Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • sp p. 30-31
  • Ụwa nke Bụ Paradaịs

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụwa nke Bụ Paradaịs
  • Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • E Kwere Nkwa Ndụ Ka Mma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ndị Enyi Chineke Ga-Ebi Na Paradaịs
    Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!
  • Ezi Okpukpe Pụrụ Ịbara Gị Uru Ruo Mgbe Ebighị Ebi!
    Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?
  • Ndụ Otú Ọ Ga-adị n’Ime Paradaịs A Ga-eweghachi
    Teta!—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?
sp p. 30-31

Ụwa nke Bụ Paradaịs

Jehova ga-emeghasịcha ihe ọjọọ nile Setan meworo. Jehova emewo ka Jisọs bụrụ Eze n’elu ala dum. N’okpuru ọchịchị ya, a ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs.​—Daniel 7:​13, 14; Luk 23:43.

Jehova kwere nkwa ihe ndị a:

ỤBA NKE IHE ORIRI: “Ala emewo ihe omume ya: Chineke, bụ́ Chineke anyị, ga-agọzi anyị.” “Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile.”​—Abụ Ọma 67:6; 72:16.

AGHA AGAGHỊ ADỊKWA: “Jeenụ, hụ ọrụ nile nke Jehova, onye doworo ihe ijuanya dị iche iche n’ụwa, na-eme ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa.”​—Abụ Ọma 46:​8, 9.

NDỊ ỌJỌỌ AGAGHỊ ADỊKWA: “N’ihi na a ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ . . . ma ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa: ị ga-elekwasịkwa ọnọdụ ya anya, ma ọ gaghị anọ.”​—Abụ Ọma 37:​9, 10.

ỌRỊA, IRU ÚJÚ, MA Ọ BỤ ỌNWỤ AGAGHỊ ADỊKWA: “Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì, ọ bụkwa ntị nke ndị ntị chiri ka a ga-emeghe. Mgbe ahụ ka onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ.”​—Aịsaịa 35:​5, 6.

“Chineke onwe ya ga-anọnyekwara ha, bụrụkwa Chineke ha: ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”​—Mkpughe 21:​3, 4.

N’adịghị ka Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya, Jehova adịghị ekwu okwu ụgha ma ọlị. Ihe ọ bụla o kwere ná nkwa aghaghị imezu. (Luk 1:​36, 37) Jehova hụrụ gị n’anya, chọọkwa ka ị dịrị ndụ n’ime Paradaịs ahụ nke ọ gaje ime. Ya mere, jekwuru Ndịàmà Jehova ka ị mụtakwuo ihe banyere eziokwu ndị dị ebube a na-achọta n’ime Okwu Chineke. Ọ bụrụ na i tinye eziokwu ahụ ná ndụ gị, a ga-atọhapụ gị site n’agbụ nke okwu ụgha, nkwenkwe ndị na-enweghị isi, na amaghị ihe. Mgbe oge ya ruru, a ga-anapụta gị ọbụna site n’agbụ nke mmehie na ọnwụ. Dị ka Jisọs kwuru: “Unu ga-amarakwa eziokwu, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu.”​—Jọn 8:32.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya