E Kwere Nkwa Ndụ Ka Mma
Ị̀GA-ACHỌ inwere onwe gị pụọ ná nsogbu ndị na-eme ka ndụ sie ike? Ị̀ chọrọ ibi n’ụwa ebe ndụ dị ụtọ dị ka ọ dị na foto e sepụtara n’ihu na n’azụ magazin a? Leruo ihe osise ahụ anya. Ndị mmadụ nwere ọtụtụ ihe iri. N’ezie nri ahụ dị ụtọ ga-atọgbu ha atọgbu. Obi dị onye ọ bụla ụtọ. Ndị sitere n’agbụrụ dị iche iche nọ n’udo ha na ibe ha. Ọbụna ụmụ anụmanụ nọ n’udo! Ọ dịghị onye na-alụ ọgụ. Ọ dịghị onye dara ogbenye. Ọ dịghị onye nọ n’ọrịa. E nwere gburugburu ebe obibi ndị mara mma, osisi ndị mara mma, na mmiri dị ọcha dịkwa mma. Lee ọmarịcha ọnọdụ nke ahụ bụ!
Ọ̀ dị mgbe ụwa a ga-adị otú ahụ? Ee, ọ ga-aghọ paradaịs. (Luk 23:43) Chineke, onye kere ụwa, ezubewo na ụmụ mmadụ ga-anụ ụtọ ndụ ka mma n’ụwa paradaịs. Ị pụkwara ịnọ n’ebe ahụ!
Olee Ndụ nke Ị Ga-ahọrọ?
Olee otú Paradaịs elu ala ahụ dị n’ihu ga-esi dị iche pụọ n’ụwa nke anyị bi n’ime ya ugbu a? Ka ọ dị ugbu a, ihe karịrị otu ijeri mmadụ na-anọ agụụ kwa ụbọchị. Ma n’ime Paradaịs ahụ Chineke zubeworo maka ụwa, onye ọ bụla ga-enwe ọtụtụ ihe iri. Bible na-ekwe nkwa, sị: “Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-emere ndị nile dị iche iche oké oriri nke ihe mara abụba, bụ́ oké oriri nke ezi mmanya vine doro edo.” (Aịsaịa 25:6) A gaghị enwe ụkọ ihe oriri, n’ihi na Bible na-asị: “Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile.”—Abụ Ọma 72:16.
Taa, ọtụtụ ndị na-ebi n’ụlọ na-adịghị mma na n’ógbè ndị jupụtara ná nkịkara ụlọ, ma ọ bụ ha na-adọlịsi ike ịkwụ ụgwọ ụlọ ha. Ndị ọzọ enweghị ebe obibi ma na-ehi n’okporo ámá. Dị ka Òtù Ahụ Ike Ụwa na-ekwu, ihe ruru 100 nde ụmụaka nọ n’ụwa enweghị ebe obibi. Ma n’ime Paradaịs ahụ gaje ịbịa, onye ọ bụla ga-enwe ụlọ nke aka ya. Okwu Chineke na-asị: “Ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akụkwa ubi vine, rie mkpụrụ ha.”—Aịsaịa 65:21.
Ọtụtụ ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ na-adịghị amasị ha. Ọtụtụ mgbe ha na-arụsi ọrụ ike ogologo oge ma na-enweta ihe dị nta ná nkwụghachi. Ihe dị ka 1 onye n’ime mmadụ 5 n’ụwa na-eji ihe na-erughị $500 ebi ndụ kwa afọ. Ma, n’ime Paradaịs ahụ na-abịanụ, ndị mmadụ ga-anụ ụtọ ọrụ ha ma hụ ezi ihe na-esite na ya. Chineke na-ekwe nkwa: “Ndị M họpụtaworo ga-enwekwa ihe aka ha rụtara mgbe dị anya nke ukwuu. Ha agaghị adọgbu onwe ha n’ọrụ n’efu.”—Aịsaịa 65:22, 23.
Ugbu a ọrịa na nrịanrịa juru ebe nile. Ọtụtụ ndị kpuru ìsì. Ntị chiri ụfọdụ. Ndị ọzọ apụghị ije ije. Ma n’ime Paradaịs, ndị mmadụ ga-enwere onwe ha pụọ n’ọrịa na nrịanrịa. Jehova na-asị: “Onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” (Aịsaịa 33:24) Banyere ndị nweworo nkwarụ, e nwere nkwa a na-ekpo obi ọkụ: “Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì, ọ bụkwa ntị nke ndị ntị chiri ka a ga-emeghe. Mgbe ahụ ka onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ.”—Aịsaịa 35:5, 6.
Ka ọ dị ugbu a, e nwere ahụhụ na ihe mgbu, iru újú na ọnwụ. Ma n’ime Paradaịs ahụ n’elu ụwa, ihe a nile agaghị adị. Ee, ọbụna ọnwụ agaghị adịkwa! Bible na-asị: “Chineke Onwe ya ga-anọnyekwara ha, bụrụkwa Chineke ha: Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”—Mkpughe 21:3, 4.
Ya mere, n’ụzọ doro anya, Paradaịs elu ụwa nke Jehova kwere nkwa ya ga-abụrụ ihe a kpọrọ mmadụ ndụ ka mma. Ma olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na ọ ga-abịa? Olee mgbe ọ ga-abịa, n’ụzọ dịkwa aṅaa? Gịnị ka ị na-aghaghị ime iji nọrọ n’ebe ahụ?