Ekwela Ka Mgbakọ Distrikti Asụsụ Dị Ọcha’ Gafenahụ Gị!
Ụbọchị anọ na-enyeghachi ezi ụgwọ ọrụ nke ọmụmụ Bible na-echere gị. Nọrọ n’ebe ahụ mgbe usoro ihe omume ga-amalite n’elekere 1:30 ehihie Thursday. Rite uru site n’okwu ahụ na-akpali iche echiche nke isiokwu ya bụ “Ndị Enyi Gị Hà Bụ Ndị Enyi Jehova?” tinyekwara okwu ahụ bụ isi, bụ́ “Asụsụ Dị Ọcha nye Mba Nile.” Okwu mmechi nke ehihie ahụ, bụ́ “Iji Ọbara Azọpụta Ndụ Gị—N’ụzọ Dị Aṅaa?,” ga-aza ajụjụ ahụ bụ: Ọbara ọ̀ dị mkpa n’ezie iji zọpụta ndụ?
Nnọkọ ụtụtụ Friday ga-amalite n’elekere 9:30. Nọrọ n’ebe ahụ iji rite uru site n’okwu ahụ na-enyocha obi nke isiokwu ya bụ́ “Kraịst ‘Kpọrọ Mmebi Iwu Asị’—Ị̀ Kpọrọ Ya Asị?” na okwu ahụ na-akpali akpali bụ “Na-ajụ Echiche Efu nke Ụwa, Ma Na-agbaso Ihe Ndị Dị Adị n’Ezie nke Alaeze.” N’ehihie ahụ, a ga-atụ aro ndị a pụrụ itinye n’ọrụ banyere ụzọ ego i nwere pụrụ isi zuoro gị. A ga-ezi ndị mụrụ ụmụ ụzọ ndị ha pụrụ isi rụzuo ọrụ dịịrị ha n’ụzọ dị irè karị, otu ihe nkiri nke dabeere n’ihe ndị na-eme n’oge a ga-enye ndị na-eto eto nduzi na-enweghị atụ n’ihe banyere ikere òkè n’ihe ndị a na-eme n’ụlọ akwụkwọ, bụ́ ndị na-emetụtaghị ihe a na-amụ.
Nnọkọ ụtụtụ Saturday ga-agụnye okwu ahụ a ga-ekwu banyere nraranye na ime baptism, tụleekwa mkpa ọ dị iji ihe ụfọdụ chụọ àjà ka mmadụ nwee ike ịdị na-enwe ọmụmụ Bible onwe onye. “Ụgbọ Ịnyịnya Eluigwe nke Jehova nke Na-aga n’Ihu” bụ otu isiokwu na-akpali akpali nke ga-adị n’usoro ihe omume nke ehihie. A ga-enwekwa ihe ncheta ndị siri ike banyere ibu ọrụ dịkwasịrị anyị dị ka ndị Kraịst inyere ndị ahụ e ji okpukpe ụgha mee ka ha kpuo ìsì aka, a ga-ewetakwa enyemaka ndị bara uru iji rụzuo ibu ọrụ nke a.
Ọ ga-amasị gị ịnọ ya n’ụtụtụ Sunday iji nụrụ ozi ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ nke a ga-ekwupụta megide Krisendọm na ndị ndú okpukpe ya. Ihe ga-esochi nke a bụ ihe nkiri e yi uwe ndị mgbe ochie mee, nke ga-egosi ihe omume ndị metụtara ndụ Jihu na Jonadab. E mesịa, n’ehihie, jide n’aka na i gere ntị n’okwu ihu ọha ahụ, bụ́ “Bụrụnụ Ndị Dị n’Otu Site n’Asụsụ ahụ Dị Ọcha.”
N’ime Ọnwa November, December 1990, na January 1991, e mewo ndokwa inwe ihe karịrị 60 mgbakọ dị iche iche n’ime Nigeria nanị, ya mere, a ga-enwe nke na-adịghị anya site n’ebe i bi. Jụta Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị ka i wee mara kpọmkwem oge na ebe a ga-eme nke kasị dịrị gị nso.