Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w24 Mee p. 20-25
  • Otú Ị Ga-esi Achọta Onye Ị Ga-alụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Ị Ga-esi Achọta Onye Ị Ga-alụ
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE GA-ENYERE GỊ AKA ỊCHỌTA EZIGBO ONYE Ị GA-ALỤ
  • WEPỤTA OGE LERUO ONYE Ị CHỌRỌ KA GỊ NA YA KPAWA ANYA
  • OTÚ UNU GA-ESI MALITE ỊKPA
  • OLEE OTÚ NDỊ ỌZỌ GA-ESI AKWADO ỤMỤNNA NA-ALỤBEGHỊ DI MA Ọ BỤ NWUNYE?
  • Otú Unu Ga-esi Eme Ka E Too Jehova Mgbe Unu Na-akpa Maka Ọlụlụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Ịkwadebe Maka Alụmdi na Nwunye Na-aga nke Ọma
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Agbala n’Èzí
    Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu
  • Alụmdi na Nwunye Bụ Onyinye Chineke Nwere Ịhụnanya Nyere Anyị
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
w24 Mee p. 20-25

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 21

ABỤ NKE 107 Ṅomie Ịhụnanya Chineke

Otú Ị Ga-esi Achọta Onye Ị Ga-alụ

“Ònye ga-achọtali ezigbo nwaanyị? Ọ bara ezigbo uru karịa nkume kọral.”​—ILU 31:10.

IHE A GA-AMỤ

Anyị ga-amụ ihe ndị Baịbụl kwuru ga-enyere mmadụ aka ịchọta ezigbo di ma ọ bụ nwunye nakwa otú ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ga-esi nyere ndị chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye aka.

1-2. (a) Olee ihe Onye Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ichebara echiche tupu ya na mmadụ akpawa maka ọlụlụ? (b) Gịnị bụ oge nwoke na nwaanyị ji akpa? (Kwuokwa ihe e dere ná “Nkọwakwu.”)

Ị̀ GA-ACHỌ ịlụ di ma ọ bụ nwunye? Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị ịlụ di ma ọ bụ nwunye ga-eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ. Ma, ọtụtụ Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, ma ndị nke na-eto eto ma ndị nke torola eto, na-atụ anya inweta onye ha ga-alụ. Ma, tupu mmadụ achọwa onye ya na ya ga-akpa maka ọlụlụ, ya na Jehova kwesịrị ịdị ná mma, o kwesịrị ịmara onwe ya nke ọma, kwesịkwa ịna-akpata ego ọ ga-eji na-elekọta onwe ya na ezinụlọ ya.a (1 Kọr. 7:36) I mee otú ahụ, gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị nwere ike ịna-enwe obi ụtọ.

2 Ma, ọ bụghị mgbe niile ka ọ na-adịrị mmadụ mfe ịchọta onye ọ ga-alụ. (Ilu 31:10) Ọ bụrụgodị na ị chọta onye ị ga-achọ ịmatakwu nke ọma, o nwere ike ọ gaghị adịrị gị mfe ka gị na ya kpawa.b N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe ga-enyere Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye aka ịchọta onye ha ga-alụ ma malitekwa ịkpa. Anyị ga-ahụkwa ihe ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ga-eme iji nyere ndị chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye aka.

IHE GA-ENYERE GỊ AKA ỊCHỌTA EZIGBO ONYE Ị GA-ALỤ

3. Gịnị ka Onye Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ichebara echiche ma ọ chọwa onye ọ ga-alụ?

3 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye, ọ ga-akacha mma ka ị mata ụdị onye ị ga-achọ ịlụ tupu gị na mmadụ ebido ịkpa. Ma ọ́ bụghị ya, i nwere ike ileghara onye ga-abụ ezigbo di ma ọ bụ nwunye anya ma ọ bụkwanụ gị na onye ọ na-agaghị adabara gị na ya amalite ịkpa. O doro anya na onye ọ bụla ị ga-elewe anya ịlụ ga-abụ Onye Kraịst e mere baptizim. (1 Kọr. 7:39) Ma, ọ bụghị onye ọ bụla mere baptizim ga-abụrụ gị ezigbo di ma ọ bụ ezigbo nwunye. N’ihi ya, i nwere ike ịjụ onwe gị, sị: ‘Olee ihe ndị m chọrọ iji ndụ m eme? Olee àgwà ndị dị ezigbo mkpa m ga-achọ ka onye ga-abụ di m ma ọ bụ nwunye m nwee? Ihe ndị m na-atụ anya n’aka onye ahụ hà kwesịrị ekwesị?’

4. Olee ihe ụfọdụ ndị na-ekpe n’ekpere mgbe ha na-achọ onye ha ga-alụ?

4 O doro anya na i kpeela ekpere ka ị chọta onye ga-abụ ọdị gị n’obi. (Fil. 4:6) Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova anaghị ekwe nkwa inye anyị di ma ọ bụ nwunye. Ma ihe bụ́ mkpa gị na otú obi na-adị gị na-emetụ ya n’obi. O nwekwara ike inyere gị aka ịchọta onye ga-abụ ezigbo di ma ọ bụ nwunye. N’ihi ya, na-agwa ya ihe ndị ị chọrọ na otú obi na-adị gị mgbe niile. (Ọma 62:8) Kpee ekpere ka Jehova nye gị amamihe nakwa ka ị na-enwe ndidi. (Jems 1:5) E nwere otu nwanna bi n’Amerịka na-alụbeghị nwaanyị aha ya bụ John.c O kwuru ihe ọ na-ekpe n’ekpere. Ọ sịrị: “M na-agwa Jehova àgwà m ga-achọ ka onye ga-abụ nwunye m nwee. M na-ekpekwa ekpere ka m nweta ohere ịhụ onye m ga-alụ. M na-arịọkwa Jehova ka o nyere m aka ịmụta àgwà ndị ga-eme ka m bụrụ ezigbo di.” Otu nwanna nwaanyị bi na Siri Lanka aha ya bụ Tanya sịrị: “Ka m na-achọ di, m na-arịọ Jehova ka o nyere m aka ịnọsi ike n’ofufe ya, na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị, ma na-enwe obi ụtọ.” Ọ bụrụgodị na ị chọtaghị onye ị ga-alụ ozugbo, Jehova kwere nkwa na ọ ga na-elekọta gị, na-ahụkwa gị n’anya.​—Ọma 55:22.

5. Olee otú Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nwere ike isi amata onye hụrụ Jehova n’anya? (1 Ndị Kọrịnt 15:58) (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

5 Baịbụl gwara anyị ka anyị nwee ‘ọtụtụ ihe anyị na-arụ mgbe niile n’ọrụ Onyenwe anyị.’ (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:58.) Ọ bụrụ na ị na-agbasi mbọ ike n’ozi Jehova, na-ewepụtakwa oge ka gị na ụmụnna gị ndị nwoke na ndị nwaanyị na-anọrị, ọ ga-eme ka ha na-agba gị ume. O nwekwara ike inyere gị aka ịmata ụmụnna na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ndị obi ha dị n’ife Jehova otú ahụ ọ dị gị. Ka ị na-eme ihe niile i nwere ike ime iji mee Jehova obi ụtọ, ị ga na-enwekwa ezigbo obi ụtọ.

Foto ndị na-egosi: 1. Ebe otu nwanna nwaanyị na-alụbeghị di na nwanna nwaanyị ọzọ tọrọ ya ji obi ụtọ na-akparịta ụka mgbe ha na-arụ n’ozi ọma. 2. Ebe nwanna nwaanyị ahụ na-ekunye ndị mmadụ nri n’ebe a na-arụ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova. 3. Ebe otu nwanna nwoke na-alụbeghị nwaanyị so otu okenye gaara otu nwanna na nwunye ya nleta ọzụzụ atụrụ n’ụlọ ha. 4. Ebe nwanna nwoke ahụ na-alụbeghị nwaanyị ji ihe e ji akwọbi ihe na-arụ ọrụ n’ebe a na-arụ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova.

Ọ bụrụ na ị na-agbasi mbọ ike n’ozi Jehova, na-ewepụtakwa oge ka gị na ụmụnna gị ndị nwoke na ndị nwaanyị na-anọrị, o nwere ike inyere gị aka ịchọta onye ị ga-alụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)


6. Ọ bụrụ na ụmụnna na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye achọwa onye ha ga-alụ, gịnị ka ha kwesịrị icheta?

6 Ma, i kwesịrị ịkpachara anya ka ịchọta onye ị ga-alụ ghara ịbụ ihe kacha mkpa ná ndụ gị. (Fil. 1:10) Ihe ga-eme ka i nwee ezigbo obi ụtọ abụghị ịlụ di ma ọ bụ nwunye. Kama, ọ bụ gị na Jehova ịdị ná mma. (Mat. 5:3) N’oge a ị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, i nwekwara ike inweta ohere ị ga-eji jekwuoro Jehova ozi. (1 Kọr. 7:32, 33) Jiri oge a mee ihe ga-akacha baara gị uru. Otu nwanna nwaanyị bi n’Amerịka aha ya bụ Jessica lụrụ di mgbe ọ fọrọ obere ka o ruo afọ iri anọ. Ọ sịrị: “M na-ejechi ozi ọma anya. O nyekwaara m aka ịna-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị na m chọrọ ịlụ di.”

WEPỤTA OGE LERUO ONYE Ị CHỌRỌ KA GỊ NA YA KPAWA ANYA

7. Gịnị mere o ji dị mma iwepụta oge leruo onye ihe ya masịrị gị anya tupu gị agwa ya na ị chọrọ ka gị na ya kpawa? (Ilu 13:16)

7 Ọ bụrụkwanụ na i chee na otu nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị ga-abụrụ gị ezigbo di ma ọ bụ nwunye, ì kwesịrị ịga gwawa ya ozugbo? Baịbụl kwuru na onye ma ihe na-akpa àgwà na-egosi na ọ ma ihe. (Gụọ Ilu 13:16.) N’ihi ya, ihe ga-egosi na ị ma ihe bụ ma i wepụta oge jiri akọ leruo onye ahụ anya tupu gị agwawa ya na i nwere mmasị n’ebe ọ nọ. Otu nwanna aha ya bụ Aschwin bi na Nedalandz sịrị: “Mmadụ nwere ike inwewe mmasị n’ebe onye ọzọ nọ, tupu ị mara ihe na-eme, ya akwụsịkwa inwe mmasị n’ebe onye ahụ nọ. N’ihi ya, ọ bụrụ na i wepụta oge leruo onye ahụ anya nke ọma, ị gaghị agwa ya ka gị na ya kpawa naanị n’ihi na ọ chabara gị anya.” Ihe ọzọ bụ na ka i wepụtara oge na-elerukwu onye ahụ anya nke ọma, i nwere ike ịchọpụta na ọ gaghị adabara gị na ya.

8. Olee otú onye na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nwere ike isi leruo onye o nwere mmasị n’ebe ọ nọ anya? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

8 Olee otú i nwere ike isi jiri akọ leruo mmadụ anya nke ọma? A gaa ọmụmụ ihe ma ọ bụ nnọkọ oriri, i nwere ike ịmata otú onye ahụ jiruru ofufe Chineke kpọrọ ihe nakwa ụdị onye ọ bụ. Olee ndị bụ́ ezigbo enyi ya? Oleekwa ihe ọ na-ekwukarị gbasara ya? (Luk 6:45) Ihe o bu n’obi ime ọ̀ dabara na nke gịnwa? I nwere ike ịjụta ndị okenye ọgbakọ ya ma ọ bụkwanụ Ndị Kraịst ndị ọzọ ma nke a na-akọ maruru ya ala. (Ilu 20:18) I nwere ike ịjụ ha gbasara ihe e ji mara ya nakwa àgwà ya. (Rut 2:11) Ka ị na-eleru onye ahụ anya, gbalịa ka ị ghara ime ihe ga-eme ka ahụ́ ghara iru ya ala. I kwesịghị ịgbalị na-anọ ya nso mgbe niile ma ọ bụ chọọ ịmatacha ihe niile gbasara ya.

Foto ndị na-egosi: Ebe nwanna nwaanyị ahụ na-alụbeghị di na nwanna nwoke ahụ na-alụbeghị nwaanyị ji akọ na-eleru ibe ha anya n’ọmụmụ ihe. 1. Ebe nwanna nwaanyị ahụ na-ele otú nwanna nwoke ahụ si emeso otu di na nwunye mere agadi. 2. Ebe nwanna nwoke ahụ na-ele ka nwanna nwaanyị ahụ na-eme ihe omume nwa akwụkwọ n’ọmụmụ ihe etiti izu.

Tupu gị agwa mmadụ na ị chọrọ ka gị na ya kpawa, jiri akọ leruo onye ahụ anya ruo oge ụfọdụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7 na nke 8)


9. Tupu gị agwa mmadụ na ị chọrọ ka gị na ya kpawa, olee ihe obi kwesịrị isi gị ike na ya?

9 Olee oge ị ga-eleru onye ahụ anya tupu gị agwa ya na ị chọrọ ka gị na ya kpawa? Ọ bụrụ na ị gwa ya ozugbo ka gị na ya kpawa, o nwere ike iwere gị ka onye na-anaghị eche echiche nke ọma tupu ya ekpebie ihe. (Ilu 29:20) Ma, ọ bụrụ na o wee gị ogologo oge, o nwere ike ịdị ya ka ị̀ na-egbu ezigbo oge tupu gị ekpebie ihe, karịchaa ma onye ahụ chọpụta na i nwere mmasị n’ebe ọ nọ. (Ekli. 11:4) Cheta na tupu gị agwawa mmadụ na ị chọrọ ka gị na ya kpawa, ọ dịghị mkpa na ọ ga-edo gị anya na gị na ya ga-alụ. Ma, obi kwesịrị isi gị ike na ị dịla njikere ịlụ di ma ọ bụ nwunye, nakwa na i chere na onye ahụ ị chọrọ ka gị na ya kpawa ga-abụ ezigbo di ma ọ bụ nwunye.

10. Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ị chọpụta na mmadụ nwere mmasị n’ebe ị nọ ma ya abụrụ na gịnwa enweghị mmasị n’ebe ọ nọ?

10 Ma, ọ bụrụkwanụ na ị chọpụta na mmadụ nwere mmasị n’ebe ị nọ? Ọ bụrụ na ị chọghị ka gị na ya kpawa, gbalịa isi n’àgwà gị mee ka o doo ya anya. Ọ gaghị adị mma ma i mee ka mmadụ chee na ị chọrọ ka gị na ya kpawa ebe ọ bụkwanụ na obi gị adịtụghị n’ebe ọ nọ.​—1 Kọr. 10:24; Efe. 4:25.

11. Ọ bụrụ na ị ga-achọtara mmadụ onye ọ ga-alụ, gịnị ka i kwesịrị ichebara echiche nke ọma?

11 N’obodo ụfọdụ, ọ na-abụ nne na nna ma ọ bụkwanụ ndị ọzọ toro eto na-ahọtara nwa ha ma ọ bụ onye ikwu ha onye ọ ga-alụ. N’obodo ụfọdụkwa, ndị ezinụlọ ma ọ bụ ndị enyi onye na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nwere ike ịchọtara ya onye ọ ga-alụ ma hazie ka ya na ya hụ ka ha mara ma ọ̀ ga-adabara ha. Ọ bụrụ na a gwa gị ka ị chọtara mmadụ onye ọ ga-alụ, gbalịa ka ị mata ihe na-amasị onye nke ọ bụla n’ime ha na ihe dị ha mkpa. Ọ bụrụ na ị chọta onye o yiri ka ọ̀ ga-adabara ya na ya, gbalịa ka ị mata ihe ndị i nwere ike ịmatali gbasara onye ahụ, dị ka àgwà ya, na nke kacha nke, ma ò ji ofufe Chineke kpọrọ ihe. Mmadụ na Jehova ịdị n’ezigbo mma dị mkpa karịa inwe ego, ịgụ akwụkwọ, ma ọ bụkwanụ ịbụ onye a ma ama. Ma, cheta na ọ bụ nwanna nwoke na nwanna nwaanyị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ga-ekpebi ma hà ga-alụ.​—Gal. 6:5.

OTÚ UNU GA-ESI MALITE ỊKPA

12. Ọ bụrụ na e nwere onye ị chọrọ ka gị na ya kpawa, olee otú ị ga-esi mee ka ọ mata?

12 Ọ bụrụ na ị chọrọ ka gị na mmadụ malite ịkpa, olee otú ị ga-esi gwa ya onye ahụ?d I nwere ike ịhazi ka gị na ya kwurịta okwu n’ekwentị ma ọ bụ n’ebe ndị mmadụ nọ. Gwa ya hoo haa na ihe ya masịrị gị nakwa na ị chọrọ ịmatakwu ya. (1 Kọr. 14:9) Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, nye ya oge ka o chebara ihe ị gwara ya echiche tupu ya azaa gị. (Ilu 15:28) Ọ bụrụ na onye ahụ achọghị ka gị na ya kpawa, amanyekwala ya.

13. Olee ihe i nwere ike ime ma mmadụ gwa gị na ọ chọrọ ka gị na ya kpawa? (Ndị Kọlọsi 4:6)

13 Ọ bụrụkwanụ na mmadụ agwa gị na ya nwere mmasị n’ebe ị nọ? Ọ ga-abụrịrị na ọ gbalịrị kata obi gwa gị otú ọ dị ya n’obi. N’ihi ya, kwanyere ya ùgwù ma gosi ya obiọma. (Gụọ Ndị Kọlọsi 4:6.) Ọ bụrụ na ị chọkwuru oge ichebara ya echiche ka ị mara ma ị̀ ga-ekwe ka gị na ya kpawa, gwa ya. Ma, gbalịa ka ị zaghachi ya ozugbo o kwere omume. (Ilu 13:12) Ọ bụrụ na ị chọghị ka gị na ya kpawa, jiri obiọma gwa ya hoo haa na ọ gaghị adaba. Legodị ihe Nwanna Hans si Ọstria kwuru mgbe otu nwanna nwaanyị gwara ya ka ya na ya kpawa. Ọ sịrị: “M medara obi gwa ya hoo haa ihe m kpebiri. M gwara ya ozugbo n’ihi na achọghị m ka o chewe na m nwere mmasị n’ebe ọ nọ. N’ihi ya, m gbalịrị na-akpachara anya ka m ghara ime ka o chee na m ga-emecha kweta.” Ma, ọ bụrụ na ị chọrọ ka gị na mmadụ kpawa, gị na ya kwurịta ihe unu ga-atụ anya ya n’oge unu na-akpa. Ihe ndị ị na-atụ anya ha nwere ike ịdị iche n’ihe ndị onye nke ọzọ na-atụ anya ha n’ihi ebe o si ma ọ bụkwanụ ihe ndị ọzọ.

OLEE OTÚ NDỊ ỌZỌ GA-ESI AKWADO ỤMỤNNA NA-ALỤBEGHỊ DI MA Ọ BỤ NWUNYE?

14. Olee otú anyị nwere ike isi si n’ihe anyị na-ekwu kwado ụmụnna ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye?

14 Olee otú anyị niile ga-esi na-akwado ụmụnna na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, ndị chọkwaranụ ịlụ? Otu ụzọ anyị ga-esi eme ya bụ ịkpachara anya n’ihe ndị anyị na-ekwu. (Efe. 4:29) Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘M̀ na-amakarị ndị chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye njakịrị? M hụ ka nwanna nwoke na-alụbeghị nwaanyị na nwanna nwaanyị na-alụbeghị di na-ekwu okwu, m̀ na-eche na ha abụọ na-akpa?’ (1 Tim. 5:13) Ihe ọzọ bụ na anyị ekwesịghị ime ka ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye chee na e nwere ihe kọrọ ha n’ihi na ha alụbeghị. Nwanna Hans anyị kwuburu okwu ya sịrị: “Ụfọdụ ụmụnna na-asị, ‘Gịnị mere na ị lụbeghị di ma ọ bụ nwaanyị? Ị bụghịzi taata.’ Ụdị okwu a na-eme ka onye na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye na-eche na naanị ihe ga-eme ka e were ya ka onye bara uru bụ ma ọ lụọ di ma ọ bụ nwunye.” Ọ ga-aka mma ma ọ bụrụ na anyị achọta ohere anyị ga-eji na-aja ụmụnna na-alụbeghị di ma ọ bụ nwaanyị mma.​—1 Tesa. 5:11.

15. (a) Dị ka e kwuru ná Ndị Rom 15:2, gịnị ka anyị kwesịrị ichebara echiche tupu anyị enyere mmadụ aka ịchọta onye ọ ga-alụ? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.) (b) Olee ihe gbara ọkpụrụkpụ ị mụtara na vidio ahụ?

15 Ọ bụrụkwanụ na anyị echee na ọ ga-adabara otu nwanna nwoke na otu nwanna nwaanyị? Baịbụl gwara anyị ka anyị na-echebara otú obi na-adị ndị ọzọ echiche. (Gụọ Ndị Rom 15:2.) Ọtụtụ ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye anaghị achọ ka ndị ọzọ chọtara ha onye ha ga-alụ. Anyị kwesịkwara ịkwanyere ha ùgwù n’ihe ahụ ha kpebiri. (2 Tesa. 3:11) Ụfọdụ nwere ike ịchọ ka anyị nyere ha aka. Ma, anyị ekwesịghị ịchọtara ha ma ọ bụrụ na ha agwaghị anyị.e (Ilu 3:27) Ọ na-akara ụfọdụ mma ka a ghara ịgwa ha na o nwere onye a chọtaara ha. E nwere otu nwanna nwaanyị si Jamanị na-alụbeghị di. Aha ya bụ Lydia. Ọ sịrị: “I nwere ike ịkpọ nwanna nwoke na nwanna nwaanyị ma ị kpọwa ndị ga-abịa nnọkọ. I nwere ike ịhazi ka ha abụọ hụ, hapụziere ha okwu.”

Ebe nwanna nwaanyị ahụ na-alụbeghị di na nwanna nwoke ahụ na-alụbeghị nwaanyị na-akparịta ụka mgbe ha gara nnọkọ.

Oge a na-enwe nnọkọ buru ibu bụ oge Onye Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nwere ike iji chọta onye ọ ga-alụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)


16. Gịnị ka Onye Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye kwesịrị icheta?

16 Anyị niile ga-enweli obi ụtọ ma ànyị alụọla di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ na anyị alụbeghị. (Ọma 128:1) N’ihi ya, ọ bụrụ na ị chọrọ ịlụ, mana ị chọtabeghị onye ị ga-alụ, lekwasị anya n’ofufe Jehova. Otu nwanna nwaanyị si Mekawu aha ya bụ Sin Yi sịrị: “E were oge gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ga-eji nọrọ na Paradaịs tụnyere oge ị nọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye, ị ga-achọpụta na oge ị nọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye dị nnọọ ezigbo obere. Jiri oge ahụ kpọrọ ihe ma were ya mee ihe ndị dị ezigbo mkpa.” Gịnịkwanụ ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị hụla onye ị ga-achọ ịlụ, unu amalitekwa ịkpa? N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-ekwu ihe ga-enyere unu aka mgbe unu na-akpa ka unu mee ezigbo mkpebi.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị na-achọ onye ị ga-alụ?

  • Gịnị mere o ji dị mkpa ka i leruo onye ị chọrọ ịlụ anya nke ọma tupu gị na ya amalite ịkpa?

  • Olee otú ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ga-esi na-akwado ụmụnna na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye chọrọ ịlụ?

ABỤ NKE 137 Ụmụ Nwaanyị Ndị Nwere Okwukwe

a Iji nyere gị aka ịmara ma ị̀ dịla njikere ịlụ di ma ọ bụ nwunye, gaa na jw.org gụọ isiokwu bụ́ “Nwoke na Nwaanyị Ịkpa​—Nke 1: M̀ Dịla Njikere Mụ na Mmadụ Ịkpawa?”

b NKỌWAKWU: N’isiokwu a na nke na-eso ya, oge nwoke na nwaanyị ji akpa bụ oge ha ga-eji amata ibe ha iji kpebie ma ọ̀ ga-adabara ha ịlụ. Nwoke na nwaanyị na-amalite ịkpa ma ọ bụrụ na ha agwa ibe ha na ha nwere mmasị n’ebe ibe ha nọ. Ha na-akpagidekwa ruo mgbe ha lụrụ ma ọ bụkwanụ mgbe ha kpebiri ịgawara onwe ha.

c Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

d N’obodo ụfọdụ, ọ na-abụkarị nwanna nwoke na-agwa nwanna nwaanyị ka ha bido ịkpa. Ma, ọ bụghị ihe ọjọọ ma nwanna nwaanyị gwa nwanna nwoke na ọ chọrọ ka ha kpawa. (Rut 3:1-13) Ị chọọ ịmatakwu gbasara ya, gụọ isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị . . . Olee Otú M Pụrụ Isi Gwa Ya Mmetụta M Na-enwe n’Ebe Ọ Nọ?” nke gbara na Teta! nke November 8, 2004.

e Gaa na jw.org lee vidio bụ́ Ndị Na-agbasi Mbọ Ike Ka Okwukwe Ha Sie Ike​—Ndị Na-alụbeghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya