ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 22
ABỤ NKE 127 Ụdị Mmadụ M Kwesịrị Ịbụ
Otú Unu Ga-esi Eme Ka E Too Jehova Mgbe Unu Na-akpa Maka Ọlụlụ
‘Ọ bụ ụdị mmadụ unu bụ ka Chineke na-anaghị eji egwu egwu.’—1 PITA 3:4 na ihe e dere n’ala ala peeji ya.
IHE A GA-AMỤ
Ihe nwoke na nwaanyị na-akpa maka ọlụlụ nwere ike ime iji mee ezigbo mkpebi nakwa otú ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ga-esi akwado ha.
1-2. Olee otú obi na-adị ụfọdụ ndị mgbe ha na-akpa maka ọlụlụ?
NWOKE na nwaanyị kpawa maka ọlụlụ, obi na-atọgbu ha atọgbu. Ọ bụrụ na e nwere onye gị na ya na-akpa ugbu a, o doro anya na ị chọrọ ka ọ gaziere unu. Ọ gaziekwarala ọtụtụ ndị. Otu nwanna nwaanyị si Etiopia aha ya bụ Tsiona sịrị: “Otu n’ime oge ndị m kacha nwee obi ụtọ ná ndụ m bụ oge mụ na di m na-akpa. Anyị kparịtara gbasara ihe ndị dị ezigbo mkpa, chịakwa ọchị. Obi tọgburu m atọgbu mgbe m chọpụtara na mụ ahụla onye m hụrụ n’anya nakwa onye hụrụ m n’anya.”
2 Ma otu nwanna si Nedalandz aha ya bụ Alessio sịrị: “Ọ tọrọ m ụtọ mgbe m nọ na-amata nwunye m n’oge anyị na-akpa. Mana, anyị nwekwara nsogbu ụfọdụ n’oge ahụ.” N’isiokwu a, anyị ga-ekwu ụfọdụ nsogbu ndị na-akpa nwere ike inwe nakwa ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru nwere ike inyere ha aka. Anyị ga-elebakwa anya n’otú ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ga-esi akwado nwoke na nwaanyị na-akpa.
IHE MERE NWOKE NA NWAANYỊ JI AKPA
3. Gịnị mere nwoke na nwaanyị ji akpa? (Ilu 20:25)
3 Ọ bụ eziokwu na nwoke na nwaanyị kpawa, obi na-atọgbu ha atọgbu, ma, ọ bụ ihe dị ezigbo mkpa nwere ike ime ka ha lụọ. N’ụbọchị nwoke na nwaanyị na-agba akwụkwọ, ha na-anọ n’ihu Jehova kwe ibe ha nkwa na ha ga-ahụ ibe ha n’anya ma na-akwanyere ibe ha ùgwù ụbọchị niile ha dị ndụ. Tupu anyị ekwe nkwa ọ bụla, anyị kwesịrị ichebara ya echiche nke ọma. (Gụọ Ilu 20:25.) Anyị kwesịrị ime otú ahụ tupu anyị ekwe mmadụ nkwa alụmdi na nwunye. Mgbe nwoke na nwaanyị na-akpa bụ oge ha na-eji amata ibe ha nke ọma ka ha nwee ike ime ezigbo mkpebi. Mgbe ụfọdụ, ha na-ekpebi ịlụ, mgbe ụfọdụ, ha ekpebie ịkwụsị ịkpa. Ha kwụsị ịkpa, ọ pụtaghị na ha mere ihe ọjọọ. Kama, ha mezuru ihe ha bu n’obi na-akpa. O nyeere ha aka ime ezigbo mkpebi.
4. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-ele nwoke na nwaanyị ịkpa maka ọlụlụ anya otú kwesịrị ekwesị?
4 Ọ dị mkpa ka ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwaanyị mata na ihe mere nwoke na nwaanyị ji akpa bụ ka ha chọpụta ma hà ga-alụ. Ọ pụtara na ha agaghị achọ ka ha na mmadụ kpawa ma ọ bụrụ na ha ebughị n’obi ịlụ onye ahụ. Ma, ọ bụghị naanị ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ịna-ele nwoke na nwaanyị ịkpa anya otú kwesịrị ekwesị. Anyị niile kwesịrị ịna-eme otú ahụ. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ na-eche na nwoke na nwaanyị kpawa, na ha ga-alụrịrị. Olee nsogbu iche otú a na-akpatara Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye? Otu nwanna nwaanyị bi n’Amerịka aha ya bụ Melissa sịrị: “Nwanna nwoke na nwanna nwaanyị kpawa, ụmụnna na-atụ anya ka ha lụọ. Ọ na-eme ka ụfọdụ ndị ka na-akpa ebe o dokwaranụ ha anya na ọ naghị adabara ha. E nwekwara ndị na-anatụdịghị ekwe ka ha na mmadụ kpawa. Ihe a nwere ike ime ka mmadụ na-echegbu onwe ya nke ukwuu.”
MATANỤ IBE UNU NKE ỌMA
5-6. Gịnị ka nwoke na nwaanyị na-akpa maka ọlụlụ kwesịrị ịmata gbasara ibe ha? (1 Pita 3:4)
5 Ọ bụrụ na e nwere onye gị na ya na-akpa, gịnị ga-enyere gị aka ikpebi ma ị̀ ga-alụ ya ma ọ bụ na ị gaghị alụ ya? Gbalịa ka unu mata ibe unu nke ọma. Ọ ga-abụ na e nwere ihe ụfọdụ ị ma gbasara onye gị na ya na-akpa tupu unu amalite ịkpa. Ma, ugbu a, i nweziri ohere ịmata ‘ụdị mmadụ ọ bụ.’ (Gụọ 1 Pita 3:4 na ihe e dere n’ala ala peeji ya.) Ihe a pụtara na ị ga-amatakwu otú onye gị na ya na-akpa si jiri ofufe Jehova kpọrọ ihe, ụdị onye ọ bụ, na otú o si eche echiche. Ka oge na-aga, ị ga-enwe ike ịza ajụjụ ndị dị ka: ‘Ihe ọ̀ ga-adabara mụ na ya ma anyị lụọ?’ (Ilu 31:26, 27, 30; Efe. 5:33; 1 Tim. 5:8) ‘Ànyị ga-ahụli ibe anyị n’anya otú o kwesịrị? Ànyị ga na-agbagharali ibe anyị mmejọ anyị?’b (Rom. 3:23) Ka unu na-amatakwu ibe unu, chetanụ na ihe kacha mkpa bụ ihe unu na-eme n’ebe unu na-enweghị otu olu, ọ bụghị n’ebe unu nwere otu olu.
6 Olee ihe ndị ọzọ i kwesịrị ịmata gbasara onye gị na ya na-akpa? Tupu unu erie ibe unu obi, unu kwesịrị ikwurịta ihe ụfọdụ dị ezigbo mkpa, dị ka ihe onye nke ọzọ kpebiri iji ndụ ya eme. Ùnu kwesịrị ikwurịta ihe ndị dị ka ma è nwere ọrịa unu na-arịa, ụgwọ unu ji, ma ọ bụ ihe mere unu n’oge gara aga? Ọ bụghị ihe niile ka e kwesịrị ikwu gbasara ha n’oge unu ka malitere ịkpa ọhụrụ. (I nwere ike ịtụle Jọn 16:12.) I chee na oge erubeghị mgbe ị ga-aza onye gị na ya na-akpa ụfọdụ n’ime ụdị ajụjụ ndị a, gwa ya. Ma, ka oge na-aga, ọ ga-adị mkpa ka ị gwa ya ihe ndị a ka o nyere ya aka ime mkpebi dị mma. N’ihi ya, o nwere oge ọ ga-eru, gị agwa ya ihe ndị a n’ezoghị ọnụ.
7. Olee otú nwoke na nwaanyị na-akpa ga-esi mata ibe ha nke ọma? (Kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “Mgbe Onye Gị na Ya Na-akpa Bi n’Ebe Dị Ezigbo Anya.”) (Kọwaakwa ihe e sere na foto ndị e ji kọwaa paragraf a.)
7 Olee otú onye nke ọ bụla ga-esi amata ibe ya nke ọma? Otú unu ga-esi eme ya bụ ịjụ ibe unu ajụjụ, ịgwa ibe unu eziokwu, nakwa ige ibe unu ntị nke ọma. (Ilu 20:5; Jems 1:19) Unu nwekwara ike ime ihe ndị ga-eme ka ọ dịrị unu mfe ikwurịta okwu, dị ka irikọ nri ọnụ, ịga ije n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị, nakwa ịrụ n’ozi ọma. I nwekwara ike ịmata onye gị na ya na-akpa ma ọ bụrụ na unu na ndị ezinụlọ unu na ndị enyi unu ana-anọkọ. Ihe ọzọ bụ ịhazi ka unu mee ihe ndị ga-eme ka ị mata otú o si akpa àgwà ma ụdị ihe dị iche iche mee, nakwa ma ya na ụdị ndị dị iche iche nọrọ. Ka anyị lee ihe Nwanna Aschwin si Nedalandz gbalịrị ime. O kwuru gbasara ihe ya na Nwanna Nwaanyị Alicia mere mgbe ha na-akpa. Ọ sịrị: “Anyị chọtara ihe ndị anyị ga-eme ga-enyere anyị aka ịmatakwu ibe anyị nke ọma. Ụfọdụ n’ime ha abụghị oké ihe, dị ka isikọ nri ọnụ ma ọ bụ ịrụkọ ọrụ ụlọ ọnụ. N’oge ndị ahụ, anyị matara ebe ibe anyị na-emeta na ebe ọ na-anaghị emeta.”
Ọ bụrụ na unu ana-eme ihe ndị ga-eme ka unu na-akparịta ụka, o nwere ike ime ka unu na-amatakwu ibe unu nke ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7 na nke 8)
8. Olee otú ịmụkọ Baịbụl ọnụ ga-esi nyere ndị na-akpa maka ọlụlụ aka?
8 Ihe ọzọ ga-enyere unu aka ịmata ibe unu nke ọma bụ ịmụkọ Baịbụl ọnụ. Unu lụọ, unu kwesịrị ịna-ewepụta oge unu ga-eji na-enwe ofufe ezinụlọ, ka ihe gbasara Chineke bụrụ ihe dị ezigbo mkpa n’alụmdi na nwunye unu. (Ekli. 4:12) N’ihi ya, ọ ga-adị ezigbo mma ma unu na-ewepụta oge unu ga-eji na-amụkọ ihe ọnụ ugbu a unu ka na-akpa. Ma, nwoke na nwaanyị kpawa, ha aghọbeghị ezinụlọ. Nke nwoke aghọbeghịkwa onyeisi nke nwaanyị. N’agbanyeghị ya, ọ bụrụ na unu ana-amụkọ Baịbụl ọnụ, unu nwere ike ịmata otú ibe unu hụruru Jehova n’anya. Nwanna Max na nwunye ya bụ́ Laysa, ndị si Amerịka, kwuru uru ọzọ ịmụkọ ihe ọnụ na-aba. Nwanna Max sịrị: “Mgbe anyị bidoro ịkpa, anyị malitere ịmụ akwụkwọ anyị ndị na-ekwu gbasara nwoke na nwaanyị ịkpa, alụmdi na nwunye, na ezinụlọ. Ịmụ akwụkwọ ndị ahụ mere ka anyị nwee ohere ikwurịta ọtụtụ ihe dị ezigbo mkpa a na-enweghị mgbe anyị gaara ekwu banyere ha.”
IHE NDỊ ỌZỌ UNU GA-ECHEBARA ECHICHE
9. Olee ihe ndị na-akpa maka ọlụlụ kwesịrị ichebara echiche ma ha kpebiwe ndị ha ga-agwa na ha na-akpa?
9 Olee ndị unu kwesịrị ịgwa na unu na-akpa? Ọ bụ unu abụọ ga-ekpebi ya. Mgbe unu ka bidoro ịkpa, unu nwere ike ikpebi ịgwa naanị mmadụ ole na ole. (Ilu 17:27) Ime otú ahụ nwere ike ime ka ọtụtụ ndị ghara ịna-agba unu ajụjụ ma ọ bụ nyewe unu nsogbu ime mkpebi. Ma, ọ bụrụ na e nweghị onye unu gwara, o nwere ike ime ka unu na-ezo ezo akpa ka ndị ọzọ ghara ịchọpụta. O nwere ike itinye unu ná nsogbu. N’ihi ya, ọ ga-adị mma ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ka unu gwa ndị nwere ike inye unu ezigbo ndụmọdụ ma si n’ụzọ ndị ọzọ nyere unu aka. (Ilu 15:22) Dị ka ihe atụ, unu nwere ike ịgwa ụfọdụ ndị ezinụlọ unu, ndị enyi unu ma nke a na-akọ, ma ọ bụ ndị okenye ọgbakọ.
10. Gịnị ka ndị na-akpa maka ọlụlụ kwesịrị ime ka ha ghara ime ihe ga-ewute Jehova? (Ilu 22:3)
10 Olee otú unu ga-esi eme ka e too Jehova mgbe unu na-akpa maka ọlụlụ? Ka ihe unu na-amasịkwu ibe unu, unu ga na-erikwu ibe unu obi. Gịnị ga-enyere unu aka ka unu ghara ime ihe ga-akpasu Jehova iwe? (1 Kọr. 6:18) Unu kwesịrị izere ịkparịta ihe ndị rụrụ arụ, naanị unu ịnọ, na ịṅụ oké mmanya. (Efe. 5:3) Ihe ndị a nwere ike ime ka agụụ inwe mmekọahụ gụwa unu, meekwa ka o siere unu ike ime ihe dị mma. Ọ ga-adị mma ka unu na-ekwurịta mgbe niile ihe unu ga-eme ka unu ghara ime omume rụrụ arụ. (Gụọ Ilu 22:3.) Lee ihe nyeere Nwanna Dawit na nwunye ya Almaz, bụ́ ndị Etiopia, aka. Ha sịrị: “Anyị abụọ na-anọkọ n’ebe ọtụtụ ndị juru ma ọ bụ n’ebe ndị enyi anyị nọ. E nweghị mgbe naanị anyị nọrọ n’ụlọ ma ọ bụ n’ụgbọala. Ihe a nyeere anyị aka izere ọnwụnwa.”
11. Olee ihe ndị na-akpa maka ọlụlụ kwesịrị ichebara echiche mgbe ha na-ekpebi otú ha ga-esi na-egosi na ha hụrụ ibe ha n’anya?
11 Nwoke na nwaanyị kpawa maka ọlụlụ, hà kwesịrị ịna-egosi na ha hụrụ ibe ha n’anya? Ka unu na-ahụkwu ibe unu n’anya, unu nwere ike ikpebi igosi ibe unu ịhụnanya otú kwesịrị ekwesị. Ma, ọ bụrụ na unu emee ka agụụ mmekọahụ gụsiwe ibe unu ike, ọ ga-esiri unu ike ikpebi ihe dị mma gbasara ibe unu. (Abụ Solo. 1:2; 2:6) Igosi ibe unu ịhụnanya nwekwara ike ime ka ọ dịrị unu mfe ichefu onwe unu ma mee ihe ga-ewute Jehova. (Ilu 6:27) N’ihi ya, ozugbo unu malitere ịkpa, jirinụ ihe Baịbụl kwuru kpebie ihe ndị unu ga-eme na ihe ndị unu ga-ezere.c (1 Tesa. 4:3-7) Jụọnụ onwe unu, sị: ‘Olee otú ndị bi n’ebe anyị bi ga-esi ele anyị anya ma ha hụ ka anyị na-egosi ibe anyị ịhụnanya? Ihe ndị a hà nwere ike ime ka agụụ mmekọahụ gụwa onye nke ọ bụla n’ime anyị?’
12. Gịnị ka ndị na-akpa maka ọlụlụ kwesịrị iburu n’obi gbasara nghọtahie ndị ha na-enwe n’oge ha na-akpa?
12 Olee ihe unu ga-eme ma unu nwee nghọtahie? Ọ bụrụ na unu na-enwe nghọtahie mgbe ụfọdụ, ọ̀ na-egosi na ọ gaghị adabara unu? Ọ bụchaghị otú ahụ. Ndị niile lụrụ di na nwunye anaghị enwe otu olu n’ihe ụfọdụ. Ihe na-eme ka di na nwunye dịrị n’ezigbo mma bụ ịna-asọpụrụ ibe ha na ịdị njikere ịhapụ ka e mee ihe onye nke ọzọ chọrọ. N’ihi ya, ihe unu na-eme ugbu a ma unu nwee nsogbu nwere ike igosi ma ihe ọ̀ ga-agaziri unu ma unu lụọ. Unu kwesịrị ịjụ onwe unu, sị: ‘Ànyị na-emeda obi ekwurịta okwu, kwanyekwara ibe anyị ùgwù? Ànyị na-adị njikere ikweta ihe ndị anyị na-emetaghị ma gbalịa imekwu nke ọma? Ànyị na-adị njikere ikwe ka e mee ihe ibe anyị chọrọ, ịrịọ mgbaghara, na ịgbaghara ibe anyị?’ (Efe. 4:31, 32) Ma, ọ bụrụ na unu na-enwekarị nghọtahie ma ọ bụ na-esekarị okwu n’oge unu na-akpa, o yikwara ka ọ̀ ga-adị otú ahụ ma unu lụchaa. Ọ bụrụ na ị chọpụta na ọ gaghị adabara gị na onye gị na ya na-akpa, ọ ga-akara unu abụọ mma ka unu kwụsị ịkpa.d
13. Olee ihe ndị ga-enyere nwoke na nwaanyị na-akpa aka ikpebi oge ha ga-akparu?
13 Olee mgbe unu kwesịrị ịkparu? Mmadụ kpebie ihe ọkụ ọkụ, o nwere ike ịkpatara ya nsogbu. (Ilu 21:5) N’ihi ya, unu kwesịrị ịna-akpa ruo mgbe unu matara ibe unu nke ọma. Ma, unu ekwesịghị ịkpa ogologo oge karịa otú o kwesịrị. Baịbụl kwukwara, sị: “Ike na-agwụ mmadụ ma ọ bụrụ na ihe ọ na-atụ anya ya emezughị mgbe ọ tụrụ anya ya.” (Ilu 13:12) Ihe ọzọ bụ na ka unu abụọ na-akpa, o nwere ike ịna-esikwuru unu ike izere ịkwa iko. (1 Kọr. 7:9) Kama ilekwasị anya n’oge unu abụọ kparurula, i nwere ike ịjụ onwe gị, sị: ‘Olee ihe m ka kwesịrị ịmata gbasara onye mụ na ya na-akpa ka o nyere m aka ime ezigbo mkpebi?’
OLEE OTÚ NDỊ ỌZỌ GA-ESI AKWADO NDỊ NA-AKPA MAKA ỌLỤLỤ?
14. Gịnị ka ụfọdụ ndị nwere ike ime iji kwado ndị na-akpa maka ọlụlụ? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
14 Ọ bụrụ na anyị ma nwanna nwoke na nwanna nwaanyị na-akpa, olee otú anyị nwere ike isi nyere ha aka? Anyị nwere ike ịkpọ ha ka ha bịa soro anyị rie nri, mee ofufe ezinụlọ, ma ọ bụ soro anyị gaa gwurie egwu. (Rom 12:13) Ha nwedịrị ike iji oge ndị ahụ matakwuo ibe ha. Hà chọrọ onye ga-anọnyere ha ma ha pụọ apụọ, ma ọ bụ onye ga-ebu ha n’ụgbọala, ma ọ bụ ebe ha ga-anọ kwurịta ihe gbasara naanị ha? Ọ bụrụ otú ahụ, anyị nwere ike inyere ha aka. (Gal. 6:10) Nwanna Nwaanyị Alicia anyị kwuburu okwu ya kwuru ihe tọgburu ya na di ya Aschwin atọgbu. Ọ sịrị: “Obi tọgburu anyị atọgbu mgbe ụmụnna ụfọdụ gwara anyị na anyị nwere ike ịbịa na nke ha ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ebe anyị ga-anọ, mana hanwa ga-anọkwa ya.” Ọ bụrụ na ụmụnna na-akpa agwa gị ka ị nọnyere ha, were ya ka ụzọ magburu onwe ya ị ga-esi enyere ha aka. Kpachara anya ka ị ghara ịhapụ naanị ha abụọ. Ma, i kwesịkwara ịma oge ị ga-enyetụ ha ohere ka ha nwee ike ikwu ihe ndị gbasara naanị ha.—Fil. 2:4.
Ọ bụrụ na anyị ma ụmụnna na-akpa maka ọlụlụ, anyị nwere ike ịchọta otú anyị ga-esi nyere ha aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14 na nke 15)
15. Olee ihe ọzọ ụmụnna nwere ike ime iji kwado ndị enyi ha na-akpa maka ọlụlụ? (Ilu 12:18)
15 Ihe anyị kwuru ma ọ bụ ihe anyị na-ekwughị nwekwara ike igosi na anyị na-akwado ụmụnna na-akpa maka ọlụlụ. Mgbe ụfọdụ, ọ dị mkpa ka anyị jide onwe anyị, ghara ikwu ihe ọ bụla. (Gụọ Ilu 12:18.) Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịna-enu anyị enu ka anyị gwa ndị ọzọ na otu nwanna nwoke na otu nwanna nwaanyị akpawala. Ma, o nwere ike ịbụ na hanwa chọrọ iji aka ha agwa ya ndị ọzọ. Anyị ekwesịghị iji ndị na-akpa maka ọlụlụ na-agba asịrị ma ọ bụ na-akatọ ha n’ihe ndị ha ga-eji aka ha ekpebiri onwe ha. (Ilu 20:19; Rom 14:10; 1 Tesa. 4:11) Ihe ọzọ bụ na anyị ekwesịghị ikwu okwu ma ọ bụ ịjụ ajụjụ ga-eme ka nwoke na nwaanyị na-akpa gaa lụọ mgbe ha na-achọbeghị. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Elise na di ya sịrị, “O menyere anyị ihere mgbe ndị mmadụ jụrụ anyị ndokwa anyị na-eme maka ịgba akwụkwọ mgbe anyịnwa na-ekwubeghị gbasara ya.”
16. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ụmụnna na-akpa maka ọlụlụ kwụsị ịkpa?
16 Ọ bụrụkwanụ na ndị na-akpa maka ọlụlụ ekpebie na ha ga-akwụsị ịkpa? Anyị ekwesịghị inyonye anya n’ihe kpatara ya ma ọ bụ chọwa onye anyị ga-adụnyere úkwù. (1 Pita 4:15) Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Lea sịrị: “M nụrụ na ndị mmadụ na-ekwu ihe ha chere mere mụ na otu nwanna ji kwụsị ịkpa. Ihe a fụrụ m ụfụ n’obi.” Dị ka anyị kwuru ná mmalite, ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị na-akpa ekpebie na ha ga-akwụsị ịkpa, ọ pụtaghị na ha mere mkpebi na-adịghị mma. Ọtụtụ mgbe, ihe ọ pụtara bụ na ọkpụkpa ha kpara enyerela ha aka ime mkpebi dị mma. Ma, ihe ahụ ha kpebiri nwere ike ime ka obi na-ajọ ha njọ. O nwekwara ike ime ka owu na-ama ha. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịchọta ụzọ ndị anyị ga-esi na-enyere ha aka.—Ilu 17:17.
17. Gịnị ka ndị na-akpa maka ọlụlụ kwesịrị ịna-eme?
17 Dị ka anyị hụrụ, nwoke na nwaanyị nwere ike inwe nsogbu ma ha na-akpa. Ma, o nwekwara ike ịtọ ha ụtọ. Nwanna Nwaanyị Jessica sịrị: “Nke bụ́ eziokwu bụ na nwoke na nwaanyị ịkpa abụghị agwọ e ji akpụka mma egbu. Ma, obi dị m ụtọ na anyị wepụtara oge, gbaakwa mbọ mata ibe anyị nke ọma.” Ọ bụrụ na unu na-akpa maka ọlụlụ, na-agbanụ mbọ ka unu matakwuo ibe unu nke ọma. Unu mee otú ahụ, ọ ga-eme ka unu mee ezigbo mkpebi.
ABỤ NKE 49 Ka Anyị Na-eme Ka Obi Jehova Ṅụrịa
a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.
b Iji mata ajụjụ ndị ọzọ ị ga-echebara echiche, gụọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2, peeji nke 39 na nke 40.
c Ịpị mmadụ aka n’ihe o ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị bụ ịkwa iko. Ọ ga-emekwa ka ndị okenye hiwere ndị mere ya òtù ikpe. Ịpị mmadụ aka n’ara na nwoke na nwaanyị iji ekwentị na-ezirịta ozi rụrụ arụ ma ọ bụ na-ekwurịta ya n’ekwentị nwere ike ime ka ndị okenye hiwere ha òtù ikpe, ma e lechaa otú o si mee.
d Ị chọọ ịhụ ebe a kọwakwuru ya, gụọ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” n’Ụlọ Nche August 15, 1999.