgide arụgide iji metụta ihe anyị kasị atụ egwu ma na-enwe mmasị na ha. Mkpọsa ngwá ahịa ndị a na-egosi na telivishọn oge uhuruchi ná mba ndị nwere ọtụtụ ụlọ ọrụ na-emepụta ihe na-atụ aro dị ukwuu n’ime otu minit karịa ihe ọ bụla e chepụtaworo na mbụ.”
Ọ Na-akpali Echiche na Mmetụta Uche
A na-eji nlezianya hazie mkpọsa ngwá ahịa iji kpalie kpọmkwem ọchịchọ na ụkpụrụ nke ndị ahụ e bu n’obi. Ikekwe otu mkpọsa ngwá ahịa ga-akpali mkpa nke ikpori ndụ, agụụ nke ịnọ ná ntụkwasị obi, ma ọ bụ ọchịchọ siri ike nke ịbụ onye ndị ọzọ nabatara. E leghị anya mkpọsa ngwá ahịa ahụ ga-eche ihu n’ọchịchọ nke ịdọta mmasị ndị ọzọ, ịdị ọcha, ma ọ bụ ịpụta ìhè dị ka onye pụrụ iche. Ụfọdụ mkpọsa ngwá ahịa na-akwalite ngwá ahịa ha site n’ime ka egwu jide anyị. Dị ka ihe atụ, otu ụlọ ọrụ na-emepụta ihe e ji asa ọnụ dọrọ aka ná ntị banyere ihe ize ndụ nke ọnụ ísì: “Ọbụna ezigbo enyi gị agaghị agwa gị” nakwa “Ị ga-abụkarị nwaada na-enyere nwanyị a na-alụ ọhụrụ aka, ma ọ dịghị mgbe ị ga-abụ nwanyị a na-alụ ọhụrụ.”
Ọ na-adị mfe oge ụfọdụ ile otu mkpọsa ngwá ahịa anya ma tụlee ụzọ o si akpali akpali. A na-eche ụfọdụ mkpọsa ngwá ahịa ihu n’ụzọ bụ isi n’akụkụ uche anyị nke ihe na-emetụta, e ji atụgharị uche, e ji eche ezi echiche. Ha na-enye ihe ọmụma doro anya banyere otu ngwá ahịa. Otu ihe atụ bụ ihe odide nke na-agwa gị na a na-ere azụ̀ ugbu a n’ọkara ọnụ ahịa ya. Ụzọ ọzọ bụ iji arụmụka siri ike mee ihe. Mkpọsa ngwá ahịa dị otú a pụrụ ikwu na azụ̀ ahụ a na-ere n’ọkara ọnụ ahịa ya agaghị echekwara gị ego nanị kama ọ ga-atọ gị ụtọ ma dozie gị na ezinụlọ gị ahụ.
A na-ahazi mkpọsa ngwá ahịa ndị ọzọ iji kpalie mmetụta uche anyị. Dị ka ihe atụ, mkpọsa ngwá ahịa ndị na-emetụta ọnọdụ uche na-akpali akpali site n’ịtapawanye onyonyo ndị mara mma n’ahụ ngwá ahịa ahụ. Ndị na-emepụta ihe ntecha, siga, na mmanya na-adabere nke ukwuu n’ụzọ a. Mkpọsa ngwá ahịa ndị ọzọ na-eji ikwughachi ihe eme ihe. Ụzọ a nke iji nrụgide ere ngwá ahịa dabeere n’olileanya nke bụ́ na ọ bụrụ na ndị mmadụ anụ ozi ruo ọtụtụ ugboro, ha ga-ekwere ya ma zụrụ ngwá ahịa ahụ, ọ bụrụgodị na ha kpọrọ mkpọsa ngwá ahịa ahụ n’onwe ya asị! Ọ bụ n’ihi nke a ka anyị ji ahụkarị mkpọsa ngwá ahịa ka ha na-ekwu ugboro ugboro ka a zụrụ otu ngwá ahịa ahụ. Ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ọgwụ ndị a pụrụ ịzụrụ n’ahụghị dọkịta na-ejikarị ụzọ a eme ihe.
N’otu aka ahụ mkpọsa ngwá ahịa ndị na-enye ntụziaka na-akpali mmetụta uche anyị. Mkpọsa ngwá ahịa ndị a na-agwa anyị kpọmkwem ime ihe: “Ṅụọ nke a!” “Zụrụ ugbu a!” A na-eche na mkpọsa ngwá ahịa ndị na-enye ntụziaka na-akasị mma maka ngwá ahịa ndị mmadụ mawooro ma nwee mmasị na ya. Ọtụtụ mkpọsa ngwá ahịa nọkwa n’ọkwá ọzọ dị iche. Ndị a bụ mkpọsa ngwá ahịa ndị na-asị ka e ṅomie ndị ọzọ, ma ọ bụ ndị na-agba akaebe uru a ga-erite. Mkpọsa ngwá ahịa ndị a na-egosi ndị a ma ama ma ọ bụ ndị na-adọrọ mmasị ka ha ji ngwá ahịa ahụ na-eme ihe ma ọ bụ na-ekwu ka e jiri ngwá ahịa ahụ nke onye na-akpọsa ngwá ahịa chọrọ ka anyị zụrụ na-eme ihe. Mkpali a na-adabere n’echiche nke bụ na anyị na-achọ ịdị ka ndị anyị nwere mmasị n’ebe ha nọ. Onye na-elekọta ịnyịnya nke na-ese siga bụ ihe atụ nke ụdị mkpọsa ngwá ahịa a.
Ndị Na-adọta Uche
Ị̀ chọpụtawo na ị pụrụ ịghọ onye otu ísìsì ma ọ bụ mkpọtụ a na-anụ mgbe nile maara ahụ nke na ọ na-esiri gị ike ịma na ọ dị? Otu ihe ahụ na-eme n’ebe mkpọsa ngwá ahịa dị.
Dị ka magazin Business Week si kwuo, otu onye America na-anụ ihe ruru mkpọsa ngwá ahịa 3,000 kwa ụbọchị. Olee otú ndị mmadụ si emeghachi omume? Ha na-eleghara ha anya, n’ụzọ nkịtị ma ọ bụ n’uche ha. Ọ dịkarịsịa mma, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-etinyetụ uche ha ná mkpọsa ngwá ahịa.
Iji merie enweghị mmasị nke ndị na-ekiri ihe, mkpọsa ngwá ahịa ga-adọtarịrị uche anyị. Mkpọsa ngwá ahịa ndị a na-egosi na telivishọn na-egosi ihe na-atụkwasị ihe n’ịma mma nke onyonyo dị iche iche. Ha na-agbalị ịbụ ihe eji atụrụ ndụ, ihe na-akpali akpali, ihe na-atọ ọchị, ihe na-eju anya, ma ọ bụ ihe na-akpali mmetụta uche. Ha na-egosi ndị a ma ama, na ndị e sere ese na-atọ ọchị bụ́ ndị na-adọrọ mmasị. Ọtụtụ na-eji ihe na-akpali mmetụta adọta uche anyị, ikekwe site n’iche ihu n’ebe ụmụ nwamba, ụmụ nkịta, ma ọ bụ ụmụ ọhụrụ nọ.
Ozugbo onye na-akpọsa ngwá ahịa dọtaworo uche anyị, ọ ga-ejiderịrị mmasị anyị ruo ogologo oge zuru ezu iji mee ka anyị mara banyere ngwá ahịa ahụ a na-akpọsa. Mkpọsa ngwá ahịa ndị nwere ihe ịga nke ọma adịghị abụ nanị ihe e ji atụrụ ndụ; ha na-anwa ịrụgide anyị ịzụrụ ihe.
Ná mkpirikpi, nke ahụ bụ ụzọ mkpọsa ngwá ahịa si arụ ọrụ. Ugbu a anyị ga-eleba anya n’ike ya.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 14]
Otu onye America na-anụ ihe ruru mkpọsa ngwá ahịa 3,000 kwa ụbọchị
[Igbe dị na peeji nke 13]
Ndị Mgbanyụ Ụda, Ndị Ngafere na Ndị Mgbagharị
Ígwè remote control nke telivishọn bụ ngwá ọgụ megide mkpọsa ngwá ahịa. Ọtụtụ na-agbanyụ ụda mkpọsa ngwá ahịa site n’ịpị aka na bọtịn e ji agbanyụ ụda. Ndị ọzọ na-etinye ihe a na-eme na tepu vidio ma mgbe ha na-akpọghachikwa ya, ha na-eme ka mkpọsa ngwá ahịa gafere ngwa ngwa site n’ịpị aka na bọtịn e ji eme ka ọ gaa n’ihu ọsọ ọsọ. Ma ndị ọzọ na-agbagharị ya agbagharị, nke pụtara na ha na-agbagharị site n’otu ụlọ ọrụ mgbasa ozi gaa n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi ọzọ iji zere mkpọsa ngwá ahịa. Ndị nwere nkà n’ime mgbagharị maara nnọọ oge otu mkpọsa ngwá ahịa ga-ewe, ha ga-alaghachikwa n’ihe omume ahụ ha nọ na-ekiri mgbe e mesịrị mkpọsa ngwá ahịa ndị ahụ.
Ndị na-akpọsa ngwá ahịa na-anwa igbochi mmadụ ịgbanyụ ụda mkpọsa ngwá ahịa ha site n’imepụta mkpọsa ngwá ahịa ndị nwere ike ịdọta uche—ndị na-adọta mmasị nke onye na-ekiri ha ozugbo ma jigide ya. Ọnyà dị n’imepụta mkpọsa ngwá ahịa ndị na-adọrọ adọrọ bụ na ndị mmadụ pụrụ icheta mkpọsa ngwá ahịa ahụ ma ghara icheta ngwá ahịa ahụ a na-akpọsa.
[Igbe dị na peeji nke 14]
Ịkpọsa Ngwá Ahịa n’Ụzọ Ndị Siri Ike Nghọta
Ná ngwụsị nke afọ ndị 1950, James Vicary zọọrọ na ya mere nchọpụta n’otu ebe a na-ekiri ihe nkiri sinima na New Jersey, U.S.A., bụ́ ebe okwu ndị ahụ bụ́ “Ṅụọ Coca-Cola” na “Taa Ọka E Ghere Eghe” pụtara n’ihe nkiri ahụ ma pụọ ozugbo ka ihe nkiri sinima ahụ na-aga n’ihu. Ozi ndị ahụ pụtara nanị n’ihe na-erughị otu sekọnd, ọ dị mkpirikpi nke ukwuu ịdịgide n’uche mmadụ. Ma, dị ka Vicary si kwuo, ha rụpụtara ịrị elu nke ahịa mmanya Coca-Cola na ọka e ghere eghe e rere. Nzọrọ a dujere ná nkwenye zuru ebe nile na ndị na-akpọsa ngwá ahịa pụrụ ịkpali ndị mmadụ ịzụrụ ihe site n’igosi ozi ndị “a na-adịghị ahụ anya.” A kọrọ na mgbe ya na òtù kasị n’ịkpọsa ngwá ahịa n’America bịanyesịrị aka n’ọrụ ngo maka nde $4.5, Maazị Vicary funyụrụ anya. Ndị ahụ na-akpọsa ngwá ahịa ghọrọ ndị e gwuru wayo.
Nchọpụta ndị sochirinụ kpughere ụgha dị ná nzọrọ Vicary. Otu onye bụworo onyeisi ndị na-akpọsa ngwá ahịa ruo ogologo oge kwuru, sị: “Ịkpọsa ngwá ahịa n’ụzọ ndị siri ike nghọta adịghị irè. Ọ bụrụ na ọ dị, anyị gaara ejiwo ya mee ihe.”
[Foto ndị dị na peeji nke 15]
A na-ahazi mkpọsa ngwá ahịa iji dọta uche anyị