Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • T-19 p. 2-6
  • Ụwa nke A Ọ̀ Ga-alanarị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụwa nke A Ọ̀ Ga-alanarị?
  • Ụwa nke A Ọ̀ Ga-alanarị?
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otu Ụwa Agwụ—Ọzọ Anọchie Ya
  • Ọdịnihu nke Ụwa A
  • “Ihe Ịrịba Ama”
  • “Ọgwụgwụ Ụwa” Ọ̀ Dị Nso?
    Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
  • Mmiri Ebibie Otu Ụwa—Ọ̀ Ga-eme Ọzọ?
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Olee Mgbe Mbibi Ụwa E Buru Amụma Ya Ga-abịa?
    Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
  • Ịnọ Na Nche Anyị Adịkwuo Ngwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụwa nke A Ọ̀ Ga-alanarị?
T-19 p. 2-6

Ụwa nke A Ọ̀ Ga-alanarị?

Ọ dịbeghị ọgbọ ọzọ nụworo nnọọ ọtụtụ okwu banyere ọgwụgwụ nke ụwa ka ọgbọ anyị. Ọtụtụ ndị na-atụ egwu na ụwa ga-abịa n’ọgwụgwụ ya n’oké mgbukpọ nke a ga-eji ngwá agha nuklia mee. Ndị ọzọ na-atụ egwu na mmetọ pụrụ ibibi ụwa. Ndị ọzọ kwa na-echegbu onwe ha na ọnọdụ ọjọọ nke akụ̀ na ụba ga-eme ka ụmụ mmadụ bilie imegiderịta onwe ha.

Ụwa nke a ọ̀ pụrụ ịgwụ n’ezie? Ọ bụrụ na ọ gwụ, gịnị ka ọ ga-apụta? Ọ̀ dịtụwo mgbe ụwa gwụrụ?

Otu Ụwa Agwụ—Ọzọ Anọchie Ya

Ee, otu ụwa gwụrụ. Tụlee ihe banyere ụwa ahụ nke jupụtara n’ajọ omume n’ụbọchị Noa. Bible na-akọwa, sị: “Ụwa nke dị n’oge ahụ [lara] n’iyi, n’ihi na iju mmiri gbara ya.” Bible na-ekwukwa, sị: “[Chineke emereghị] ụwa ochie ebere, kama ọ bụ Noa, onye mere ha asatọ, bụ́ onye na-ekwusa ezi omume, ka O chere, mgbe O mere ka iju mmiri bịakwasị ụwa nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.”—2 Pita 2:5; 3:6.

Rịba ama ihe ọgwụgwụ nke ụwa ahụ pụtara na ihe ọ na-apụtaghị. Ọ pụtaghị ọgwụgwụ nke ihe a kpọrọ mmadụ. Noa na ezinụlọ ya lanarịrị Iju Mmiri ahụ zuru ụwa ọnụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa mbara Ụwa na eluigwe mara mma nke jupụtara na kpakpando. Ọ bụ “ụwa nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke” lara n’iyi, ajọ usoro ihe.

Mgbe e mesịrị, ka ụmụ Noa na-aba ụba, ụwa ọzọ malitere. Ụwa, ma ọ bụ usoro ihe nke abụọ ahụ, adịwo ruo ụbọchị anyị. Agha, mpụ, na ime ihe ike, ejupụtawo n’akụkọ ihe mere eme ya. Gịnị ga-eme ụwa a? Ọ̀ ga-alanarị?

Ọdịnihu nke Ụwa A

Mgbe o kwusịrị na e bibiri ụwa nke ụbọchị Noa, ihe ndekọ Bible ahụ gara n’ihu ịsị: “Eluigwe nke dị ugbu a, ha na ụwa, ka a kpadoworo nye ọkụ site n’otu okwu ahụ.” (2 Pita 3:7) N’ezie, dị ka onye ọzọ so dee Bible na-akọwa: “Ụwa [nke dị ugbu a] na-agabigakwa.”—1 Jọn 2:17.

Bible adịghị ekwu na ụwa na eluigwe nkịtị nke jupụtara na kpakpando ga-agabiga, dịkwa ka ha na-agabigaghị n’ụbọchị Noa. (Abụ Ọma 104:5) Kama nke ahụ, ụwa a ya na “eluigwe” ya, ma ọ bụ ndị ọchịchị gọọmenti nọ n’okpuru ike Setan, na “ụwa,” ma ọ bụ ọha mmadu ya, ka a ga-ebibi dị ka à ga-asị na e ji ọkụ bibie ha. (Jọn 14:30; 2 Ndị Kọrint 4:4) Ụwa, ma ọ bụ usoro ihe nke a, ga-alarịrị n’iyi dị nnọọ ka ụwa ahụ e nwere tupu Iju Mmiri ahụ lara. Ọbụna Jisọs Kraịst kwuru okwu banyere ọnọdụ ahụ dị ‘n’ụbọchị Noa’ dị ka ihe atụ nke ihe ga-eme kpọmkwem tupu ọgwụgwụ ụwa a.—Matiu 24:37-39.

N’ụzọ dị ịrịba ama, mgbe Jisọs kwuru okwu banyere ụbọchị Noa, ọ bụ ná nzaghachi nke ajụjụ ndị ozi ya jụrụ: “Gịnị ga-abụ ihe ịrịba ama nke ọbịbịa gị, na nke ọgwụgwụ ụwa?” (Matiu 24:3, King James Version) Ụmụazụ Jisọs maara na ụwa a ga-agwụsị. Ihe a ha tụrụ anya ya ò mere ka ha tụọ egwu?

N’ụzọ megidere nke ahụ, mgbe Jisọs kọwara ihe ndị ga-eme tupu ọgwụgwụ ụwa, ọ gbara ha ume ịṅụrị ọṅụ ‘n’ihi na mgbapụta ha na-eru nso.’ (Luk 21:28) Ee, mgbapụta pụọ n’aka Setan na ajọ usoro ihe ya baa n’ime ụwa ọhụrụ nke udo!—2 Pita 3:13.

Ma olee mgbe ụwa a ga-abịa n’ọgwụgwụ ya? “Ihe ịrịba ama” dị aṅaa ka Jisọs nyere banyere ‘ọbịbịa ya, na ọgwụgwụ nke ụwa’?

“Ihe Ịrịba Ama”

Okwu Grik a sụgharịrị n’ebe a ịbụ “ọbịbịa” bụ pa·rou·siʹa, ọ pụtakwara “ọnụnọ,” ya bụ, ịnọ ya n’ezie. Ya mere, mgbe a hụrụ “ihe ịrịba ama” ahụ, ọ gaghị apụta na Kraịst ga-abịa n’isi nso kama na ọ lọghachiworị, nọrọkwa anọrọ. Ọ ga-apụta na ọ malitewo ịchị achị n’ụzọ a na-adịghị ahụ anya dị ka eze nke eluigwe, nakwa na ọ ga-eme ka ndị iro ya gwụsịa n’isi nso.—Mkpughe 12:7-12; Abụ Ọma 110:1, 2.

Jisọs enyeghị nanị otu ihe ga-emenụ dị ka “ihe ịrịba ama.” Ọ kọwara ọtụtụ ihe ga-eme n’ụwa na ọnọdụ ndị ga-adị na ya. Ihe ndị a nile ga-eme n’oge ahụ ndị dere Bible kpọrọ “mgbe ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1-5; 2 Pita 3:3, 4) Tụlee ụfọdụ n’ime ihe ndị Jisọs buru n’amụma a ga-eji mara “mgbe ikpeazụ.”

“Mba ga-ebili imegide mba ọzọ, alaeze ga-ebilikwa imegide alaeze ọzọ.” (Matiu 24:7) A lụwo ọtụtụ agha n’oge a karịa otú a lụrụ mgbe ọ bụla ọzọ. Otu onye ọkọ akụkọ ihe mere eme kwuru, sị: “Agha Ụwa Mbụ [nke malitere na 1914] bụ agha mbụ ‘zuru ebe nile.’” Ma, Agha Ụwa nke Abụọ bibiri ihe n’ụzọ ka nnọọ ukwuu. Agha ka nọgidekwara na-ebibi ụwa. Ee, okwu Jisọs emezuwo n’ụzọ dị ịrịba ama!

‘Oké ụnwụ ga-adị.’ (Matiu 24:7) Mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị, e nwere ma eleghị anya ụnwụ nri kasị ukwuu n’akụkọ ihe mere eme nile. Ụnwụ nri dị egwu sochikwara Agha Ụwa nke Abụọ. Ihe otiti nke erighị ezigbo nri na-emetụta ihe ruru otu ụzọ n’ụzọ ise nke ọnụ ọgụgụ ndị nọ n’ụwa, na-egbu ihe dị ka nde ụmụaka 14 kwa afọ. N’ezie, e nwewo “oké ụnwụ”!

‘Oké ala ọma jijiji ga-adị.’ (Luk 21:11) Ná nkezi, ọnụ ọgụgụ ndị nwụworo kwa afọ n’ihi ala ọma jijiji kemgbe 1914 ejiwo ihe dị ka okpukpu iri karịa ka ọ dịworo na narị afọ ndị bu ụzọ. Tụlee nanị ole na ole bụ́ isi: 1920, China, o gburu mmadụ 200,000; 1923, Japan, mmadụ 99,300 nwụrụ na ya; 1939, Turkey, mmadụ 32,700 nwụrụ; 1970, Peru, o gburu mmadụ 66,800; na 1976, China, ihe dị ka mmadụ 240,000 (ma ọ bụ, dị ka akụkọ si n’ebe ụfọdụ na-ekwu, mmadụ 800,000) nwụrụ na ya. N’ezie, ha bụ “oké ala ọma jijiji”!

“Ajọ ọrịa na-efe efe ga-adịkwa n’ebe dị iche iche.” (Luk 21:11) Ozugbo Agha Ụwa Mbụ gasịrị, ihe dị ka nde mmadụ 21 nwụrụ n’ihi ahụ ọkụ si Spain. Akwụkwọ bụ Science Digest kọrọ sị: “N’akụkọ ihe mere eme nile e nwetụbeghị ọdachi nke ọnwụ n’ụzọ siri ike na n’ụzọ gara ngwa ngwa karịa ka e nwere ugbu a.” Kemgbe ahụ, ọrịa obi, ọrịa cancer, ọrịa AIDS, na ọtụtụ ihe otiti ndị ọzọ egbuwo ọtụtụ narị nde mmadụ.

“Ihe na-emebi iwu ga-aba ụba.” (Matiu 24:12) Kemgbe 1914, a matawo ụwa anyị dị ka nke ime mpụ na ime ihe ike. N’ọtụtụ ebe, ọ dịghị onye na-enwe mmetụta nke ịnọ ná nchebe n’okporo ámá dị iche iche ọbụna n’oge ehihie. N’abalị, ndị mmadụ na-anọ n’ime ụlọ ha a gbachiri ọnụ ụzọ ha agbachi ma tụchie ha ihe n’azụ, na-atụ egwu ịpụ n’èzí.

E buru amụma banyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ ga-eme na mgbe ikpeazụ, ihe ndị a nile na-emezukwa. Nke a pụtara na ọgwụgwụ ụwa dị nso. Ma, ọ bụ ihe obi ụtọ na a ga-enwe ndị ga-alanarị ya. Mgbe o kwusịrị na “ụwa na-agabigakwa,” Bible na-ekwe nkwa sị: “Onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:17.

Ya mere, ọ dị anyị mkpa ịmụta uche Chineke ma na-eme ya. Mgbe ahụ anyị pụrụ ịlanarị ọgwụgwụ ụwa nke a iji nweta ngọzi dị iche iche nke ụwa ọhụrụ Chineke ruo mgbe ebighị ebi. Bible na-ekwe nkwa na n’oge ahụ: “Chineke . . . ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya [ụmụ mmadụ]; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ.”—Mkpughe 21:3, 4.

Ọ gwụlakwa ma e gosịrị nsụgharị ọzọ, nhota Bible nile e mere na traktị a sitere na Bible Nsọ nke Union Version.

[Ebe E Si Nweta Ihe Osise dị na peeji nke 6]

Ebe Ndị E Si Nweta Foto: Ụgbọelu: foto USAF. Nwatakịrị: foto WHO site n’aka W. Cutting. Ala ọma jijiji: Y. Ishiyama, Mahadum Hokkaido, Japan.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya