Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
“Ịnụ Ọkụ ná Mmụọ” na Mexico
“O YIRI nnọọ ka mba ahụ dum na-anụ ọkụ, na-arụsikwa ọrụ ike.” Otú ahụ ka alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na Mexico dere, leekwa nnọọ ka okwu ahụ si bụrụ eziokwu! Ọrụ a na-arụsi ike n’ala ahụ pụtara ìhè n’eziokwu ahụ nke bụ na n’ọnwa August, e nwewo ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa kasị elu kwa ọnwa ruo 70 ọnwa n’alatụghị azụ, na-eru ngụkọta nke 277,436. Tụkwasị na nke ahụ, e nyere akụkọ ihe karịrị 400,000 ọmụmụ Bible, ndị bịara Ememe Ncheta n’afọ gara aga rukwara 1,046,291. Lee nnọọ ezi ihe ndabere nke a bụ maka ito uto n’ọdịnihu!
Otu ihe pụtara ìhè nke mere na 1989 bụ mgbanwe nke ọnọdụ Ndịàmà Jehova na Mexico. N’ihi nke a, a pụrụ iji Bible mee ihe nke mbụ ya n’ọrụ nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ, a pụkwara iji ekpere na-emeghe nzukọ dị iche iche. Nke a nwere mmetụta a hụrụ anya ozugbo. N’ime ọnwa abụọ, ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa jiri ihe karịrị 17,000 mụbaa.
A na-ahụta ọṅụ ụmụnna ahụ nwere n’ihe nke a merenụ site n’okwu ndị ha kwuru. Otu n’ime ha dere, sị: “Mgbe a gụrụ akwụkwọ ozi ahụ n’ọgbakọ, e ji oké ịkụ aka kwụsịtụ ọgụgụ ya ugbo abụọ. Ọ bụ ihe na-akpali akpali nke ukwuu!” Onye ọzọ kwukwara, sị: “Anyị apụghị ijighachi anya mmiri nke ọṅụ azụ. Ihe ọ rụpụtara apụtawo ìhè ná mmeziwanye ihe e nwere n’ịbịa n’oge. Onye ọ bụla chọrọ ịnọ ya maka ekpere mmeghe.”
“N’ókèala anyị,” ka otu Onyeàmà ọzọ kwuru, “otu nwanyị nke na-arụsi ọrụ ike n’usoro ọmụmụ Bible Chọọchị Katọlik kwuru, sị: ‘Ọ bụrụ na n’oge gara aga, site nanị n’okwu ọnụ na magazin ha, [Ndịàmà ahụ] na-eme ka anyị ghara inwe ọnụ okwu, ugbu a ha na-emeghezi Bible ha n’ụlọ ndị mmadụ, anyị efuola!’”
Ndịàmà Jehova nọ na Mexico na-ekwusikwa okwu ike banyere iji Bible na-agba àmà mberede. Otu nwanna nwanyị jekwuuru otu nwanyị onye jụrụ ya ihe o chere banyere isikwopụ afọ ime. Onyeàmà ahụ zaghachiri, sị: “Ihe m chere banyere ya adịghị mkpa dị ka ihe Bible kwuru.” Mgbe ọ gụsịrị akụkụ akwụkwọ nsọ ole na ole, nwanna nwanyị ahụ tụgharịrị uche, sị: “Nye Onye Okike ahụ, ndụ bụ ihe dị mkpa nke ukwuu, ọbụna ndụ nke ndị ahụ a na-amụbeghị amụ.”
Nwanyị ahụ kwupụtaziri na ya dị ime nwa mbụ ya, ma na nnyocha ndị ụlọ ọgwụ meworo gosiri na ahụ agaghị ezucha nwa ahụ okè. Onye dọkịta na-elekọta ya chọrọ ka o sikwopụ afọ ime ahụ, di ya kwekwara, ma nwanyị ahụ ejichaghị n’aka ma ọ bụ ihe ya chọrọ ime. Onye nkwusa ahụ sooro ya tụgharịkwuo uche site na Bible, gwa ya aha ya, wee gawa ebe ọ na-aga.
Mgbe afọ ise gasịrị n’otu mgbakọ distrikti, otu dị na nwunye na nwa ha dị afọ anọ chọrọ ịhụ nwanna nwanyị ahụ na di ya. Ọ bụ otu nwanyị mbụ ahụkwa! Gịnị meworo? Mgbe ya na Onyeàmà ahụ nwesịrị mkparịta ụka, nwanyị ahụ kpebiri na ya ga-amụ nwa ahụ. Onye dọkịta ahụ na-elekọta ya jụrụ ilekọta ya ọzọ, ọbụna na di ya yiri ya egwu ịhapụ ya ma ọ bụrụ na a mụpụta nwa ahụ dị ka onye ahụ na-ezughị okè. Mgbe oge ịmụ nwa ya ruru, o jekwuuru dọkịta mbụ ọ pụrụ ịhụ maka enyemaka.
Ozugbo a mụsịrị nwa ahụ, onye dọkịta ahụ sịrị: “Nne, I riela! Ị mụtala nwa agbọghọ nta mara mma.” N’ekwenyeghị ihe ọ nụrụ, ọ gwara dọkịta ahụ ka o lezie nwa ahụ anya nke ọma. O wee kọọrọ ya akụkọ ahụ. Ihe dọkịta ahụ pụrụ ikwu bụ nanị: “Nke a bụ ọrụ ebube.” Nwanyị ahụ nwere obi ụtọ na ya nwere obi ike iji sọpụrụ echiche Jehova banyere ịdị nsọ nke ndụ, o wee gụọ ọmarịcha nwa ya nwanyị ahụ gbasiri ike aha nwanna nwanyị ahụ. Mgbe ahụ gbasiri ya ike, ọ chọtara ebe Ndịàmà nọ wee malite iso ha na-amụ Bible. N’ihe na-erughị otu afọ, ya na di ya abụwo ndị mere baptism.
Pọl onyeozi gbara ume, sị: “N’akụkụ mmụọ unu, na-adịnụ ọkụ; n’akụkụ [Jehova, NW] na-abụnụ ohu.” (Ndị Rom 12:11) Ndịàmà Jehova bi na Mexico, dịkwa ka ezi ndị Kraịst n’ebe nile, ji obi ha nile na-anara agbamume nke a. Ọ bụ ya mere mba ahụ dum ji na-anụ ọkụ, na-arụsikwa ọrụ ime mmụọ ike. Lee ka Jehova na-esi agọzi ndị ya kwesịrị ntụkwasị obi n’ụba!