Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 11/1 p. 32
  • Bịa Mgbakọ Distrikti “Egwu Chineke”!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Bịa Mgbakọ Distrikti “Egwu Chineke”!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mgbakọ Distrikti “Ndị Ji Ọṅụ Enye Otuto” nke Ndịàmà Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Bịa Mgbakọ Distrikti “Okwukwe n’Okwu Chineke”!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ị Gaghị Achọ Ka Ọ Kwaa Gị!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ị̀ Ga-anọ n’Ebe Ahụ?
    Teta!—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 11/1 p. 32

Bịa Mgbakọ Distrikti “Egwu Chineke”!

Ka ọ dị ugbu a ì mewo atụmatụ iji jee Mgbakọ Distrikti “Egwu Chineke” nke Ndịàmà Jehova nke 1994? N’ezie, ị ga-erite uru site n’ịnọzu ụbọchị atọ ahụ nile! Ebe e meworo ndokwa maka ihe karịrị 99 mgbakọ maka Nigeria nanị, o yiri ka a ga-enwe otu mgbakọ n’ebe dị nso n’ebe i bi.

Ụdị egwu ụfọdụ pụrụ imebi obi ike ma bibiekwa olileanya; okwu bụ́ isi nke ụtụtụ Friday ga-akọwa egwu Chineke ma kọwaakwa ọtụtụ uru ndị dị na ya. N’ezie usoro ihe omume dum nke mgbakọ ahụ ga-eme ka uru ndị a pụta ìhè.

N’ehihie Friday, ị gaje ịnụ otú egwu Chineke pụrụ isi mesiwanye alụmdi na nwunye na ndụ nke ezinụlọ ike, nakwa otú ọ pụrụ isi nyere ndị na-eto eto aka ịkwụrụ chịm n’iguzosi ike n’ihe ha nye Chineke. Ihe omume ehihie ahụ ga-eji okwu na-akpali akpali bụ́ “Nkasi Obi Maka Ndị Mmadụ Nwụnahụrụ” mechie. Ị ga-enwe mmasị n’ihe ọmụma bara uru e wepụtara n’oge a na-ekwu okwu ahụ iji nyere ndị ndị ha hụrụ n’anya nwụnahụrụ aka.

Usoro ihe omume Saturday ga-egosi otú egwu Chineke pụrụ isi wusie nrapagide anyị ná nduzi Jehova n’ihe banyere ọgbakọ na ije ozi ike. N’okwu bụ́ “Gụọ Okwu Chineke, bụ́ Bible Nsọ, Kwa Ụbọchị,” ndị bịara mgbakọ ga-anata aro ndị bara uru maka ịgụ na ịmụ Bible. Usoro ihe omume Saturday ga-eji okwu dabeere n’isiokwu ahụ na-akpali mmasị bụ́ “Ụbọchị ahụ Dị Egwu nke Jehova Dị Nso” mechie.

Ihe omume na-adọrọ mmasị n’usoro ihe omume Sunday bụ isiokwu ahụ bụ́ “A Ga-enwe Mbilite n’Ọnwụ nke Ndị Ezi Omume.” N’okwu na-esonụ, “Ndị E Chebere Ndụ Gabiga Mkpagbu Ukwu Ahụ,” a ga-enye nkọwa nke nkwa dị ebube nke Jisọs banyere ndị ahụ na-agaghị anwụ ma ọlị.​—⁠Jọn 11:26.

Ụtụtụ Sunday ga-eji ihe nkiri ahụ na-akpali iche echiche nke ga-ewe 40 minit nke isiokwu ya bụ Nhọrọ Ndị Ị Na-eche Ihu mechie. A ga-eme ka ndị na-ege ntị chetaghachi ihe mere n’ụbọchị Joshua, hụkwa ka e gosiri mkpebisi ike ya ịnọgide na-efe Jehova. A ga-egosikwa nnwale ọkụ ahụ n’ụbọchị Elaịja, a ga-enwetakwa ihe mmụta site n’ihe omume abụọ ndị ahụ nke ga-enyere ndị bịara mgbakọ aka igosipụta egwu Chineke taa. N’ehihie, okwu ihu ọha bụ́ “Ihe Mere A Ga-eji Tụọ Ezi Chineke ahụ Egwu Ugbu A” ga-abụ ihe omume kasịnụ nke mgbakọ ahụ.

Mee atụmatụ ugbu a ịbịa. Iji chọta ebe ga-akasị dịrị gị nso, kpọtụrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova dị n’ógbè unu ma ọ bụ detara ndị na-ebipụta magazin nke a akwụkwọ. Mbipụta Teta! nke October 8 bukwa adres nke ala mgbakọ nile na Nigeria.

[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 32]

T. Rosenthal/SUPERSTOCK

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya