Ihe Mere Ị Ga-eji Gaa
Ị GA-ENWETA ụbọchị anọ na-enyeghachi ụgwọ ọrụ nke ntụziaka ime mmụọ ná Mgbakọ Distrikti “Izi Ihe Chineke,” bụ́ nke ga-ewere ọnọdụ n’oge ọkọchị n’obodo dị iche iche n’akụkụ ụfọdụ nke ụwa. Na Nigeria nanị, a ga-enwe 84 n’ime mgbakọ ndị a n’ọnwa November, December, na January. N’ozuzu ha, ihe omume ahụ ga-amalite na Thursday n’elekere 1:20 nke ehihie ma mechie na Sunday n’elekere 4:15 nke mgbede. Otu ihe ga-apụ iche bụ akụkọ nke ndị ozi ala ọzọ, ndị e nyewooro aka ịlaghachi ná mba nke aka ha maka oge obi ụtọ nke a.
Ma ì mewo okenye ma ị̀ bụ nwata—di, nwunye, nna, nne, onye nọ n’agbata afọ ndụ iri na atọ na iri na itoolu, ma ọ bụ nwatakịrị—ị ga-enweta nkụzi nke e nyere n’ụzọ doro anya, nke na-adọrọ adọrọ, nke ga-abara gị uru. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ taa na-ajụ, sị, Gịnị bụ nzube nke ndụ? N’ụtụtụ Friday, ọ ga-amasị gị ịnụ ka a tụlere ajụjụ a, nweekwa obi ụtọ n’ihe ị ga-anata iji nyere ndị ọzọ aka ịghọta isiokwu a.
N’ehihie Friday usoro ihe omume ahụ ga-ewepụta akụkụ ndị bụ́ “Ime Alụmdi na Nwunye Njikọ Na-adịgide Adịgide,” “Rụsie Ọrụ Ike Maka Nzọpụta nke Ezinụlọ Gị,” na “Ndị Nne na Nna—Ụmụ Unu Nwere Mkpa Nlekọta Pụrụ Iche.” Ozugbo ndị a gasịrị, a ga-elekwasị anya kpọmkwem ná nsogbu dị iche iche nke ndị na-eto eto na-eche ihu na otú ha pụrụ isi mee ihe banyere ha. E kwesịrị ịgba ha ume site n’ihe nkiri nke ihe ndị na-eme ugbu a nke a kpọrọ Ndị Ntorobịa Ndị Na-echeta Onye Kere Ha Ugbu A.
Na Saturday usoro ihe omume ahụ ga-ewepụta amụma Jisọs banyere mgbe ikpeazụ na karịsịa okwu ya ndị bụ: “Ngwa ngwa, mgbe mkpagbu mgbe ahụ gasịrị, anyanwụ ga-agba ọchịchịrị.” (Matiu 24:29) Ị ga-achọ ịnụ nkọwa banyere mgbe mkpagbu ahụ ga-ewere ọnọdụ. Usoro ihe omume Saturday ga-atụleghachikwa ihe ndekọ Ndịàmà Jehova n’oge ndị a ma gosi ihe ha rụzuworo.
Na Sunday, ihe nkiri ọzọ a kpọrọ Abụla Onye E Duhiere ma ọ bụ Onye Na-elelị Chineke, ga-eche ihu n’ihe ịma aka nye iguzosi ike n’ezi ihe nke mmadụ n’ihi vidio na egwú ndị na-ewu ewu taa. Okwu ihu ọha n’ehihie ga-ewepụta isiokwu bụ́ “Izi Ihe Na-enye Aka Maka Oge Anyị Dị Oké Egwu.” Usoro ihe omume ahụ ga-eji okwu agbamume bụ́ “Nọgide Na-ejidesi Izi Ihe Chineke Ike” mechie.
N’ezie, ị ga-erite uru site n’ịnọ ya ụbọchị anọ ahụ dum! E ji obi ụtọ na-akpọ gị òkù ịbịa. Iji mata ebe kasị ụlọ gị nso, gaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova dị n’ógbè gị ma ọ bụ detara ndị na-ebipụta magazin a akwụkwọ ma ọ bụ lee mbipụta September 8 nke Teta!, nke nwere adres nke ebe nile a ga-enwe mgbakọ na Nigeria.