Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ypq ajụjụ 4 p. 12-14
  • Olee Otú M Ga-esi Mezie Ihe M Mejọrọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú M Ga-esi Mezie Ihe M Mejọrọ?
  • Azịza Ajụjụ Iri Ndị Na-eto Eto Na-ajụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Ihe M Kwesịrị Ime Ma M Mejọọ Ihe?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Kwere n’Ihe E Mehiere?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Otú E Kwesịrị Isi Na-ele Mmejọ Anya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Ị̀ Na-esi n’Ihe Ndị I Mejọrọ Amụta Ihe?
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Azịza Ajụjụ Iri Ndị Na-eto Eto Na-ajụ
ypq ajụjụ 4 p. 12-14
Ebe ụmụaka abụọ na-ele enyo ụgbọala kụwara akụwa

AJỤJỤ NKE 4

Olee Otú M Ga-esi Mezie Ihe M Mejọrọ?

IHE MERE AJỤJỤ A JI DỊ MKPA

Ọ bụrụ na ị na-ekweta ihe i mejọrọ, ndị mmadụ ga na-akwanyekwuru gị ùgwù, na-atụkwasịkwu gị obi.

GỊNỊ KA Ị GA-EME?

Chegodị banyere ihe atụ a: Tim na ndị enyi ya nọ na-egwu egwu, ya atụọ bọl, bọl ahụ agaa kụwaa enyo dị́ n’ụgbọala onye agbata obi ha.

Ọ bụrụ na ị bụ Tim, gịnị ka ị ga-eme?

CHEGODỊ ECHICHE

E NWERE IHE ATỌ I NWERE IKE IME:

  1. Ịgba ọsọ.

  2. Ikwu na ọ bụ onye ọzọ kụwara ya.

  3. Ịgwa onye ahụ ihe merenụ, gwakwa ya na ị ga-akwụ ụgwọ ya.

Obi gị nwere ike ịgwa gị ka ị họrọ Nke A. Ma e nwere ezigbo ihe mere ị ga-eji kweta ihe i mejọrọ, ma ị̀ kụwara enyo dị́ n’ụgbọala ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ.

IHE ATỌ MERE Ị GA-EJI KWETA IHE I MEJỌRỌ

  1. Ọ bụ ihe i kwesịrị ime.

    Baịbụl kwuru, sị: “Anyị na-achọ ka anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.”​—⁠Ndị Hibru 13:⁠18.

  2. Mmadụ kweta ihe o mejọrọ, o nwere ike ime ka a gbaghara ya.

    Baịbụl kwuru, sị: “Onye na-ezochi ajọ omume ya agaghị enwe ihe ịga nke ọma, ma onye na-ekwupụta ya ma na-ahapụ ya ka a ga-emere ebere.”​—⁠Ilu 28:⁠13.

  3. Nke ka nke, ọ na-eme Chineke obi ụtọ.

    Baịbụl kwuru, sị: “Onye aghụghọ bụ ihe arụ n’anya Jehova, ma ya na ndị na-eme ihe n’eziokwu na-enwe mmekọrịta chiri anya.”​—⁠Ilu 3:⁠32.

N’Amerịka, otu nwa agbọghọ dị́ afọ iri abụọ aha ya bụ Karina bu ụgbọala gbaa ọnwụ ọnwụ, ndị gọọmenti erie ya iwu, ya ezochiere ya papa ya. Ma, o zochilighị ya ruo mgbe ebighị ebi. Karina kwuru, sị: “Mgbe ihe dị́ ka otu afọ gara, papa m hụrụ akwụkwọ e ji rie m iwu e dere aha m na ya. Abara m n’ezigbo nsogbu.”

Gịnị ka ihe a na-akụziri gị? Karina sịrị: “Izochi ihe i mejọrọ ga-eme ka ihe ka njọ. Ị ga-emecha taa ahụhụ ya.”

OTÚ Ị GA-ESI MỤTA IHE N’IHE NDỊ I MEJỌRỌ

Baịbụl kwuru, sị: “Anyị niile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro.” (Jems 3:⁠2) Ikweta ihe i mejọrọ ga-egosi na ị dị umeala n’obi nakwa na ị ghọọla dimkpa, nke ka nke, ma i kweta ozugbo.

Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ịmụta ihe n’ihe ndị i mejọrọ. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Vera sịrị: “M na-agba mbọ ịmụta ihe n’ihe ọ bụla m mejọrọ. Ọ na-enyere m aka ịghọkwu ezigbo mmadụ. M na-amata ihe m kwesịrị ime mgbe ọzọ.” Ka anyị chọpụta otú ị ga-esi eme ya.

Ka e were ya na papa gị bunyere gị ọgba tum tum ya, gị emebie ya. Gịnị ka ị ga-eme?

  • Gbachi nkịtị ma kpewe ekpere ka papa gị ghara ịmata.

  • Gwa papa gị ihe merenụ.

  • Gwa papa gị ihe merenụ ma kwuo na ọ bụ onye ọzọ kpatara ya.

Ka e were ya na ị dara ule n’ihi na ị gụghị akwụkwọ. Gịnị ka ị ga-eme?

  • Ikwu na ule ahụ siri ike.

  • Ikweta na ọ bụ gị mere onwe gị.

  • Ikwu na onye nkụzi kpọrọ gị asị.

Ebe otu nwa agbọghọ na-anya ụgbọala ma na-ele enyo o ji ahụ ihe dị́ n’azụ

Ọ bụrụ na ị na-echegbu onwe gị banyere ihe i mejọrọ n’oge gara aga, o yiri ebe onye na-anya ụgbọala legidere anya n’enyo o ji ahụ ihe dị́ n’azụ

Chegodị banyere ihe atụ ndị ahụ anyị nyeburu. Were ya na ị bụ (1) papa gị na (2) onye nkụzi unu. Olee otú papa gị na onye nkụzi unu ga-esi ele gị anya ma i kweta ihe i mejọrọ ozugbo? Olee otú ha ga-esi ele gị anya ma i zochie ihe i mejọrọ?

Chebara ihe ndị i mejọrọ n’afọ gara aga echiche ma zaa ajụjụ ndị a.

Gịnị bụ ihe ahụ i mejọrọ? Olee ihe i mere banyere ya?

  • M zochiri ya.

  • M kwuru na ọ bụ onye ọzọ kpatara ya.

  • M kwetara ozugbo na ọ bụ m mere ya.

Ọ bụrụ na i kwetaghị ihe i mejọrọ, olee otú obi mechara dị́ gị?

  • Obi dị m ụtọ maka na o nweghị onye matara ihe m mere.

  • Obi nọ na-apịa m ụtarị. M gaara ekwu eziokwu.

Olee ihe ka mma ị gaara eme?

Gịnị ka ị mụtara n’ihe ahụ i mejọrọ?

GỊNỊ KA I CHERE?

Gịnị mere ụfọdụ ndị anaghị ekweta ihe ha mejọrọ?

Olee otú ndị mmadụ ga-esi na-ele gị anya ma ị na-ezochikarị ihe i mejọrọ? Ma, olee otú ha ga-esi na-ele gị anya ma ị na-ekweta ihe i mejọrọ?​—⁠Luk 16:⁠10.

IHE M GA-EME

  • Sí ugbu a ruo otu afọ, olee ihe i nwere ike ikpebi ịna-eme ma i mejọọ ihe?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya