Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Olee Otú M Pụrụ Isi Soro Onye Nọ n’Ebe Dị Anya Mee Mbedo?
“M ka dulasịrị otu ìgwè bịara mgbakọ mba nile nke Ndịàmà Jehova na họtel ha. M na-ejikere ịla, ma ìgwè ọzọ batara mgbe ahụ. Ya mere m cheere ka m soro ha kwurịta okwu, ezutekwara m Odette. Anyị zutekwara ọzọ n’ime izu ahụ. Anyị kpebiri iderịta akwụkwọ ozi, mgbe afọ ole na ole nke ịmata ibe anyị site n’akwụkwọ ozi gasịkwara, anyị malitere mbedo.”—Tony.
ỤWA aghọọla ebe dị ntakịrị karị. N’iri afọ ndị na-adịbeghị anya mmepụta nke njem ụgbọelu dị ọnụ ala, usoro telifon jikọtara ụwa nile, usoro nkesa akwụkwọ ozi dị ngwa, na Internet emewo ka e nwee ike ime ihe ndị ọhụrụ n’ihe banyere mmekọrịta ịhụnanya. N’ọtụtụ ụzọ kwa, echiche nke iso onye nọ ọtụtụ narị ma ọ bụ ọbụna ọtụtụ puku kilomita na-eme mbedo pụrụ iyi ihe na-adọrọ adọrọ—karịsịa ma ọ bụrụ na e nwere ntakịrị olileanya nke ịlụ di ma ọ bụ nwunye ná mba nke gị.
Nye ụfọdụ ndị, iso onye nọ n’ebe dị anya na-eme mbedo aghọwo ngọzi. “Anyị enwewo obi ụtọ n’alụmdi na nwunye anyị ruo afọ 16,” ka Tony na-ekwu. Ụfọdụ pụrụ ọbụna ịrụ ụka na iso onye nọ n’ebe dị anya na-eme mbedo nwere abamuru nke inye mmadụ abụọ ohere ịmata onwe ha n’abụghị ndị ndọrọ anụ ahụ kpuchiri anya. Otú ọ dị, n’agbanyeghị uru ndị dị na ya, iso onye nọ n’ebe dị anya na-enwe mmekọrịta ịhụnanya nwere ihe ịma aka ụfọdụ pụrụ iche.
Ịmata Onwe Unu
Ọ kasị mma ịmata ihe nile i nwere ike ịmata banyere onye ị na-eche echiche ịlụ. Otú ọ dị, dị ka otu di aha ya bụ Frank si kwuo site n’ahụmahụ nke ya, “ọ dịghị mfe ịmata onye ahụ n’ezie, ‘mmadụ zoro ezo nke mkpụrụ obi.’” (1 Pita 3:4) Doug, bụ́ onye Kraịst ọzọ nke sooro onye nọ n’ebe dị anya mee mbedo, na-ekweta, sị: “N’ileghachi anya azụ, ana m achọpụta na anyị amatachaghị onwe anyị nke ọma.”
Ọ̀ ga-ekwe omume n’ezie ịmata onye bi ọtụtụ narị ma ọ bụ ọtụtụ puku kilomita site n’ebe i bi? Ee, ma ọ pụrụ ịchọ mgbalị pụrụ iche. “Anyị enweghị ego iji na-akpọ na fon, ya mere anyị dere akwụkwọ ozi otu ugboro kwa izu,” ka Doug na-ekwu. Otú ọ dị, Joanne na Frank chọpụtara na ide akwụkwọ ozi ezughị. “Anyị dere akwụkwọ ozi na mbụ ma kpọtụ na fon,” ka Joanne na-ekwu. “Mgbe ahụ Frank ziteere m otu ntakịrị ígwè tepụ. Anyị ga-ekwunye okwu ndị ọhụrụ na tepụ kwa izu.”
Ikwu Eziokwu Agwụla Otú A Pụrụ Isi Mee Ya
N’agbanyeghị ụdị ụzọ nkwurịta okwu unu ji na-eme ihe, ọ dị mkpa ikwu eziokwu. “Ọ bụrụ na ị ghaa ụgha, ọ ga-apụta ìhè mgbe e mesịrị ma metụta mmekọrịta ahụ,” ka otu nwunye bụ́ onye Kraịst aha ya bụ Ester na-ekwu. “Gwanụ onwe unu eziokwu. Gwa onwe gị eziokwu. Ọ bụrụ na ọ dị ihe unu na-ekwekọrịtaghị na ya, ahapụla ya. Kwurịtanụ ya.” Pọl onyeozi na-enye ndụmọdụ dị mma, sị: “Na-ekwunụ eziokwu onye ọ bụla n’ebe onye agbata obi ya nọ.”—Ndị Efesọs 4:25; tụlee Ndị Hibru 13:18.
Olee ihe ụfọdụ unu na-aghaghị ịhụ na unu kwurịtara? Ọ dị ndị nile na-eme mbedo mkpa ikwurịta ihe ndị dị ka ihe mgbaru ọsọ, ụmụ, okwu ego, na ahụ ike. Otú ọ dị, e nwere okwu ndị pụrụ ịchọ nlebara anya pụrụ iche. Dị ka ihe atụ, otu onye—ma ọ bụ unu abụọ—aghaghị ịkwagharị ma unu lụọ. Ị̀ dị njikere ma nwee ike ime otú ahụ, n’uche na n’ụzọ mmetụta uche? Olee otú i si mara? Ị̀ kwagharịtụla mbụ ma ọ bụ hapụ ezinụlọ gị ruo ogologo oge? Onye ga-emesị bụrụ di Joanne chọrọ ka ha abụọ jee ozi dị ka ndị ọrụ afọ ofufo n’isi ụlọ ọrụ Watch Tower Society, bụ́ ndị na-ebipụta magazin a. “Ọ jụrụ m ma m ga-ebili ná ntakịrị ọnụ ụlọ, n’enweghị ego buru ibu,” ka Joanne na-echeta. “Anyị kwurịtara ya nke ọma.”
Ọ bụrụ na mbedo ahụ metụtara onye si ala ọzọ, ị̀ dị njikere ịgbanwe iji kwekọọ n’ọdịbendị ọzọ? “Ọdịbendị ibe unu ọ̀ tọwala unu ụtọ atọwa kwa ụbọchị?” ka Frank na-ajụ. “Kwurịtanụ ihe ndị a dị mkpa ná mmalite nke mmekọrịta unu. Ọ ka mma na unu chọpụtara n’oge—tupu unu etinye mmetụta uche ma ọ bụ ego dị ukwuu ná mmekọrịta ahụ.” Ee, ibi kwa ụbọchị n’ọdịbendị ọzọ dị iche n’ime nleta ruo ụbọchị ole na ole. Ọ̀ ga-adị gị mkpa ịmụ asụsụ ọzọ? Ị̀ ga-enwe ike ịgbanwe iji kwekọọ n’oké ọdịiche dị n’ọnọdụ ibi ndụ? N’aka nke ọzọ, ọ̀ pụrụ ịbụ na ọ bụ ọdịbendị ahụ dọọrọ mmasị gị, ma eleghịkwa anya ọ bụchaghị onye ahụ? Ma eleghị anya ụdị ndọrọ ahụ ga-ebelata ka oge na-aga. Ma alụmdi na nwunye na-ejikọta mmadụ abụọ n’ụzọ na-adịgide adịgide.—Matiu 19:6.
Tony na-akọwa, sị: “Otu nwa agbọghọ m maara si n’akụkụ ọzọ nke ụwa lụrụ otu onye si Caribbean. Ma ụdị ndụ a na-ebi n’àgwàetiti siiri ya ike. Okpomọkụ dị oge nile, ọ dakwara ọrịa. Ihe oriri ha dị iche, ezinụlọ ya gụkwara ya agụụ. Ya mere ha gbalịrị ibi ná mba nke nwanyị. Ma ọ dị nke nwoke ka ụdị ndụ dị n’ebe ahụ ọ̀ bụ nke oké nchụso ihe onwunwe, mkpakọrịta chiri anya nke ya na ezinụlọ ya na ndị agbata obi ya na-enwe gụkwara ya agụụ. Ha ekewaala ugbu a; nke nwoke bi n’ala a mụrụ ya, nke nwanyị bikwa na nke ya. Ụmụ ha abụọ adịghị enweta ịhụnanya na nlebara anya nke nne na nna ha.”
Ịlụ onye si ebe dị anya, ikekwe ọdịbendị ọzọ, nwekwara ihe ịma aka ndị ọzọ. Ị̀ dị njikere maka mmefu ọzọ nke ime njem na nkwurịta okwu? Lydia na-echeta, sị: “Phil na-ejibu ya ama njakịrị na anyị lụrụ n’ihi na ụgwọ telifon ya buru ibu, ma ugbu a anyị aghaghị ịkwụ ụgwọ òkù m na-akpọ mama m na telifon!” Gịnịkwanụ ma a mụọ ụmụ? Ụfọdụ na-etolite n’amakebeghị ihe banyere ndị ikwu ha, n’enweghị ike ọbụna ịgwa ha okwu na fon n’ihi nsogbu anụghị asụsụ! Nke a abụghị ikwu na a pụghị imeri ụdị nsogbu ndị ahụ. Ma mmadụ kwesịrị ịgbakọ ihe ịbanye n’ụdị alụmdi na nwunye ahụ ga-efu.—Tụlee Luk 14:28.
Olee Ụdị Onye Ọ Bụ n’Ezie?
Olee otú ị pụrụ isi mata ma enyi gị ọ̀ na-agwa gị eziokwu na ihe dị ya n’obi? “Ezi osisi ọ bụla na-amị mkpụrụ ọma,” ka Matiu 7:17 na-ekwu. Ya mere gịnị bụ ọrụ ya? Ihe ndị ọ na-eme hà na-akwado ihe ọ na-ekwu? Ihe ndị o mere n’oge gara aga hà na-akwado ihe ndị ọ na-ekwu bụ́ ihe mgbaru ọsọ ya maka ọdịnihu? “Ihe ndị mbụ anyị chọpụtara banyere onwe anyị bụ ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ anyị,” ka Ester na-akọwa. “Ọ nọwo na-eje ozi dị ka onye na-ezisa ozi ọma oge nile ruo afọ asatọ, nke ahụ nyekwara m obi ike na ọ na-ekwu eziokwu banyere ịchọ ịga n’ihu.”
Ma ọ bụrụkwanụ na onye gị na ya na-eme mbedo yiri ka ọ dị ihe ọ na-ezere ịza. Ahapụla okwu ahụ ma na-enwe nnọọ olileanya na ihe ga-adị mma. Jụkwuo ajụjụ! Jụọ ya N’IHI GỊNỊ? Otu ilu na-ekwu, sị: “Mmiri nke miri emi ka ndụmọdụ n’obi mmadụ bụ; ma onye nghọta ga-adọpụta ya.” (Ilu 20:5) “Onye na-enweghị uche na-ekwere okwu nile ọ bụla: ma onye nwere ezi uche na-aghọta ijeụkwụ ya,” ka ilu ọzọ na-adọ aka ná ntị.—Ilu 14:15.
Ihu na Ihu
N’agbanyeghị nke ahụ, ị pụrụ ịmata nanị ihe dị nta banyere mmadụ site n’akwụkwọ ozi ma ọ bụ fon. N’ụzọ na-adọrọ mmasị, Jọn onyeozi degaara ụmụnna ya bụ́ ndị Kraịst ọtụtụ akwụkwọ ozi. Ọ bụ ezie na akwụkwọ ozi ndị a mere ka nkekọ ịhụnanya nke dị n’etiti ha sie ike karị, Jọn kwuru, sị: “Ebe m nwere ọtụtụ ihe idegara unu n’akwụkwọ, ezubeghị m iwere akwụkwọ na ink dee ha: kama ana m ele anya na m ga-abịaru unu ahụ, werekwa ọnụ gwa unu okwu.” (2 Jọn 12) N’otu aka ahụ, ọ dịghị ihe karịrị gị na mmadụ ịnọkọ ọnụ ihu na ihu. Ọ pụrụ ọbụna ịba uru ka otu onye n’ime unu kwagharịa ruo nwa oge ka unu wee nọdewe onwe unu nso karị. Nke a ga-emekwa ka onye nke kwagharịrị nwee ike ịmata otú ihu igwe na ọnọdụ ibi ndụ nke ebe pụrụ ịghọ ebe obibi ọhụrụ ya dị.
Olee otú unu pụrụ isi jiri oge unu abụọ ji nọkọọ mee ihe n’ụzọ kasị mma? Meenụ ihe ndị na-ekpughe àgwà ibe unu. Mụkọọnụ Okwu Chineke. Hụnụ ibe unu mgbe unu na-ekere òkè ná nzukọ ọgbakọ na n’ozi. Rụkọọnụ ọrụ ụlọ ọnụ, dị ka ihicha ihe na ịga ahịa. Ịhụ otú onye nke ọzọ si akpa àgwà ná nrụgide nke usoro ihe omume nke na-adịghị enye mmadụ ohere pụrụ inye nghọta dị ukwuu.a
E kwesịkwara iso ndị ga-abụ ndị ọgọ nọtụ. Gbalịa ka gị na ha nwee mmekọrịta dị mma. E kwuwerị, ọ bụrụ na unu abụọ alụọ, ha ga-aghọ ezinụlọ gị. Ị̀ maara ha? Ùnu dị ná mma? Joanne na-adụ ọdụ, sị: “Ọ bụrụrịị na ọ ga-ekwe mee, ọ dị mma ka ezinụlọ abụọ ahụ zute.” Tony gara n’ihu kwuo, sị: “Otú enyi gị si emeso ndị ezinụlọ ya bụ otú ọ ga-esi mesoo gị.”
Ma unu na-eme mbedo ihu na ihu ma ọ bụ site na fon na akwụkwọ ozi, zere ime mkpebi ọkụ ọkụ. (Ilu 21:5) Ọ bụrụ na o doo anya na alụmdi na nwunye agaghị nnọọ adabara unu abụọ, mgbe ahụ ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ikwurịta banyere ịkwụsị mbedo ahụ. (Ilu 22:3) N’aka nke ọzọ, ọ pụrụ nnọọ ịbụ na a chọkwuru oge maka inwe nkwurịta okwu sitere n’obi, nke bụkwa eziokwu.
Iso onye nọ n’ebe dị anya na-eme mbedo pụrụ isi ike, ma ọ pụkwara iweta ụgwọ ọrụ. Ka o sina dị, ọ bụ okwu a na-agaghị eji gwurie egwu. Achụla ya ọsọ ọsọ. Matanụ onwe unu. Mgbe ahụ, ọ bụrụ na unu ekpebie ịlụ, mbedo unu ga-abụ oge unu ga-ewere dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa, ọ bụghị nke a ga-akwara ụta.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere ime mbedo, lee akwụkwọ bụ́ Questions Young People Ask—Answers That Work, peji nke 255-260, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 23]
Hụnụ na unu kwurịtara ihe ndị dị ka ihe mgbaru ọsọ, ụmụ, na okwu ego ná mmalite nke mmekọrịta unu