Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w22 Eprel p. 10-14
  • Na-enwe Obi Ụtọ ma I Meere Jehova Ike Gị Niile

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-enwe Obi Ụtọ ma I Meere Jehova Ike Gị Niile
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • MGBE ANYỊ NA-AGAGHỊ EMELI IHE NDỊ ANYỊ CHỌRỌ IME
  • Ọ BỤRỤ NA I NWERE ONYINYE, JIRI YA JEERE JEHOVA OZI
  • MỤTA IHE N’AKA NDỊ ỌZỌ
  • KA OBI NA-ATỌ GỊ ỤTỌ N’OFUFE JEHOVA
  • Na-enwe Obi Ụtọ n’Ọganihu Gị n’Ozi Jehova
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Ị Bara Uru n’Ọgbakọ Jehova
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Otú Ị Ga-esi Emeri Ịda Mbà n’Obi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Kere Òkè N’ọṅụ Nke Inye Ihe!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
w22 Eprel p. 10-14

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 16

Na-enwe Obi Ụtọ ma I Meere Jehova Ike Gị Niile

“Ka onye ọ bụla na-eleru ihe ọ na-eme anya.”​—GAL. 6:4.

ABỤ NKE 37 M Ji Obi M Niile Na-efe Jehova

IHE ISIOKWU A NA-EKWUa

1. Gịnị ga-eme ka anyị na-enwe ezigbo ọṅụ?

JEHOVA chọrọ ka anyị na-enwe ọṅụ. Otú anyị si mata bụ na ọṅụ so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. (Gal. 5:22) Ebe ọ bụ na a na-aka enwe obi ụtọ n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe, anyị ga-enwe ezigbo obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị ejiri ozi ọma kpọrọ ihe nakwa ma ọ bụrụ na anyị esi n’ụzọ dị iche iche na-enyere ụmụnna anyị aka.​—Ọrụ 20:35.

2-3. (a) Dị ka e kwuru ná Ndị Galeshia 6:​4, olee ihe abụọ nwere ike inyere anyị aka ịna-enwe obi ụtọ n’ozi Jehova? (b) Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?

2 Pọl onyeozi kwuru ihe abụọ ga-enyere anyị aka ịna-enwe ọṅụ ná Ndị Galeshia 6:4. (Gụọ ya.) Nke mbụ, anyị kwesịrị ịna-emere Jehova ike anyị niile. Ọ bụrụ na anyị ana-emere ya ike anyị niile, anyị kwesịrị ịna-enwe obi ụtọ. (Mat. 22:​36-38) Nke abụọ, anyị ekwesịghị iji onwe anyị na-atụnyere ndị ọzọ. Anyị kwesịrị ikele Jehova n’ihi ihe ọ bụla anyị nwere ike imeli n’agbanyeghị ma ahụ́ ọ̀ dị anyị, nkà anyị nwere, ma ọ bụkwanụ ọzụzụ e nyere anyị. A sị ka e kwuwe, ihe niile anyị nwere si n’aka ya. Ọ bụrụkwa na e nwere otú ndị ọzọ si ka anyị eme nke ọma n’ozi ọma, anyị kwesịrị ịna-enwe obi ụtọ na ha ji onyinye Jehova nyere ha na-eto ya, ọ bụghị iji ya na-eto onwe ha ma ọ bụ ime ihe ga-abara naanị ha uru. N’ihi ya, anyị kwesịrị isi n’aka ha mụta ihe kama anyị ịga ka anyị na ha mawa aka.

3 N’isiokwu a, anyị ga-ahụ ihe nwere ike inyere anyị aka ma ọ bụrụ na ike agwụwa anyị n’ihi na anyị anaghị emelizi ihe niile anyị chọrọ ime n’ozi Jehova. Anyị ga-ahụkwa otú anyị ga-esi jiri onyinye ọ bụla Jehova nyere anyị na-eto ya, na-amụtakwa ihe n’aka ndị ọzọ.

MGBE ANYỊ NA-AGAGHỊ EMELI IHE NDỊ ANYỊ CHỌRỌ IME

Foto ndị na-egosi: Otu nwanna na-emere Jehova ike ya niile ná ndụ ya niile. 1. Ebe ọ na-arụ ọrụ n’ebe a na-asụ ákwà na Betel. 2. Ebe ya na nwunye ya bụ ndị ọsụ ụzọ. 3. Ebe nwanna ahụ, nwunye ya, na ụmụ ha abụọ nọ n’ozi ọma. 4. Ebe nwanna ahụ ji akwụkwọ ozi na-ekwusa ozi ọma mgbe o merela agadi.

Ọ bụrụ na anyị ana-eme ike anyị niile ná ndụ anyị niile, anyị na-eme Jehova obi ụtọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4 ruo na nke 6)b

4. Olee ihe nwere ike ime ka ike gwụwa ụfọdụ ndị? Mee ihe atụ.

4 Ụfọdụ n’ime ndị na-efe Jehova enweghịzi ike ime ihe ndị ha chọrọ ime n’ozi Jehova n’ihi na ha akawala nká ma ọ bụ na ha na-arịa ọrịa. Ihe a nwere ike ịna-eme ka ike na-agwụ ha. Ọ bụ ihe mere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Carol. O nweburu mgbe ọ na-eje ozi n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma. N’oge ahụ, o nwere mmadụ iri atọ na ise ọ na-amụrụ Baịbụl. O nyekwaara ọtụtụ ndị aka ha enyefee Jehova onwe ha ma mee baptizim. Ozi Nwanna Nwaanyị Carol nọ na-atọ ya ezigbo ụtọ mgbe ahụ. Ma, o mechara rịawa ọrịa, ya emee ka ọ na-anọkarịzi n’ụlọ. Ọ sịrị: “Ama m na ọrịa emeela ka m ghara ịna-emelizi ihe ndị ọzọ na-eme. Ma, ọ bịaziri dị m ka mụ abụghịzi ezigbo Onye Kraịst otú ahụ ha bụ. Anaghịzi m emeli ihe niile m chọrọ ime, ya ana-eme ka ike na-agwụ m.” Nwanna Nwaanyị Carol chọrọ imere Jehova ihe niile o nwere ike ime. Ihe a o mere dị ezigbo mma. Obi sikwara anyị ike na obi dị Jehova ụtọ maka na ọ na-emere ya ike ya niile.

5. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị icheta ma ọ bụrụ na ike na-agwụ anyị n’ihi na e nwere ihe anyị na-anaghị emeli? (b) Dị ka anyị hụrụ na foto e ji kọwaa paragraf a, olee otú nwanna ahụ si na-emere Jehova ihe niile o nwere ike ime n’ozi ya?

5 Ọ bụrụ na e nwee ihe ị na-anaghị emeli, ya emee ka ike na-agwụ gị mgbe ụfọdụ, jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị ka Jehova chọrọ m n’aka?’ Jehova chọrọ ka ị na-emere ya ihe niile i nwere ike imere ya ugbu a. Legodị ihe atụ a. Ka e were ya na e nwere otu nwanna nwaanyị dị afọ iri asatọ ike na-agwụ n’ihi na ọ naghịzi agali ozi ọma otú ọ na-agabu mgbe ọ dị afọ iri anọ. N’agbanyeghị na ọ na-eme ike ya niile, o chere na obi adịghị Jehova ụtọ maka ya. Ma, ihe a o chere ọ̀ bụ eziokwu? Chebagodịrị ya echiche. Ọ bụrụ na nwanna nwaanyị a meere Jehova ihe niile o nwere ike imere ya mgbe ọ dị afọ iri anọ, ka na-emekwara Jehova ihe niile o nwere ike imere ya ugbu a ọ dị afọ iri asatọ, ọ kwụsịbeghị imere Jehova ike ya niile. Ọ bụrụ na anyị echee na obi anaghị adị Jehova ụtọ maka ozi anyị na-ejere ya ugbu a, anyị kwesịrị ichetara onwe anyị na ọ bụ Jehova na-ekpebi ihe dị ya mma na ihe na-adịghị ya mma. Ọ bụrụ na anyị emeere Jehova ihe niile anyị nwere ike imere ya, ọ ga-enwe ezigbo obi ụtọ. Ọ ga-asị anyị, ‘Unu mere nke ọma.’​—I nwere ike ịtụle Matiu 25:​20-23.

6. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ Nwanna Nwaanyị Maria?

6 Ọ ga-adịrị anyị mfe ịna-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị ana-elekwasị anya n’ihe anyị ga-emeli kama ilekwasị anya n’ihe anyị na-agaghị emeli. Legodị ihe mere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Maria. E nwere ọrịa ọ na-arịa nke mere ka ọ gharazie ịna-aga ozi ọma otú o si agabu. Na mbụ, ọ na-eme ka ike na-agwụ ya, ya echee na e nweghịzi uru ọ bara. Ma, o mechara chee gbasara otu nwanna nwaanyị nọ n’ọgbakọ ha na-anaghị ebili ebili. O kpebiri inyere ya aka. Maria sịrị: “Ahaziri m ka mụ na ya jiri ekwentị na akwụkwọ ozi na-ekwusa ozi ọma. Mgbe ọ bụla mụ na ya rụchara n’ozi ọma, obi na-adị m ezigbo ụtọ na m mere ike m niile iji nyere ya aka.” Anyị ga na-enwekwu ọṅụ ma ọ bụrụ na anyị ana-elekwasị anya n’ihe ndị anyị ga-emeli kama ịna-elekwasị anya n’ihe ndị anyị na-agaghị emeli. Ma, ọ bụrụkwanụ na e nwere ebe anyị kwesịrị ịna-emekwu nke ọma n’ozi anyị na-ejere Jehova ma ọ bụkwanụ na e nwere ebe anyị na-eme nke ọma n’ozi Jehova?

Ọ BỤRỤ NA I NWERE ONYINYE, JIRI YA JEERE JEHOVA OZI

7. Olee ihe Pita onyeozi gwara Ndị Kraịst ka ha mee?

7 N’akwụkwọ ozi mbụ Pita onyeozi dere, ọ gbara ụmụnna ya ume ka ha jiri onyinye ọ bụla ma ọ bụ nkà ọ bụla ha nwere na-agba ụmụnna ha ume. Pita dere, sị: “Ka onye ọ bụla n’ime unu jiri onyinye Chineke nyere ya na-ejere ibe ya ozi, ebe unu bụ ezigbo ndị ohu Chineke ji ihe akpọrọ ihe, ndị Chineke meere amara.” (1 Pita 4:10) Anyị ekwesịghị ịghara ime ike anyị niile n’ihi na anyị chere na ọ ga-eme ka ndị ọzọ mewere anyị anyaụfụ ma ọ bụkwanụ mee ka ha daa mbà. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, ọ pụtara na anyị anaghị emere Jehova ihe niile anyị nwere ike imere ya.

8. Dị ka e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 4:​6, 7, gịnị mere anyị ekwesịghị iji onyinye anyị nwere na-etu ọnụ?

8 Anyị kwesịrị iji onyinye anyị nwere na-eme ike anyị niile n’ofufe Jehova. Ma, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ịna-eji ya etu ọnụ. (1 Ndị Kọrịnt 4:​6, 7.) Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ọ na-adịrị gị mfe ịmalite ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl. I kwesịrị ịna-agba mbọ na-eme ya. Ma, anyị kwesịrị icheta na anyị ekwesịghị ịna-eji ya na-etu ọnụ. Ka e were ya na e nwere onye ị malitere ịmụrụ Baịbụl n’ozi ọma. Ị chọrọ ịkọrọ ndị nọ n’ìgwè ozi ubi unu otú o si mee. Ma mgbe i rutere n’ebe ha nọ, ị hụrụ ka otu nwanna nwaanyị na-akọ otú o si nye mmadụ magazin. Yanwa nyere magazin, gịnwa amalite ọmụmụ Baịbụl. Gịnị ka ị ga-eme? Ị ma na ihe ahụ ị chọrọ ịkọ ga-agba ụmụnna ahụ ume, mana gị ekpebie na ọ ka mma iche ruo oge ọzọ dabara adaba ka i nwee ike ịkọ ya n’ihi na ị chọghị ime ka nwanna nwaanyị ahụ chee na ị ka ya eme nke ọma n’ozi ọma. Ihe a bụ imere ya obiọma. Ma, ọ ganụghị eme ka ị kwụsị ịmalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl. Ebe ọ bụ na i nwere onyinye ịmalite ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl, na-eme ya.

9. Olee ihe anyị kwesịrị iji onyinye ndị anyị nwere eme?

9 Anyị kwesịrị icheta na nkà ọ bụla anyị nwere bụ onyinye si n’aka Chineke. Anyị kwesịrị iji onyinye ndị ahụ na-agba ụmụnna anyị ume, ọ bụghị iji ha eme ka e towe anyị. (Fil. 2:3) Ọ bụrụ na anyị ejiri ike anyị na nkà ndị anyị nwere na-eme uche Chineke, anyị ga-enwe obi ụtọ. Ma, ihe mere anyị ga-eji na-enwe obi ụtọ abụghị n’ihi na anyị chọrọ ịna-eme ihe karịrị nke ndị ọzọ mere ma ọ bụ ka anyị gosi na anyị ka ha, kama, n’ihi na anyị ji onyinye ndị ahụ na-eme ka e too Jehova.

10. Gịnị mere na ọ dịghị mma ka anyị na-eji onwe anyị atụnyere ndị ọzọ?

10 Ọ bụrụ na mmadụ akpacharaghị anya, o nwere ike ịmalite iji ihe ndị ọ na-emeta na-atụnyere ihe onye ọzọ na-anaghị emeta. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na nwanna na-ekwu okwu ihu ọha nke ọma. Ihe a bụ ihe ọ na-emeta. Ma n’obi ya, o nwere ike ịna-eleda nwanna ọzọ ikwu okwu ihu ọha na-esiri ike anya. Ma, nwanna ahụ nwere ike ịna-ele ọbịa nke ọma, na-azụ ụmụ ya nke ọma, ma ọ bụ jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị nwere ọtụtụ ụmụnna na-eji nkà ha nwere na-ejere Jehova ozi ma na-enyere ụmụnna ha aka.

MỤTA IHE N’AKA NDỊ ỌZỌ

11. Gịnị mere anyị kwesịrị iji gbalịa na-eme ka Jizọs?

11 Ọ bụ eziokwu na anyị ekwesịghị ịna-eji onwe anyị atụnyere ndị ọzọ, ma anyị nwere ike ịmụta ihe n’aka ndị ọzọ na-efe Jehova. Iji maa atụ, ka anyị lee ihe anyị ga-amụta n’aka Jizọs. N’agbanyeghị na o zuru okè, anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe n’ọmarịcha àgwà ndị o nwere na ihe ndị magburu onwe ha o mere. (1 Pita 2:21) Ọ bụrụ na anyị agbalịsie ike na-eme ka ya, anyị ga na-efekwu Jehova nke ọma, na-emekwu nke ọma n’ozi ọma.

12-13. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka Eze Devid?

12 Na Baịbụl, anyị ga-ahụ akụkọ ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị anyị nwere ike ịna-eme ka ha n’agbanyeghị na ha ezughị okè. (Hib. 6:12) Chee gbasara Eze Devid. Jehova kpọrọ ya “nwoke obi m nabatara.” Otú Baịbụl ọzọ si sụgharịa ya bụ “ụdị mmadụ m chọrọ.” (Ọrụ 13:22) Devid ezughị okè. N’eziokwu, e nwere ụfọdụ ihe jọgburu onwe ha o mere. Ma, anyị ka nwere ike ịmụta ihe n’aka ya. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na mgbe a gbaziri ya, ọ bịaghị gọrọwa onwe ya. Kama, ọ nabatara ndụmọdụ e nyere ya, chegharịakwa. Ihe o mere wuteruru ya n’ọkpụkpụ. Ọ bụ ya mere Jehova ji gbaghara ya.​—Ọma 51:​3, 4, 10-12.

13 Anyị nwere ike ịmụta ihe n’aka Devid ma ọ bụrụ na anyị ajụọ onwe anyị, sị: ‘Gịnị ka m na-eme ma e nye m ndụmọdụ? M̀ na-achọpụta ebe m mejọrọ ihe ozugbo, ka m̀ na-agbalị igosi na ihe m mere dị mma? M̀ na-ata ndị ọzọ ụta ozugbo maka ihe m mere? M̀ na-agbalịsi ike ka m ghara ime ihe ọjọọ ahụ ọzọ?’ I nwere ike ịna-ajụ onwe gị ụdị ajụjụ ndị a ma ị na-agụ gbasara ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị ọzọ fere Jehova a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. Nsogbu ha nwere ò yiri nke gịnwa nwere? Olee àgwà ndị mara mma ha kpara? Ị gụwa gbasara onye nke ọ bụla n’ime ha, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú m nwere ike isi na-emekwu ka ohu Jehova a ji obi ya niile fee ya?’

14. Olee uru ile ihe ụmụnna anyị na-eme ga-abara anyị?

14 Anyị nwekwara ike ịmụta ihe ma ọ bụrụ na anyị ana-ele ihe ụmụnna anyị na-eme, ma nwata ma okenye. Dị ka ihe atụ, è nwere nwanna ị ga-echeta n’ọgbakọ unu ji obi ya niile na-edi ọnwụnwa bịaara ya? O nwere ike ịbụ na ndị ọgbọ ya chọrọ ka o mee ihe na-adịghị mma ma ọ bụ na ndị ezinụlọ ya na-akpagbu ya ma ọ bụkwanụ na ọ na-arịa ọrịa. È nwere ọmarịcha àgwà nwanna ahụ na-akpa gịnwa chọkwara ịgbakwu mbọ na-akpa? Ọ bụrụ na i chebara ihe ndị o mere echiche, ị ga-ahụ ụzọ ndị ị ga-esi na-edi ọnwụnwa nke gịnwa. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị nwere ụdị ụmụnna ahụ anyị nwere ike inwe ụdị okwukwe ha nwere.​—Hib. 13:7; Jems 1:​2, 3.

KA OBI NA-ATỌ GỊ ỤTỌ N’OFUFE JEHOVA

15. Olee ndụmọdụ Pọl nyere ga-enyere anyị aka iji ọṅụ na-efe Jehova?

15 Iji mee ka ọgbakọ dịrị n’udo, dịrịkwa n’otu, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịna-eme ike ya niile. Chegodị gbasara Ndị Kraịst n’oge ndịozi Jizọs. Ha nwere onyinye dị iche iche na ọrụ dị iche iche. (1 Kọr. 12:​4, 7-11) Ma, o meghị ka ha na-ama aka ma ọ bụ na-alụso ibe ha ọgụ. Kama nke ahụ, Pọl gbara onye ọ bụla n’ime ha ume ka ọ na-eme ihe o kwesịrị ime “ka ahụ́ Kraịst sie ike.” Pọl degaara ndị Efesọs akwụkwọ ozi, sị: “Ọ bụrụ na ihe nke ọ bụla dị n’ahụ́ na-arụ ọrụ ya nke ọma, ahụ́ ga na-eto eto, gbasiekwa ike n’ihi na ihe nke ọ bụla dị n’ahụ́ hụrụ ibe ya n’anya.” (Efe. 4:​1-3, 11, 12, 16) Ndị mere ihe a Pọl kwuru mere ka udo dịrị n’ọgbakọ, ha adịrịkwa n’otu. Anyị na-ahụkwa ụdị ihe a n’ọgbakọ Ndị Kraịst taa.

16. Olee ihe anyị kwesịrị ikpebisi ike ime? (Ndị Hibru 6:10)

16 Kpebisie ike na ị gaghị na-eji onwe gị atụnyere ndị ọzọ. Kama nke ahụ, mụta ihe n’aka Jizọs, na-agbalịkwa ime ka ya. Mụta ihe n’aka ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl nakwa ụmụnna ndị nwere okwukwe taa. Ka ị na-eme ike gị niile n’ofufe Jehova, ka obi sie gị ike na Jehova “abụghị onye ajọ omume. Ọ gaghị echefu ọrụ” gị. (Gụọ Ndị Hibru 6:10.) Na-enwe obi ụtọ n’ofufe ị na-efe Jehova ebe ị ma na obi dị ya ụtọ maka otú i si jiri obi gị niile na-efe ya.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Gịnị mere na anyị ekwesịghị iji onwe anyị na-atụnyere ndị ọzọ?

  • Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-enwe obi ụtọ n’ozi anyị na-ejere Jehova ọ bụrụgodị na e nwere ihe ndị anyị na-anaghị emelizi?

  • Olee ihe anyị nwere ike ime ka àgwà ọma ndị ọzọ baara anyị uru?

ABỤ NKE 65 Gaa n’Ihu

a Anyị niile nwere ike ịmụta ihe n’ihe ndị ọzọ mere n’ozi Jehova. Ma, e nwere ihe anyị kwesịrị izere. Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịmata otú anyị ga-esi na-enwe ọṅụ ma ghara ịdị mpako ma ọ bụ ikwe ka ike gwụwa anyị n’ihi na anyị ji ihe ndị anyị nwere ike imeli n’ozi Jehova na-atụnyere ihe ndị ọzọ na-eme.

b NKỌWA FOTO: Otu nwanna na-eje ozi na Betel mgbe ọ bụ nwa okorobịa. Mgbe ọ lụrụ nwaanyị, ha malitere ịsụ ụzọ. Mgbe ọ mụrụ ụmụ, ọ na-akụziri ha otú e si ezi ozi ọma. Ugbu a o merela agadi, ọ ka na-emekwa ike ya niile n’ozi ọma. Ọ na-eji akwụkwọ ozi ekwusa ozi ọma.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya