Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 6/97 p. 1
  • “Mee Ihe Nile I Nwere Ike Ime”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Mee Ihe Nile I Nwere Ike Ime”
  • Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị̀ Na-eme Ihe Nile Ị Pụrụ Ime?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • “Chebaranụ Ụdị Mmadụ Unu Kwesịrị Ịbụ Echiche”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Na-enwe Obi Ụtọ ma I Meere Jehova Ike Gị Niile
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Ị̀ Na-ejezu Ozi Gị?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1997
km 6/97 p. 1

“Mee Ihe Nile I Nwere Ike Ime”

1 Mgbe anyị raara onwe anyị nye Jehova, anyị kwere nkwa inye ya ihe kasị mma anyị nwere. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, Pita onyeozi gbara ndị Kraịst narị afọ mbụ ume ime ihe nile ha nwere ike ime n’ijide nguzo ha n’ihu Jehova n’aka. (2 Pita 1:10) Anyị chọrọ n’ezie ime ihe nile anyị nwere ike ime iji mee Jehova obi ụtọ n’ijere ya ozi taa. Gịnị ka nke a gụnyere? Ka mmekọrịta anyị na Jehova na-emikwu emi, anyị na-atụgharịkwa uche n’ihe nile o mewooro anyị, obi anyị na-akwali anyị mgbe nile ime ike anyị nile n’ozi ya. Anyị ga-achọ ịkwalite ọdịdị na, ebe o kwere omume, mụbaa ọ̀tụ̀tụ̀ nke ozi anyị.—Abụ Ọma 34:8; 2 Tim. 2:15.

2 Otu nwanna nwoke na-eto eto nke chọrọ imekwu ihe n’ozi chọpụtara na ịmụchi Okwu Chineke anya mere ka obi ekele ya maka Jehova mikwuo emi ma kụnye ịnụ ọkụ n’obi ka ukwuu n’ime ya. Nke a kwaliri ya itinye akwụkwọ maka ozi ọsụ ụzọ. Otu nwanna nwanyị ọ na-esiri ike ịgwa onye ọ na-amaghị okwu mụghachiri ụfọdụ n’ime ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ bụ́ ndị dị n’akwụkwọ nta bụ́ Nkwurịta Okwu Bible ma malite inwe ihe ịga nke ọma ka ukwuu n’ozi ya n’oge na-adịghị anya. O nwere ike iduziri otu di na nwunye ọmụmụ Bible bụ́ ndị nakweere eziokwu ahụ.

3 Ṅụrịa Ọṅụ n’Ihe Ị Pụrụ Ime: Ụfọdụ n’ime anyị na-enwe ọnọdụ ndị siri ike dị ka ahụ esighị ike, mmegide ezinụlọ, ịda ogbenye, ma ọ bụ enweghị mmasị n’ókèala. Ọtụtụ nsogbu ndị ọzọ a na-ahụkarị ná mgbe ikpeazụ a pụrụ igbochi ije ozi anyị. (Luk 21:34, nkọwa ala ala peji NW; 2 Tim. 3:1) Nke a ọ̀ pụtara na anyị adawo ná nraranye anyị nye Jehova? Ọ bụghị ya ma ọ bụrụ na anyị na-ejere ya ozi site n’ime ihe nile anyị nwere ike ime.

4 Ọ bụghị ihe amamihe dị na ya ikpe onwe anyị ikpe dabere n’ihe ndị ọzọ nwere ike ịrụzu. Kama nke ahụ, Akwụkwọ Nsọ na-agba anyị ume ka “onye ọ bụla nwapụta ọrụ nke aka ya.” Inyefe onwe anyị n’ụzọ zuru ezu ruo n’ókè anyị nwere ike na-atọ Jehova ụtọ ma na-enye anyị ‘ihe anyị ga-anyara isi.’—Gal. 6:4; Kọl. 3:23, 24.

5 Ka anyị ṅaa ntị n’okwu Pita bụ́ ‘[ime ihe nile anyị nwere ike ime, NW] ka e wee hụ anyị n’udo, ndị na-enweghị ntụpọ, ndị a na-apụghịkwa ịta ụta n’ihu Ya.’ (2 Pita 3:14) Mmụọ ahụ ga-eme ka anyị nọrọ ná nchebe, ọ ga-ewetakwara anyị udo nke uche nke nanị Jehova pụrụ inye.—Abụ Ọma 4:8.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya