Anyị zụlitere ụmụ asatọ n’ịdụ ọdụ nke Jehova
DỊ KA OVERLAC MENEZES SI KỌỌ
“Ha ji ịnyịnya ígwè na-ebu mmadụ abụọ wee bịa.” Nke a bu otú akwukwo akụkọ bu Jornal de Resende si malite akụkọ ya nke juru otu peji banyere ezinụlọ anyị na 1988, mgbe anyị na-ahapụ Resende ịga Lages nke dị n’ebe ndịda Brazil.
AKỤKỌ ahụ gara n’ihu, sị: “Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị metụworo okenye karị ga-echeta di na nwunye ahụ ndị dọọrọ mmasị Resende n’ihi ụdị ihe e ji aga njem ahụ a na-ahụtụbeghị mbụ ha ji bịa: ịnyịnya ígwè nke nwere nnukwute frame na oche abụọ. Onye nọ n’ihu ma na-anya ya bụ ‘onye draịva,’ bụ́ Overlac Menezes; nwunye ya, bụ́ Maria José, nọ n’oche nke abụọ. Afọ ahụ: 1956.”
Onye dere ihe odide ahụ bụ nwoke nke aha ya bụ Arisio Maciel, onye bụkwa onye nduzi nke ụlọ ọrụ redio dị n’ebe ahụ. O zutere anyị nke mbụ laa azụ na 1956 mgbe mụ na nwunye m na-ekere òkè n’ihe omume ahụ Watch Tower Society na-eme na redio kwa izu, nke isiokwu ya bụ, Things People Are Thinking About (Ihe Ụmụ Mmadụ Na-eche Echiche Banyere Ha). N’ihe odide ahụ, o hotara ihe m kwuru na n’oge ọnụnọ anyị “anyị jere n’ụlọ nile dị na Resende, site n’otu okporo ama ruo n’okporo ama ọzọ.”
Ị̀ ga-achọ ịmara otu anyị si ghọọ ndị a maara nke ọma na Resende? Otú o sikwa bụrụ na n’oge anyị bi n’ebe ahụ, anyị gbalịrị ịzụlite ụmụ asatọ ‘n’ịdụ ọdụ nke Jehova’ ka anyị nọ na-enye aka iji ozi ọma Alaeze ahụ jee n’ụlọ nile dị na Resende?—Ndị Efesọs 6:4.
Ịmụta Ụzọ Nile nke Jehova
Na January 1950, Maria Minc, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, malitere iduziri nwanne m nwanyị bụ Adeilde, onye bi na São Paulo, ọmụmụ Bible. Adị m 16 afọ n’oge ahụ, bụrụkwa onye e meworo baptism dị ka onye Katọlik, ma ruo oge ụfọdụ, akwụsịwo m ịga chọọchị. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, m ka kwere na Chineke, chọọkwa ijere ya ozi. Ya mere n’otu anyasị, ejere m n’ụlọ Adeilde ije chọpụta ihe banyere okpukpe ọhụrụ nke a ọ na-amụ ihe banyere ya. Maria Minc kpọrọ m òkù ka m sonye n’ọmụmụ ihe ahụ, na nke mbụ ya ná ndụ m, ahụkwara m Bible. N’oge ọmụmụ ihe ndị sochiri nke ahụ, ọ bụụrụ m ihe ịtụnanya ịmụta site na Bible na aha Chineke bụ Jehova, na ụwa ga-aghọ paradaịs n’oge na-adịghị anya, na ọkụ ala mmụọ na pọgatrị adịghị adị, na mmadụ enweghịkwa mkpụrụ obi nke na-adịghị anwụ anwụ. Ndị ikwu m gwara m, sị: “Isi ga-agbaka gị ma ọ bụrụ na ị gụọ Bible nke ukwuu otú a!” Enwere m ezi ọganihu n’ọmụmụ Bible m, malitekwa ije nzukọ dị iche iche n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ọgbakọ Belém nke dị na São Paulo. N’ịtụ anya ịhụ nanị ndị toruworo ogo mmadụ n’ebe ahụ, ọ bụụrụ m ezi ihe ijuanya ịhụ ọtụtụ ndị na-eto eto ndị mụ na ha bụ ọgbọ. Na February 5, 1950, ekeere m òkè nke mbụ ya n’ọrụ nkwusa ahụ, na November 4 nke otu afọ ahụkwa, egosipụtara m nrara m raara onwe m nye Jehova site na baptism ime mmiri.
N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, a họpụtara m ịbụ onyeọkà okwu ihu ọha. N’oge ahụ, ihe nke a pụtara bụ na m ga na-ekwu okwu ihu ọha n’okporo ama na n’ogige ntụrụndụ ọha dị iche iche site n’iji ígwè na-amụba ụda olu nke e guzobere na bumper nke otu moto. Ọrụ ọzọ bụ ọrụ ikesa magazin. N’oge ndị ahụ, ihe anyị na-eme bụ iburu akpa magazin anyị wee guzo n’isi okporo ama dị iche iche na-eti mkpu, sị: “ỤIọ Nche na Teta! Ikwupụta Alaeze Jehova!” Etinyeghị m ọtụtụ magazin, ma enwetara m obi ike iji kwuo okwu n’ihu ọha.
Ije Ozi Oge Nile dị ka Ihe Mgbaru Ọsọ
N’oge na-adịghị anya, a dọọrọ mmasị m gaa n’ịdị mkpa nke ozi ọsụ ụzọ, ma ọ bụ ọrụ nkwusa nke oge nile. Mbipụta April 1, 1950, nke UIỌ Nche (Bekee) nwere otu ihe odide nke isiokwu ya bụ “A Chọkwuru Ọtụtụ Ndị Ọsụ Ụzọ nke Ozi Ọma.” Nke a kwuru, sị: “Ibu ụzọ chọọ Alaeze ahụ pụtara na mmadụ ga-eburu ọdịmma Alaeze ahụ dị ka ihe nọ n’ọkwá kachasị elu n’uche ya n’oge nile. Onye dị otú ahụ ga na-elepụ anya iji hụ ohere ọ ga-eji jeere ya ozi, ọ gaghị anọgidekwa ruo mgbe ebighị ebi na-achụso mkpa ihe onwunwe nke onwe ya, na-akwakọbakwa ihe onwunwe nke ụwa ji chebe ọdịnihu ya.” Okwu ndị a kụnyere mmụọ ọsụ ụzọ n’ime obi m.
N’oge na-adịghị anya, otu ọmarịcha nwa agbọghọ aha ya bụ Maria José Precerutti gbanwere ndụ m n’ụzọ pụtara nnọọ ìhè. Ọ na-enwe nnọọ ezi ọganihu n’ọmụmụ Bible nke ya na di na nwunye bụ Ndịàmà aha ha bụ José na Dília Paschoal. Na January 2, 1954, ọ ghọrọ ezi nwunye m m hụrụ n’anya, onye òtù m, enyi m, na onye na-enyere m aka. Ihe mgbaru ọsọ ya bụkwa ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ. Ya mere, n’ịbụ ndị a gbara ume site n’ihe nlereanya nke ndị ozi ala ọzọ dị ka Harry Black, Edmundo Moreira, na Richard Mucha, anyị tinyere akwụkwọ iji banye n’ozi ọsụ ụzọ. Cheedị echiche ụdị ọṅụ—na nchegbu—anyị ga-enwe mgbe anyị natara azịza ahụ bụ: “A kwadowo nhọpụta gị dị ka onye nlekọta sekit”!
Mgbe m natara akwụkwọ nke ebe mbụ e kenyere m ọrụ sekit, oké egwu jidere m. Sekit ọhụrụ m gụnyere ọgbakọ iri dị n’ebe bụ isi obodo Brazil n’oge ahụ, bụ́ Rio de Janeiro, gụnyere ụfọdụ ndị dị nso Betel. Otu ụlọ obibi ndị ozi ala ọzọ nke ndị a zụrụ n’ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead dị n’ọgbakọ nke mbụ e kenyere m ije leta. N’ịbụ onye dị 22 afọ, enwere m mmetụta nke onye na-erughị nnọọ eru, m wee gwa Nwanna Mucha, bụ́ onye na-elekọta ọrụ anyị na Brazil n’oge ahụ, sị: “Gịnị ka m pụrụ ịkụziri ndị a?” Ọ zara, sị: “Nwanna, nanị tinye ndụmọdụ ndị sitere na Bible nakwa ná nzukọ a n’ọrụ.” Nke a bụ ezi ndụmọdụ n’ezie!
Mgbe otu afọ gasịrị, Maria José tụụrụ ime, ọ dịkwara mkpa ka anyị hapụ ọrụ sekit. Otú ọ dị, ọ bụ ihe obi ụtọ na anyị nọgidere n’ozi oge nile. Ná nzaghachi nye arịrịọ ezinụlọ abụọ bụ ndị Finland rịọrọ, bụ́ ezinụlọ ndị be Edvik na ndị be Leiniö, Society zijere anyị Resende dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, bụ́ ókèala nke fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na a kpabeghị ya aka ọ bụla, nke nwere 35,000 ndị bi na ya. Ọ bụ ezinụlọ Leiniö nyere anyị ịnyịnya ígwè ahụ na-ebu mmadụ abụọ nke a kpọtụrụ aha n’akwụkwọ akụkọ Jornal de Resende. N’iji ya mee ihe, o kwere anyị mee ịkụnye ọtụtụ mkpụrụ nke eziokwu ahụ n’ókèala ahụ nke na-amịpụta mkpụrụ, anyị nọgidekwara na-eje ozi n’ebe ahụ ruo ọnwa ole na ole mgbe a mụsịrị nwa anyị nwanyị bụ Alice na 1956. Mgbe anyị hapụrụ ebe ahụ, ụmụnna nwanyị abụọ, bụ́ Anita Ribeiro na Marian Weiler, bịara ịkwọsa mmiri ná mkpụrụ ndị ahụ, ‘Chineke mekwara ka ha too.’ Taa, Resende nwere ọgbakọ itoolu na ihe karịrị 700 ndị nkwusa.—1 Ndị Kọrint 3:7.
Otu n’ime ndị mbụ m zutere na Resende bụ Manoel Queiroz. Mgbe m nọ na-echere ụgbọ bọọsụ, enyefere m ya akwụkwọ abụọ n’ebe ọ na-arụ ọrụ. Ya, na e mesịakwa nwunye ya, bụ́ Piedade, nwere ezi ọganihu, e meekwa ha baptism. Manoel ghọrọ okenye ọgbakọ, nọgidekwa n’ikwesị ntụkwasị obi ruo mgbe ọ nwụrụ. Mụ na Álvaro Soares mụkwara ihe. Ná nzukọ mbụ ọ bịara, ọ bụụrụ ya ihe ijuanya ịhụ nanị mmadụ isii bịaranụ, ma taa, ọ bụ onye city overseer nke Resende, ebe ihe karịrị otu puku mmadụ na-abịa nzukọ ndị a na-enwe n’ọgbakọ ndị ahụ dị iche iche. Na 1978, nwa Álvaro nke nwoke bụ Carlos lụrụ nwa anyị nwanyị bụ Alice. Taa, ihe karịrị 60 ndị si n’ezinụlọ Soares bụ Ndịàmà.
Ịhapụ Resende pụtara na anyị ejiriwo ije ozi oge nile anyị gbanwere ibu ọrụ ndị Kraịst ọzọ, ‘inye ndị nke ezinụlọ anyị ihe na-akpa ha.’ (1 Timoti 5:8) Otú ọ dị, anyị gbalịsiri ike ijigide mmụọ ọsụ ụzọ ahụ, na-edebe ije ozi oge nile dị ka ihe mgbaru ọsọ ahụ. Achọtara m ọrụ n’otu ụlọ ọrụ dị na São Paulo, n’ọgwụgwụ izu ọ bụla n’ime otu afọ, ana m agakwa ogologo 190 maịlụ [300 kilomita] ahụ ije Resende maka inyere ìgwè ahụ nke 15 ndị nkwusa nọ n’ebe ahụ aka. E mesịa, na 1960, anyị kwaghachiri na Resende.
