Ị̀ Pụrụ Inwe Olileanya Ịdị Ndụ Ebighị Ebi?
“Ọ DỊ ihe na-eme n’ime ahụ mmadụ iji kpebie oge ndụ kasị ogologo ga-ekwe omume nke afọ 115 ruo 120,” ka Dr. James R. Smith, bụ́ prọfesọ nkà mmụta mkpụrụ ndụ na-ekwu. “E nwere ebe njedebe—ma anyị amaghị ihe na-ekpebi ya.” Ọkà mmụta ihe ndị dị ndụ bụ́ Dr. Roger Gosden na-ekwu na n’ihi ya ọ bụghị ihe ijuanya na “ndị ọkà mmụta sayensị aka-achọtabeghị ụzọ isi gbatịkwuo oge ndụ, o sikatakwa ike ịhụ onye ọ bụla n’ime ha na-echedị ya.” Nke ahụ ọ̀ chọwala ịgbanwe?
Iche “Ajụjụ ahụ Dị Mkpa n’Ezie” Ihu
Ọ bụ ezie na e nwere ọtụtụ ihe ndị e chepụtara echepụta na-ekwe nkwa ịkwụsị ime agadi, ihe ka ọtụtụ ná ndị ọkachamara kwenyeere Dr. Gene D. Cohen, bụ́ onyeisi Òtù Na-ahụ Maka Ime Agadi nke America, na “mgbọ magik ndị a nile enweghịzi ihe e ji agbapụ ha.” N’ihi gịnị? Tinyere ihe ndị ọzọ, ka Nancy Shute na-ede banyere sayensị na-ekwu, na U.S.News & World Report, “ọ dịghị onye matarala ihe na-akpata ime agadi na ihe na-aghaghị isi na ya pụta, bụ́ ọnwụ. Inye ọgwụ maka ọrịa ahụ mgbe ị na-amaghị ihe kpatara ya bụkwa iji ya eme ihe aghara ghara ma e kwuo ya n’ụzọ kasị mma.” Dr. Gosden na-ekwukwa na ime agadi ka bụ ihe omimi: “Ọ na-apụta ìhè n’ahụ onye ọ bụla n’ime anyị ma ihe na-akpata ya ka bụ ihe omimi.” Ọ na-ekwu na a dịghị elebachara “ajụjụ ahụ dị mkpa n’ezie bụ́ banyere ihe mere o jidị eme” anya.a
Ihe àmà na-egosi na dị ka e nwere ebe ụmụ mmadụ pụrụ ịgbaru ọsọ, ebe ha pụrụ ịwụliru elu, na ebe ha pụrụ ịmabaru n’ime mmiri, e nwekwara ókè a pụrụ iji echiche mmadụ nanị kọwaa ihe. Ịzakwa “ajụjụ ahụ dị mkpa n’ezie bụ́ gịnị mere” yiri ka ọ gafere ebe ahụ. Ya mere, nanị ụzọ isi chọta azịza ya bụ ichigharịkwuru isi iyi nke gabigara ebe nanị ihe ọmụma mmadụ pụrụ iru. Nke ahụ bụ kpọmkwem ihe otu akwụkwọ amamihe ochie, bụ́ Bible, na-atụ aro ka i mee. N’ikwu banyere Onye Okike, bụ́ “isi iyi ndụ,” Bible na-emesi anyị obi ike, sị: “Ọ bụrụkwa na unu achọọ Ya, Ọ ga-eme ka unu chọta Ya.” (Abụ Ọma 36:9; 2 Ihe E Mere 15:2) Gịnịzi ka nnyocha nke Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-egosi banyere ihe mere n’ezie mmadụ ji anwụ anwụ?
Isi Ihe Kpatara Ọnwụ
Bible na-agwa anyị na mgbe Chineke kere ndị mmadụ mbụ, o tinyere “echiche nke mgbe ebighị ebi n’obi ha.” (Eklisiastis 3:11, Beck) Otú ọ dị, Onye Okike nyere nne na nna mbụ nke mmadụ ihe karịrị ọchịchọ ịdị ndụ ebighị ebi; o nyekwara ha ohere ime otú ahụ. E kenyere ha ahụ na uche zuru okè, ha bikwara na gburugburu ebe obibi udo dị na ya. Onye Okike zubere ka ndị mmadụ mbụ a dị ndụ ebighị ebi nakwa ka oge na-aga ka ụwa jupụta n’ụmụ ha zuru okè.—Jenesis 1:28; 2:15.
Otú ọ dị, ndụ na-enweghị ọgwụgwụ nwere ihe ọ dabeere na ya. Ọ dabeere n’irubere Chineke isi. Ọ bụrụ na Adam enupụrụ Chineke isi, ọ “ghaghị ịnwụ anwụ.” (Jenesis 2:16, 17) N’ụzọ dị mwute, ndị mmadụ mbụ ahụ nupụrụ isi. (Jenesis 3:1-6) Site n’ime otú a, ha ghọrọ ndị mmehie, n’ihi na ‘mmehie bụ mmebi iwu.’ (1 Jọn 3:4) N’ihi ya, ha enwekwaghị atụmanya nke ndụ ebighị ebi, n’ihi na “ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ.” (Ndị Rom 6:23) Ya mere, mgbe ọ na-ama ndị mmadụ mbụ ahụ ikpe, Chineke kwuru, sị: “Ájá ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị galata.”—Jenesis 3:19.
N’ihi ya, mgbe ndị mmadụ mbụ ahụ mehiesịrị, e dere mmetụta nke mmehie ahụ e buru n’amụma ná mkpụrụ ndụ ihe nketa ha, e guzobekwara ebe njedebe ahụ. Dị ka ihe si na ya pụta, ha ghọrọ ndị na-eme agadi, ihe ọ na-arụpụta abụrụkwa ọnwụ. Ọzọkwa, mgbe a chụpụsịrị ha n’ebe obibi Paradaịs mbụ ha, nke a na-akpọ Iden, ndị mmadụ mbụ ahụ chere ihe ọzọ nwere mmetụta ọjọọ ná ndụ ha ihu—gburugburu ebe obibi yiri ihe mgbochi na-abụghị n’ime Iden. (Jenesis 3:16-19, 23, 24) Ngwakọta nke ihe nketa a na-ezukwaghị okè na gburugburu ebe obibi dị njọ metụtara ndị mmadụ mbụ ahụ nakwa ụmụ ha mesịrị mụọ.
Otu Ikpe Ọmụma na Otu Nkwa
Ebe ọ bụ na mgbanwe ọjọọ ndị a weere ọnọdụ ná ndụ ndị mmadụ mbụ ahụ tupu ha amụta ụmụ, ha pụrụ nanị ịmụta ụmụ dị ka ha—na-ezughị okè, na-emehie emehie, na-emekwa agadi. ‘Ọnwụ si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehiere,’ ka Bible na-ekwu. (Ndị Rom 5:12; tụlee Abụ Ọma 51:5.) “Anyị bu ikike anyị nwere ịnwụ anwụ bụ́ nke e dere ná mkpụrụ ndụ anyị,” ka akwụkwọ bụ́ The Body Machine—Your Health in Perspective na-ekwu.
Otú ọ dị, nke a apụtaghị na e nweghị olileanya nke ịdị ndụ na-enweghị ọgwụgwụ—ndụ nke ime agadi na ọnwụ na-adịghị na ya. Nke mbụ, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ikwere na Onye Okike nke kasị mara ihe nke kere ndụ mmadụ na ụdị ndụ ndị ọzọ n’ụdị ha dịgasị iche n’ebube ha pụrụ ịgwọ ezughị okè ọ bụla nke mkpụrụ ndụ ma nye ike dị mkpa iji mee ka ndụ mmadụ dịruo ebighị ebi. Nke abụọ, nke a bụ kpọmkwem ihe Onye Okike kweworo nkwa ime. Mgbe ọ masịrị ndị mmadụ mbụ ahụ ikpe ọnwụ, Chineke kpughere ọtụtụ mgbe na nzube ya maka ụmụ mmadụ ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa agbanwebeghị. Dị ka ihe atụ, ọ na-enye mmesi obi ike bụ́: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29) Gịnị ka ọ dị gị mkpa ime iji hụ mmezu nke nkwa a?
Ụzọ Isi Gbatịkwuo Ndụ Gị —Ruo Mgbe Ebighị Ebi
N’ụzọ na-adọrọ mmasị, mgbe Ronald Kotulak na-ede akwụkwọ sayensị gbasịrị ihe karịrị ndị nnyocha ọgwụ 300 ajụjụ ọnụ, o kwuru, sị: “Ọ dịwo anya ndị ọkà mmụta sayensị matara na ego a na-akpata, ọrụ, na mmụta bụ ihe ndị kasị mkpa na-ekpebi ahụ ike ụmụ mmadụ na afọ ole ha ga-adịru ndụ. . . . Ma ọ bụ mmụta na-apụta dị ka ihe kasị nnọọ ekpebi afọ ole a ga-adịru ndụ.” Ọ kọwara, sị: “Dị nnọọ ka nri anyị na-eri na-enye usoro ahụ anyị ji alụso ọrịa ọgụ ume iji lụsoo nje ndị na-efe efe ọgụ, bụ́ ndị na-eyi ndụ egwu, mmụta na-eme ka anyị ghara ime nhọrọ ọjọọ.” Dị ka otu onye nnyocha kwuru, “mmụta na-eme ka ị mata otú ị ga-esi chịkwaa onwe gị” na otú ị ga-esi “merie ihe mgbochi ndị pụrụ ịdapụta.” N’ihi ya, n’otu akụkụ, mmụta bụ, dị ka Kotulak na-ede akwụkwọ si tinye ya, “isi ihe na-eme ka e nwee ahụ ike, na ndụ dịwanyere ogologo.”
Nzọụkwụ mbụ a ga-azọ iji nweta ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu bụkwa mmụta—mmụta Bible. Jisọs Kraịst kwuru, sị: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Inweta ihe ọmụma banyere Jehova Chineke, bụ́ Onye Okike, banyere Jisọs Kraịst, na banyere ndokwa nke ihe mgbapụta Chineke mere bụ nanị ụdị mmụta ga-akwadebe mmadụ ịzọnye nzọụkwụ mbụ n’ụzọ ahụ na-eduga ná ndụ ebighị ebi.—Matiu 20:28; Jọn 3:16.
Ndịàmà Jehova na-eduzi usoro ihe omume nke mmụta Bible pụrụ inyere gị aka inweta ihe ọmụma Bible a na-enye ndụ. Gaa n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze ha iji mụtakwuo ihe banyere usoro ihe omume a bụ́ n’efu, ma ọ bụ gwa ha ka ha bịa na nke gị n’oge dị gị mma. Ị ga-ahụ na Bible nwere ihe siri ike na-egosi na oge mgbe ihe mgbochi na ebe njedebe na-agakwaghị egbochi ndụ ma kpaara ya ókè dị nso. N’eziokwu, ọnwụ achịwo ruo ọtụtụ puku afọ, ma n’oge na-adịghị anya a ga-emeri ya ruo mgbe ebighị ebi. Lee aha atụmanya na-enye obi ụtọ ọ bụụrụ ma okenye ma nwata!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ndị ọkachamara n’ihe banyere ime agadi echepụtawo ọtụtụ ihe (otu onye gụtara ihe karịrị 300!) na-akọwa otú a pụrụ isi mee agadi. Otú ọ dị, ihe ndị a e chepụtara echepụta adịghị akọwa ihe mere o ji emedị eme.
[Foto ndị dị na peeji nke 21]
Nzọụkwụ mbụ a ga-azọ iji nweta ndụ ebighị ebi bụ mmụta Bible