Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 9/1 p. 3-4
  • Ihe Krisendọm Kụworo n’Africa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Krisendọm Kụworo n’Africa
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mkpụrụ nke Ozi Ala Ọzọ
  • Owuwe Ihe Ubi nke Krisendọm n’Africa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • A Na-eziga Ndị Ozi Ala Ọzọ “n’Ebe Kacha Anya n’Ụwa”
    Ihe Ndị E Ji Onyinye I Nyere Eme
  • Ọrịa Aids n’Africa—Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Ụta Dịịrị Krisendọm?
    Teta!—1996
  • Krisendọm na Ịzụ Ahịa Ohu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 9/1 p. 3-4

Ihe Krisendọm Kụworo n’Africa

N’AFỌ 1867, Charles Lavigerie, onye France bụ́ onye Katọlik, bịara n’Africa dị ka onye achịbishọp a họpụtara ọhụrụ nke Algiers. “Chineke ahọrọwo France,” ka o kwuru, “ime Algeria mmalite nke oké mba na mba ndị Kristian.”

Ọchịchọ Lavigerie gabigara Algeria. N’ezie, o zipụrụ ndị ozi ala ọzọ garuo n’ọzara ahụ, na-enwe ihe mgbaru ọsọ nke “ijikọ Ebe Etiti na Ebe Ugwu nke Africa n’otu ụzọ ndụ nke Krisendọm.”

Ka nke ahụ na-aga n’ihu, n’akụkụ ọdịda anyanwụ, ndịda, na ọwụwa anyanwụ nke kọntinent ahụ, ndị ozi ala ọzọ nke ndị Protestant amaliteworị ọrụ. Ha nagidere ọtụtụ ihe isi ike, dị ka ịrịa ọrịa ịba mgbe mgbe, ya na ihe ndị e ji amata ya bụ́ ahụ ịma jijiji, igba ọsụsọ, na uche mgbasasị. N’ịbụ ndị na-enweghị ume site n’ọrịa ebe okpomọkụ, ọtụtụ nwụrụ n’oge na-adịghị anya mgbe ha bịarutere. Ma ndị ọzọ nọgidere na-abịa. “Onye ọ bụla gara n’Africa,” ka Adlai Stevenson kwuru, “bụ onye a na-echetara mgbe nile banyere obi ike nke ndị ozi ala ọzọ. . . . Ha lụrụ ọgụ megide ịba anya odo, afọ ọbara, na ọrịa njé dị iche iche, nkume ili ozu ndị m hụkwara . . . nkume ili ozu ha—n’akụkụ Africa nile.”

Mkpụrụ nke Ozi Ala Ọzọ

Ka ndị ozi ala ọzọ na-abanye Africa, ha chọpụtara na ihe ka ọtụtụ n’agbụrụ ya amaghị akwụkwọ. “N’ime ihe dị ka asụsụ [ndị Africa] narị asatọ,” ka Ram Desai kọwara n’akwụkwọ ya bụ́ Christianity in Africa as Seen by Africans, “nanị anọ ka e deworo ede tupu ndị ozi ala ọzọ ahụ abịa.” Ya mere, ndị ozi ala ọzọ chepụtara ụzọ a ga-esi na-ede asụsụ ndị a ede. Mgbe ahụ, ha dere ọtụtụ akwụkwọ ọgụgụ wee malite ịkụziri ndị ahụ otú e si agụ. Iji mezuo nke ahụ, ha wuru ụlọ akwụkwọ n’akụkụ nile nke Africa.

Ndị ozi ala ọzọ ahụ wukwara ụlọ ọgwụ. “Ọ dịghị ụlọ ọrụ ọzọ a pụrụ iji tụnyere ihe ndekọ ha nke ọrụ obi ebere,” ka Ram Desai kwetara. E wezụga ọgwụgwọ ọrịa, ndị Africa chọrọ ihe onwunwe nke Europe. Ụfọdụ ndị ozi ala ọzọ guzobere ogige azụmahịa, ebe ha kwetara na nke a ga-adọrọ mmasị nke ndị a tọghataworo. Dị ka ihe atụ, òtù Basel Mission sitere Switzerland guzobere otu ụlọ ahịa na Ghana. Ha chọpụtara na osisi cacao na-eme nke ọma n’ebe ahụ, taa, Ghana bụkwa mba nke atọ kasị na-emepụta cocoa n’ụwa nile.

Otu ihe kasị pụta ìhè ndị ozi ala ọzọ nke Krisendọm rụzuru bụ nsụgharị ha sụgharịrị Bible. Ma ịgbasa ozi Bible nwere ibu ọrụ ọzọ dị oké mkpa. Onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi gosiri nke a site n’ịjụ, sị: “Gị onye na-akụzi mmadụ ibe gị ihe, ị́ dịghị ezi onwe gị? Gị onye na-ekwusa ka mmadụ ghara izu ohi, ị̀ na-ezu ohi?” Bible na-adọ aka ná ntị na ndị na-ezi Iso Ụzọ Kraịst aghaghị n’onwe ha ibi ndụ kwekọrọ n’ezi ụkpụrụ nile e setịpụrụ n’Okwu Chineke.—Ndị Rom 2:21, 24.

Gịnị banyere ozi Krisendọm jere n’Africa? Ò wetaworo Chineke nke Bible otuto, ka ò mewo ka ozizi nile nke ndị Kraịst yie nke ụgha?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya