Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 10/11 p. 30-31
  • Chineke Ọ̀ Kwadoro Agha A Na-alụ n’Oge A?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Ọ̀ Kwadoro Agha A Na-alụ n’Oge A?
  • Teta!—2011
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Atọ Kpatara Ya
  • Ihe Mere Chineke Ji Jiri Ọgbakọ Ndị Kraịst Dochie Anya Mba Izrel
  • Mmadụ Ọ̀ Ga-ahụli Ndị Iro Ya n’Anya?
    Teta!—2010
  • Ndị Kraịst Bụ́ Ndị Na-anọpụ Iche n’Ụbọchị Ikpeazụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Ịlụ Agha Ò Kwekọrọ n’Ozizi Ndị Kraịst?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Otú Anyị Ga-esi Anọpụ Iche n’Ụwa
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2011
g 10/11 p. 30-31

Echiche Baịbụl

Chineke Ọ̀ Kwadoro Agha A Na-alụ n’Oge A?

E NWERE otu eze chiri Izrel n’oge ochie, aha ya bụ Devid. Nwoke a bụ dike n’agha. Mgbe ọ na-ekwu gbasara otú o si kpaa ike n’agha, o kwuru, sị: “[Chineke] na-akụziri aka m otú e si ebu agha, ogwe aka m ekwewo ụta ọla kọpa.”​—Abụ Ọma 18:34.

Ma, mgbe Pọl onyeozi na-ekwu gbasara Ndị Kraịst, o kwuru, sị: “Ọ bụ ezie na anyị na-eje ije n’anụ ahụ́, anyị adịghị ebu agha dị ka ihe anyị bụ n’anụ ahụ́ si dị. N’ihi na ngwá agha anyị ji ebu agha abụghị nke anụ ahụ́.”​—2 Ndị Kọrịnt 10:3, 4.

Pọl onyeozi ọ̀ na-agba ihe a Eze Devid kwuru ụkwụ, ka è nwere ihe mere Chineke ji hapụ mba Izrel ka ha lụọ agha n’oge ochie ma gwa Ndị Kraịst ka ha ghara ịlụ agha taa? Otú Chineke si lee ịlụ agha anya n’oge ochie ọ̀ gbanweela? Azịza ajụjụ ndị a ga-edo anyị anya ma anyị leba anya n’ụzọ ihe atọ gbara ọkpụrụkpụ mere Jehova ji hapụ ụmụ Izrel ka ha lụọ agha ma gwa ezigbo Ndị Kraịst ka ha ghara ịlụ agha.

Ihe Atọ Kpatara Ya

NKE MBỤ: Mba Izrel oge ochie bụ mba Chineke nwe n’onwe ya, o nyekwara ha ala ebe ha ga-ebi. Ma, mba ndị gbara ha gburugburu na-achọkarị ha okwu. N’ihi ya, Chineke gwara ha ka ha ghara ikwe ka ndị ọ bụla nara ha ala ha. Ọ bụrụ na ndị iro ha ebuso ha agha, Chineke na-enyere ha aka imeri ha. (Ndị Ikpe 11:32, 33) Ma, ezigbo Ndị Kraịst abụghị mba otú ahụ Izrel bụ, e nweghịkwa otu ebe a ga-asị na ha niile bi. Ha bi ebe dị iche iche n’ụwa. N’ihi ya, ọ bụrụ na ndị na-eso ụzọ Kraịst ndị bi n’otu mba esoro busoo mba ọzọ agha, ha ga na-alụso Ndị Kraịst ibe ha bi ná mba ahụ agha. Ị manụ na Chineke gwara ha ka ha hụ ibe ha n’anya ma nwụọrọ ha ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa.​—Matiu 5:44; Jọn 15:12, 13.

NKE ABỤỌ: Mba Izrel nwere eze a na-ahụ anya, ocheeze ya dịkwa na Jeruselem. Ma, onye na-achị ezigbo Ndị Kraịst bụ Jizọs Kraịst. Ọ bụ mmụọ dị ike, ocheeze ya dịkwa n’eluigwe. (Daniel 7:13, 14) Jizọs n’onwe ya kwuru, sị: “Alaeze m abụghị nke ụwa a. A sị na alaeze m bụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara alụ ọgụ ka a ghara inyefe m n’aka ndị Juu. Otú ọ dị, alaeze m esighị n’ebe a.” (Jọn 18:36) N’ihi ya, e nweghị alaeze ọ bụla ma ọ bụ ọchịchị ọ bụla dị n’ụwa a a ga-asị na ọ bụ nke Kraịst. Olee otú ihe a e kwuru si gbasa ‘ndị na-ejere Jizọs ozi,’ ya bụ, ndị na-eso ụzọ ya. Ihe nke atọ anyị ga-ekwu okwu na ya ugbu a ga-akọwa ya.

NKE ATỌ: N’oge ochie, mba Izrel na-ezipụ ndị na-ejere ha ozi, ma ọ bụkwanụ ndị a na-akpọ ndị nnọchiteanya taa, ka ha gaara ha ozi otú ahụ mba ndị ọzọ na-emekwa. (2 Ndị Eze 18:13-15; Luk 19:12-14) Kraịst zipụkwara ndị nnọchiteanya ya ma ọ bụ ndị na-ejere ya ozi ka ha na-agara ya ozi. Ma, e nwere ihe abụọ dị iche ná ndị nke Kraịst na ndị nke mba Izrel. Nke mbụ bụ na ndị niile na-eso ụzọ Kraịst bụ ndị nnọchiteanya ya ma ọ bụ ndị na-ejere ya ozi. Ọ bụ ya mere Pọl onyeozi ji gwa Ndị Kraịst ibe ya, sị: “Anyị bụ ndị nnọchiteanya nọ n’ọnọdụ Kraịst.” (2 Ndị Kọrịnt 5:20) Ebe ha bụ ndị nnọchiteanya na-eme udo, ha alụghị agha ọ bụla. Nke abụọ bụ na ndị na-eso ụzọ Jizọs ziri ndị niile nwere mmasị ige ha ntị ozi ha ji bịakwute ha. Jizọs sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile.” (Matiu 24:14) O kwukwara, sị: “Ya mere, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. . . . Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu.”​—Matiu 28:19, 20.

Ma, nke ọjọọ ya bụ na ọ bụghị mgbe niile ka a na-ege ndị na-ejere Jizọs ozi ntị. Ọ bụ ya mere Pọl ji gwa otu Onye Kraịst na-ezisa ozi ọma, aha ya bụ Timoti, sị: “Dị ka ezi onye agha nke Kraịst Jizọs, kere òkè nke gị n’ịhụju anya.” (2 Timoti 2:3) Agha Timoti lụrụ bụ agha ime mmụọ, ngwá agha o jikwa lụọ ya bụ ngwá agha ime mmụọ. Otu n’ime ihe ndị so ná ngwá agha ya bụ Okwu Chineke, bụ́ nke Pọl kpọrọ “mma agha nke mmụọ nsọ.”​—Ndị Efesọs 6:11-17.

Ihe Mere Chineke Ji Jiri Ọgbakọ Ndị Kraịst Dochie Anya Mba Izrel

Chineke na mba Izrel dị ka nnu na mmanụ ruo ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ ise. Ihe mere ha ji dịrị ná mma bụ na ya na ha gbara ndụ. (Ọpụpụ 19:5) Mozis bụ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ahụ. Chineke nyere ha Iwu Iri na iwu ndị ọzọ. Ihe mere o ji nye ha iwu ndị ahụ bụ ka o nyere ha aka ịkpa àgwà dị mma nakwa ka ha nwee ike ife ya otú ọ chọrọ. (Ọpụpụ 19:3, 7, 9; 20:1-17) Ma, ọ dị mwute ikwu na mba Izrel nupụụrụ Chineke isi, nke na ha gburu ụfọdụ ndị amụma ya.​—2 Ihe E Mere 36:15, 16; Luk 11:47, 48.

N’ikpeazụ, Jehova zitere Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst n’ụwa, a mụọ ya n’Izrel. Kama ụmụ Izrel ga-anabata Mesaya a Chineke ziteere ha, ha jụrụ ya. Ọ bụ ya mere Chineke ji kwụsị ọgbụgba ndụ ya na ha gbara kemgbe. Chineke wepụkwara ihe e nwere ike ịsị na ọ bụ mgbidi nke kewapụrụ ndị Juu n’ebe ndị na-abụghị ndị Juu nọ.a (Ndị Efesọs 2:13-18; Ndị Kọlọsi 2:14) Ọ bụkwa n’oge ahụ ka Chineke mere ka ọgbakọ Ndị Kraịst malite ịdị ma họpụta Jizọs ka ọ bụrụ Onyeisi ya. Ihe ọzọ bụ na tupu afọ 99 Oge Anyị agwụ, ndị si ná mba dị iche iche nụbatara n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Pita onyeozi, bụ́ onye Juu, kwuru, sị: “Ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu [Chineke] ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.”​—Ọrụ 10:35.

Ndịàmà Jehova na-agbalị ịdị ka Ndị Kraịst oge ochie. Ọ bụ ya mere ha ji ekwusa ozi ọma ebe niile. Ha anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụkwanụ soro na-alụ agha mba dị iche iche na-alụ. (Matiu 26:52; Ọrụ 5:42) N’eziokwu, ha anaghị ekwe ka ihe ọ bụla gbochie ha ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ihi na Alaeze Chineke bụ naanị ọchịchị ga-ekpochapụ ihe ọjọọ n’ụwa a ma mee ka udo dịrị ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụ ihe ọma a Chineke ga-emere ụmụ mmadụ n’ọdịnihu ka Pọl onyeozi bu n’uche kwuo, sị: “Dị ka ndị nọ n’ọnọdụ Kraịst, anyị na-arịọ, sị: ‘Meenụ ka unu na Chineke dị ná mma.’” (2 Ndị Kọrịnt 5:20) Taa, anyị kwesịrị ime ihe a Pọl kwuru ngwa ngwa n’ihi na ọ fọrọ obere ka ‘oge ikpeazụ’ nke ụwa a Setan na-achị gwụ.​—2 Timoti 3:1-5.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a N’oge ochie, a kpọhaala mmadụ “onye Juu” a ma na o si ebo Juda n’Izrel. Ma, ka oge na-aga, a malitere ịkpọ onye ọ bụla bụ́ onye Izrel onye Juu.​—Ezra 4:12.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

● Olee àgwà Ndị Kraịst kwesịrị ịna-akpaso ibe ha?​—Jọn 13:34, 35.

● Olee “ngwá agha” kacha ngwá agha ezigbo Ndị Kraịst ji alụ agha?​—Ndị Efesọs 6:17.

● Olee ozi dị mkpa ndị na-anọchite anya Kraịst na-ezi ndị mmadụ?​—Matiu 24:14; 2 Ndị Kọrịnt 5:20.

[Foto dị na peeji nke 31]

Ndịàmà Jehova nọ ná mba dị iche iche, ha anaghịkwa etinye aka n’agha ndị a na-alụ taa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya