ISI NKE IRI NA OTU
“M Ga-eji Obi M Nye Unu Ndị Ọzụzụ Atụrụ”
1, 2. (a) Olee ihe nwere ike ime ìgwè atụrụ ma ọ bụrụ na e chebeghị ha? (b) Gịnị bụ ọrụ onye ọzụzụ atụrụ n’oge Baịbụl?
E NWERE otu nwoke bi na Japan aha ya bụ Hiroyasu. Mgbe ọ bụ nwatakịrị, nne ya zụtara otu ebule na otu nne atụrụ. Ọ bụ ya na-elekọta ha. Nne atụrụ ahụ na-amụkwa ụmụ abụọ kwa afọ. N’ihi ya, atụrụ ha malitere ịmụba. Mgbe Hiroyasu dị afọ iri na abụọ, atụrụ ha eruola iri na abụọ ma ọ bụ iri na atọ. O kwuru, sị: “N’otu isi ụtụtụ mgbe m ka na-ehi ụra, anụrụ m ka ha na-ebe ubé. Agaghị m ozugbo ịmara ihe na-eme ha. Mgbe m mechara gaa, ahụrụ m ìgwè nkịta ọhịa ka ha si n’ebe ụmụ atụrụ m nọ na-agbapụ. Ha atapuola ụmụ atụrụ ahụ afọ. Achị m obi n’aka na-achọ nne ha. Ahụrụ m ya ka ọ ka na-eku ume, ma ọbara juru n’ebe ọ makpu. Atụrụ ahụ niile nwụrụ, ya afọdụ naanị ebule ahụ. Obi gbawara m. A sị na m ma, m gaara aga mara ihe na-eme ha ozugbo m nụrụ ubé ha. Ike adịghị ha ịgbanahụ nkịta ọhịa ndị ahụ.”
2 N’oge Baịbụl, ọ fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ na mmadụ niile maara ọrụ onye ọzụzụ atụrụ, nke bụ́ iduru ìgwè atụrụ ya gaa n’ebe ha ga-ata nri ma hụ na ha rijuru afọ. Ọ na-echebe ha ka anụ ọhịa ghara ịdọgbu ha. Ọ na-achọkwa ndị kpafuru akpafu. (1 Sam. 17:34-36) Onye ọzụzụ atụrụ na-edu atụrụ ya aga ebe ihe na-agaghị eme ha ka ha zuo ike. Ọ na-enyere nne atụrụ aka mgbe ọ na-amụ nwa, ma na-elekọta ụmụ atụrụ. Jeremaya mere ihe ọtụtụ ndị ọzọ so dee Baịbụl mere, ya bụ, iji onye e nyere ọrụ ilekọta ndị mmadụ tụnyere onye ọzụzụ atụrụ. O nwere ike bụrụ onye ọchịchị ma ọ bụ onye na-elekọta ndị Chineke.
3. Gịnị ka Jeremaya bu n’obi mgbe o kwuru banyere “onye ọzụzụ atụrụ” na ‘ịzụ atụrụ’?
3 Ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst nwere ike iche na ọ bụ naanị mgbe ndị okenye gara leta ụmụnna ha ka ha nyere ha aka ma gbaa ha ume ka ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ. Ma, ọ bụrụ na anyị eleruo anya n’ihe Jeremaya kwuru banyere “onye ọzụzụ atụrụ” na ‘ịzụ atụrụ,’ anyị ga-aghọta na o ji okwu ndị ahụ kọwaa ihe niile ndị na-elekọta Juda na ndị ha na-elekọta mekọrọ. Ọtụtụ mgbe, Chineke kpọrọ ndị isi, ndị amụma, na ndị nchụàjà nọ na Juda ndị ọzụzụ atụrụ ọjọọ n’ihi na ha anaghị achọ otú ihe ga-esi adịrị ndị ha na-elekọta mma. (Jere. 2:8) Ha rụsara “atụrụ” ha arụrụala, duhie ha, ma leghara ha anya n’ihi na ha na-achụ ihe ga-abara naanị onwe ha uru. Ha leghaara ndị Chineke anya, nke mere ka mmekọrịta ha na Chineke jọgbuo onwe ya. Jehova kwuru na “ahụhụ ga-adịrị” ndị ọzụzụ atụrụ adịgboroja ahụ. O mesikwara ndị ya obi ike na ya ga-enye ha ndị ọzụzụ atụrụ ga-ahụ ha n’anya, lebara ha anya ma chebe ha n’ezie.—Gụọ Jeremaya 3:15; 23:1-4.
4. Olee ndị na-elekọta ìgwè atụrụ Chineke taa, oleekwa àgwà ha nwere?
4 Nkwa ahụ Chineke kwere kacha mezuo n’isi Onyeisi Ọzụzụ Atụrụ Jehova, bụ́ Jizọs, onye ghọrọ Onyeisi nke ọgbakọ Ndị Kraịst. Ọ kpọrọ onwe ya “onye ọzụzụ atụrụ ọma,” onye gosiri ndị ọ na-edu ezi ọmịiko. (Jọn 10:11-15) Taa, ndị Jehova ji na-elekọta ìgwè atụrụ ya nọ n’ụwa bụ ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’okpuru Jizọs, ma ụmụnna e tere mmanụ, bụ́ ndị so n’ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, ma ndị okenye ji ọrụ ha kpọrọ ihe, bụ́ ndị so ‘n’oké ìgwè mmadụ.’ (Mkpu. 7:9) Ndị ọzụzụ atụrụ ndị a na-agbalịsi ike ibu mkpa ndị ọzọ n’isi otú ahụ Jizọs mere. Dị ka Kraịst, ha na-achọsi ike ịzụ ọgbakọ ma na-elekọta ya. Ahụhụ ga-adịrị onye ọ bụla n’ime ha nke leghaara ụmụnna ya anya, ma ọ bụ mee ka ọ̀ bụ ya nwe ha, ma ọ bụkwanụ jiri obi ọjọọ ma ọ bụ mpako na-emeso ha ihe! (Mat. 20:25-27; 1 Pita 5:2, 3) Olee ihe Jehova chọrọ ka Ndị Kraịst bụ́ ndị ọzụzụ atụrụ taa na-eme? Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Jeremaya dere banyere àgwà ndị okenye kwesịrị inwe nakwa ihe ha kwesịrị ibu n’obi mgbe ha na-arụ ọrụ ha? Ka anyị leba anya n’ọrụ ndị ha na-arụ, ya bụ, inyere ụmụnna ha aka, ichebe ha, ịkụzi ihe ma n’ọgbakọ ma n’èzí, nakwa ikpe ikpe.
ICHEBE ÌGWÈ ATỤRỤ CHINEKE
5-7. (a) Olee otú Jehova chọrọ ka e si na-elekọta atụrụ ya, n’ihi gịnịkwa? (b) Olee otú ndị okenye nwere ike isi gosi na ha hụrụ ụmụnna ha n’anya n’ezie, tinyere ndị nke kpafuru akpafu?
5 Pita onyeozi kpọrọ Jehova “onye ọzụzụ atụrụ na onye nlekọta nke mkpụrụ obi [anyị].” (1 Pita 2:25) Olee otú Chineke si akpaso “atụrụ” ya àgwà? Anyị ga-ahụ azịza ya ma anyị tụlee ihe mere n’oge Jeremaya. Mgbe Jehova kwuchara ihe ọjọọ ndị ọzụzụ atụrụ ọjọọ ahụ na-eme, ya bụ, ndị na-achụsa ma na-eleghara ìgwè atụrụ ya anya, o kwuru na ya ‘ga-achịkọta’ atụrụ ya ma kpọghachi ha n’ala ịta ahịhịa ha. O kwere nkwa inye ha ezi ndị ọzụzụ atụrụ, bụ́ ‘ndị ga na-azụ ha dị ka atụrụ’ ma hụ na e chebere ndị ya ka ndị iro ha bụ́ ndị anyaukwu ghara irigbu ha. (Jere. 23:3, 4) N’ezie, Jehova ji atụrụ ya kpọrọ ihe, ma n’oge ahụ ma n’oge anyị a. O ji ihe dị oké ọnụ ahịa napụta ha ka ha nweta ndụ ebighị ebi.—1 Pita 1:18, 19.
6 Ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta kwesịrị iṅomi ndị na-azụ atụrụ. Ha ekwesịghị ileghara ọgbakọ anya. Ọ bụrụ na ị bụ okenye, ị̀ na-agbalị ịchọpụta ihe ọ bụla na-egosi na ụmụnna gị na-ata ahụhụ, ị̀ dịkwa njikere inyere ha aka ozugbo? Eze Sọlọmọn maara ihe dere, sị: “I kwesịrị ịmara ọdịdị ìgwè ewu na atụrụ gị nke ọma. Mee ka obi gị dịrị n’ìgwè anụ ụlọ gị.” (Ilu 27:23) N’agbanyeghị na amaokwu ahụ na-egosi otú ndị na-azụ atụrụ si arụsi ọrụ ha ike, e nwere ike iji ya kọwaa otú ndị ọzụzụ atụrụ n’ọgbakọ si elekọta atụrụ Chineke. Ọ bụrụ na ị bụ okenye, ị̀ na-agbasi mbọ ike ịhụ na ị naghị akpa àgwà ka ọ̀ bụ gị na-achị ndị ọzọ? Okwu a Pita kwuru, nke bụ́ “ime ndị bụ́ ihe nketa nke Chineke dị ka ọ̀ bụ unu nwe ha,” gosiri na okenye nwere ike ime ụdị ihe ahụ. Olee otú i nwere ike isi nye aka ime ihe e kwuru na Jeremaya 33:12? (Gụọ ya.) Ma eleghị anya, e nwere ndị nne ma ọ bụ nna naanị ha na-azụ ụmụ, nakwa ndị inyom di ha nwụrụ, ndị agadi, na ndị na-eto eto e kwesịrị ilebara anya ma nyere aka n’ihi mkpa pụrụ iche ha nwere.
7 O nwere ike ịdị mkpa mgbe ụfọdụ ka onye ọzụzụ atụrụ n’ọgbakọ mee ihe onye na-azụ atụrụ na-emere atụrụ ya, nke bụ́ ịga chọọ ndị si n’ìgwè atụrụ Chineke kpafuo n’ihi otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ, ma nyere ha aka. Ihe ga-enyere ya aka ime otú ahụ bụ ịdị umeala n’obi na ịchọ ọdịmma nke ndị ọzọ. Ọ na-ewepụta oge ya ma jiri ndidi na-egboro ndị e nyere ya ka ọ na-elekọta mkpa ha. N’ezie, ndị okenye ọgbakọ kwesịrị ịjụ onwe ha n’eziokwu, sị: ‘Àna m agbasi mbọ ike ịgba ndị ọzọ ume na ime ka okwukwe ha sie ike, kama ịma ha ikpe na ịkatọ ha? M̀ chọrọ n’ezie imekwu nke ọma?’ Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị mkpa ka e nyere mmadụ aka ugboro ugboro ile ihe anya otú Chineke si ele ya. Ọ bụrụ na nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị achọghị ige ntị na ndụmọdụ e si n’Akwụkwọ Nsọ nye ya (nke na-abụghị ihe okenye chepụtara), cheta Jehova, bụ́ Onye Ọzụzụ Atụrụ na Onye Nlekọta Kacha Ukwuu. O ji ndidi “na-agwa” ndị ya bụ́ ndị isi ike “okwu” ma na-agbalị inyere ha aka. (Jere. 25:3-6) Ọtụtụ ndị Chineke taa anaghị eme ihe ọjọọ, ma mgbe ọ dị mkpa ka e nye ha ndụmọdụ, okenye kwesịrị inye ya otú ahụ Jehova mere.
8. Olee otú ndị ọzụzụ atụrụ n’ọgbakọ nwere ike isi ṅomie Jeremaya?
8 Jeremaya kpere ekpere maka ndị Juu ibe ya mgbe ha ka nwere ike ịlaghachikwuru Jehova. Ọ gwara Chineke, sị: “Cheta otú m si guzoro n’ihu gị kwuo ihe ọma banyere ha, iji mee ka oké iwe ị na-eweso ha dajụọ.” (Jere. 18:20) I nwere ike ịghọta na ihe ahụ Jeremaya kwuru gosiri na ọ na-agbalị ịhụ ebe ụmụnna ya na-eme nke ọma. Ọ naghị echere ha echiche ọjọọ. Taa, Ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta kwesịrị ime ihe ahụ Jeremaya mere ọ gwụkwala ma è nwere ihe doro anya gosiri na mmadụ ekpebiela na ya ga na-eme ihe ọjọọ. Ha kwesịrị ịna-aja ndị ọzọ mma, na-echeta ha n’ekpere, ha na ha ana-ekpekọkwa ekpere.—Mat. 25:21.
Olee nkwa Chineke si n’ọnụ Jeremaya kwe banyere ndị ga-azụ ndị ya dị ka atụrụ? Olee otú Ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta nwere ike isi na-echebe atụrụ Chineke?
“HA GA-EME KA UNU NWEE IHE ỌMỤMA NA NGHỌTA”
9, 10. Gịnị mere o ji bụrụ na mmadụ ịkụzi ihe nke ọma ga-eme ka ọ bụrụ ezigbo onye ọzụzụ atụrụ (ya bụ, okenye ọgbakọ)?
9 Ndị Kraịst bụ́ ndị ọzụzụ atụrụ na-eme ihe e kwuru na Jeremaya 3:15, ya bụ, ‘ime ka ndị ọzọ nwee ihe ọmụma na nghọta,’ nke pụtara na ha ga-abụ ndị nkụzi. (1 Tim. 3:2; 5:17) Jehova kwere ndị ya nkwa na ndị bụ́ ezigbo ndị ọzụzụ atụrụ ga-emere ha otú ahụ. Ọ gbakwara ndị Juu ume ka ha nabata aka ná ntị onye amụma ya bụ́ Jeremaya na-adọ ha iji kụziere ha ihe. (Gụọ Jeremaya 6:8.) Inye atụrụ nri na-eme ka ahụ́ dị ya mma. Otú ahụ ka ọ dị ndị Chineke. Ihe ga-eme ka okwukwe ha sie ike bụ iji Akwụkwọ Nsọ na-azụ ha ma na-eduzi ha.
10 A bịa n’izi ihe, ndị okenye nwere ọrụ abụọ ha na-arụ, ya bụ, inyere ndị nọ n’ọgbakọ aka nakwa inyere ndị na-aghọbeghị ezi Ndị Kraịst aka. N’ihe banyere inyere ndị na-aghọbeghị ezi Ndị Kraịst aka, cheta na otu n’ime isi ihe mere e ji nwee ọgbakọ Ndị Kraịst bụ ka a na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. N’ihi ya, ndị okenye kwesịrị iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. (Jere. 1:7-10) Ọ ga-eme ka ha rụzuo ọrụ Chineke nyere ha ma na-akpa àgwà ọma ụmụnna ha ga-eṅomi. Ọ bụrụ na ị bụ okenye, ọ̀ bụ na ị chọpụtabeghị na ọ bụrụ na gị na ụmụnna dị iche iche ana-arụ n’ozi ọma mgbe niile, ọ ga-eme ka i nyere ha aka ime ka otú ha si ezi ihe ka mma, meekwa ka otú i si ezi ihe ka mma? Mgbe i ji ịnụ ọkụ n’obi na-ebute ụzọ n’ikwusa ozi ọma, ị na-agba ụmụnna gị ezigbo ume, nke nwere ike inyere ọgbakọ aka imekwu nke ọma.
11, 12. Olee ihe okenye nke chọrọ ịbụ ezi onye ọzụzụ atụrụ kwesịrị ilebara anya?
11 Ihe ndị okenye na-akụziri ọgbakọ kwesịrị isi na Baịbụl, nke ga-eme ka ọ bụrụ nri ime mmụọ na-edozi ahụ́. N’ihi ya, i nwere ike ịghọta na ọ bụrụ na ndị ọzụzụ atụrụ n’ọgbakọ chọrọ ịna-akụzi ihe nke ọma, ha kwesịrị ịna-amụsi Okwu Chineke ike. Jiri ya tụnyere ihe Jeremaya kwuru mere ndị na-edu ndị obodo ya ji ghara ịrụ ọrụ ha nke ọma. O kwuru, sị: “Ndị na-azụ atụrụ emewo ihe n’echeghị echiche, ha achọghị Jehova. Ọ bụ ya mere ha ejighị nghọta mee ihe, a chụsasịwokwa anụmanụ ha niile ndị nọ n’ebe ịta ahịhịa.” (Jere. 10:21) Ndị kwesịrị ịbụ ndị nkụzi emeghị ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru. Ha achọghịkwa Chineke. N’ihi ya, omume ha gosiri na ha enweghị ezi amamihe. Ihe Jeremaya kwusara a ga-eme ndị amụma ụgha kadị njọ.—Gụọ Jeremaya 14:14, 15.
12 Ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta adịghị ka ndị ọzụzụ atụrụ ụgha ahụ, n’ihi na ha na-amụ ihe Jizọs mere ma na-eṅomi ya. Ọ bụ ya mere ha ji bụrụ ndị ọzụzụ atụrụ na-eji amamihe elekọta ìgwè atụrụ Chineke. O nwere ike ịna-esiri ha ike iwepụta oge ha ga-eji na-amụ ihe mgbe niile, n’ihi ihe dị iche iche ha kwesịrị iji oge ha na-eme, nakwa ihe ndị ha kwesịrị ilebara anya. Ma, ọ bụrụ na ị bụ okenye, ì kwenyesiri ike na naanị ihe ga-eme ka ndụmọdụ i nyere baa uru ma zie ezi, gosikwa na i nwere amamihe na nghọta, bụ mgbe o si n’Okwu Chineke nakwa ná ntụziaka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche? Ọ bụrụ na ị chọpụta na ị naghịzi amụ ihe otú ị na-amụbu, olee ihe ị ga-eme ka ị ghara ịkpa àgwà ka ndị ọzụzụ atụrụ ụgha ndị ahụ e nwere n’oge Jeremaya?
13. Olee ihe nyeere Jeremaya aka izi ihe nke ọma, oleekwa ihe Ndị Kraịst bụ́ ndị ọzụzụ atụrụ taa nwere ike ịmụta n’aka ya?
13 Ihe kacha mee ka Jeremaya zie ihe nke ọma bụ na ọ na-eji ihe atụ ezi ihe. N’ezie, ọ bụ Jehova ziri ya ihe. O doro anya na o nweghị mgbe ndị mmadụ chefuru ite ụrọ ahụ ha hụrụ ọ kụwara ma kwuo na ọ bụ otú ahụ ka a ga-esi kụọ Jeruselem na ndị ya righirighi! (Jere. 19:1, 10, 11) Ihe atụ ọzọ bụ na Jeremaya mere yok osisi ma nyara ya n’olu iji gosi na ndị Babịlọn ga-achị ndị obodo ya ọchịchị nchịgbu. (Jere., isi nke 27-28) Chineke agwaghị ndị okenye ọgbakọ unu ka ha na-eme ụdị ihe ahụ Jeremaya mere iji mee ka a ghọta ihe ha na-ekwu. Ma, obi ọ́ naghị atọ gị ụtọ ma ọ bụrụ na ha ewebata ihe atụ ndị dabara adaba na akụkọ ndị mere eme mgbe ha na-ezi ihe? Ọ bụrụ na mmadụ echee echiche nke ọma nye ihe atụ ndị dabara adaba, o nwere ike ịkpa ike ma ruo ndị ọzọ n’obi.
14. (a) Gịnị mere Jeremaya ji kwuo banyere ‘mmanụ bọlsọm dị na Gilied’? (b) Olee otú ndị okenye nwere ike isi mee ka ahụ́ sie ụmụnna ha ike n’ụzọ ime mmụọ?
14 Obi kwesịrị ịdị anyị ụtọ n’ihi ihe Ndị Kraịst bụ́ ndị ọzụzụ atụrụ na-akụziri anyị! N’oge Jeremaya, ọ ghọtara na e kwesịrị ịgwọ ndị obodo ya ọrịa ime mmụọ ha na-arịa. Ọ jụrụ, sị: “Ọ̀ bụ na mmanụ bọlsọm adịghị na Gilied? Ka ọ̀ bụ na e nweghị onye na-agwọ ọrịa na ya?” (Jere. 8:22) Na Gilied, bụ́ obodo Izrel nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Jọdan, e nwere mmanụ a na-akpọ bọlsọm. N’oge ochie, a ma mmanụ ahụ na-esi ísì ụtọ nke a na-enweta n’osisi ama n’ihi na ọ bụ ọgwụ, nke a na-etekarị n’ọnyá iji mee ka ụfụ ya belata, meekwa ka ọ laa. Ma, a gwọghị ọrịa ime mmụọ ha na-arịa. N’ihi gịnị? Jeremaya kwuru, sị: “Ndị amụma na-ebu amụma ụgha; ndị nchụàjà na-eji ike ha emegbu ndị mmadụ. Ma ọ dị ndị m mma otú ahụ.” (Jere. 5:31) Oleekwanụ maka oge anyị a? Ọ̀ bụ na i kweghị na e nwere ‘mmanụ bọlsọm na Gilied,’ ya bụ, n’ọgbakọ unu? Anyị nwere ike iji mmanụ bọlsọm a na-ete n’ọnyá tụnyere otú ndị okenye si akasi ụmụnna ha obi, na-agwa ha ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru, na-agba ha ume ma na-echeta ha n’ekpere, ha na ha ana-ekpekọkwa ekpere.—Jems 5: 14, 15.
Olee ihe ụfọdụ na-atọ gị ụtọ n’otú ndị okenye ọgbakọ unu si akụzi ihe? Gịnị na-eme ka ha na-ezi ihe nke ọma?
“NKE A BỤ IHE JEHOVA KWURU”
15, 16. Gịnị mere e ji kwesị ilebara ìgwè atụrụ nkịtị na ìgwè atụrụ Chineke anya?
15 Chegodị echiche banyere ọṅụ onye na-azụ atụrụ nke na-arụsi ọrụ ike na-enwe mgbe atụrụ ya mụrụ ụmụ ahụ́ gbasiri ike, n’ihi otú o si wepụta oge lekọta atụrụ ya nke ọma! Ma, ọ ma na o kwesịrị ilekọta ụmụ atụrụ ndị ahụ ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ka ha na-eto nke ọma. Onye ọzụzụ atụrụ ahụ kwesịrị ịhụ na ha na-eri ezigbo nri. Ụmụ atụrụ na-enwe ọdụ ogologo mgbe a mụrụ ha. Ha nwere ike ịtụrụ ha na nsị ha nakwa n’unyi. Ebe ọ bụ na onye ọzụzụ atụrụ chọrọ ka atụrụ ya na-adị ọcha, nakwa ka ahụ́ gbasie ha ike, o nwere ike ịchabilata ọdụ ha. O kwesịrị iji nwayọọ eme ya ka ọ ghara ịfụ ha oké ụfụ. Ndị ọzụzụ atụrụ n’ọgbakọ na-ejikwa obiọma elekọta atụrụ Chineke, bụ́ ndị ha na ha nọ n’ọgbakọ. (Jọn 21:16, 17) Obi na-atọkwa ndị okenye ụtọ mgbe ha hụrụ ka ndị nwere mmasị na-agbalị ịghọ ezi Ndị Kraịst. Ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta chọrọ ka ahụ́ gbasie atụrụ Chineke niile ike, ma ndị agadi ma ndị na-eto eto. Ha chọkwara ka a na-enyeju ha afọ. Ọ bụ ya mere ha ji elebara ha anya mgbe niile, na-enyekwara ha aka mgbe ọ dị mkpa. Otu n’ime ọrụ ndị ahụ ha na-arụ bụ ichetara ụmụnna ha “ihe Jehova kwuru,” ya bụ, ihe Akwụkwọ Nsọ na-akụzi.—Jere. 2:2, 5; 7:5-7; 10:2; Taị. 1:9.
16 Jeremaya kwesịrị inwe obi ike ma ọ bụrụ na ọ ga-ezisa ozi Chineke. Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị okenye ọgbakọ, nke ka nke, mgbe ha kwesịrị ikwusi okwu ike iji chebe ụmụnna ha. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na onye ọzụzụ atụrụ n’ọgbakọ ahụla na e kwesịrị ime ihe iji chebe ‘atụrụ a mụrụ ọhụrụ’ ma ọ bụkwanụ “atụrụ” torola eto ka ụwa Setan ghara imetọ ya. O nwedịrị ike ịbụ na onye ahụ nke nọ ná nsogbu agwaghị mmadụ ka o nye ya ndụmọdụ. Ma, onye ọzụzụ atụrụ anya ruru ala ọ̀ ga-anọ na-ele n’anya n’anya otu n’ime atụrụ ọ na-elekọta abaa ná nsogbu? Mbanụ! Ọ gaghịkwa eleghara atụrụ ahụ anya, na-eme ka à ga-asị na nsogbu adịghị, ebe ọ bụkwanụ na nsogbu dị, nke nwere ike ime ka nwanna ya na Jehova ghara ịdị ná mma.—Jere. 8:11.
17. Olee mgbe onye ọzụzụ atụrụ nwere ike ilebara atụrụ anya n’ụzọ pụrụ iche, oleekwa otú o nwere ike isi mee ya?
17 Ọ bụrụ na atụrụ emee iberiibe si n’ìgwè atụrụ kpafuo, onye ọzụzụ atụrụ anya dị nkọ ga-eme ihe ozugbo idughachite ya n’ìgwè atụrụ ahụ. (Gụọ Jeremaya 50:6, 7.) N’otu aka ahụ, o nwere ike ịdị mkpa mgbe ụfọdụ ka onye nlekọta jiri obiọma dọsie ndị chọrọ ịbanye ná nsogbu aka ná ntị ike. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịchọpụta na nwoke na nwaanyị kwere ibe ha nkwa ọlụlụ na-anọ naanị ha n’ebe nwere ike ime ka ha kwaa iko. Okenye nke dị obiọma ma nwee nghọta nwere ike inyere ha aka izere ụdị ọnwụnwa ahụ. Ọ bụ ezie na ọ ga-akpachara anya ka ọ ghara ibo ha ebubo, o nwere ike ime ka ha ghọta ihe ndị nwere ike ime ka ha mee ihe Jehova kpọrọ asị. Dị ka Jeremaya, ndị okenye kwesịrị ntụkwasị obi na-akatọ ihe Chineke kpọrọ asị. Ha si otú ahụ eṅomi Jehova, bụ́ onye na-adịghị obi ọjọọ, nke mere o ji si n’ọnụ onye amụma ya rịọ ndị ya, sị: “Biko, unu emela ụdị ihe arụ a m kpọrọ asị.” (Jere. 5:7; 25:4, 5; 35:15; 44:4) Ì nwere obi ụtọ n’ezie maka otú ndị ọzụzụ atụrụ hụrụ ìgwè atụrụ Chineke n’anya si achọ ka ihe dịrị ha mma?
18. Olee uru ụmụnna na-erite n’otú ndị ọzụzụ atụrụ n’ọgbakọ si enyere ha aka?
18 O doro anya na ọ bụghị ndị niile Jeremaya nyere ndụmọdụ gere ya ntị. Ma ụfọdụ ndị gere ya ntị. Dị ka ihe atụ, chee banyere Barọk, bụ́ odeakwụkwọ Jeremaya, nke ya na ya rụkọrọ ọrụ. E nwere mgbe e kwesịrị inye ya ndụmọdụ n’ezoghị ọnụ; Jeremaya nyere ya ndụmọdụ ahụ. (Jere. 45:5) Olee uru ọ baara Barọk? O mere ka Chineke gọzie Barọk ma chebe ya mgbe e bibiri Jeruselem. Otú ahụ ka ọ dị taa. Uru ụmụnna na-erite n’otú ndị okenye ọgbakọ si enyere ha aka nwere ike ịgba ndị okenye ume ‘itinyesi mgbalị ike n’inye ha ndụmọdụ nakwa n’izi ha ihe’ ndị ga-eme ka a zọpụta ha.—1 Tim. 4:13, 16.
ỊDỌ AKA NÁ NTỊ “RUO N’ÓKÈ KWESỊRỊ EKWESỊ”
19, 20. Olee ọrụ ndị okenye na-arụ ma e nwee ndị mere ihe ọjọọ n’ọgbakọ?
19 Ọrụ ọzọ ndị nlekọta na-arụ taa bụ ikpe ikpe n’ọgbakọ. Mgbe ụfọdụ, ndị okenye nwere ike ilebara ndị kpachaara anya na-eme mmehie anya, na-achọ inyere ha aka ichegharị. Jehova ji obiọma gwa ndị na-eme ihe ọjọọ hoo haa ka ha hapụ ụzọ ọjọọ ha. (Jere. 4: 14) Ma ọ bụrụ na onye nọ n’ọgbakọ achọghị ịhapụ mmehie ya, ndị nlekọta kwesịrị ime ihe iji chebe ìgwè atụrụ Chineke ka ha ghara ịmụta ihe ọjọọ onye ahụ na-eme. Dị ka Akwụkwọ Nsọ kwuru, ha nwere ike ịchụpụ onye ahụ n’ọgbakọ. Mgbe ụdị ihe ahụ mere, Jehova chọrọ ka ndị okenye ṅomie ya ma kpee ikpe ziri ezi. Eze ọma bụ́ Josaya mere otú ahụ. “O kpechitere ọnụ onye nọ n’ahụhụ na ogbenye.” O ṅomiri Chineke, bụ́ onye hụrụ ikpe ziri ezi n’anya. Ọ bụ ya mere Jehova ji jụọ banyere omume Josaya, sị: “Ọ́ bụghị nke ahụ bụ ịmara m?” ‘Ihe gaziiri’ Josaya n’ihi na o kpere ikpe ziri ezi ma mee ezi omume. Obi ọ́ naghị erukwu gị ala mgbe ndị okenye ọgbakọ gị na-agbalị iṅomi Josaya?—Jere. 22:11, 15, 16.
20 Ka obi sie gị ike na Jehova na-adọ ndị mmehie aka ná ntị “ruo n’ókè kwesịrị ekwesị.” (Jere. 46:28) N’ihi ya, ndị okenye nwere ike inye nwanna ndụmọdụ, gbaa ya ume ma ọ bụ dọọ ya aka ná ntị mgbe ha tụlechara ihe mere o ji mee ihe ọjọọ nakwa àgwà ọ kpara mgbe a gwara ya ihe o mere. O nwere ike ịbụ na e kwesịrị ịchụpụ onye mmehie nke na-achọghị ichegharị. Ọ bụrụ na mmadụ na-eme ihe ọjọọ n’achọghị ichegharị, nke mere ka a chụpụ ya n’ọgbakọ, ndị okenye anaghị echeta ya n’ekpere mgbe ha na-edu ndị ọzọ n’ekpere; ọ baghị uru ime otú ahụ.a (Jere. 7:9, 16) Ma, ha ga-agwa onye ahụ a chụpụrụ n’ọgbakọ ihe ọ ga-eme ka ya na Chineke dịghachi ná mma. Ha ga-esi otú ahụ ṅomie Chineke. (Gụọ Jeremaya 33:6-8.) Ọ bụ ezie na o nwere ike iwute anyị ma a chụpụ mmadụ n’ọgbakọ, obi kwesịrị isi anyị ike na iwu Chineke ziri ezi ma bụrụ ihe ga-akacha baara mmadụ niile uru.—Ákwá 1:18.
21. Gịnị ka e kwesịrị imere ìgwè atụrụ Chineke, oleekwa otú ị ga-esi gosi na ị kwadoro ndokwa ahụ?
21 Ọ bụrụ na ndị ọzụzụ atụrụ n’ọgbakọ aghọta iwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee ma kọwaara ya ìgwè atụrụ Chineke, ọ ga-eme ka ha na-eriju nri ime mmụọ afọ, mee ka okwukwe ha sie ike, chebekwa ha. (Ọma 23:1-6) Ihe Jeremaya gwara anyị banyere àgwà ndị mmadụ na ihe ndị ha bu n’obi, ma ndị kwesịrị ekwesị ma ndị na-ekwesịghị ekwesị, nwere ike ịbara Ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta uru ka ha na-arụ ọrụ dị mkpa e nyere ha, nke bụ́ ilekọta atụrụ Chineke. N’ihi ya, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị, ‘M̀ ga na-akwado ndị ọzụzụ atụrụ, bụ́ ndị na-eji “ihe ọmụma na nghọta” azụ ìgwè atụrụ Chineke, si otú ahụ gosi na obi dị m ụtọ maka ndokwa Jehova mere izi ndị ya ihe, iduzi ha, na ichebe ha?’—Jere. 3:15; 23:4.
Olee mgbe ndị nlekọta kwesịrị iji obi ike mee ihe n’ọgbakọ? Gịnị ka Jehova chọrọ ka ndị okenye mee mgbe ha na-ekpe ikpe n’ọgbakọ?