Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g05 10/8 p. 32
  • Ị̀ Dị Njikere Ịga?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Dị Njikere Ịga?
  • Teta!—2005
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị Gaghị Achọ Ka Ọ Kwaa Gị!
    Teta!—2000
  • Bịa Mgbakọ Distrikti “Okwukwe n’Okwu Chineke”!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ị̀ Ga-anọ n’Ebe Ahụ?
    Teta!—1996
  • Ị Gaghị Achọ Ka Ọ Kwaa Gị!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2005
g05 10/8 p. 32

Ị̀ Dị Njikere Ịga?

Ịga gịnị? Ịga Mgbakọ Distrikti “Irubere Chineke Isi” nke Ndịàmà Jehova! A malitere inwe mgbakọ ụbọchị atọ a n’izu ikpeazụ nke ọnwa May na United States. Ndị a ga-enwe na Nigeria ga-amalite n’ọnwa October. Eleghị anya, a ga-enwe otu n’ime ha n’obodo dị gị nso.

N’ihe ka ukwuu n’ebe ndị a ga-enwe mgbakọ a, a ga-eji abụ olu ụtọ malite ya ma o jiri ọkara gafee elekere anya itoolu nke ụtụtụ. Isiokwu ihe omume nke ụbọchị Friday bụ “Geenụ Ntị Olu M, M Ga-abụkwara Unu Chineke.” (Jeremaịa 7:23) Mgbe e kwusịrị okwu abụọ isiokwu ha bụ “E Mere Ka Anyị Bụrụ Oké Ọrụ” na “Mbilite n’Ọnwụ—Ihe Mere I Ji Kwesị Inwe Olileanya na Ọ Ga-adịrịrị” n’ụtụtụ ahụ, nnọkọ nke ụtụtụ ga-eji okwu bụ́ isi nke isiokwu ya bụ, “Na-agbaso Onye Nlereanya Anyị, Bụ́ Kraịst, Site n’Irubere Chineke Isi,” mechie.

Ná nnọkọ nke ehihie Friday, a ga-ekwu okwu ndị isiokwu ha bụ “Nọgide ‘Na-atụkwasị Uche n’Ihe nke Mmụọ Nsọ,’ Ka I Wee Dị Ndụ,” “Na-echenụ Nche Megide Ụdị Ọchịchọ Anyaukwu Ọ Bụla,” na “Agbasola ‘Akụkọ Ụgha E Ji Akọ Chepụta.’” Nke ahụ gasịa, a ga-enwe okwu mmadụ abụọ ga-ekwu nke ga-akọwapụta isi ihe ndị dị n’akwụkwọ Bible abụọ bụ́ Hagaị na Zekaraịa. Nnọkọ nke ụbọchị ahụ ga-eji okwu isiokwu ya bụ “Ahụhụ Nile Ga-akwụsị n’Isi Nso!” mechie.

Isiokwu ihe omume ụbọchị Saturday bụ “Isi n’Obi Na-erube Isi” “n’Ihe Nile,” nke dabeere ná Ndị Rom 6:17 na 2 Ndị Kọrint 2:9. Nnọkọ nke ụtụtụ ga-agụnye okwu mmadụ atọ ga-ekwu nke isiokwu ya bụ, “Obi Ụtọ Na-adịrị Ezinụlọ Ndị Na-agbaso Ụkpụrụ Chineke.” Ọ ga-enwe ihe ngosi na ajụjụ ọnụ, ọ ga-akọwakwa otú onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ—di, nwunye, na ụmụaka—pụrụ isi mee ka obi ụtọ dị n’ezinụlọ. Nnọkọ nke ụtụtụ ga-eji isiokwu bụ́ “Ka Ee Gị Bụrụ Ee,” mechie. Nke ahụ gasịa, a ga-enwe ohere maka ime ndị ruru eru baptizim.

Okwu ndị a ga-ekwu n’ehihie Saturday ga-agụnye “Ka Anya Gị Abụọ Si n’Ihe Efu Gabiga” na “Laghachikwurunụ Onye Na-azụ Mkpụrụ Obi Unu.” Okwu mmadụ abụọ ga-ekwu nke isiokwu ya bụ “Na-eruberenụ Ndị Na-edu Ndú . . .Isi” ga-esochi. Okwu ikpeazụ n’ehihie ahụ nke isiokwu ya bụ “Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?” bụ okwu ga-akasị akpali mmasị ná mgbakọ ahụ.

Ihe omume ụtụtụ ụbọchị Sunday ga-akọwapụta isiokwu bụ́ “Rube Isi n’Okwu Ndị A Nile Ka Ihe Wee Gaziere Gị,” nke dabeere na Deuterọnọmi 12:28. Okwu mmadụ atọ ga-ekwu nke isiokwu ya bụ “Nyere Ndị Ọzọ Aka Irube Isi n’Ihe Ndị Bible Na-akụzi,” ga-enyere anyị aka ịma ụzọ isi malite na iduzi ọmụmụ Bible dị mma.

Nnọkọ nke ụtụtụ ga-eji ihe nkiri a ga-eyi uwe ihe nkiri eme, nke isiokwu ya bụ “Chụsoo Ihe Mgbaru Ọsọ Ndị Na-ewetara Chineke Nsọpụrụ” mechie. Tupu e mewe ihe nkiri ahụ, a ga-ekwu okwu isiokwu ya bụ “Ndị Ntorobịa—Ihe Mgbaru Ọsọ Unu Hà Na-eme Ka Unu Nwee Ihe Ịga Nke Ọma?” Okwu a ga-atọ ntọala maka ihe nkiri ahụ si na Bible. Ọ bụ banyere nwa okorobịa bụ́ Timoti, bụ́ onye setịpụrụ ihe nlereanya nke achọghị ọdịmma onwe onye nanị, nke a na-agba ndị ntorobịa oge a ume iṅomi. Ná nnọkọ ikpeazụ nke mgbakọ ahụ n’ehihie Sunday, a ga-ekwu okwu ihu ọha nke isiokwu ya bụ “Ònye Ka Anyị Kwesịrị Ịdị Na-erubere Isi?”

Mee ndokwa ugbu a ịga. Iji chọpụta ebe kasị dịrị gị nso n’ime ebe ndị a ga-enwe mgbakọ a, ị pụrụ ịga n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova dị n’ógbè gị ma ọ bụ detara ndị na-ebipụta magazin a akwụkwọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya