Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwyp isiokwu 29
  • Olee Ihe M Kwesịrị Ime Ma M Mejọọ Ihe?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Ihe M Kwesịrị Ime Ma M Mejọọ Ihe?
  • Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ gị?
  • Ihe atọ mere ị ga-eji kweta ihe i mejọrọ
  • Otú Ị Ga-esi Mụta Ihe n’Ihe I Mejọrọ
  • Olee Otú M Ga-esi Mezie Ihe M Mejọrọ?
    Azịza Ajụjụ Iri Ndị Na-eto Eto Na-ajụ
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Kwere n’Ihe E Mehiere?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Otú E Kwesịrị Isi Na-ele Mmejọ Anya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Ị̀ Na-esi n’Ihe Ndị I Mejọrọ Amụta Ihe?
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
ijwyp isiokwu 29
Ebe ụmụaka abụọ na-ele glas ụgbọala bọl ha kụwara

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Olee Ihe M Kwesịrị Ime Ma M Mejọọ Ihe?

  • Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ gị?

  • Ihe atọ mere ị ga-eji kweta ihe i mejọrọ

  • Otú Ị Ga-esi Mụta Ihe n’Ihe I Mejọrọ

Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ gị?

Gụọ ihe mere Karina, ma weregodị ya na ọ bụ gịnwa ka o mere. Olee ihe ị gaara eme ma asị na ọ bụ gịnwa ka o mere?

Ka m nya ụgbọala anyị na-aga ụlọ akwụkwọ, onye uwe ojii jidere m n’ihi oké ọsọ m na-agba, ma nye m akwụkwọ gosiri na m dara iwu. Iwe were m, mụ agwa ya mama m. Mama m asị m gaa gwa papa m ihe merenụ. Ma, achọghị m ịgwa ya papa m.”

Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ gị?

  1. A: Gbachi nkịtị, buru n’obi na papa gị agaghị amata gbasara ya.

  2. B: Gwa papa gị ihe niile merenụ.

Obi gị nwere ike ịgwa gị ka ị họrọ Nke A. I nwere ike ịna-eche na mama gị ga-ewere ya na ị kọọrọla papa gị ihe niile merenụ. Ma e nwere ezigbo ihe mere ị kwesịrị iji kwuo ihe i mere, ma ọ bụ iwu okporo ụzọ ka ị dara, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ ka i mere.

Ihe atọ mere ị ga-eji kweta ihe i mejọrọ

  1. 1. Ọ bụ ihe i kwesịrị ime. Baịbụl kwuru otú Ndị Kraịst kwesịrị isi na-akpa àgwà. Ọ sịrị: “Anyị na-achọ ka anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.”​​—Ndị Hibru 13:18.

    “M gbalịsiri ike iji hụ na m na-ekwu eziokwu mgbe niile, na iji isi m buru ihe m metara. M mejọọ ihe, m na-ekweta ozugbo.”​​—Alexis.

  2. 2. Mmadụ kweta ihe o mejọrọ, o nwere ike ime ka a gbaghara ya. Baịbụl kwuru, sị: “Onye na-ezochi ajọ omume ya agaghị enwe ihe ịga nke ọma, ma onye na-ekwupụta ya ma na-ahapụ ya ka a ga-emere ebere.”​​—Ilu 28:13.

    “Ọ dịghị mfe mmadụ ịkata obi kweta ihe o mejọrọ. Ma, ime otú ahụ ga-eme ka ndị mmadụ tụkwasị gị obi. Ha ga-amata na ịbụ onye na-ekwu eziokwu, ha agaghị ewerekwa ihe ahụ i mejọrọ ka oké ihe.”​​—Richard.

  3. 3. Nke ka nke bụ na ọ na-eme Jehova Chineke obi ụtọ. Baịbụl kwuru, sị: “N’ihi na onye aghụghọ bụ ihe arụ n’anya Jehova, ma ya na ndị na-eme ihe n’eziokwu na-enwe mmekọrịta chiri anya.”​​—Ilu 3:32.

    “Mgbe m mechara otu ihe dị ezigbo njọ, ọ bịara doo m anya na ọ ga-aka mma ikweta ihe m mere kama izochi ya. O nweghị otú Jehova ga-esi agọzi m ma ọ bụrụ na mụ anaghị eme ihe otú ọ chọrọ.”​​—Rachel.

Gịnị ka Karina mechara mee? O zochiiri papa ya na ya dara iwu okporo ụzọ. Ma, papa ya mechara chọpụta. Karina kwuru, sị: “Mgbe ihe dị ka otu afọ gachara, ka papa m nọ na-eleba anya n’akwụkwọ ịnshọransị ezinụlọ anyị, ọ hụrụ akwụkwọ gosiri na m dara iwu okporo ụzọ. M bara n’ezigbo nsogbu. Iwe were mama m na mụ agwaghị ya papa m otú ahụ ọ gwara m mee.”

Ihe ọ mụtara: Karina kwuru, sị: “Mmadụ ịgbalị izochi ihe o mejọrọ na-eme ka ihe ka njọ. Onye ahụ ga-emecha taa ahụhụ ya.”

Otú Ị Ga-esi Mụta Ihe n’Ihe I Mejọrọ

Ọ dịghị onye na-adịghị emejọ ihe. (Ndị Rom 3:23; 1 Jọn 1:8) Dị ka anyị hụrụ, mmadụ ikweta ihe o mejọrọ ozugbo o mere ihe ahụ na-egosi na onye ahụ bụ dimkpa, nakwa na ọ dị umeala n’obi.

Ihe ọzọ dị mkpa bụ ịmụta ihe n’ihe ndị i mejọrọ. Ọ dị mwute na ọtụtụ ndị na-eto eto anaghị amụta ihe n’ihe ndị ha mejọrọ. O nwere ike ịdị ha otú ọ dịbu otu nwa agbọghọ aha ya bụ Priscilla. Priscilla kwuru, sị: “Obi na-ajọ m ezigbo njọ maka ihe ndị m mejọrọ. Ọ na-eme ka ihere onwe m na-eme m, na-adịkwa m ka ihe o mebichaala nke na ọ gaghị ekwe mmekwata. Ya dị otú ahụ, ike ụwa agwụ m, ya adịrịzie m ka nke m na-eme ọ̀ gwụla.”

Ebe nwata nwaanyị na-anya ụgbọala na-ele anya n’enyo e ji ahụ ihe na-eme n’azụ

Ò nwere mgbe ọ na-adị gị otú ahụ ọ dị Priscilla? Ọ bụrụ otú ahụ, cheta na: Ichegbu onwe gị maka ihe ndị i mejọrọ n’oge gara aga, dị ka ebe onye na-akwọ ụgbọala na-ele anya n’enyo e ji ahụ ihe na-eme n’azụ, kama ilewe anya n’ihu. Ịna-echegbu onwe gị maka ihe ndị i mejọrọ n’oge gara aga ga-eme ka ike ụwa gwụ gị, meekwa ka o siere gị ike ịma ihe ị ga-eme maka nsogbu ndị ọzọ ga-abịara gị.

Kama ime otú ahụ, ọ ka mma ka i bido lewe ihe anya otú kwesiri ekwesi.

“Mụta ihe n’ihe ndị i mejọrọ n’oge gara aga ka ị ghara ime ha ọzọ. Ma, a nọkwala na-eche gbasara ha mgbe niile ka ọ ghara ime ka ị daa mba.”​—Elliot.

“M na-ewere ihe ndị m mejọrọ ka ihe ndị m ga-eji na-amụta ihe na ihe ndị ga-enyere m aka ịghọ ezigbo mmadụ. Eche m na ọ bụ ihe kacha mma ime n’ihi na ọ ga-enye aka ka i si na ya mụtakwuo ihe.”​—Vera.

IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU

Connor

“O nwere ụfọdụ ndị ihe ha mejọrọ na-ewute, nweekwa ndị nke ọ na-enweghị ihe ha ji ya kpọrọ. Ma, ọ kacha mma ka ihe i mejọrọ wute gị ka i si na ya mụta ihe ga-enyere gị aka ighara ime ya ọzọ.”​—Connor.

Dami

“Ndị na-agba ọsọ na-eme ha daa, ha ahapụ ihere, jisie ike bilie ma gbarakwa na-aga. Ọ bụ ihe i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na i mejọọ ihe. I si n’ihe ndị i mejọrọ mụta ihe, ma gharakwa ime ha ọzọ, ị ga-eme ka ndụ gị kakwuo mma.”​—Dami.

Zipporah

“Ọ kacha mma mmadụ iche otú ihe o mejọrọ ga-esi nyere ya aka, ka ihe ndị ọ ga-amụta na ha nyere ya aka ịghara ime ha ọzọ. Ekwela ka ha nọgide na-enye gị nsogbu n’obi, kama, ka ihe ndị ị mụtara na ha baara gị ezigbo uru.”​—Zipporah.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya