Ụzọ Mmụọ Chineke Pụrụ Isi Metụta Gị
“NÁ MMALITE Chineke kere eluigwe na ala. Ala bụkwa ihe na-enweghị ụdịdị na ihe tọgbọrọ n’efu, ọchịchịrị dịkwa n’elu ogbu mmiri ahụ; Mmụọ Chineke na-ejegharịkwa n’elu mmiri ahụ.” (Jenesis 1:1, 2, Revised Standard Version) Okwu nke a dị n’Akwụkwọ nsọ na-eme ka otu ụzọ pụta ìhè nke onye ọ bụla dị ndụ n’elu ala siworo rite uru site ná mmụọ nsọ ahụ. Mmụọ ahụ rụrụ ọrụ n’oge okike ihe, sitekwa n’ịrụ ọrụ ya, elu ala ghọrọ ebe obibi mara mma nye ihe a kpọrọ mmadụ.
Ma ụmụ mmadụ pụrụ irite uru nke ukwuu karị site ná mmụọ nsọ ahụ. Otu ilu nke sitere n’ike mmụọ nsọ na-asị: “Laghachinụ n’ịba mba m: lee, m ga-awụpụrụ unu mmụọ m, m ga-eme ka unu mara okwu m nile.” (Ilu 1:23) N’ụbọchị anyị a, “okwu” Chineke a chịkọtara achịkọta dị adị n’ime Bible Nsọ, nke ụmụ mmadụ dere, bụ́ ndị ‘mmụọ nsọ duziri.’ (2 Pita 1:21; Mak 12:36; 2 Timoti 3:16) Mgbe ọ bụla onye nwere obi umeala gụrụ Bible, ọ na-erite uru site ná mmụọ nsọ ahụ.
Mmụọ Nsọ na Ọrụ Nkwusa ahụ
Mgbe otu n’ime Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ gị ikwu okwu banyere ozi ọma Alaeze ahụ, mmụọ nsọ ahụ pụrụ imetụta ndụ gị n’otu ụzọ ọzọ. Ànyị si aṅaa mara? Ee, mgbe Jisọs malitere ikwusa ozi ọma ahụ, ọ kọwara okwu onye amụma ahụ bụ Aịsaịa banyere onwe ya, na-asị: “Mmụọ nke Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] dị n’ahụ m, n’ihi na o tere m mmanụ izi ndị ogbenye ozi ọma: . . . ikwusa afọ mgbe Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] na-anara mmadụ nke ọma.” (Luk 4:18, 19; Aịsaịa 61:1, 2) Ee, mmụọ nsọ tere Jisọs mmanụ ikwusa ozi ọma ahụ.
Ọzọkwa, Jisọs buru amụma na nkwusa nke ozi ọma ahụ ga-anọgide na-aga n’ihu mgbe ọnwụ ya gasịrị. O buru amụma, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (Matiu 24:14) Nwa mgbe nta tupu Jisọs alagoo n’eluigwe, o nyere ndị na-eso ụzọ ya ọrụ nke a: “Gaanụ, mee [“ndị nke,” NW] mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke mmụọ nsọ: na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke m nyere unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20) Ya mere, mgbe Jisọs lagosịrị n’eluigwe, ndị na-eso ụzọ ya weere ọrụ ahụ nke mmụọ nsọ nyere ikike ya, bụ́ ikwusa ozi ọma na izi ihe, gaa n’ihu. Taa, Ndịàmà Jehova na-eṅomi ndị na-eso ụzọ oge ochie ahụ n’ikwusa ozi ọma ahụ gburugburu ụwa.
Baptism na Mmụọ Nsọ
Mgbe mmadụ naara ozi ọma ahụ nke ọma, Jisọs kwuru na e kwesịrị ime ya baptism “n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke mmụọ nsọ.” Ya bụ na mmụọ nsọ na-enwe mmetụta gaa n’ihu ná ndụ ndị ọhụrụ na-eso ụzọ. Okwu ahụ bụ “n’aha nke” pụtara n’ezie “site n’ikike nke” ma ọ bụ “n’ịmata ọnọdụ nke.”a N’ihi ya, ịbụ onye e mere baptism n’aha nke Nna pụtara ịnakwere n’enweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla ịbụ ọkaaka nke Chineke ná ndụ anyị. Baptism n’aha nke Ọkpara ahụ pụtara ịnakwere Jisọs dị ka Onye Mgbapụta, Onye setịpụrụ ihe nlereanya, na Eze. Ime baptism n’aha mmụọ nsọ ahụ gụnyekwara ịdabere ná mmụọ ahụ na ido onwe onye n’okpuru ike ya.b
Mmụọ Nsọ ahụ ná Ndụ Gị
Ọ bụ ihe mwute ịhụ na emeghị ihe n’eziokwu, ndụ rụrụ arụ, ime ihe ike, na mmebi iwu zuru ebe nile nke anyị na-ahụ ná mba ndị “Kristian” dị iche iche na-eme ka eziokwu ahụ pụta ìhè nke bụ na ihe ka ọtụtụ n’ime ndị ahụ na-akpọ onwe ha ndị Kraịst na-eguzogide mmụọ nsọ ahụ n’ezie. Ma ndị ahụ na-edo onwe ha n’okpuru ya na-enweta ngọzi dị ukwuu. Otu ihe bụ na ha na-eji ihe ha gụtara na Bible nke mmụọ ahụ kpaliri odide ya kpọrọ ihe nke ukwuu, na-etinyekwa ya ná ndụ ha. Otú a, ha nwere amamihe, nghọta, ike ime mkpebi, akọ, ihe ọmụma, na ike iche echiche. (Ilu 1:1-4) Ndị a bụ ihe onwunwe bara uru n’ime oge anyị a nke dị ná nsogbu.
Mmụọ nsọ ahụ na-enyekwara ndị dị otú a aka imeri ihe isi ike dị iche iche. N’oge ochie, Chineke ziri ndị ya ụzọ ha ga-esi nwee ike ịrụzu ọrụ siri oké ike. Jehova kwuru na a ga-eme ya “ọ bụghị site n’usuu ndị agha, ọ bụghịkwa site n’ike, kama ọ bụ site ná mmụọ [ya].” (Zekaraịa 4:6) Ọ bụrụ na anyị edoo onwe anyị n’okpuru Chineke na mmụọ ya, a ga-enyekwara anyị aka ịrụzu ọrụ dị iche iche, meriekwa ihe isi ike ndị gaara abụworị ihe karịrị ike anyị.—Matiu 6:33; Ndị Filipaị 4:13.
N’ịga n’ihu, mmụọ Chineke na-enyere anyị aka inwe nnwere onwe nke ụwa dum na-amaghị ihe banyere ya. Pọl onyeozi dere, sị: “Ebe mmụọ nke Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] nọ, n’ebe ahụ ka mmadụ nweere onwe ha.” (2 Ndị Kọrint 3:17) Ndị ahụ na-edo onwe ha n’okpuru mmụọ Chineke na-enwere onwe ha pụọ n’okpukpe ụgha, nkwenkwe ụgha, egwu nke ọdịnihu, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-eme ka mmadụ bụrụ ohu. Mmụọ Chineke bụ n’ezie ike nke na-eme ezi ihe! Ọ pụrụ ọbụna ịgbanwe ndị mmadụ. Bible kwuru ihe metụtara nke a mgbe ọ sịrị: “Mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obi ọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi [“okwukwe,” NW], ịdị nwayọọ, imeru ihe n’ókè: ọ dịghị iwu na-emegide ihe nile dị otú a.” (Ndị Galetia 5:22, 23) Lee nnọọ ka ụwa nke a ga-esi bụrụ ebe dị iche ma a sị na onye ọ bụla na-edo onwe ya n’okpuru mmetụta nke mmụọ Chineke!
Dị ka otu ìgwè, ezi ndị Kraịst na-enwekwa “ịdị n’otu nke mmụọ nsọ n’ime ihe okike nke bụ udo.” (Ndị Efesọs 4:3) Ịdị n’otu na udo bụ ihe ndị a na-adịghị ahụkebe taa. Ma ha dị adị n’ebe mmụọ Chineke na-arụsi ọrụ ike. N’eziokwu, n’etiti Ndịàmà Jehova ihe nkekọta ịdị n’otu nke mmụọ nsọ ahụ ejikọtawo ndị sitere n’agbụrụ nile, asụsụ nile, na mba nile bịa n’ịbụ otu ezi “òtù ndị bụ ụmụnna.”—1 Pita 2:17.
Mmụọ Chineke na Gị
Ị̀ na-ahụ abamuru nke inwe amamihe Chineke nyeworo na nke inwe ezi nnwere onwe? Ọ́ gaghị abụ ihe dị ebube inweta enyemaka Chineke n’imeri ihe isi ike nile na iwulite ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obi ọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, na imeru ihe n’ókè? Ya bụrụ otú ahụ, doo onwe gị n’okpuru ike nke mmụọ nsọ Chineke. Ma olee ụzọ mmadụ pụrụ isi mee nke a?
Kwere ka Okwu Chineke, bụ́ Bible, nwee ike n’uche na n’obi gị. Soro ndị ahụ na-ekwe ka mmụọ nsọ ahụ nwee ike ná ndụ ha na-akpakọrịta. Mee ihe ugbu a iji mụta, na-emekwa uche Chineke. Mgbe ahụ, ka “Chineke nke olileanya ahụ mejuo [gị] n’ọṅụ nile na udo nile n’ikwe ekwe, ka [ị] wee nwebiga olileanya ahụ ókè, n’ike mmụọ nsọ.”—Ndị Rom 15:13.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Tụlee okwu Bekee ahụ bụ “n’aha nke iwu,” ma a sụgharịa ya. Leekwa Matiu 10:41 ebe Jisọs jiri okwu ndị ahụ bụ “n’aha onye amụma” na “n’aha onye ezi omume” mee ihe.
b Lee okwu Pita gwara ndị Juu na Pentikọst nke 33 O.A., mgbe ọ kọwara akụkụ dị iche iche nke ọrụ Jisọs na nke mmụọ nsọ ahụ nwere ịrụ ná ndụ nke ndị kwere ekwe e mere baptism. Mgbe o kwusịrị okwu, e mere 3,000 mmadụ baptism n’aha nke Nna, na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ.—Ọrụ 2:14-42.