Ije Ije Site na Mmụọ Nsọ Na-eme Ka Anyị Na-ebi Ndụ Kwekọrọ ná Nrara Anyị Raara Onwe Anyị Nye Jehova
“Nọgidenụ na-eje ije site na mmụọ nsọ, unu agaghịkwa emezu ọchịchọ anụ ahụ́ ọ bụla ma ọlị.”—GAL. 5:16.
1. Olee baptizim abụọ e mere ndị mmadụ n’ụbọchị Pentikọst?
MGBE ndị na-eso ụzọ Jizọs malitere ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche n’ụbọchị Pentikọst nke afọ 33 O.A. bụ mgbe e jirila mmụọ nsọ mee ha baptizim. Ha malitekwara ịrụ ọrụ ebube dị iche iche. (1 Kọr. 12:4-10) Olee ihe nke a na okwu ahụ Pita kwuru rụpụtara? Okwu ahụ ‘dụrụ ọtụtụ n’ime ha adụ n’obi.’ Pita gbara ha ume ka ha gbanwee ndụ ha, ha echegharịa, e wee mee ha baptizim. Baịbụl sịrị: ‘E mere ndị ji obi ha niile nabata okwu ya baptizim, a tụkwasịkwara ihe dị ka puku mkpụrụ obi atọ n’ụbọchị ahụ.’ (Ọrụ 2:22, 36-41) Dị ka Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha na-eme, e mere ndị ahụ baptizim n’ime mmiri n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke mmụọ nsọ.—Mat. 28:19.
2, 3. (a) Kọwaa ihe dị iche n’iji mmụọ nsọ eme mmadụ baptizim na ime mmadụ baptizim n’aha nke mmụọ nsọ. (b) Taa, gịnị mere e ji kwesị ime ndị niile ghọrọ ezigbo Ndị Kraịst baptizim n’ime mmiri?
2 Ma, ò nwere ihe dị iche n’iji mmụọ nsọ eme mmadụ baptizim na ime mmadụ baptizim n’aha nke mmụọ nsọ? Ee. Ndị e ji mmụọ nsọ mee baptizim bụ ndị a mụrụ ọzọ, ya bụ, ndị Chineke ji mmụọ nsọ mụta. (Jọn 3:3) E tere ha mmanụ ka ha na Kraịst bụrụ eze, bụrụkwa ndị nchụàjà n’Alaeze eluigwe, ha bụkwa ndị mmụọ nsọ mere ka ha na ya bụrụ otu ahụ́. (1 Kọr. 12:13; Gal. 3:27; Mkpu. 20:6) Ya mere, baptizim nke a, ya bụ, baptizim nke e ji mmụọ nsọ mee mmadụ, bụ ya ka Jehova mere ụmụ mmadụ n’ụbọchị Pentikọst nakwa ka oge na-aga, mgbe ọ họọrọ ndị ha na Kraịst ga-abụ eze n’Alaeze eluigwe. (Rom 8:15-17) Oleekwanụ maka baptizim a na-eme n’ime mmiri n’aha nke mmụọ nsọ, bụ́ nke a na-emekarị ndị mmadụ ná mgbakọ dị iche iche ndị Jehova na-enwe taa?
3 A na-eme ezigbo Ndị Kraịst baptizim n’ime mmiri iji gosi na ha ararala onwe ha nye Jehova Chineke kpamkpam. A na-emekwa ya ndị a kpọrọ òkù ịga eluigwe. N’oge anyị a, a na-ejikwa mmiri eme ọtụtụ nde ndị ikom na ndị inyom baptizim, bụ́ ndị nwere olileanya ibi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. Ma mmadụ ò nwere olileanya ịga eluigwe ma ọ bụkwanụ ibi n’ụwa, a ghaghị ime ya baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ ka ya na Chineke wee dị ná mma. Ndị Kraịst niile e mere baptizim a kwesịrị ‘ịnọgide na-eje ije site na mmụọ nsọ.’ (Gụọ Ndị Galeshia 5:16.) Ị̀ na-eje ije site na mmụọ nsọ ma na-ebi ndụ kwekọrọ ná nrara ị raara onwe gị nye Jehova?
Ihe Ije “Ije Site na Mmụọ Nsọ” Pụtara
4. Gịnị ka ije “ije site na mmụọ nsọ” pụtara?
4 Ije “ije site na mmụọ nsọ” pụtara mmadụ ikwe ka mmụọ nsọ na-arụ ọrụ n’ahụ́ ya, ya bụ, mmadụ ikwe ka mmụọ nsọ na-edu ya. E kwuo ya n’ụzọ ọzọ, ọ pụtara mmadụ ikwe ka mmụọ nsọ na-achị ya n’ihe niile ọ na-eme kwa ụbọchị. Ndị Galeshia isi ise kwuru ihe dị iche ná mmadụ ikwe ka mmụọ nsọ na-achị ya na onye ahụ ikwe ka anụ ahụ́ na-achị ya.—Gụọ Ndị Galeshia 5:17, 18.
5. Ọ bụrụ na mmụọ nsọ na-achị anyị, olee ọrụ ndị anyị ga-ezere?
5 Ọ bụrụ na mmụọ nsọ na-achị gị, ị ga-ezere itinye aka n’ọrụ nke anụ ahụ́. Ha gụnyere “ịkwa iko, adịghị ọcha, omume rụrụ arụ, ikpere arụsị, ime mgbaasị, ibu iro, esemokwu, ekworo, iwe ọkụ, ndọrọ ndọrọ, nkewa, inwe òtù, anyaụfụ, ịṅụ oké mmanya, oriri oké mkpọtụ.” (Gal. 5:19-21) Nke a pụtara na ị na-eme “ka omume niile nke ahụ́ nwụọ site na mmụọ nsọ.” (Rom 8:5, 13) Nke a ga-eme ka uche gị dịrị n’ihe ndị metụtara mmụọ nsọ, meekwa ka ị na-erubere ya isi, kama ikwe ka ọchịchọ anụ ahụ́ gị na-achị gị.
6. Nye ihe atụ nke na-egosi ihe anyị kwesịrị ime iji nwee mkpụrụ nke mmụọ nsọ.
6 Ọ bụrụ na mmụọ nsọ na-achị gị, ị ga-enwe àgwà na-amasị Chineke, ya bụ, “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.” (Gal. 5:22, 23) Ma, ị ghaghị ịgbasi mbọ ike ka i wee nwee ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye ọrụ ugbo akọnye ihe n’ala, anwụ na mmiri dị ihe ahụ mkpa, ma ọ́ bụghị ha, o nweghị ihe ọ ga-eweta n’ubi. Anyị nwere ike iji mmụọ nsọ tụnyere anwụ. Mmụọ nsọ na-enyere anyị aka inwe mkpụrụ nke mmụọ nsọ. Ma, o nweghị ihe ugbo mmadụ ga-emepụta ma ọ bụrụ na onye ahụ anaghị arụsi ọrụ ike? (Ilu 10:4) N’ezie, otú i si akọ ala ihe atụ ahụ, bụ́ obi gị, ga-ekwu otú mkpụrụ mmụọ nsọ ga-esi na-arụ ọrụ n’ahụ́ gị, nakwa otú ọ ga-aha. N’ihi ya, jụọ onwe gị, sị, ‘M̀ na-ekwe ka mmụọ nsọ nyere m aka inwe mkpụrụ ya site n’ịgbasi mbọ ike?’
7. Gịnị mere ịmụ ihe na ịtụgharị uche ji dị gị ezigbo mkpa ma ọ bụrụ na ị chọrọ inwe mkpụrụ nke mmụọ nsọ?
7 Ndị ọrụ ugbo na-agba ihe ha kọrọ n’ugbo mmiri ka o wee mee nke ọma. Iji nwee mkpụrụ nke mmụọ nsọ, mmiri eziokwu nke dị na Baịbụl, bụ́ nke ọgbakọ na-akọwara anyị taa, dị gị mkpa. (Aịza. 55:1) Ọ ga-abụ na ị na-agwa ọtụtụ ndị mmadụ na ọ bụ ike mmụọ nsọ ka e ji dee Baịbụl. (2 Tim. 3:16) Ihe ọzọkwa bụ na ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, na-eme ka anyị ghọta eziokwu dị na Baịbụl, nke bụ́ mmiri dị ọcha. (Mat. 24:45-47) Ihe nke a pụtara doro anya. Anyị aghaghị ịna-agụ Okwu Chineke ma na-atụgharị uche na ya ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka mmụọ nsọ na-achị anyị. Ọ bụrụ na ị na-eme nke a, ị na-eṅomi ezigbo ihe nlereanya ndị amụma setịpụrụ, bụ́ ndị “jụrụ ase nke ọma” iji mata ihe na-edoghị ha anya. Ọ dị mma ịmara na ndị mmụọ ozi nwere mmasị dị ukwuu n’ihe Baịbụl kwuru banyere Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa nakwa n’ọgbakọ Ndị Kraịst e tere mmanụ.—Gụọ 1 Pita 1:10-12.
Olee Otú Mmụọ Nsọ Si Achị Anyị?
8. Gịnị mere o ji dị mkpa ka ị na-arịọ Jehova ka o nye gị mmụọ ya?
8 Mmụọ nsọ anaghị amalite ịchị anyị naanị n’ihi na anyị na-amụ Akwụkwọ Nsọ ma na-atụgharị uche na ya. I kwesịrị ịna-arịọ Jehova ka o nyere gị aka ma duzie gị. O nwere ike “ime ihe nke ukwuu karịa ihe niile anyị na-arịọ ma ọ bụ na-eche n’echiche.” (Efe. 3:20; Luk 11:13) Ma, ọ bụrụ na mmadụ ajụọ gị, sị, “Olee ihe m ga-eji na-arịọ Chineke mmụọ nsọ ebe ọ ma ‘ihe ndị na-akpa m tupu mụ arịọ ya’?” (Mat. 6:8) Otu n’ime ihe mere ị ga-eji na-arịọ ya mmụọ nsọ bụ na ime otú a na-egosi na ị tụkwasịrị Jehova obi. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ abịa na nke gị ka i nyere ya aka, ị ga-eme ike gị niile iji nyere ya aka, n’ihi na ọ tụkwasịrị gị obi wee rịọ gị ka i nyere ya aka. (Tụlee Ilu 3:27.) N’otu aka ahụ, Jehova na-enwe ọṅụ ma ị rịọ ya mmụọ ya, ọ ga-enyekwa gị ya.—Ilu 15:8.
9. Olee otú ịga ọmụmụ ihe nwere ike isi mee ka i nwekwuo mmụọ Chineke?
9 Obi ga-adị gị ụtọ ịmata na ebe ọzọ anyị na-enweta mmụọ Chineke bụ n’ọmụmụ ihe anyị nakwa ná mgbakọ dị iche iche. Ịgba mbọ na-aga ha ma na-ege ntị mgbe anyị gara ha dị ezigbo mkpa. Ime nke a ga-enyere anyị aka ịghọta “ihe ndị miri emi nke Chineke.” (1 Kọr. 2:10) Anyị ga-eritekwa ọtụtụ uru ma anyị na-aza ajụjụ mgbe niile n’ọmụmụ ihe. Chee echiche banyere ọmụmụ ihe ndị ị gara n’izu anọ gara aga. Ugboro ole ka i weliri aka iji zaa ajụjụ ka i wee kwupụta okwukwe gị? Ò nwere ihe i nwere ike ime iji na-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe karịa ka ị na-aza ugbu a? Ọ bụrụ na o nwere ihe ị ga-eme, kpebie otú i ga-esi mee ya n’izu ndị na-abịa abịa. Jehova ga-ahụ mbọ ị na-agba ka i wee na-aza ajụjụ, ọ ga-enyekwa gị mmụọ ya, bụ́ nke ga-enyere gị aka ịmụta ọtụtụ ihe n’ọmụmụ ihe.
10. Olee òkù ọ ga-abụ anyị na-akpọ ndị ọzọ ànyị amara na anyị na-eje ije site na mmụọ nsọ?
10 Onye zara òkù ahụ dị ná Mkpughe 22:17 na-ejekwa ije site na mmụọ nsọ. Amaokwu ahụ sịrị: “Mmụọ nsọ na nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asị: ‘Bịa!’ Onye ọ bụla nke nụrụ ya, ya sịkwa: ‘Bịa!’ Onye ọ bụla nke akpịrị na-akpọ nkụ, ya bịakwa; onye ọ bụla nke chọrọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.” Mmụọ nsọ ji òtù nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ, bụ́ nke e tere mmanụ, na-akpọ ụmụ mmadụ òkù ka ha bịa nara mmiri nke ndụ. Ọ bụrụ na ị zaala òkù ahụ a kpọrọ gị ka ị “bịa!,” ì kpebiela ịkpọ ndị ọzọ ka ha “bịa!”? Iso na-arụ ọrụ a nke na-azọpụta ndụ bụ nnukwu ihe ùgwù.
11, 12. Olee otú mmụọ nsọ si enyere anyị aka ikwusa ozi ọma?
11 Mmụọ nsọ na-enyere anyị aka ịrụ ọrụ a dị mkpa. Baịbụl kwuru otú mmụọ nsọ si nye aka mee ka ndị ozi ala ọzọ gaa zie ozi ọma n’ebe ndị a na-enweghị onye na-ezi ozi ọma na ha. ‘Mmụọ nsọ machibidoro Pọl onyeozi na ndị so ya na-aga ozi iwu ikwu okwu Chineke n’ógbè Eshia’; o kweghịkwa ka ha banye Bitinia. Anyị amaghị kpọmkwem otú mmụọ nsọ si gbochie ha ịbanye ebe ndị ahụ, ma, ihe doro anyị anya bụ na mmụọ nsọ duuru Pọl banye Yurop, bụ́ ebe buru ibu ha ga na-ekwusa ozi ọma. Ọ hụrụ ọhụụ ka otu nwoke onye Masedonia na-arịọ ya ka ọ bịa nyere ha aka.—Ọrụ 16:6-10.
12 Taakwa, mmụọ Jehova na-eduzi ozi ọma anyị na-ezi n’ụwa niile. N’agbanyeghị na Jehova anaghị eme ka ndị o tere mmanụ hụ ọhụụ wee mara ebe ha ga-aga ozi ọma, o ji mmụọ nsọ eduzi ha. Mmụọ nsọ na-enyekwara ụmụnna ndị ikom na ụmụnna ndị inyom aka ka ha jiri ike ha niile na-ekwusa ozi ma na-akụziri ndị mmadụ ihe. Ọ ghaghị ịbụ na i so arụ ọrụ a dị mkpa. Ì nwere ike inwekwu ọṅụ n’ọrụ a nke na-eme obi ụtọ?
13. Olee otú i nwere ike isi na-erubere mmụọ nsọ isi? Nye ihe atụ.
13 Ị na-erubere mmụọ nsọ isi ma ọ bụrụ na ị na-eme ihe a gwara ndị Chineke ka ha na-eme. Tụlee ihe banyere Mihoko, bụ́ otu nwa agbọghọ onye Japan. Mgbe ọ malitere ịsụ ụzọ, o chere na ya erughị eru ịga nletaghachi; ọ nọ na-eche na ya amaghị otú ya ga-esi na-ekwu okwu ka ọ masị ndị na-ege ya ntị. Ọ bụ n’oge ahụ ka e bipụtara n’Ozi Alaeze Anyị otú mmadụ nwere ike isi gaa nletaghachi n’ụlọ mmadụ wee gwa ya okwu dị mkpirikpi. Ka oge na-aga, e bipụtara broshuọ bụ́ A Satisfying Life—How to Attain It. (Ndụ nke Na-eme Obi Ụtọ—Otú Anyị Ga-esi Nweta Ya) Akwụkwọ a nyeere ndị na-ezi ozi ọma na Japan nnukwu aka. Mihoko mere ihe ndị a tụrụ aro ka e mee banyere otú a ga-esi na-eji broshuọ ahụ eje ozi ọma, nke ka nke, otú a ga-esi jiri ya na-aga nletaghachi dị nkenke. N’oge na-adịghị anya, ọ malitere ịmụrụ ndị na-anaghị egebu ntị ihe. Ọ sịrị: “M malitere ịmụrụ mmadụ iri na abụọ ihe nke na m na-agwa ụfọdụ ka ha cheretụ ka m mụchaara ndị ọzọ.” Ọ bụrụ na ị na-eje ije site na mmụọ nsọ wee na-eme ihe a gwara ndị ohu Jehova, ị ga-aghọrọ mkpụrụ n’ụba.
Tụkwasị Mmụọ Chineke Obi
14, 15. (a) Olee otú ndị na-ezughị okè ga-esi nwee ike ibi ndụ kwekọrọ ná nrara ha raara onwe ha nye Jehova? (b) Olee otú i nwere ike isi mete ezigbo ndị enyi?
14 O nwere ọrụ a họpụtara gị ịrụ. (Rom 10:14) I nwere ike na-eche na i rughị eru ịrụ ya. Ma, ọ bụ Chineke mere ka i ruo eru, dị ka o mere ka ndị o tere mmanụ ruo. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 3:5.) I nwere ike ịna-ebi ndụ kwekọrọ ná nrara ị raara onwe gị nye Jehova site n’ime ike gị niile ma na-atụkwasị mmụọ Chineke obi.
15 Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ naghị adịrị anyị bụ́ ndị na-ezughị okè mfe ibi ndụ kwekọrọ ná nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova Chineke anyị, bụ́ onye zuru okè. Otu n’ime ihe na-eme ka o sikwuoro anyị ike bụ na otú anyị si ebi ndụ ugbu a nwere ike ịna-eju ndị bụbu ndị enyi anyị anya, ha ewee “na-ekwujọ” anyị. (1 Pita 4:4) Ma, chetakwa na imetalarị ndị enyi ọzọ, abụọ kacha n’ime ha bụ Jehova na Jizọs Kraịst. (Gụọ Jems 2:21-23.) Ịmara ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ unu dịkwa mkpa, ha so ‘n’òtù ụmụnna dum’ nọ ebe niile n’ụwa. (1 Pita 2:17; Ilu 17:17) Jehova ga-eji mmụọ ya nyere gị aka ka i mete ndị enyi ga na-enyere gị aka ime uche ya.
16. Dị ka Pọl, olee ihe mere ị ga-eji na-enweta “obi ụtọ n’adịghị ike”?
16 Ihe nwekwara ike ka na-esitụrụ gị ike n’agbanyeghị na i nwere ezigbo ndị enyi na-enyere gị aka n’ọgbakọ. Nsogbu bịaara gị nwere ike ime ka ị na-echegbu onwe gị mgbe ụfọdụ nke na ike na-agwụcha gị, dị ka à ga-asị na nsogbu gị karịrị akarị. Nke a bụ oge ị kacha kwesị ịbịakwute Jehova wee rịọ ya ka o nye gị mmụọ nsọ. Pọl onyeozi dere, sị: “Mgbe m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka m na-adị ike.” (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 4:7-10; 12:10.) Pọl maara na mmụọ Chineke ga-eme ka anyị sie ike n’okwukwe n’agbanyeghị na anyị ezughị okè. Ya mere, ike Chineke nke nọ n’ọrụ ga-ewusi gị ike mgbe ọ bụla ị dara mba ma chọọ enyemaka. Pọl dere na ya na-enweta “obi ụtọ n’adịghị ike.” Ọ bụ mgbe ike na-adịghị ya ka ọ na-ahụ ike mmụọ nsọ na-akpa n’ahụ́ ya. O nwere ike ịdị gị otú ahụ!—Rom 15:13.
17. Olee otú mmụọ nsọ nwere ike isi nyere gị aka ka i wee na-aga ebe i kwesịrị ịga?
17 Mmụọ Chineke dị anyị mkpa iji na-ebi ndụ kwekọrọ ná nrara anyị raara ndụ anyị nye ya. Ka e were ya na ị bụ onyeisi ụgbọ mmiri. Ihe i bu n’obi bụ ifegide Jehova ruo mgbe ebighị ebi. Mmụọ nsọ yiri ifufe nke ga-enyere gị aka iru ebe ị na-aga n’enweghị nsogbu. Ekwela ka mmụọ nke ụwa Setan na-ebugharị gị. (1 Kọr. 2:12) I kwesịrị ịchọpụta ifufe nke ga-enyere gị aka iru ebe ị na-aga ka i wee kwọrọ ụgbọ ihe atụ gị gawa ebe o feere na-aga. Ifufe a bụ mmụọ nsọ. Mmụọ nsọ ga-eji Okwu Chineke na ọgbakọ ya na-edu gị ka i wee na-aga ebe i kwesịrị ịga.
18. Gịnị ka i kpebisiri ike na ị ga na-eme, ọ bụkwa n’ihi gịnị?
18 Ọ bụrụ na gị na Ndịàmà Jehova na-amụ ihe kemgbe, gị ana-abịakwa ọmụmụ ihe ha, ma, ị rarabeghị onwe gị nye Jehova, e mebeghịkwa gị baptizim, jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị ji m?’ Ọ bụrụ na ị chọpụtala otú mmụọ nsọ si emezu uche Jehova taa, ma nwee obi ụtọ n’ihi otú o si arụ ọrụ, mee ihe ị mụtara na i kwesịrị ime. Jehova ga-agọzi gị nke ukwuu. Ọ ga-enye gị mmụọ nsọ ya n’ụba. Ọ bụrụ na e mere gị baptizim ọtụtụ afọ gara aga, o doro anya na mmụọ nsọ na-akpa ike n’ahụ́ gị. Ị hụkwalanụ otú Chineke si eji mmụọ ya eme ka okwukwe gị sikwuo ike. Otú a ka o nwere ike isi na-ewusi gị ike ruo mgbe ebighị ebi. Ya mere, kpebisie ike na ị ga na-eje ije site na mmụọ nsọ.
Ì Chetara?
• Gịnị ka ije “ije site na mmụọ nsọ” pụtara?
• Gịnị ga-enyere gị aka ka i wee nọgide “na-eje ije site na mmụọ nsọ”?
• Olee otú i nwere ike isi na-ebi ndụ ga-ekwekọ ná nrara ị raara onwe gị nye Jehova?
[Foto dị na peeji nke 15]
Ị ghaghị ịna-agba mbọ ka i wee nwee ike na-akọ ihe n’ala ihe atụ bụ́ obi gị
[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]
Mmụọ Chineke ọ̀ na-achị gị?