Jehova Gọziri Mkpebi M
Dị KA RICHARD WUTTKE SI KỌỌ
“Ị gaje ịnwụ n’ime ọnwa atọ! “Gịnị ka ị na-ekwu?”
Nwanne m nwoke bụ William zaghachiri, sị, “Nke ahu bụ ihe onye dọkita ahụ i jekwuuru n’Assis gwara m.”
MA ACHỌRỌ m ịdị ndụ, ọ bụghị ịnwụ anwụ. Na nke mbụ ya, ekpekuru m Chineke ekpere maka enyemaka. Ọ bụ ihe obi ụtọ na mgbe 46 afọ gasịrị, apụrụ m ikwu na, ọ bụ ezie na onye dọkịta ahụ agwaghị m ihe bụ nsogbu m, nchọpụta ọrịa o mere ezighị ezi. Otú ọ dị, iyi egwu ahụ mere ka m chee echiche banyere ihe bụ nzube m ná ndụ na mkpa ọ dị ijere Onye Okike anyị ozi.
Ezinụlọ nke Nọ na Njem
Mgbe a mụrụ m na November 11, 1921, ndị mụrụ m bi na Grosen, bụ́ otu obodo nta dị n’ọwụwa anyanwụ Germany. Ọ bụ ndị si Germany kwaga Russia mụrụ ha. Ma mgbe mgbanwe ọchịchị ndị Bolshevik nke 1917 ahụ webatara ọchịchị ndị Kọmunist, a chụpụrụ ha na ndị ọzọ bụ ndị Germany, ihe nile ha nwere wee funarị ha. Mgbe ha gasịrị ogologo njem e ji ụgbọ okporo ígwè nke na-ebu ngwongwo wee gaa, ndị mụrụ m na obere ụmụ ha rutere n’ókèala nke Germany. Otú ọ dị, a jụrụ na ha agaghị abata, o wee dị mkpa ka ha gaa njem laghachị Russia. N’ebe ahụ, a jụkwara na ha agaghị abanyeghachi, ya mere ha laghachikwara Germany. Mgbe ọtụtụ ọnwa nke ihe isi ike gasịrị, e mesịrị kwere ka ha banye ná mba ahụ.
Mgbe m dị afọ iri, nna m nwụrụ. Mgbe afọ abụọ gasịrị, na 1933, Hitler banyere n’ọchịchị, a manyekwara m isonyere òtù Ndị Na-eto Eto bụ ndị Nazi. N’oge ọchịchị Hitler, e nwere ihe isi ike nye ndị Germany a mụrụ ná mba ndị ọzọ, e nwekwara ihe àmà ndị na-egosi na Germany nọ na-eme nkwadebe maka agha ọzọ. Ya mere, anyị kpebiri ịkwaga Brazil, ebe anyị nwetara agbamume site n’aka ndị ọzọ kwajeworo ebe ahụ. Anyị bịarutere na Santos, Brazil, na May 1936.
Mgbe anyị rụsịrị ọrụ ọnwa ole na ole n’otu ugbo kọfị, anyị zụtara otu ubi nta nke dị n’ógbè na-emepụta nri nke dị nso Maracaí, na steti nke Sào Paulo. Mgbe anyị na-ewu ụlọ nke anyị, anyị binyeere otu onye ụkọchukwu okpukpe Lutheran. Ọ gbara anyị ume ịbịa chọọchị ya, ma mgbe ma ya ma onye mesịrị nọchie anya ya malitere ikwu okwu banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’okwuchukwu ha, anyị hapụrụ chọọchị ahụ.
Nzute Mbụ Anyị Zutere Eziokwu Bible
Ọ bụ n’ihe dị ka oge a ka nwanne m nwoke gwara m banyere ajọ nchọpụta onye dọkịta ahụ mere. Ya mere, ejere m Sáo Paulo ka m nụ ihe onye ọzọ ga-ekwu. N’oge m nọ n’ebe ahụ, Otto Erbert, bụ́ enyi nke ezinụlọ mụ na ha bi, bịara leta ha. Ọ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ọ malitekwara ịgbara anyị àmà. Otú ọ dị, ezinụlọ ahụ enweghị mmasị n’ihe ọ na-ekwu, ha hapụkwara ime ụlọ ahụ n’otu n’otu, na-ahapụ nanị mụ na onye bịara ileta ha.
Otto gwara m okwu ihe ruru hour abụọ n’isiokwu ndị metụtara ọkụ ala mmụọ; anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi; ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova; Alaeze ya; na olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala nke bụ paradaịs. Lee nnọọ ọdịnihu dị mma ọ kọrọ banyere ya! Lee nnọọ ka o si dị iche n’ihe m mụtaworo na Chọọchị Lutheran! N’ikpeazụ, Otto jụrụ m, sị: “Ì kweere n’ozizi ụgha nile nke Krisendọm ka ọ̀ bụ na Bible?”
Azara m, sị, “Na Bible.”
Ọ gbara m ume, sị, “Ya bụrụ otú ahụ, mụọ ya!” kwuokwa, sị: “Ọ bụrụkwa na ị chọrọ ịnụkwu ihe banyere ya, bịa n’ụlọ m.” Ebe ọ bụ na ihe m nụworo masịrị m, karịsịa ihe banyere ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala, ejere m ịhụ ya n’echi ya. Mkparịta ụka nke abụọ ahụ mere ka m kwere na achọtawo m ‘eziokwu ahụ nke na-eme ka ihe a kpọrọ mmadụ pụọ n’ohu.’ (Jọn 8:32) Eji m otu akwụkwọ nta hapụ ebe ahụ, bụ́ Health and Life, tinyekwara ọkpụkpọ òkù ka a malitere m ọmụmụ Bible n’asụsụ German.
Imezu Ọchịchọ M Kasị Dịrị Omimi
Ka ọ dịgodi mgbe ahụ, enwetara m nlekọta ahụ ike dị mma wee nwee ike ịlaghachi. Akpọọrọ m Otto Erbert laa maka ezumike. Nne m nwere obi ụtọ nke ukwuu na m na-amụ Bible, bụ́ akwụkwọ ahụ nke na-atọgbọ n’elu table anyị mgbe dum ma ọ dịghị onye na-agụ ya agụ. Mgbe Otto laghachisịrị Sào Paulo, eduziiri m ezinụlọ m ọmụmụ Bible ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’abalị nile ruo ókè m pụrụ ime. Enwere m ọṅụ nke ukwuu mgbe nne m, nwanne m nwoke bụ Robert, na nwanne m nwanyị bụ Olga nakweere ozi nke eziokwu ahụ. Ụlọ anyị na-abụbu ebe a na-anọkarị enwe nnọkọ oriri na ọṅụṅụ, ma mgbe ọnwa abụọ nke ịgba àmà anyị gasịrị, ọ fọziri nke nta ka ọ tọgbọrọ chakoo. Otu n’ime ndị ahụ na-abịabu n’ụlọ anyị sịrị: “Ọ bụrụ na unu anọgide n’ihe nke a, njedebe unu ga-abụ n’ụlọ ọgwụ ndị isi mgbaka!”
Otú ọ dị, ọchịchọ m nwere ijere Jehova ozi nọgidere na-amụbawanye. Anatakwuru m akwụkwọ ndị ọzọ, ana m agụrụkwa akwụkwọ ruo etiti abalị. Ma akwụkwọ ndị ahụ nile bụ n’asụsụ German, aghọtakwara m na ka m wee nwee ike izi ndị ọzọ ihe, ọ ga-adị mkpa ka m mụọ asụsụ Portuguese. Ya mere, na 1945, akwafere m Sào Paulo ka m wee mụọ asụsụ Portuguese. Mụ na Otto Erbert biri, bụ onye mesịrị lụọ nwanne m nwanyị bụ Olga.
Esonyeere m ihe dị ka 50 mmadụ ndị ọzọ wee malite ije nzukọ dị iche iche na nanị Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ e nwere na Sáo Paulo. Otu ọgbakọ ahụ etowo ugbu a gaa n’ihe karịrị 510 ọgbakọ n’ógbè Sào Paulo, na-enwe ihe karịrị 50,000 ndị nkwusa Alaeze. Na January 6, 1946, emere m baptism dị ka ihe àmà nke nrara m raara onwe m nye ime uche Chineke. N’otu afọ ahụkwa, ejere m Mgbakọ Ọchịchị Chineke nke “Mba Ndị Nwere Ọṅụ” na São Paulo, bụ́ mgbakọ ukwu mbụ m jere. Lee nnọọ ihe mkpali ọ bụ ịhụ 1,700 mmadụ ndị bịara na Sunday! Ná mgbakọ a, ezutere m Otto Estelmann, onye gbara m ume, sị: “Richard, ị bụ nwa okorobịa; ahụ gbasiri gị ike; ya mere ghọọ onye ọsụ ụzọ.”
Echewo m echiche banyere ije ozi oge nile mbụ, ma ugbu a, echesiri m echiche ike banyere ya. Tinyere mmadụ abụọ ndị ọzọ, e setịpụrụ m oge ịmalite ya mgbe ọnwa isii gasịrị. Mgbe oge ahụ ruru, ajụrụ m, sị: “unu dị njikere ịmalite?” Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha dị njikere. Ya mere, agwara m ha na agaje m ịmalite n’agbanyeghị nke ahụ. Ha dọrọ m aka ná ntị, sị, “Ị ga-enwe ọtụtụ ihe isi ike.” Ma anọgidere m ná mkpebi m. Na May 24, 1947, anatara m ọrụ dị ka onye ọsụ ụzọ oge nile.
Ọnụ Ụzọ Ije Ọzi Ndị Ọhụrụ Emeghee
Ókèala m buru oké ibu, gụnyere ógbè ebe ndị mmadụ bi na ebe e nwere ụlọ ahịa dị iche iche na São Paulo. Etinyere m ọtụtụ narị akwụkwọ kwa ọnwa. N’otu ụtụtụ, abanyere m n’otu nnukwute ime ụlọ ebe ọtụtụ ndị ikom nọ na-arụ ọrụ. Ejekwuuru m nwoke nke mbụ wee chee ya akwụkwọ ahụ bụ “The Truth Shall Make You Free” n’ihu.
Ọ jụrụ m, sị, “Akwụkwọ ole ka i nwere n’akpa gị?”
Azaghachiri m, sị, “Ihe dị ka 20.” O weere ha nile ma nye onye ọ bụla nọ n’ebe ahụ otu otu. Emesịrị m chọpụta na ebe ahụ bụ ụlọ nzukọ obodo!
Otú ọ dị, ọṅụ m kasị ukwuu na-abịa site n’iduzi ọmụmụ Bible ebe obibi. N’ime afọ anọ, site n’enyemaka Jehova, 38 n’ime ndị ahụ m duziiri ọmụmụ ihe mere baptism. Ọtụtụ n’ime ha malitere ije ozi oge nile. Otu n’ime ha bụ Afonso Grigalhunas, onye jere ozi ihe karịrị afọ iri dị ka onye ọsụ ụzọ inyeaka, ruo mgbe ọ nwụrụ na 1988—o bukwa ụkwụ e ji osisi mee n’oge a nile. E nwekwara ezinụlọ Ciuffa. Francisco, bụ nwa ha, jere ozi ruo ọtụtụ afọ dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, nwanne ya nwanyị, bụ Ângela, ka bụkwa onye ọsụ ụzọ.
Na 1951 a kpọrọ m òkù ịbụ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị. Ebe e kenyere m ọrụ gụnyere akụkụ dị ukwuu nke steti Rio Grande do Sul na Santa Catarina. Ọtụtụ puku ndị si Europe bi n’ebe ahụ n’ebe ndịda Brazil. Ihe ka ọtụtụ ná nleta ndị ahụ bụ nke e jere leta mmadụ na ìgwè ndị dịpụrụ adịpụ, ebe ọ bụ na e nwere nanị ọgbakọ ole na ole n’oge ahụ. E nwere ọtụtụ osimiri, ma ọ bụ nanị àkwà mmiri ole na ole ka e nwere, nke pụtara na m na-eji ụkwụ gafee ndị dịtụ nta karị, na-ebu igbe m n’azụ, burukwa ígwè typewriter na akpa m n’aka. E mezighị ụzọ ndị dịnụ emezi, ha jupụtakwara n’olulu. Iji mee ka ntụ ahụ ghara imebi uwe m, ana m eyi obere uwe elu na-ekpuchi ahụ. Nke a mere ka ụfọdụ ndị chee na m bụ onye ụkọchukwu ọhụrụ ha, ha na-anwakwa isutụ ọnụ n’aka m.
Ịkwado Ọdịmma Alaeze
Ka m nọ na-agbalị ile ihe isi ike dị iche iche anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị, agbasoro m ụkpụrụ nke a: Ọ bụrụ na ndị ọzọ pụrụ ibi n’ebe dị anya otú a site n’obodo ukwu, na-aga ije n’okporo ụzọ nta ndị a, na-agafekwa osimiri ndị a, n’ihi gịnị ka m na-agaghị enwe ike ime otú ahụ, karịsịa ebe ozi m na-eweta dị oké mkpa otú a?
Ihe isi ike ndị dị nnọọ iche na-ebilite mgbe mgbe n’obodo ndị dị nta karị. Dị ka ihe atụ, otu mgbe, anyị mere ndokwa inwe nzukọ n’ụlọ akwụkwọ dị n’otu ime obodo nke dị nso otu ogige ntụrụndụ. N’akụkụ nke ọzọ nke ogige ahụ, e nwere otu ụlọ ịṅụ mmanya na otu ụlọ chọọchị Katọlik. Mgbe onye nkuzi na-abịaghị imeghe ọnụ ụzọ ụlọ akwụkwọ ahụ, ekpebiri m ịnọ na ogige ahụ wee kwuo okwu. Nwa mgbe nta mgbe okwu ahụ malitesịrị, ndị ikom isii si n’ụlọ mmanya ahụ pụta wee malite iti mkpu na ifegharị aka ha. Anyị mesịrị nụ na ọ bụ onye ụkọchukwu kwụrụ ha ụgwọ ime nke a.
Amalitere m ikwusikwu okwu ike, na-agwa ha okwu kpọmkwem. Ha kwụsịrị, otu n’ime ha wee sị: “Ọ na-ekwu okwu banyere Chineke, gịnị mere onye ụkọchukwu ahụ ji kwuo na ọ bụ onye Ekwensu?” Mgbe ọnye ụkọchukwu ahụ hụrụ na ndị ikom ahụ agajeghị ịkwụsị nzukọ ahụ, ọ banyere n’ụgbọ ala jeep ya wee na-agba gburugburu ogige ahụ, na-eti mkpu, sị: “Onye ọ bụla bụ onye Katọlik ekwesịghị ịnọ ná nzukọ a!” Ọ dịghị onye megharịrị ahụ, nzukọ ahụ gakwara n’ihu n’udo.
N’obodo Mirante do Paranapanema, Sào Paulo, ejekwuuru m onyeisi ndị uwe ojii iji kọwaa otú ọrụ anyị si aga nakwa iji rịọ maka otu ụlọ nzukọ anyị ga-eji mee ihe maka okwu ihu ọha. O mere ndokwa ka anyị jiri otu ụlọ nzukọ ọha mee ihe. Anyị gwara ya na anyị gaje ịkwadebe mpempe akwụkwọ ndị anyị ga-eji kpọsaa okwu ihu ọha ahụ. Ọ jụrụ, sị, “Olee akụkụ ebe unu ga-ekesa ha?” Mgbe anyị gwasịrị ya, ọ rịọrọ ka e nye ya ụfọdụ ndị ọ ga-ekesa n’akụkụ ọzọ nke obodo ahụ. Na Sunday, ọ bịara maka okwu ahụ, ọ kpọkwa ndị uwe ojii abụọ bịa, dị ka o kwuru, “iji hụ na ihe gara n’usoro.”
Ọ jụrụ, sị, “Ị̀ chọrọ m ka m jee kpọpụta okwu gị?”
Azaghachiri m, sị, “Nke ahụ ga-amasị m nnọọ, ma, ka m kọwaa otú anyị na-esi akpọpụta ndị ọkàokwu anyị.” Mgbe ọ kpọpụtasịrị m, ọ nọdụrụ ala n’ikpó okwu ahụ ige ntị. N’eziokwu, ndị ahụ na-ege ntị kpara nnọọ ezi àgwà. Anyị enweghị nsogbu ọ bụla n’ebe ahụ, ebe ndị uwe ojii abụọ guzo n’ọnụ ụzọ, onyeisi ndị uwe ojii nọkwa n’ikpó okwu, na-ele ihe na-aganụ!
Na March 1956, a họpụtara m dị ka onye nlekọta distrikti, elekọtakwara m mgbakọ ndị e mere gburugburu Brazil dum. Njem a na-aga na-adị ogologo. N’otu mgbe, o were ụbọchị atọ isi n’otu mgbakọ gaa na nke ọzọ. N’ebe ugwu nke mba ahụ, mgbe ụfọdụ a na-eji ụgbọ ala station wagon na-aga njem. Ụgbọ ala ndị a adịghị enwe windo, ya bụ na ikuku na-abata ha nnọọ nke ọma, nke bụ nnọọ echiche dị mma, n’ihi na ndị njem ahụ na-agụnye ọkụkọ na ézì!
Gilead Ewusiwanye Mkpebi M Ike
Lee nnọọ ihe mkpali ọ bụụrụ m na 1958 ije Watchtower Bible School of Gilead! Klasị nke anyị gụsịrị akwụkwọ n’oge ọkọchị afọ ahụ n’oge mgbakọ ahụ e mere na Yankee Stadium na Polo Grounds, bụ ebe 253,922 mmadụ ndị sitere na 123 mba dị iche iche bịara ịnụ okwu ihu ọha ahụ. Lee nnọọ oké ihe ọ bụ ikiri! M wee laghachi Brazil, na-ekpebisikwu ike karịa ka ọ dị na mbụ ịnọgide na-akpọsa Alaeze Jehova.
Na 1962 alụrụ m Ruth Honemann, onye jewororị ozi ihe karịrị afọ isii dị ka onyeozi ala ọzọ na Brazil. Kemgbe anyị lụrụ di na nwunye, anọgidewo m na-enweta ọṅụ site n’ihe ùgwù ije ozi ndị ọzọ, na-eduzi ihe ọmụmụ nke Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze na Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ụsụ Ụzọ, tinyekwara ibute ụzọ n’ime ndokwa maka mgbakọ mba na nke mba nile ndị a na-enwe nakwa n’iwu Ụlọ Mgbakọ mbụ e wuru na São Paulo.
Ka ọ dị ugbu a, anyị na-enweta ọṅụ na nke kasị ukwuu n’ọrụ ọchịchị Chineke ndị anyị rụworo dị ka ndị so n’ezinụlọ Betel nke Brazil. N’ileghachi anya azụ n’ihe karịrị 40 afọ nke ije ozi oge nile, nke e tinyere 35 n’ime ha dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, apụrụ m ikwu na ha ejupụtawo n’ọrụ ndị na-enye obi ụtọ, ndị na-enyeghachikwa ụgwọ ọrụ. (Ilu 10:22) Amụtawo m ihe dị ukwuu site ná nzukọ Jehova, gụnyere mkpa ọ dị igosi ọmịiko, ịbụ enyi ọ bụghị onyeisi, ịgharakwa ịbụ onye ji ọrụ n’aka ruo n’ókè nke enweghị ike ilebara mkpa nke ndị ọzọ anya. Ná mmechi, ọ ga-amasị m ikwu, karịsịa, gwa ndị ka na-eto eto, ihe ahụ Nwanna Estelmann gwara m ọtụtụ afọ gara aga, sị: “Ị bụ nwa okorobịa; ahụ gbasiri gị ike; ya mere ghọọ onye ọsụ ụzọ”!
[Foto dị na peeji nke 29]
Ebe anyị bi ugbu a, Betel nke Brazil