Ịzụlite Ụmụntakịrị—Ihe Ùgwù A Tụkwasịrị Anyị
N’ezie, anyị emeghị atụmatụ inwe ọtụtụ ụmụ otú a, ma n’agbanyeghị nke ahụ anyị mụtara ha, a mụọ otu ọzọ esochie. Mgbe a mụsịrị Alice, a mụrụ Léo, mgbe ahụ, a mụọ Márcia, Maércio, Plínio, André, na n’ikpeazụ, na 1976, ụmụ ejima bụ Sônia na Sofia. Anyị ji obi ụtọ nabata nke ọ bụla n’ime ha dị ka “ihe nketa nke na-esi n’aka Jehova.” (Abụ Ọma 127:3) A zụlitekwara nke ọ bụla ‘n’ịdụ ọdụ nke Jehova’ site n’enyemaka ya.—Ndị Efesọs 6:4.
Otú ọ dị, nke a abụghị ọrụ dị mfe. Mgbe ụfọdụ, anyị na-akwa ákwá n’ihi ihe isi ike dị na ya. Ma ọ bụ ihe na-enyeghachi ụgwọ ọrụ. Olee ụzọ anyị siri zụlite ha? Site n’inwe ọmụmụ ihe ezinụlọ, site n’ịkpọ ha na-aga nzukọ dị iche iche nakwa ozi ubi site na mgbe ha dị na nwata, site n’imekọ ihe n’otu, site n’ijide n’aka na ha nwere ezi ndị enyi, site n’inye ha ịdọ aka ná ntị siri ike, sitekwa n’isetịpụrụ ha ezi ihe nlereanya n’onwe anyị.
N’afọ ole na ole gara aga, n’usoro ihe omume nke otu mgbakọ e mere na Cruzeiro, São Paulo, onye nlekọta sekit jụrụ anyị ajụjụ ọnụ. Mgbe anyị kwusịrị okwu banyere ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị, onye nlekọta sekit ahụ jụrụ m, sị: “Ọrụ dị aṅaa ka nwunye gị rụrụ na nke a?” Echetara m na anya mmiri jupụtara m n’anya, akpịrị gụchikwara m n’ihi mmetụta nke na apụghị m ịza ya. Ọ bụ n’ihi gịnị? N’ihi na enwere m ekele n’ezie maka ọrụ dị oké mkpa Maria José rụrụ n’ime ka ezinụlọ anyị nọgide n’ụkpụrụ ọchịchị Chineke. E wezụga nkwado o ji ikwesị ntụkwasị obi na-enye, n’ezie ọ gaara esiworị ike nke ukwuu!
Malite n’oge anyị kwerịtara nkwa ọlụlụ, mụ na Maria José na-amụkọ Bible ọnụ. Mgbe anyị mụtara ụmụ, ọ ghọrọ oké ihe ịma aka ịnọgide na-enwe ọmụmụ ihe ahụ n’ụzọ chiri anya. Iji nye aka na nke a, kwa izu, ana m amapawa n’ibo ọnụ ụzọ fridge oge a ga-enwe ọmụmụ ihe nke izu na-abịanụ nakwa ihe ọmụmụ a ga-atụle na ha. Ana m ekenye ọrụ ndị pụrụ iche dị ka mkpa ya si dị. Dị ka ihe atụ, otu ụbọchị Márcia na Plínio lụrụ ọgụ mgbe a na-eri nri. Ya mere, n’echi ya, ha hụrụ n’ibo ọnụ ụzọ fridge ahụ ihe omume bụ “Ụzọ gị na ụmụnne gị ga-esi na-adị ná mma.” N’ụbọchị ọzọ anyị nwere ọmụmụ ihe, ha abụọ kwuchara ọnụ ha wee dozie esemokwu ha.
Otu nsogbu ọzọ bụ n’ụtụtụ ụbọchị Sunday mgbe ụmụntakịrị ndị nwoke ahụ na-ekwukarị na ahụ adịghị ha nke na ha agaghị enwe ike ije ozi ubi. Léo na Plínio bụ ndị ọkà n’ichepụta afọ mgbu na ọrịa ndị ọzọ iji zere iso anyị jee ọrụ nkwusa. Mgbe ọ bụla m nwere ihe ịrụ ụka ma hà na-arịa ọrịa n’ezie, ana m ekwu ihe yiri nke a: ‘Ọ bụrụ na ị na-arịa ọrịa nke na ị gaghị enwe ike ije ozi ubi, mgbe ahụ o doro anya na ahụ agaghị adị gị ije gbaa bọọlụ mgbe e mesịrị.’ Dị ka ọ na-adịkarị, ha na-agbake oké ngwa ngwa.
Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị mkpa ka anyị jiri nlezianya lebaa ọnọdụ ụfọdụ anya. Mgbe Léo dị 11 afọ, o sooro Ndịàmà ndị ọzọ jee mkpapụ ntụrụndụ, n’anataghịkwa ikike, ọ zụụrụ pound abụọ [otu kilogram] nke anụ ézì a hakpọrọ ahakpọ ọ ga-eri. Mgbe e mesịrị, mgbe anyị natara akwụkwọ e ji agba anyị ụgwọ ya, Maria José jụrụ Léo, sị: “I chefuru echefu na ị zụrụ anụ ézì ahụ?” “Ee e,” ka ọ zara dị ka onye na-emeghị ihe ọjọọ ọ bụla. “Ọ dịghị ihe m zụrụ.” Nne ya sịrị, “Ọ dị mma, ka anyị jee hụ onyenwe ụlọ ahịa ahụ.” Mgbe ha nọ n’ụzọ, ọrịa nchefu ihe nke Léo lara. Ọ kwupụtara, sị, “Oo echetala m ugbu a. Ego m ji mgbe ahụ ezughị ezu, m wee zụrụ ya n’aka ma chefuo ịkwụ ụgwọ ya.” Akwụrụ m ụgwọ ahụ n’onwe m wee gwa onyenwe ụlọ ahịa ahụ ka o were Léo n’ọrụ, ka ọ rụọrọ ya ọrụ ruo mgbe ọ kpatara ego zuru ezu iji kwụghachi m ụgwọ. Nke ahụ bụ ahụhụ e nyere ya. Kwa ụtụtụ, n’elekere anọ, Léo na-abụ onye mbụ na-abịarute ọrụ, mgbe otu ọnwa na-agwụsịkwa, ọ kwụghachiri m ego ahụ dum.
Mgbe nile, ụlọ anyị na-ejupụta ná ndị ọsụ ụzọ, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ndị ozi ala ọzọ, na ndị Betel. Ọtụtụ mgbe, anyị enweghị telivishọn n’ụlọ, nke a nyekwaara anyị aka iwulite ezi àgwà ịmụ ihe na àgwà ndị Kraịst. Ọ bụ na gburugburu ebe dị otú a ka anyị zụlitere ụmụ anyị. Ụfọdụ n’ime akwụkwọ ozi ndị ha na-edetara anyị mgbe ha tolitesịworo gosiri na ọ rụrụ nnọọ ọrụ nke ọma.—Lee igbe dị na peji 30.
Ịmaliteghachi Ọrụ Ọsụ Ụzọ!
Mgbe ihe ka ọtụtụ n’ụmụ anyị toliteworo, echetara m otu isiokwu dị ná mbipụta March 1, 1955, nke Ụlọ Nche (Bekee) nke bụ “Ije Ozi Oge Nile Ọ̀ Dịịrị Gị?” Nke a kwuru n’otu akụkụ, sị: “Ụfọdụ ndị pụrụ ịdị na-ele ozi oge nile anya dị ka ihe a na-arụ nanị n’ọnọdụ pụrụ iche. Ma na nke a, echiche ha ezighị ezi n’ihi na site ná nkwa nraranye ahụ o kwere, onye Kraịst ọ bụla nwere ibu ọrụ nke ije ozi oge nile, ọ gwụlakwa ma ọnọdụ ndị ọ na-apụghị ịgbanwe o mere ka ọ ghara ikwe ya omume.”
N’otu anyasị, ekpekuru m Jehova ekpere ka o megheere m ụzọ ịbanyeghachi n’ozi oge nile. Ezinụlọ m nyere aka, ndị enyi anyị gbakwara m ume. N’ịbụrụ m oké ihe ijuanya, onyeisi ụlọ ọrụ ebe m rụworo ọrụ ruo 26 afọ kwere ka m na-arụ ọrụ nwa oge ka m wee nwee ike ije ozi dị ka onye ọsụ ụzọ oge nile. Ya mere eji m obi ụtọ nara ọrụ ahụ nke ọ dịrị mkpa ka m hapụ ọtụtụ afọ gara aga. Atọ n’ime ụmụ anyị gbasokwara ihe nlereanya m.
Anyị jere ozi ruo afọ abụọ n’obodo Itatiaia, bụ́ ebe m bụworo okenye ọgbakọ ruo 15 afọ, mgbe ahụ, anyị kpebiri ịkwapụ iji jee ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu. Nke a pụtara iji obere ụgwọ ezumike nká na-ebi ndụ, bụ́ nke ya na otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ezigbo ụgwọ ọnwa hà. Otú o sina dị, n’ịtụkwasị obi ná nkwa Jisọs nke dị na Matiu 6:33, anyị degaara Society akwụkwọ banyere atụmatụ anyị na-eme. Mgbe otu izu gasịrị, ọ fọrọ nke nta ka anyị malie elu n’ihi ọṅụ mgbe anyị natara nzaghachi ha: “O yiri anyị ihe ezi uche dị n’ime ya ịtụ aro ka unu kwaje obodo Lages. N’agbanyeghị na e nwere ihe karịrị 200,000 mmadụ bi n’ebe ahụ, e nwere nanị 100 ndị nkwusa nọ n’ọgbakọ nta atọ. Ị ga-abụ oké ihe enyemaka n’ókèala ahụ.”
Anyị kwafere ebe ahụ na February 1988. Anyị ka nọkwa n’ebe a, ihe karịrị 600 maịlụ [1,000 kilomita] site n’ebe ụmụ anyị na ndị enyi anyị nọ. Anyị ka gabigasịrị oge oyi kasị njọ e nweworo n’ime 20 afọ. Ọ bụ nanị m bụ okenye e nwere n’ọgbakọ ahụ, ya mere e nwere ọrụ dị ukwuu a ga-arụ. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, anyị nwere nnọọ ngọzi dị ukwuu. Nke kasị enye ọṅụ bụ ókèala ahụ. Mgbe anyị kụrụ aka n’ọnụ ụzọ ha, ndị ebe ahụ na-asị: “Biko batanụ!” Ọ na-adị mfe ịmalite ọmụmụ Bible. Anyị na-anata ụmụ ihe dị iche iche dị ka onyinye mgbe ego na-adịghị, anyị alọtawokwa, na-eji ncha, ihe e ji achụ ísìsì ọjọọ, mma agụba, uwe ụmụaka (maka nwa nwa anyị), ihe ọṅụṅụ dị iche iche e ji ọka mee, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi, mmiri ara ehi a kwadebeworo n’ụdị yogurt, mmanya, na ọbụna ice cream. N’otu mgbe, anyị natara obere oche osisi dị iche iche!
Mkpụrụ Nke Na-eweta Nkwụghachi Ụgwọ n’Ụba
Taa, mgbe m gbaworo 56 afọ, ọ na-abụrụ m ihe oké mkpali mgbe ọ bụla m tụlere ihe banyere ezinụlọ anyị. Ụmụntakịrị ahụ abụghị “ndị a mụrụ n’eziokwu ahụ.” A mụrụ ha n’ime ezinụlọ ndị Kraịst, ọ dịkwa mkpa ịkụnye eziokwu ahụ n’ime uche na n’obi ha nke ka na-eto eto. Ndị lụworo di ma ọ bụ nwunye n’ime ha mere otú ahụ “n’ime Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 7:39; Deuterọnọmi 6:6, 7) N’eziokwu, anyị mehiere ihe ụfọdụ n’ime mkpebi. Mgbe ụfọdụ anyị mere ihe n’ikpe na-ezighị ezi. Mgbe ụfọdụ esetịpụghị m ihe nlereanya kachasị mma, gbakụtakwa ibu ọrụ m azụ dị ka nna na onye bụ di. Mgbe m chọpụtara ihe m meworo, ana m arịọ mgbaghara n’aka Jehova na n’aka nwunye m ma ọ bụ ụmụ m, ana m emekwa mgbalị imezi ihe ahụ m mejọrọ.
N’agbanyeghị ezughị okè nile anyị, ezinụlọ anyị—nke a mụbawanyeworo ugbu a site ná ndị di ụmụ anyị, ndị nwunye ụmụ anyị, na ụmụ ụmụ—nwere mmadụ isii ndị nọ n’ozi oge nile, ndị okenye ọgbakọ anọ, na otu ohu na-eje ozi. Mmadụ nile, e wezụgakwa ụmụ ụmụ anyị, emewo baptism. Obere ụmụntakịrị atọ ndị anyị na ha ka nọ na-eme atụmatụ ịbanye ozi oge nile dị ka ọrụ ha ga-arụ ná ndụ. Olee nkwụghachi ụgwọ dị ukwuu karịa nke a nke mmadụ pụrụ ịtụ anya ya? Ana m ekele Jehova maka iduzi anyị n’ịzụlite ụmụ anyị n’ịdụ ọdụ ya. Ọ na-abụrụ anyị ihe mkpali ịhụ na ha ka na-agbaso ozizi ya nile. Ana m ekpekwa ekpere ka anyị, dịkwa ka ha onwe ha, ghara ichigharị mgbe ọ bụla pụọ n’ụzọ nke ndụ.
[Igbe dị na peeji nke 30]
Mgbe ha tolitesịrị, ụmụ anyị na-egosipụta obi ekele ha mgbe ụfọdụ site n’akwụkwọ ozi ndị ha na-edeta maka ụzọ anyị si zụlite ha. Ndị a bụ okwu ole na ole ha kwuworo:
“Papa, jide n’aka na gị na Mama mere ihe kachasị mma unu pụrụ imewororị anyị, ọ bụ ezie na unu pụrụ imehieworịị ihe ụfọdụ—bụ́ ihe na-emekwa ọtụtụ mgbe ugbu a n’ebe mụ na Carlos nọ n’ịzụlite nwa anyị nwoke bụ Fabrício.”
Nwa m nwanyi bụ Alice, 33, nne nke ụmụ abụọ.
“Anyị aghaghị ịnakwere na unu jikọrọ aka mee ihe n’ịzụlite anyị n’ịdụ ọdụ nke Jehova. Leekwa nnọọ ka anyị si na-erite uru ya nke ukwuu ugbu a!”
Nwa m nwanyi bụ Márcia, 27, na di ya, onye nọ n’ọrụ sekit.
“Amatara m na ihe ùgwù m nwere ugbu a agaraghị ekwe omume ma e wezụga enyemaka unu abụọ nyere m iji guzobe ezi ntọala ime mmụọ na ịhụnanya n’ebe Jehova na ije ozi ya dị.”
Nwa m nwoke bụ Maércio, 23, onye ọsụ ụzọ pụrụ iche.
“André, jiri mkpakọrịta gị na Papa na ahụmahụ ya mere ihe n’ụzọ zuru ezu. Eledala ndụmọdụ ya anya mgbe ọ bụla. Unu ga-enwe ike inyerịtara ibe unu aka. Enwere m obi ụtọ ugbu a karịa otú m nwetụworo mgbe ọ bụla.”
Nwa m nwoke bụ Plínio, 20, onye nọ na Betel.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 26]
Foto: MOURA
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 27]
Foto: CALINO