Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 9/15 p. 32
  • Ị Gaghị Achọ Ka Ọ Kwaa Gị!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị Gaghị Achọ Ka Ọ Kwaa Gị!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị̀ Ga-anọ n’Ebe Ahụ?
    Teta!—1996
  • Ị Gaghị Achọ Ka Ọ Kwaa Gị!
    Teta!—2000
  • Ị̀ Dị Njikere Ịga?
    Teta!—2005
  • Bịa Mgbakọ Distrikti “Okwukwe n’Okwu Chineke”!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 9/15 p. 32

Ị Gaghị Achọ Ka Ọ Kwaa Gị!

KA GỊNỊ kwaa gị? Mgbakọ Distrikti “Ndị Ozi nke Udo Chineke” nke Ndịàmà Jehova bụ́ nke ji ọsọ na-abịaru nso! N’ihe ka n’ọtụtụ ebe, mgbakọ ahụ ga-eji usoro ihe omume olu ụtọ malite na 9:20 ụtụtụ Friday. Mgbe a nụsịrị ajụjụ ọnụ ndị na-ewusi okwukwe ike n’oge okwu bụ́ “Ịnụrụ Site n’Ọnụ Ndị Ji Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-akpọsa Udo,” ị ga-anụrụ okwu ahụ na-agba ume bụ́ “Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?”

Ihe bụ isi n’ehihie Friday ga-abụ okwu bụ isi na-akpali akpali bụ́ “Ọrụ Anyị Dị Ka Ndị Ozi nke Udo Chineke.” Mgbe ahụ okwu ahụ bụ́ “Inyere Ndị Ọzọ Aka Ịmụta Ihe Chineke Na-achọ” ga-atụ aro banyere ịkụziri ndị ọhụrụ ihe. Usoro isiokwu bịara n’ezi oge bụ́ “Kpachara Anya Maka Ọnyà Ndị Zoro Ezo nke Ntụrụndụ” ga-esochi nke a. Usoro ihe omume Friday ga-emechi site n’okwu ndị bụ “Guzogide Ekwensu—Anabatala Ihe Ọjọọ” na “Iji Ịnọgidesi Ike n’Ihe Na-akwado Izi Ezi nke Okwu Chineke.”

Usoro ihe omume nke ụtụtụ Saturday ga-emesi ike mkpa nke ọrụ ime ndị na-eso ụzọ n’usoro isiokwu nwere akụkụ atọ bụ́ “Ndị Ozi Na-eweta Ozi Ọma nke Udo.” Nnọkọ a ga-emechi site n’okwu ndị bụ “Iji Obi Ụtọ Na-enye Ihe n’Ime Nzukọ Jehova” na “Ndụ na Udo Site ná Nraranye na Baptism,” bụ́ nke ọ gasịa a ga-enwe ohere ime ndị na-eso ụzọ ọhụrụ baptism.

Okwu ehihie Saturday bụ́ “Na-atụle Echiche Jehova n’Ihe Dị Iche Iche” ga-aza ụdị ajụjụ ndị dị ka ‘Ndị Kraịst hà na-ekere òkè n’ọrụ nkewa ahụ taa?’ na ‘Gịnị bụ echiche Bible banyere ntaramahụhụ ogbugbu?’ Ị ga-enwekwa ọṅụ ịnụ usoro isiokwu na-enye obi ụtọ nke nwere akụkụ abụọ bụ́ “Chineke nke Udo Na-elekọta Gị” na karịsịa okwu mmechi bụ́ “Chụsoo Udo Chineke n’Ime Ndụ Ezinụlọ.”

Usoro ihe omume ụtụtụ Sunday ga-agụnye usoro isiokwu nwere akụkụ atọ bụ́ “Ịmata Ụdị Ndị Ozi Bụ Ndị Ọma Ya” na okwu ahụ bụ́ “Gee Ntị ma Rubere Okwu Chineke Isi.” Usoro ihe omume nke ụtụtụ ga-emechi site n’ihe nkiri a ga-eji ejiji zuru ezu wee mee nke ga-ewepụta ihe mmụta ndị bara uru site n’ihe ndekọ Bible nke Onyeikpe Gideọn.

Nnọkọ ikpeazụ nke mgbakọ ahụ n’ehihie Sunday ga-enwe okwu ihu ọha, nke a kpọrọ “Ezi Udo n’Ikpeazụ!—Site n’Olee Ebe?” N’ikpeazụ, okwu ahụ na-akpali akpali bụ́ “Ịga n’Ihu Dị Ka Ndị Ozi nke Udo Chineke” ga-eweta mgbakọ ahụ ná njedebe.

Mee ndokwa ugbu a ịga. Iji chọta ebe dịkarịsịrị ebe i bi nso, kpọtụrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova n’ógbè gị ma ọ bụ degara ndị na-ebipụta magazin a akwụkwọ. Mbipụta June 8 nke Teta! depụtara ebe nile a ga-enwe mgbakọ na Nigeria.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya