‘N’aha nke Mmụọ Nsọ’
“Ya mere, gaanụ, mee [“ndị nke,” NW] mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke . . . mmụọ nsọ.”—MATIU 28:19.
1. Okwu ọhụrụ dị aṅaa ka Jọn Onye Na-eme Baptism jiri mee ihe n’ihe banyere mmụọ nsọ?
N’AFỌ 29 nke Oge Anyị, Jọn Onye Na-eme Baptism rụrụ ọrụ n’Israel n’ịkwadebe ụzọ maka Mesaịa ahụ, n’oge ozi ya kwa, ọ mara ọkwa ihe dị ọhụrụ banyere mmụọ nsọ. Otú ọ dị, ndị Juu amaraworị ihe Akwụkwọ nsọ Hibru kwuru banyere mmụọ ahụ. Otú ọ dị, ọ pụrụ ijuwo ha anya mgbe Jọn sịrị: “Mụ onwe m na-eji mmiri mee unu baptism n’ezie ka unu wee chegharịa: ma onye nke na-abịa n’azụ m . . . ga-eji mmụọ nsọ . . . mee unu baptism.” (Matiu 3:11) ‘Iji mmụọ nsọ eme baptism’ bụ okwu dị ọhụrụ.
2. Okwu ọhụrụ dị aṅaa ka Jisọs webatara, bụ́ nke metụtara mmụọ nsọ?
2 Onye ahụ nke na-abịanụ bụ Jisọs. N’oge ndụ ya n’elu ala, Jisọs ejighị mmụọ nsọ mee onye ọ bụla baptism n’ezie, ọ bụ ezie na o kwuru okwu banyere mmụọ ahụ ọtụtụ mgbe. Ọzọkwa, mgbe a kpọlitesịrị ya n’ọnwụ, o zoro aka n’ebe mmụọ nsọ ahụ dị n’ụzọ ọzọ dịkwa ọhụrụ. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke mmụọ nsọ.” (Matiu 28:19) Okwu ahụ bụ “n’aha nke” pụtara “ná nghọta nke.” Baptism ime mmiri ná nghọta nke Nna, Ọkpara, na mmụọ nsọ gaje ịdị iche site na baptism n’ime mmụọ nsọ. Ọ bụkwa okwu ọhụrụ banyere mmụọ nsọ.
Ndị E Ji Mmụọ Nsọ Mee Baptism
3, 4. (a) Olee mgbe baptism ndị mbụ n’ime mmụọ nsọ weere ọnọdụ? (b) E wezụga ime ha baptism, olee otú mmụọ nsọ si rụọ ọrụ n’ebe ndị na-eso ụzọ Jisọs nọ na Pentikọst nke 33 O.A.?
3 Banyere baptism n’ime mmụọ nsọ, kpọmkwem tupu ọ lagoo, Jisọs kwere ndị na-eso ụzọ ya nkwa, sị: “A ga-eji mmụọ nsọ mee unu baptism mgbe ọtụtụ ụbọchị na-agaghị agabiga site n’ugbu a.” (Ọrụ 1:5, 8) N’oge na-adịghị anya mgbe nke a, gasịrị, e mezuru nkwa ahụ. Mmụọ nsọ bịakwasịrị n’isi ihe dị ka 120 ndị na-eso ụzọ bụ́ ndị zukọrọ n’ọnụ ụlọ dị n’elu na Jerusalem mgbe Jisọs, site n’eluigwe, mere baptism ndị mbụ ya n’ime mmụọ nsọ. (Ọrụ 2:1-4, 33) Gịnị ka ọ rụpụtara? Ndị ahụ na-eso ụzọ ghọrọ akụkụ nke ahụ ime mmụọ nke Kraịst. Dị ka Pọl onyeozi na-akọwa, “n’ime otu mmụọ nsọ ka e mere [ha] nile baptism ịba n’otu ahụ.” (1 Ndị Kọrint 12:13) N’otu oge ahụ, e tere ha mmanụ ịbụ n’ọdịnihu ndị eze na ndị nchụàjà n’Alaeze eluigwe nke Chineke. (Ndị Efesọs 1:13, 14; 2 Timoti 2:12; Mkpughe 20:6) Mmụọ nsọ jekwara ozi dị ka ihe ịka akara mbụ na ihe ịrịba ama nke ihe nketa ahụ a ga-enwe n’ọdịnihu, ma ọ bụghị nanị nke ahụ.—2 Ndị Kọrint 1:21, 22.
4 N’afọ ole na ole tupu mgbe ahụ, Jisọs agwawo Nikọdimọs, sị: “Ọ bụrụ na a mụghị mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ alaeze Chineke anya. . . . Ọ bụrụ na a mụghị mmadụ site ná mmiri na mmụọ nsọ, ọ pụghị ịba n’alaeze Chineke.” (Jọn 3:3, 5) Ugbu a, a mụwo 120 mmadụ ọzọ. Site na mmụọ nsọ, e dowo ha dị ka ụmụ ime mmụọ nke Chineke, ụmụnna Kraịst. (Jọn 1:11-13; Ndị Rom 8:14, 15) Ọrụ ndị a nile nke mmụọ nsọ dị ịtụnanya n’ụzọ nke ha karịa ọrụ ebube dị iche iche. Ọzọkwa, n’adịghị ka ọrụ ebube ndị na-ewere ọnọdụ nanị otu ugbo, mmụọ nsọ akwụsịghị mgbe ndị ozi ahụ nwụsịrị kama ọ nọgidewo na-arụ ọrụ n’ụzọ dị otú a ruo kpọmkwem n’ụbọchị anyị. Ọ bụ ihe ùgwù nye Ndịàmà Jehova inwe n’etiti ha ndị ikpeazụ n’etiti ndị e ji mmụọ nsọ mee baptism bụ́ ndị so n’ahụ Kraịst, ndị a na-ejekwa ozi dị ka ‘ohu kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche’ inye nri ime mmụọ n’oge ya.—Matiu 24:45-47.
Ndị E Mere Baptism “Baa n’Aha nke . . . Mmụọ Nsọ”
5, 6. Olee otú baptism ndị mbụ n’ime mmụọ nsọ si dugaa na baptism ime mmiri?
5 Ma gịnị banyere baptism ime mmiri ahụ baa n’aha nke Nna, Ọkpara, na mmụọ nsọ, bụ́ nke e kwere nkwa ya? Ndị mbụ ahụ na-eso ụzọ e ji mmụọ nsọ mee baptism enwetaghị baptism ime mmiri dị otú ahụ. Ha enwetaworị baptism ime mmiri nke Jọn, ebe ọ bụkwa na Jehova na-anakwere nke ahụ n’oge ahụ kpọmkwem, ọ dịghị mkpa imegharị ha baptism. Ma na Pentikọst nke 33 O.A., oké ìgwè mkpụrụ obi natara baptism ime mmiri ọhụrụ ahụ. Olee otú nke a si mee?
6 Iji mmụọ nsọ mee 120 ndị ahụ baptism bụ nke e mere site n’oké mkpọtụ dara ụda nke dọtara uche ìgwè mmadụ. Ndị nwere ihe ijuanya ịnụ ka ndị ahụ na-eso ụzọ na-asụ asụsụ ha, ya bụ, n’asụsụ ndị mba ndị ọzọ nke ndị nọ n’ebe ahụ na-aghọta. Pita onyeozi kọwara na ọrụ ebube nke a bụ ihe àmà nke na Jisọs, onye e siworo ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite, onye na-anọdụkwa ala ugbu a n’aka nri Chineke n’eluigwe, awụpụwo mmụọ Chineke. Pita gbara ndị na-ege ya ntị ume, sị: “Ka ụlọ nile nke Israel mara n’ezie na Chineke mere ya ma Onyenwe anyị ma Kraịst, bụ́ Jisọs nke a onye unu kpọgburu.” Mgbe ahụ o kwubiri okwu site n’ịsị: “Chegharịanụ, ka e meekwa unu nile baptism n’otu n’otu n’aha Jisọs Kraịst ka e wee gbaghara mmehie nile unu; unu ga-anatakwa onyinye a, bụ́ mmụọ nsọ.” Ihe dị ka 3,000 mkpụrụ obi nakweere òkù ahụ.—Ọrụ 2:36, 38, 41.
7. N’ụzọ dị aṅaa ka e si mee 3,000 mmadụ e mere baptism na Pentikọst 33 O.A. baptism baa n’aha nke Nna, nke Ọkpara, na nke mmụọ nsọ?
7 À pụrụ ikwu na e mere ndị a baptism baa n’aha nke (ná nghọta nke) Nna, Ọkpara, na nke mmụọ nsọ? Ee. Ọ bụ ezie na Pita agwaghị ha ka e mee ha baptism baa n’aha nke Nna, ha aghọtaworị Jehova dị ka Eze Onyenwe anyị, ebe ọ bụ na ha bụ ndị Juu n’ụzọ anụ ahụ, ndị so ná mba nke a raara nye Ya. Pita kwuru, sị: ‘Ka e mee unu baptism baa n’aha nke Ọkpara.’ Ya mere baptism ha gosipụtara nghọta ha ghọtara Jisọs dị ka Onyenwe anyị na Kraịst. Ha bụ ugbu a ndị na-eso ụzọ ya, kwerekwa na mgbaghara nke mmehie bụ site na ya malite ugbu a. N’ikpeazụ, baptism ahụ bụ ná nghọta nke mmụọ nsọ, a na-emekwa ya ná nzaghachi nke na ha ga-anata mmụọ ahụ dị ka onyinye efu.
8. (a) Tinyere baptism ime mmiri, baptism ọzọ dị aṅaa ka ndị Kraịst e tere mmanụ nataworo? (b) Ònye e wezụga 144,000 ahụ na-anata baptism ime mmiri baa n’aha nke mmụọ nsọ?
8 E mekwara ndị e mere baptism n’ime mmiri n’ụbọchị Pentikọst ahụ nke afọ 33 O.A. baptism n’ime mmụọ, na-abụ ndị e tere mmanụ dị ka ndị eze na ndị nchụàjà n’ọdịnihu n’Alaeze eluigwe. Dị ka akwụkwọ Mkpughe na-ekwu, e nwere nanị 144,000 n’ime ndị a. Ya mere ndị e mere baptism n’ime mmụọ nsọ ma mesịakwa ‘kaa ha akara’ dị ka ndị nketa Alaeze dị nanị 144,000 n’ọnụ ọgụgụ. (Mkpughe 7:4; 14:1) Otú ọ dị, ndị ọhụrụ nile na-eso ụzọ—n’agbanyeghị ihe olileanya bụ—bụ ndị a na-eme baptism n’ime mmiri baa n’aha nke Nna, nke Ọkpara, na nke mmụọ nsọ. (Matiu 28:19, 20) Mgbe ahụ, gịnị ka baptism baa n’aha nke mmụọ nsọ pụtara nye ndị Kraịst nile, ma hà so ‘n’ìgwè atụrụ nta’ ahụ ma ọ bụ ‘n’ìgwè atụrụ ọzọ’ ahụ? (Luk 12:32; Jọn 10:16) Tupu inye azịza nke ahụ, ka anyị tụlee ọrụ ụfọdụ nke mmụọ ahụ n’oge ndị Kraịst.
Mkpụrụ nke Mmụọ ahụ
9. Ọrụ dị aṅaa nke mmụọ nsọ dị mkpa nye ndị Kraịst nile?
9 Otu ọrụ dị mkpa nke mmụọ nsọ bụ inyere anyị aka ịzụlite àgwà nile nke ndị Kraịst. N’eziokwu, n’ihi ezughị okè anyị apụghị izere ime mmehie. (Ndị Rom 7:21-23) Ma mgbe anyị ji ezi obi chegharịa, Jehova na-agbaghara anyị ná ndabere nke àjà Kraịst. (Matiu 12:31, 32; Ndị Rom 7:24, 25; 1 Jọn 2:1, 2) Ọzọkwa, Jehova na-atụ anya n’aka anyị ịgba mgba megide ọchịchọ anyị ime mmehie, mmụọ nsọ na-enyekwara anyị aka ime nke a. Pọl sịrị, “Na-ejegharịnụ site na mmụọ nsọ, unu agaghị emezukwa agụụ nke anụ ahụ ma ọlị.” (Ndị Galetia 5:16) Pọl gara n’ihu igosi na mmụọ ahụ pụrụ ịmịpụta àgwà ndị kasị mma dị ka mkpụrụ n’ime anyị. O dere, sị: “Mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obi ọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ, imeru ihe n’ókè.”—Ndị Galetia 5:22, 23.
10. Olee otú e si azụlite mkpụrụ nke mmụọ ahụ n’ime onye Kraịst?
10 Olee otú mmụọ nsọ si eme ka o kwe omume inwe mkpụrụ dị otú a n’ime onye Kraịst? Ọ dịghị ewere ọnọdụ n’onwe ya nanị n’ihi na anyị bụ ndị Kraịst raara onwe ha nye, e meekwa anyị baptism. Anyị aghaghị ịrụ ọrụ maka ya. Ma ọ bụrụ na anyị na-eso ndị Kraịst ndị ọzọ na-egosipụta àgwà ndị a na-akpakọrịta, ọ bụrụ na anyị ekpegara Chineke ekpere ka mmụọ ya nyere anyị aka ịzụlite kpọmkwem àgwà ụfọdụ, ọ bụrụ na anyị ezere mkpakọrịta ọjọọ ma mụọ Bible maka ndụmọdụ na ezi ihe nlereanya dị iche iche, mgbe ahụ mkpụrụ nke mmụọ ahụ ga-eto n’ime anyị.—Ilu 13:20; 1 Ndị Kọrint 15:33; Ndị Galetia 5:24-26; Ndị Hibru 10:24. 25.
Ndị Mmụọ Nsọ Họpụtara
11. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka e si na-ahọpụta ndị okenye site na mmụọ nsọ?
11 Pọl, mgbe ọ na-agwa ndị okenye Efesọs okwu, wepụtara ọrụ ọzọ mmụọ nsọ na-arụ mgbe ọ sịrị: “Lezienụ onwe unu na ìgwè atụrụ ahụ dum anya, nke mmụọ nsọ họpụtara unu dị ka ndị nlekọta n’etiti ya, ịzụ ọgbakọ Chineke dị ka atụrụ, bụ́ nke o ji ọbara Ọkpara ya zụta.” (Ọrụ 20:28, NW) Ee, ndị nlekọta ọgbakọ, ma ọ bụ ndị okenye, bụ ndị mmụọ nsọ họpụtara. N’ụzọ dị aṅaa? N’ihi na ndị okenye a họpụtara ahọpụta aghaghị inwe iru eru ndị e depụtara n’ime Bible nke e dere n’ike mmụọ nsọ. (1 Timoti 3:1-13; Taịtọs 1:5-9) Ha pụrụ ịzụlite iru eru ndị ahụ nanị site n’enyemaka mmụọ nsọ. Ọzọkwa, òtù ndị okenye nke na-atụ aro maka onye okenye ọhụrụ na-ekpe ekpere maka nduzi mmụọ nsọ iji mata ma ò nwere iru eru ndị ahụ ma ọ bụ na o nweghị ha. A na-emekwa nhọpụta ahụ kpọmkwem n’okpuru nlekọta nke ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi nke nwekwara uche bụ́ nke e ji mmụọ nsọ ahụ tee mmanụ.
Ka Mmụọ ahụ Na-eduzi Gị
12. Olee otú mmụọ ahụ pụrụ isi metụta anyị site na Bible?
12 Ndị Kraịst matara na e dere Akwụkwọ Nsọ n’okpuru mmetụta nke mmụọ nsọ. N’ihi ya, ha na-etinye anya n’ime ya maka amamihe sitere n’ike mmụọ nsọ, dị ka ndịàmà Jehova tupu oge ndị Kraịst mere. (Ilu 2:1-9) Ha gụrụ ha, tụgharịa uche na ha, ma kwere ka o duzie ndụ ha. (Abụ Ọma 1:1-3; 2 Timoti 3:16) E si otú a nyere ha aka site na mmụọ ahụ ‘inyocha ihe nile dị omimi nke Chineke.’ (1 Ndị Kọrint 2:10, 13; 3:19) Iduzi ndị na-ejere Chineke ozi n’ụzọ dị otú a bụ otu ọrụ dị mkpa nke mmụọ Chineke n’oge anyị.
13, 14. Gịnị ka Jisọs jiri mee ihe n’iche nsogbu ndị e nwere n’ọgbakọ ihu, oleekwa otú o si na-eme otu ihe ahụ taa?
13 Ọzọkwa, n’akwụkwọ Mkpughe, Jisọs ahụ e mere ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilite zigaara ọgbakọ asaa dị n’Asia Minor ozi. (Mkpughe, isi nke 2 na 3) N’ime ha o kpughere na ya enyochawo ọgbakọ ndị ahụ ma mata ọnọdụ ime mmụọ ha. Ọ chọpụtara na ụfọdụ na-esetịpụ ihe nlereanya ọma n’okwukwe. N’ime ndị ọzọ, ndị okenye ekwerewo ka nkewa, omume rụrụ arụ, na ekpoghị ọkụ na ajụghị oyi merụọ ìgwè atụrụ ahụ. Ọgbakọ dị na Sadis, e wezụga mkpụrụ obi ole na ole na-ekwesị ntụkwasị obi, nwụrụ anwụ n’ụzọ ime mmụọ. (Mkpughe 3:1, 4) Olee otú Jisọs si chee nsogbu ndị a ihu? O ji mmụọ nsọ mee ihe. Mgbe ọ na-enye ọgbakọ asaa ahụ ndụmọdụ, ozi Jisọs mechiri na nke ọ bụla site n’okwu bụ: “Onye nwere ntị, ya nụ ihe mmụọ nsọ na-agwa nzukọ Kraịst.”—Mkpughe 2:7, 11, 17, 29; 3:6, 13, 22.
14 Taakwa, Jisọs na-enyocha ọgbakọ nile. Mgbe ọ hụtakwara nsogbu, ọ ka na-ejikwa mmụọ nsọ eche ha ihu. Mmụọ ahụ pụrụ inyere anyị aka ịhụta na imeri nsogbu dị iche iche kpọmkwem site n’anyị ịgụ Bible. Enyemaka pụkwara ịbịa site n’akwụkwọ Bible ndị ndị ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi nke nwekwara uche bụ́ nke mmụọ ahụ tere mmanụ, na-ebipụta. Ma ọ bụ ọ pụrụ ịbịa site n’aka ndị okenye mmụọ ahụ họpụtara n’ime ọgbakọ. N’agbanyeghị ebe o sitere, ma ndụmọdụ ahụ ọ̀ bụ nye ndị mmadụ n’otu n’otu ma ọ bụ nye ọgbakọ n’ozuzu ya, ànyị na-aṅa ntị n’okwu Jisọs ndị bụ: “Onye nwere ntị, ya nụ ihe mmụọ nsọ na-agwa nzukọ Kraịst”?
Mmụọ ahụ na Ọrụ Nkwusa
15. Olee otú mmụọ ahụ si rụọ ọrụ n’ebe Jisọs nọ n’ihe banyere ọrụ nkwusa ahụ?
15 N’otu oge mgbe Jisọs mere nkwusa n’ụlọ nzukọ ndị Juu dị na Nazaret, o gosipụtara ọbụna ọrụ ọzọ nke mmụọ ahụ. Ihe ndekọ ahụ na-agwa anyị, sị: “O wee meghee akwụkwọ ahụ, chọta ebe e deworo ya, sị, Mmụọ nke Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] dị n’ahụ m. N’ihi na o tere m mmanụ izi ndị ogbenye ozi ọma: o ziteworo m ikwusa ọhịha gwa ndị a dọtara n’agha, na ikwusa ịhụ ụzọ gwa ndị ìsì, izipụ ndị e tihịaworo ahụ ka ha laa. O wee malite ịsị ha, Taa ka e mezuworo ihe a e deworo n’akwụkwọ nsọ ná ntị unu.” (Luk 4:17, 18, 21; Aịsaịa 61:1, 2) Ee, e ji mmụọ nsọ tee Jisọs mmanụ ikwusa ozi ọma.
16. Na narị afọ mbụ, olee otú mmụọ nsọ si tinye aka n’ụzọ dị ukwuu ná nkwusa nke ozi ọma?
16 N’oge na-adịghị anya tupu ọnwụ ya, Jisọs buru amụma oké ọrụ nkwusa ndị na-eso ụzọ ya ga-arụzu. Ọ sịrị: “A ghaghịkwa ibu ụzọ kwusaa ozi ọma nke m n’ihu mba nile.” (Mak 13:10) Okwu ndị a nwere mmezu mbụ ha na narị afọ mbụ, òkè mmụọ nsọ keere pụtakwara ìhè. Ọ bụ mmụọ nsọ dujere Filip izi onozi Etiopia ahụ oziọma. Mmụọ nsọ duuru Pita gakwuru Kọniliọs, mmụọ nsọ kwukwara ka e zipụ Pọl na Banabas dị ka ndị ozi site n’Antiọk. E mesịa, mgbe Pọl chọrọ ime nkwusa n’Esia na Bitinia, n’ụzọ ụfọdụ mmụọ nsọ gbochiri ya. Chineke chọrọ ka ọrụ nkwusa ahụ banye na Europe.—Ọrụ 8:29; 10:19; 13:2; 16:6, 7.
17. Taa, olee otú mmụọ nsọ si etinye aka n’ọrụ nkwusa ahụ?
17 Taa, mmụọ nsọ na-etinyekwa aka n’ụzọ dị ukwuu n’ọrụ nkwusa ahụ. Ná mmezu ọzọ nke Aịsaịa 61:1, 2, mmụọ Jehova etewo ụmụnna Jisọs mmanụ ime nkwusa. Ná mmezu ikpeazụ nke Mak 13:10, ndị a e tere mmanụ, site n’enyemaka oké ìgwè mmadụ ahụ, ekwusawo ozi ọma n’ụzọ nkịtị nye “mba nile.” (Mkpughe 7:9) Mmụọ ahụ na-akwadokwa ha nile na nke a. Dị ka ọ dị na narị afọ mbụ, ọ na-emeghepụ ókèala dị iche iche ma na-eduzi akụkụ nile nke ọganihu ọrụ ahụ. Ọ na-agba ndị mmadụ n’otu n’otu ume, na-enyere ha aka imeri ịtụ egwu na ịzụlite nkà ozizi ihe ha. Ọzọkwa, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “N’ihu ndị isi na ndị eze ka a ga-ekurukwa unu jee n’ihi m, ịbụrụ ha na ndị mba ọzọ àmà. Ma mgbe ọ bụla ha ga-arara unu nye, unu echegbula onwe unu otú unu ga-ekwu ma ọ bụ okwu unu ga-ekwu; . . . n’ihi na ọ bụghị unu onwe unu na-ekwu, kama ọ bụ mmụọ nke Nna unu nke na-ekwu n’ime unu.”—Matiu 10:18-20.
18, 19. N’ụzọ dị aṅaa ka mmụọ ahụ si na-esoro nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-akpọ ndị dị obi umeala òkù ka ha “nara mmiri nke ndụ n’efu”?
18 N’akwụkwọ Mkpughe, Bible na-emesikwa aka mmụọ nsọ na-etinye n’ọrụ nkwusa ahụ ike. N’ebe ahụ Jọn onyeozi na-akọ, sị: “Mmụọ nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asịkwa, Bịa, onye na-anụ, ya sịkwa, Bịa. Onye akpịrị na-akpọkwa nkụ, ya bịa: onye na-achọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.” (Mkpughe 22:17) Nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ, nke ihe fọdụrụ n’ime 144,000 ahụ bụ́ ndị ka nọ n’ụwa, na-anọchite anya ya, na-akpọ mmadụ nile òkù ịbịa nara mmiri nke ndụ n’efu. Ma rịba ama na mmụọ nsọ ahụ na-asịkwa “Bịa!” Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa?
19 Ọ bụ n’ụzọ nke na ozi ahụ nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ—nke oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ ahụ na-enyere aka taa—na-ekwusa na-esite na Bible, bụ́ nke e dere kpọmkwem n’okpuru nduzi nke mmụọ nsọ. Otu mmụọ ahụ kwa emeghewo obi na uche nke òtù nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ ịghọta Okwu ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ wee kọwaara ya ndị ọzọ. Ndị e mere baptism dị ka ndị ọhụrụ na-eso ụzọ Jisọs Kraịst na-enwe obi ụtọ ịnara mmiri nke ndụ ahụ n’efu. A na-akpalikwa ha ịdị na-esonyere mmụọ ahụ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ n’ịgwakwa ndị ọzọ “Bịa!” Taa, ihe karịrị nde mmadụ anọ so mmụọ ahụ na-ekere òkè n’ọrụ a.
Ibi Ndụ n’Ụzọ Kwekọrọ na Baptism Anyị
20, 21. Olee otú anyị pụrụ isi bie ndụ n’ụzọ kwekọrọ na baptism anyị baa n’aha nke mmụọ nsọ, oleekwa otú anyị kwesịrị isi lee baptism nke a anya?
20 Baptism baa n’aha nke mmụọ nsọ bụ nkwupụta ihu ọha nke na anyị ghọtara mmụọ nsọ ahụ ma mata òkè ọ na-ekere ná nzube nile nke Jehova. Ọ na-agụnye na anyị ga-ekwenyere mmụọ ahụ, ghara ime ihe ọ bụla nke ga-egbochi ịrụ ọrụ ya n’etiti ndị Jehova. Otú a, anyị na-amata ma na-ekwenyere ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi nke nwekwara uche. Anyị na-arụ ọrụ n’ụzọ kwekọrọ ná ndokwa ndị okenye n’ime ọgbakọ. (Ndị Hibru 13:7, 17; 1 Pita 5:1-4) Anyị na-ebi ndụ ọ bụghị site n’amamihe anụ ahụ, kama nke ime mmụọ ma na-ekwere ka mmụọ ahụ kpụzie ọdịdị anyị, na-eme ka o yikwuo nke Kraịst. (Ndị Rom 13:14) Anyị na-ejikwa obi anyị dum na-esonyere mmụọ ahụ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ n’ịgwa ọtụtụ nde ndị ka pụrụ ịnakwere ya, sị, “Bịa!”
21 Lee ihe siri ike ọ bụ ịbụ onye e mere baptism ‘n’aha nke mmụọ nsọ’! Ma, lee aha ngọzi ọ pụrụ iweta! Ka ọnụ ọgụgụ ndị e meworo baptism otú a nọgide na-arị elu. Ka anyị nile nọgidekwa na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ihe baptism ahụ pụtara mgbe anyị na-abụ ohu nye Jehova ma nọgide ‘na-adị ọkụ ná mmụọ.’—Ndị Rom 12:11.
Gịnị Ka Ị Na-echeta Banyere Mmụọ Nsọ?
◻ Ọ̀ bụ n’ụzọ ndị dị aṅaa ka mmụọ nsọ si rụọ ọrụ na Pentikọst 33 O.A.?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi mịa mkpụrụ nile nke mmụọ ahụ?
◻ N’ụzọ dị aṅaa ka e si na-ahọpụta ndị okenye site ná mmụọ nsọ?
◻ Olee otú Jisọs si edozi nsogbu ndị e nwere n’ime ọgbakọ site na mmụọ nsọ?
◻ Olee otú mmụọ nsọ ahụ si etinye aka n’ụzọ dị ukwuu n’ọrụ nkwusa?
[Foto dị na peeji nke 15]
Baptism nke Pita kwusara bụkwa baptism baa n’aha nke Nna na nke mmụọ nsọ
[Foto dị na peeji nke 17]
Mmụọ nsọ na-etinye aka n’ụzọ dị ukwuu n’ọrụ nkwusa ozi ọma