Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 5/14 p. 4-5
  • Ihe Ị Ga-eme ma A Dụọ Gị Ọdụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ị Ga-eme ma A Dụọ Gị Ọdụ
  • Teta!—2014
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE MERE O JI ESI IKE
  • Ịdọ Aka ná Ntị Na-egosi na Jehova Hụrụ Anyị n’Anya
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
  • Kụziere Nwa Gị Ịna-edi Ihe
    Teta!—2019
  • 6 Na-agbazi Ụmụ Gị
    Teta!—2018
  • Kụziere Ụmụ Gị Ịdị Umeala n’Obi
    Teta!—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2014
g 5/14 p. 4-5
A young man receiving correction from an older man

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | NDỊ NA-ETO ETO

Ihe Ị Ga-eme ma A Dụọ Gị Ọdụ

IHE MERE O JI ESI IKE

Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asaa aha ya bụ Amakaa kwuru, sị: “Mgbe mmadụ na-enye gị ndụmọdụ, ọ pụtara na onye ahụ na-agwa gị na ihe ị na-eme adịghị mma. Ahụtụbeghịkwa m onye sịrị na obi na-adị ya mma ma a gwa ya na ihe ọ na-eme adịghị mma.”

Ebe e si enye ndị na-anya ụgbọelu ntụziaka ka ha ghara ịkụ ibe ha

Onye na-ajụ ndụmọdụ e nyere ya dị ka ọkwọ ụgbọelu na-eleghara ntụziaka a na-enye ya anya. Ị manụ na o nwere ike ịba na nsogbu.

Obi ọ̀ na-ajọ gị njọ ma mama gị na papa gị ma ọ bụ ndị nkụzi unu ma ọ bụkwanụ ndị ọzọ baara gị mba? Ọ bụrụ na ọ na-ewe gị iwe ma a baara gị mba, isiokwu a ga-enyere gị aka.

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

E nweghị onye a na-ekwesịghị ịdụ ọdụ.

“Anyị niile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro.”—Jems 3:2.

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Nnenna kwuru, sị: “Mmadụ ekwesịghị imewe ihere ma a baara ya mba mgbe o mere ihe na-adịghị mma.”

A dọọ gị aka ná ntị, ọ pụtaghị na ị bụ ajọ mmadụ.

“Onye Jehovab hụrụ n’anya ka ọ na-abara mba, ọbụna dị ka nna si abara nwa ya nke ihe ya dị ya mma mba.”—Ilu 3:12.

Nwa agbọghọ aha ya bụ Chidịmma sịrị: “Ọ bụrụ na mmadụ dụọ m ọdụ, ihe m na-eche bụ na ihe mere onye ahụ ji kata obi gwa m ihe ahụ bụ na ọ hụrụ m n’anya.”

Ịnara ndụmọdụ ga-eme ka ị kpawa ezigbo àgwà.

‘Nụrụ ịdọ aka ná ntị wee mara ihe.’—Ilu 8:33.

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Urunwa kwuru, sị: “Ndụmọdụ so n’ihe na-enyere onye na-eto eto aka ịghọ mmadụ. Ọ na-enyere onye na-eto eto aka ịmata otú ndị ọzọ si ele ya anya, nyekwara ya aka ịkwụsị àgwà ọjọọ ọ na-amaghị na ya akpawala.”

IHE I NWERE IKE IME

Ewela iwe. E nwere ike obi agaghị adị gị mma ma a dụwa gị ọdụ, ma gbalịa ka ị ghara iwe iwe. Gịnị ga-enyere gị aka? Were ya na ị na-adụ nwanne gị nke obere ọdụ. Ì chere na ihe ị na-agwa ya ga-abara ya uru? Ugbu a, ọ bụ gị ka a na-adụ ọdụ. Ihe onye ahụ gwara gị ga-abara gị uru.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ekliziastis 7:9.

Nwa agbọghọ aha ya bụ Ogechi sịrị: “Oge ụfọdụ, iwe nwere ike iwe gị ma a gwa gị na ihe i mere adịghị mma. Ọ ga-emezi ka i chefuo na onye ahụ achọghị ịkpasu gị iwe kama ọ chọrọ ka ị kpawa ezigbo àgwà.”

Dị umeala n’obi. Ekwela ka nganga mee ka ị jụ ndụmọdụ e nyere gị. Ma, adala mbà n’ihi na a gwara gị na e nwere ihe ị na-emetaghị. Ị ga-egosi na ị dịghị mpako ma ọ bụrụ na ị jụghị ndụmọdụ ahụ ma ọ bụkwanụ daa mbà. Cheta na mba a baara gị, ya ewee gị ezigbo iwe nwere ike ịbụ ya ga-aka abara gị uru. Ọ bụrụ na ị jụ ya, o nwere ike ịbụ na ị jụrụ ihe ga-enyere gị aka ịghọ mmadụ.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 16:18.

Mba a baara gị, ya ewee gị ezigbo iwe nwere ike ịbụ ya ga-aka abara gị uru

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Ugomma kwuru, sị: “Onye chọrọ ịghọ mmadụ ekwesịghị ịna-ajụ ndụmọdụ. Ọ bụrụ na anyị ajụ ya, anyị agaghị erite uru. Anyị nwedịrị ike ime ihe anyị ga-emecha kwaara mmakwaara.”

Kelee onye dụrụ gị ọdụ. Ọ sọgodị ya ya bụrụ na ihe onye ahụ gwara gị were gị iwe, kelee ya. O doro anya na onye ahụ buuru gị ihe ọma n’obi, chọọkwa inyere gị aka.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Abụ Ọma 141:5.

Nwa agbọghọ aha ya bụ Chizọba kwuru, sị: “Ọ bụghị ihe ọjọọ ma i kelee onye baara gị mba, karịchaa ma ọ gwa gị ihe ga-abara gị uru. Ọ bụrụgodị na ihe o kwuru agbasaghị gị, kelee ya maka na ọ katara obi bịa gwa gị ihe ahụ.”

a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

b Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

  • “Adịla ngwa ná mmụọ gị ịbụ onye a kpasuru iwe.”—Ekliziastis 7:9.

  • “Nganga na-abịa tupu nkụpịa.”—Ilu 16:18.

  • “Ọ bụrụ na onye ezi omume etie m ihe [ya bụ, nye m ndụmọdụ], ọ ga-abụ obiọma.”—Abụ Ọma 141:5.

Justin

“Obi anaghị adị m mma ma a baara m mba, ma m na-echeta na onye ahụ chọrọ ka ihe dịrị m mma. M na-ewere onye ahụ ka enyi m.”​—JUSTIN

Charlette

“Ama m na e nwere ihe ndị m na-agaghị na-emeta, n’ihi ya, iwe anaghị ewe m ma mmadụ gwa m ihe m na-emetaghị. Ọ na-eme ka m mara ebe m ga-emekwu nke ọma.”​—CHARLETTE

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya