Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 6/1 p. 7
  • Ndụ na Ije Ozi Jisọs

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndụ na Ije Ozi Jisọs
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Isiokwu Ọhụrụ nke Ga Na-agba n’Ụlọ Nche
    Ozi Alaeze Anyi—2012
  • Ị̀ Na-eji Ya Eme Ihe n’Ụzọ Zuru Ezu?
    Ozi Alaeze Anyi—2008
  • Ihe Ọhụrụ nke Ga-enyere Anyị Aka Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl
    Ozi Alaeze Anyi—2010
  • Akwụkwọ Ọhụrụ Akpalie Ọṅụ nke Ọtụtụ Nde Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 6/1 p. 7

Ndụ na Ije Ozi Jisọs

IHE odide ahụ nke isiokwu ya bụ “Jisọs Emezuo Ihe Nile Chineke Chọrọ Ya n’Aka,” nke dị na peji ndị na-esonụ, bụ akụkụ ikpeazụ n’usoro ihe odide anyị dịworo ogologo oge nke bụ “Ndụ na Ije Ozi Jisọs.” Ihe odide nke a apụtawo n’Ụlọ Nche ruo ihe karịrị afọ isii, ná mbipụta 149 dị iche iche n’esepụghị aka, malite ná mbipụta April 1, 1985.

Anyị nwere olileanya na usoro ihe odide nke a dị n’Ụlọ Nche enyeworo gị aka ịgbaso ndụmọdụ Pọl onyeozi nke bụ ‘ilegide Jisọs anya’ nakwa ịgbaso ihe Chineke nyere n’iwu nke bụ ‘ige ya ntị.’ (Ndị Hibru 12:2, 3; Matiu 17:5) N’ime afọ ndị gaworo aga, ọtụtụ ndị edetawo akwụkwọ ịkọwa na e nyeworo ha aka ime nke a. “Ọ dị nnọọ ka à ga-asị na anọ m n’ebe ahụ na-ege ya ntị, na-ekiri ihe ọ na-eme,” ka otu onye na-agụ akwụkwọ anyị dere. “Enwewo m ịhụnanya dị ukwuu karị n’ebe ọ nọ n’ihi ihe odide ndị a.”

Otu onye ọzọ na-agụ akwụkwọ anyị dere, sị: “Mbipụta nke ọ bụla yiri ka ọ̀ na-enwe otu isi ihe nke m na-agụtaghị mgbe m na-agụ ihe ndekọ Bible ahụ. Enwewo m ọṅụ n’itinye ihe omume dị iche iche dị ná ndụ Jisọs n’ime uche m n’usoro ka mma nke otú ha si mee site n’ịgụ isiokwu nke ọ bụla.” Ọtụtụ ndị ekwuwo okwu ekele yiri ndị a maka ịmata oge na ebe Jisọs nọrọ zie ihe, meekwa ihe dị iche iche n’oge ije ozi ya.

Otu nwanyị na Spain kwuru, sị: “Ejikọtawo m ihe odide ahụ nile site ná mmalite ya. Ha na-ezi ihe nke ukwuu nye ma ndị okenye ma ụmụntakịrị. Adị m 44 afọ, ana m enwekwa mkpali dị ukwuu mgbe m na-agụ ihe ndekọ ndị a. Ọ dị ka à ga-asị na anọ m ya mgbe nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ mere eme na-eme.”

Otu onye bụ nne na United States dere, sị: “N’ihi ịdị mkpirikpi nke isiokwu ndị ahụ na okwu dị mfe e ji dee ha, di m esonyewo n’ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị. Nwa m nwoke nke gbara afọ asatọ gwara m ka m dee akwụkwọ iji kelee unu n’ihi na nna ya na-amụ Bible ugbu a. Ọ na-arịọ ka e jikọta usoro ihe odide ndị a nile ma bipụta ha n’otu akwụkwọ mgbe ọ bụla e dezuru ha, ka ya nwee ike iso ụmụ akwụkwọ ibe ya kerịta ha.”

Ma eleghị anya i nwere mmetụta yiri nke otu onye na-agụ akwụkwọ anyị, bụ́ onye kwara àrị̀rị̀ kwuo n’oge na-adịbeghị anya, sị: “Ọ na-ewutetụ m icheta na n’oge na-adịghị anya usoro isiokwu ndị ahụ ga-agwụsị ka a na-atụle ụbọchị ndị ikpeazụ nke ndụ Jisọs. Ọ ga-ewute m n’ezie ịhụ na ha adịghịzi n’ime Ụlọ Nche.” Anyị nwere olileanya na akụkụ ikpeazụ nke a nke usoro ihe odide anyị bụ “Ndụ na Ije Ozi Jisọs” ga-amasị gị.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya