Ị̀ Na-eme Ihe Nile Ị Pụrụ Ime?
“MGA-EME ihe nile m pụrụ ime.” Lee nnọọ ka ihe na-esochi okwu a ọtụtụ mgbe na-abụkarị “ma” na ahịrị dị ogologo nke ihe ngọpụ onwe onye maka emeghị mgbalị dị ukwuu! Gịnị banyere nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova? Anyị na-emezu nkwa anyị ime ihe nile anyị pụrụ ime maka ya?
Ime nraranye pụtara ‘itinye onwe onye kpam kpam maka ozi ma ọ bụ ofufe nke Chineke ma ọ bụ maka iji mee ihe dị nsọ.’ Jisọs mere ihe dị ukwuu iji gosi ihe mmadụ ịrara onwe ya nye Jehova gụnyere site n’ikwu, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ka o so m n’azụ, ya jụ onwe ya, buliekwa [osisi ịta ahụhụ, NW] ya, na-esokwa m.” (Matiu 16:24) Onye jụworo onwe ya ma rara onwe ya nye Chineke na-eme ka ime uche Chineke bụrụ ọrụ kasị mkpa ná ndụ ya.
Dị ka ndị raara onwe ha nye, anyị ga-enyocha onwe anyị iji hụ ma ànyị na-ebi ndụ kwesịrị nraranye anyị. Pita gosiri ihe mere anyị ji kwesị inyocha onwe anyị mgbe ọ gbara ndị Kraịst e tere mmanụ ume, sị: “Na-anụnụ ọkụ n’obi karị ime ka ọkpụkpọ unu na nhọpụta unu bụrụ ihe na-eguzosi ike: n’ihi na a sị na unu emee ihe ndị a, unu agaghị asụ ngọngọ mgbe ọ bụla ma ọlị.” (2 Pita 1:10) Ee, ọ bụrụ na anyị emee ihe nile anyị pụrụ ime, anyị agaghị emesi bụrụ ndị ahịa ghọrọ n’ụzọ ime mmụọ.
A Pụrụ Ime Ka Ihe Nile Anyị Pụrụ Ime Bukwuo Ibu
N’ụzọ sara mbara karị, ndị ohu Chineke nile raara onwe ha nye ya bụ ndị a na-atụ anya n’aka ha ime ihe nile ha pụrụ ime, ma ọ bụ ihe kasị mma ha pụrụ, iji mee ihe na-atọ Jehova ụtọ. Otú ọ dị, ihe nile anyị pụrụ ime n’ime uche Chineke pụrụ ịmụba amụba. Nye nwata nwoke dị afọ atọ, ịga obere ozi pụrụ ịbụ ihe kasị mma ọ pụrụ ime iji nyere nne ya aka, ma ka ọ na-emewanye okenye, ọ pụrụ inwe ike ime ihe karị. Otu ahụ ka ọ dị n’uto ime mmụọ anyị—ihe bụbu ihe nile anyị pụrụ ime nwere ike ọ gaghị abụkwa. A na-akpali anyị imekwuru Jehova ihe.
Ekele bara ụba anyị na-enwe maka Jehova na-akpali ịdị njikere anyị ime ihe karị. Inwe ekele maka ihe o mewooro anyị bụ nke a na-eme ka o sikwuo ike site n’ọmụmụ ihe onwe onye nke Okwu ya, bụ́ Bible. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị ji nlezianya nyochaa ma tụgharịa uche n’otú Jehova si zite Ọkpara ya ịtọgbọ ndụ ya iji gbapụta agbụrụ mmadụ site ná mmehie, a na-akpali anyị ijere Onye guzobere ndokwa nke ihe mgbapụta ahụ ozi. (Jọn 3:16, 17; 1 Jọn 4:9-11) ka anyị na-aga n’ihu ‘na-edetụ ire, ịhụ na Jehova dị mma,’ otú a ka a na-akpalikwu obi anyị ijere ya ozi.—Abụ Ọma 34:8.
Otu onye na-eje ozi oge nile aha ya bụ Jetter ghọtara nke a. N’iji gwumikwuo ime n’ihe ọ na-amụ, o wepụtara otu obere ọnụ ụlọ dị n’ụlọ ya maka nzube ahụ. Ọ haziri ya ka o wee nwee ike ilekwasị anya n’ihe ọ na-eme mgbe ọ na-eme nnyocha. O nwere akwụkwọ Watch Tower Publications Index dị iche iche tinyere mpịakọta Ụlọ Nche na Teta! n’ebe aka ya ga-eru ha n’elu ebe ọ na-edebe akwụkwọ. “Mgbe m gwupụtara ihe ọmụma na-adọrọ mmasị,” ka ọ na-ekwu, “ana m enwe oké ọchịchọ isoro ndị ọzọ kerịta ya.”
Otú ọ dị, dị ka iri nri mara abụba site n’oge ruo n’oge na-adịghị eme ka mmadụ ghara inwe mkpa nke iri nri mgbe nile kwa ụbọchị, nnyocha miri emi nke Bible nke e mere otu ugbo adịghị akachapụ mkpa ọ dị iri nri ime mmụọ kwa ụbọchị. Ruth na-aghọta mkpa nke a, n’ihi na laa azụ ruo otú ọ pụrụ icheta, ezinụlọ ya gụkọrọ Bible ọnụ kwa ụtụtụ na abalị mgbe ha risịrị nri. Ugbu a, mgbe ọ dị 81 afọ, mgbe o tinyewokwara ihe karịrị 60 afọ n’ije ozi oge nile, ọ ka na-agụ Bible oge nile mgbe o tetara ụra n’elekere 6:00 nke ụtụtụ. Ozugbo ọ natara magazin Ụlọ Nche na Teta!, Ruth na-ewepụta oge ịgụ ha. Ọ na-agụghachi otu isiokwu ugbo atọ ma ọ bụ anọ ma ọ dịkarịa ala tupu ọ mụọ ya n’ọgbakọ. “Ịmụ Okwu Chineke bụ ihe dị gị mkpa iji nọgidesie ike n’okwukwe,” ka ọ na-ekwu. O nyewokwara ya aka ịnọgide n’ozi ala ọzọ ruo ọtụtụ afọ.
Ime Ihe Nile Anyị Pụrụ Ime n’Inyere Ndị Ọzọ Aka
Site n’ọmụmụ ihe dị omimi na nke a na-eme mgbe nile nke Okwu Chineke, ịnụ ọkụ n’obi anyị ijere Chineke ozi na-aba ụba, otu ihe dịkwa n’ime anyị na-agbakwa anyị ume ime karị. (Tụlee Jeremaịa 20:9.) Ọ bụ ịnụ ọkụ n’obi dị otú ahụ kpaliri Hirohisa ije ozi ya n’ụzọ zuru ezu. (2 Timoti 4:5) Ya na nanị nne ya na ụmụnne ya ndị ikom na ndị inyom ndị obere biri. Mgbe ọ nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu, Hirohisa kwadoro ezinụlọ ya n’ụzọ ego site n’ibili n’elekere atọ nke ụtụtụ iji kesaa akwụkwọ akụkọ. Ọ chọrọ imekwu ihe n’ịgwa ndị ọzọ banyere Jehova, n’ihi ya Hirohisa tinyere akwụkwọ maka ozi ọsụ ụzọ, dị ka a na-akpọ ije ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova. Ọ bụ ezie na ọ bụ onye na-eto eto, o nwere obi ụtọ n’inyere ndị ọzọ aka isonyere ya n’ime ihe nile ha pụrụ ime iji too Jehova.
Ime ihe nile anyị pụrụ ime iji nyere ndị ọzọ aka na-agụnye ịghọ ndị dị irè n’ije ozi anyị. N’otu oge Jisọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume, sị: “Ọ bụrụ na unu matara ihe ndị a, ngọzi na-adịrị unu ma a sị na unu na-eme ha.” (Jọn 13:17) Naomi bụ ihe nlereanya dị mma nke itinye n’ọrụ aro dị iche iche nke nzukọ Jehova na-atụ iji mee ka ije ozi anyị dịwanye mma. Ihe siiri ya ike ịgwa ndị ọ na-amaghị okwu site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ọtụtụ mgbe kwa, ọ pụghị icheta ihe ọ ga-ekwu ka ọ na-eguzo n’ọnụ ụzọ ndị mmadụ. Ndị okenye n’ọgbakọ gbara ya ume itinye n’ọrụ aro dị iche iche a na-achọta n’akwụkwọ ahụ bụ́ Reasoning From the Scriptures, n’akụkụ ahụ bụ́ “Introductions for Use in the Field Ministry” (Okwu Mmalite A Ga-eji Mee Ihe n’Ozi Ubi).a O buru okwu mmalite ndị ahụ dị n’okpuru isiokwu nta bụ́ “Family/Children” (Ezinụlọ/Ụmụaka) n’isi ma kwughachi ha ọtụtụ ugbo. Dị ka ihe si na ya pụta, o nwere ike isoro otu nwanyị na-arụ ọrụ n’ụlọ kwurịta okwu, bụ́ onye nọ n’agbata 30 afọ ruo 39 afọ. Ọbụna tupu Naomi enwee ike ịgaghachi, nwanyị a bịara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. E mere ndokwa maka ọmụmụ Bible. Nwanyị ahụ na-arụ ọrụ n’ụlọ na di ya bụ ndị Kraịst e mere baptism ugbu a, na-enwe ndụ ezinụlọ obi ụtọ, ha na ụmụ ha.
Ime Ihe Nile Anyị Pụrụ Ime n’Igosi Mmasị Onwe Onye
Anyị pụkwara iṅomi Pọl onyeozi, bụ́ onye kwuru, sị: “Ana m eme ihe nile n’ihi ozi ọma, ka m wee ghọọ onye na-enwekọ ya.”—1 Ndị Kọrint 9:22, 23.
Hatsumi gosipụtara àgwà nke a. Mgbe Hatsumi nọ n’ozi ihu ọha, otu nwanyị jiri ụzọ nkwanye ùgwù kwuo site n’eriri nkwurịta okwu na ya ji ọrụ n’aka nke na ya apụghị ikwu okwu. Olu onye ahụ nwe ụlọ dị nro, ya mere Hatsumi nọgidere na-eleta ya. Ọ bụ nanị site n’eriri nkwurịta okwu ka onye ahụ nwe ụlọ na-azaghachi, ọ dịghị mgbe ọ bụla ọ pụtara ịhụ Hatsumi. Nke a gara n’ihu ruo afọ abụọ na ọkara.
Otu ụbọchị Hatsumi gbanwere oge o ji eme nleta ahụ, wee gaa mgbe oge ehihie gamiworo. Ọ dịghị onye zaghachirinụ. Otú ọ dị, ka ọ na-ahapụ, otu olu ọ maara si n’azụ ya jụọ sị, “Ònye ka ị bụ?” Nwanyị ahụ ka si n’ezí bata. Mgbe ọ nụrụ aha Hatsumi, ọ zaghachiri ozugbo ahụ, “Oo, ọ bụ gị bụ onye nọworo na-eleta m. Ekelee m gị maka iche banyere m mgbe nile.” N’ihi na nwanyị ahụ akwụsịwo isoro Ndịàmà Jehova na-amụ Bible n’ebe ọzọ, ahụ erughị ya ala imepere Hatsumi ụzọ. A maliteghachiri ọmụmụ Bible, onye ahụ nwe ụlọ na-enwekwa ọganihu nke ọma. Ihe banyere ndị ahụ anyị na-ezute n’ozi ụlọ n’ụlọ ọ̀ na-emetụ anyị n’obi otú a?
Mee Ihe Nile Ị Pụrụ Ime
Jehova na-enwe mmasị ná mgbalị anyị ijere ya ozi ruo otú nile anyị pụrụ ijeru. Ọ dị ka nna nke nwa ya nwoke ji onyinye dị iche iche na-abịakwute. Ruo ọtụtụ afọ, onyinye ahụ pụrụ ịdịgasị iche na-adabere n’afọ ndụ nke nwa nwoke ahụ na otú ike ya hà. Dị ka nna ahụ na-enwe obi ụtọ ịnata onyinye ọ bụla si n’obi nwa ya nwoke pụta nke ọ na-enye ya, otú a ka Jehova na-adị njikere ịnara ozi anyị ji obi anyị na-eje n’ụzọ kwekọrọ n’uto ime mmụọ anyị.
Otú ọ dị, ọ baghị uru iji ihe nile anyị pụrụ ime na-atụnyere nke ndị ọzọ. Dị ka Pọl na-ekwu, anyị ga-enwe ihe anyị ga-eji nyaa isi n’ihe banyere onwe anyị, ‘ọ bụghịkwa n’ebe ibe anyị nọ.’ (Ndị Galetia 6:4) Ka anyị nọgide na-ege ntị ná ndụmọdụ nke Pita onyeozi: “Na-anụnụ ọkụ n’obi ka e wee hụ unu n’udo, ndị na-enweghị ntụpọ, ndị a na-apụghịkwa ịta ụta n’ihu ya.”—2 Pita 3:14.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 29]
Ị̀ na-eme ihe nile kasị mma ị pụrụ ime n’itinye aro dị iche iche a na-atụ maka ozi ubi n’ọrụ?