Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • gf ihe ọmụmụ 5 p. 8-9
  • Ndị Enyi Chineke Ga-Ebi Na Paradaịs

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Enyi Chineke Ga-Ebi Na Paradaịs
  • Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • E Kwere Nkwa Ndụ Ka Mma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Paradaịs
    Teta!—2013
  • “Anyị Ga-ahụ na Paradaịs!”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Ụwa nke Bụ Paradaịs
    Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!
gf ihe ọmụmụ 5 p. 8-9

IHE ỌMỤMỤ NKE 5

Ndị Enyi Chineke Ga-ebi Na Paradaịs

Paradaịs agaghị adị ka ụwa anyị bi n’ime ya ugbu a. Ọ dịghị mgbe Chineke chọrọ ka ụwa jupụta ná nsogbu na mwute, ihe mgbu na ahụhụ. N’ọdịnihu, Chineke ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs. Olee otú Paradaịs ga-adị? Ka anyị lee ihe Bible kwuru:

Ebe a na-eme mkpapụ na paradaịs

Ndị ezi mmadụ. Paradaịs ga-abụ ebe obibi nke ndị enyi Chineke. Ha ga na-emere ibe ha ihe ọma. Ha ga na-ebi ndụ dị ka ụzọ ezi omume nke Chineke si dị.—Ilu 2:21.

Ụbara ihe oriri. N’ime Paradaịs, agụụ agaghị adị. Bible na-ekwu, sị: “Ka ọtụtụ ọka [ma ọ bụ, ihe oriri] dị n’ala n’elu ugwu nile.”—Abụ Ọma 72:16.

Ebe ndị mmadụ na-arụ ụlọ na paradaịs, ndị ọzọ a na-ewere nri, nakwa ebe otu nne kpụ nwa ya nwanyị n’aka

Ụlọ ndị mara mma na ọrụ na-enye obi ụtọ. N’ụwa Paradaịs, ezinụlọ ọ bụla ga-enwe ebe obibi nke ya. Onye ọ bụla ga na-arụ ọrụ na-eweta ezi obi ụtọ.—Aịsaịa 65:21-23.

Udo n’ụwa nile. Ndị mmadụ agakwaghị na-alụ agha ma na-anwụ na ya. Okwu Chineke na-ekwu, sị: “[Chineke] na-eme ka agha nile kwụsị.”—Abụ Ọma 46:8, 9.

Ezi ahụ ike. Bible na-ekwe nkwa, sị: “Onye obibi [nke Paradaịs] agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” (Aịsaịa 33:24) Ọzọkwa, ọ dịghị onye ga-ada ngwụrọ ma ọ bụ kpuo ìsì ma ọ bụ bụrụ onye ntị chiri ma ọ bụ onye na-apụghị ikwu okwu.—Aịsaịa 35:5, 6.

Ọgwụgwụ nke ihe mgbu, mwute, na ọnwụ. Okwu Chineke na-ekwu, sị: “Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”—Mkpughe 21:4.

A ga-ekpochapụ ndị ọjọọ. Jehova na-ekwe nkwa, sị: “Ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-efopụ na ya.”—Ilu 2:22.

Ndị mmadụ ga-ahụ ibe ha n’anya ma kwanyere ha ùgwù. A gakwaghị enwe ikpe na-ezighị ezi, mmegbu, anyaukwu, na ịkpọasị. Ndị mmadụ ga-adị n’otu ma bie ndụ kwekọrọ n’ụzọ ezi omume nke Chineke.—Aịsaịa 26:9.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya