Olee Otú Mmadụ Pụrụ Isi Dị n’Onyinyo Chineke?
“CHINEKE wee kee mmadụ n’onyinyo Ya, n’onyinyo Chineke ka O kere ya: nwoke na nwanyị ka O kere ha.” Otú a ka ihe ndekọ ahụ e dere site n’ike mmụọ nsọ na-ekwu, ma gịnị ka ọ pụtara? Olee otú e si kee nwoke na nwanyị mbụ n’onyinyo Chineke?—Jenesis 1:27.
Hà dị ka Chineke n’ọdịdị ahụ? Ee e, nke ahụ apụghị ime. Mmadụ bụ mmadụ, nwee anụ ahụ, e mere maka ibi n’elu ala. Chineke bụ mmụọ, na-ebi n’ebube eluigwe nke a na-apụghị ichetụ n’echiche nke mmadụ ọ bụla na-apụghị ọbụna ịbịaru nso. (Ọpụpụ 33:18-20; 1 Ndị Kọrint 15:50) Mgbe ahụ, olee otú e si mee mmadụ n’onyinyo Chineke? Ọ bụ n’ihi na e nyere mmadụ ikike igosipụta àgwà ndị bụ isi nke Chineke—ịhụnanya, ikpe ziri ezi, amamihe, na ike—tinyekwara àgwà ndị ọzọ.
Àgwà Dị Iche Iche nke Jehova
A na-egosipụta àgwà dị iche iche nke Jehova Chineke n’ihe nile o kere eke, ma e gosipụtara ha n’ụzọ na-enweghị atụ ná mmeso ya n’ebe di na nwunye mbụ, Adam na Iv nọ. (Ndị Rom 1:20) A hụrụ ịhụnanya ya n’ihi na o kere ụwa n’ụzọ kwesịrị nnọọ ekwesị ka mmadụ biri n’elu ya. Jehova keere nwoke otu nwanyị zuru okè ịbụ onye ya na ya ga-ebi na nne nke ụmụ ya. O debere ha abụọ n’otu ubi mara mma ma nye ha ihe nile dị mkpa n’ụba ka ha wee nọgide na-adị ndụ na-enwekwa obi ụtọ. Nke kasị ịtụnanya, Chineke nyere ha ohere nke ịdị ndụ ebighị ebi.—Jenesis 2:7-9, 15-24.
A hụrụ amamihe Chineke na ya ile di na nwunye mbụ ahụ ule. Ọ bụrụ na ha ga-anọgide dị ka ndị òtù nke ezinụlọ eluigwe na ala nke Jehova, ọ bụrụkwa na ha ga-adị ndụ ruo ebighị ebi dị ka nne na nna nke agbụrụ mmadụ, ọ ga-adị ha mkpa ịbụ ihe nlereanya nke ikwesị ntụkwasị obi na nke ezi ofufe. Ya mere, Jehova nyere ha ohere nke igosipụta ọnọdụ obi ha n’okpuru otu ule kwesịrị ekwesị—ha agajeghị iri site ná mkpụrụ osisi nke ịma ezi ihe na ihe ọjọọ. Lee otú o si bụrụ amamihe n’ebe Jehova nọ inye ụmụ mmadụ ohere ka ha gosipụta nrubeisi na ịhụnanya ha n’ebe ọ nọ tupu o nye ha ihe ùgwù dị iche iche dị ịtụnanya o bu n’obi maka ha!
A hụrụ ikpe ziri ezi nke Chineke ná nnọgidesi ike ya n’ụkpụrụ ndị dị elu n’ihe ndị o kere eke nakwa na ya ịghara imebi ụkpụrụ ndị ahụ. A hụrụ nke a n’ohere o nyere Adam na Iv ime ihe ziri ezi. Mgbe ha dakwara ada n’ime nke a, a hụrụ ikpe ziri ezi ya n’ikpe ọ mara ha ịta ahụhụ e buworo ụzọ kwuo maka nnupụisi.
A hụrụ ike Jehova n’ịhụ na e mezuru okwu ikpe ya. Setan, onye nnupụisi ukwu ahụ, emewo ka o yie ka Jehova ọ̀ bụ onye ụgha, Setan kwekwara Iv nkwa inye ya ihe dị ukwuu ma ọ bụrụ na o nupụrụ Chineke isi. (Jenesis 3:1-7) Ma Setan enweghị ike imezu nkwa ya. Ọ pụghị igbochi Jehova ịchụpụ Adam na Iv n’ubi Iden ahụ, ọ pụghịkwa igbochi mmezu nke okwu Chineke ndị ahụ nye Adam: “Ájá ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị ga-alata.” (Jenesis 3:19) Otú ọ dị, Jehova emezughị ikpe ọmụma ọnwụ ahụ otu mgbe ahụ, na nke a kwa o gosikwuru ịhụnanya ya. O nyere ohere ka Adam na Iv nwee oge ịmụ ụmụ bụ́ ndị a ga-emesị site na ha mezuo nzube Chineke mbụ maka ihe a kpọrọ mmadụ.—Jenesis 1:28.
N’ikpeazụ, e mere ka ikpe ziri ezi, ịhụnanya, ike, na amamihe nke Jehova Chineke pụta ìhè ná nkwa ya iweta otu mkpụrụ nke ga-emebi ọrụ Setan nile ma dozigharịa ihe si ná nnupụisi mbụ ahụ megide ọkaaka eluigwe na ala Chineke pụta. (Jenesis 3:15) Lee aha Onye Okike dị ebube anyị nwere!
Mgbalị Iṅomi Chineke
Ọ bụ ezie na ha ezukwaghị okè, ụmụ mmadụ ka pụrụ igosipụta àgwà dị iche iche nke Chineke. Ya mere, Pọl gbara ndị Kraịst nke ụbọchị ya ume, sị: “Bụrụnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya.” (Ndị Efesọs 5:1) Otú ọ dị, n’akụkọ ihe mere eme nile, ọtụtụ ndị egosipụtawo enweghị nsọpụrụ jọgburu onwe ya n’ebe àgwà Chineke dị. Ka ọ na-erule oge Noa, ụmụ mmadụ arụwo arụ nke na Jehova kpebiri ibibi ihe nile a kpọrọ mmadụ ma e wezụga Noa na ezinụlọ ya. Noa bụ “onye ezi omume, onye zuru okè n’ọgbọ ya nile,” o gosipụtakwara ịhụnanya ya n’ebe Chineke nọ site n’imezu iwu Chineke nile. “Noa wee mee ya; dị ka iwu nile si dị nke Chineke nyere ya, otú a ka o mere.” (Jenesis 6:9, 22) Noa gosiri ịhụnanya n’ebe mmadụ ibe ya nọ na nrapagide ya siri ike n’ikpe ziri ezi site n’ịbụ “onye na-ekwusa ezi omume.” (2 Pita 2:5) O gosiri amamihe ma jiri ikike efu ya mee ihe n’ụzọ ziri ezi site n’iso ntụzi Chineke n’iwu otu ụgbọ buru ibu, ịkwakọba nri n’ime ya, ịchịkọta anụmanụ, na ịbanye n’ime ya dị ka iwu Jehova si dị. O gosikwara ịhụnanya ya maka ezi omume n’ekweghị ka ndị agbata obi ya na-eme ihe ọjọọ metọọ ya.
Bible na-akọwa ọtụtụ ndị ọzọ gosipụtara àgwà Chineke n’otu aka ahụ. Onye kasị ha nile bụ Jisọs Kraịst, onye dị n’onyinyo Chineke n’ụzọ zuru okè nke na ọ pụrụ ịsị: “Onye hụworo m anya ahụwo Nna m anya.” (Jọn 14:9) N’ime àgwà ndị Jisọs gosipụtara, nke pụtara ìhè bụ ịhụnanya ya. Ịhụnanya n’ebe Nna ya nọ na n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ kwaliri ya ịhapụ ebe obibi eluigwe ya na ibi dị ka mmadụ n’elu ala. Ọ kwaliri ya inye Nna ya otuto site n’omume ezi omume ya na izi ihe a kpọrọ mmadụ ozi ọma nke nzọpụta. (Matiu 4:23; Jọn 13:31) Mgbe ahụ, ịhụnanya kwaliri Jisọs inye ndụ ya zuru okè maka nzọpụta nke ihe a kpọrọ mmadụ na, n’ụzọ kakwa mkpa, maka ido aha Chineke nsọ. (Jọn 13:1) N’ịgbalị iṅomi Chineke, è nwere ihe nlereanya ka mma a ga-agbaso karịa Jisọs Kraịst?—1 Pita 2:21.
Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Dịkwuo Ka Chineke Taa?
Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta àgwà dị iche iche nke Chineke taa wee si otú a mee ihe n’onyinyo Chineke? Ọ dị mma, buru ụzọ tụlee àgwà nke ịhụnanya. Jisọs sịrị: “Ị ga-ewere obi gị dum, werekwa mkpụrụ obi gị dum, werekwa uche gị dum, hụ Onyenwe anyị Chineke gị n’anya.” Olee otú anyị si egosi ịhụnanya n’ebe Chineke nọ? Jọn onyeozi na-aza, sị: “Nke a bụ ịhụnanya Chineke, ka anyị debe ihe nile O nyere n’iwu: ihe O nyere n’iwu adịghịkwa arọ.”—Matiu 22:37; 1 Jọn 5:3.
N’ezie, ka anyị wee rube isi n’ihe Jehova nyere n’iwu, anyị ga-ama ha. Nke a na-agụnye ịgụ ihe, ịmụ ihe, na ịtụgharị uche n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. Dị ka onye ọbụ abụ ahụ, anyị kwesịrị inwe ike ịsị: “Lee ka m si hụ iwu Gị n’anya! Ogologo ụbọchị nile ka nke ahụ bụ ihe m na-atụgharị n’uche.” (Abụ Ọma 119:97) Ka anyị na-enweta nghọta dịwanye omimi nke Okwu Chineke, anyị na-ejupụta n’ụzọ Chineke si eche echiche. Anyị na-ahụ ezi omume n’anya ma na-akpọ ihe ọjọọ asị. (Abụ Ọma 45:7) Nke ahụ bụ ebe Adam gahiere. Ọ matara iwu Jehova, ma ọ hụghị ya n’anya ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ nke ịrapagidesi ike na ya. Mgbe anyị na-agụ Okwu Chineke, anyị kwesịrị ịdị na-ajụ onwe anyị mgbe nile, ‘Olee otú nke a si metụta m? Gịnị ka m pụrụ ime iji mee ka akparamagwa m kwekọọ n’àgwà Chineke karị?’
Jisọs kwukwara, sị: “Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” (Matiu 22:39) Onye ọ bụla nwere ahụ ike na-ahụ onwe ya n’anya na-achọkwa ihe kasị mma maka onwe ya. Nke ahụ adịghị njọ. Ma ànyị na-egosi ịhụnanya yiri nke ahụ n’ebe ndị agbata obi anyị nọ? Ànyị na-agbaso ndụmọdụ Bible ahụ bụ́: “Egbochila ezi ihe ná ndị ọ dịịrị, mgbe ọ dịịrị ike aka gị ime ya”?—Ilu 3:27; Ndị Galetia 6:10.
Gịnị banyere àgwà nke amamihe? Ọchịchọ anyị na-achọ igosipụta àgwà nke a na-eduje anyị n’ịmụ Bible n’ihi na nke ahụ bụ isi iyi nke amamihe Chineke. Abụ Ọma 119:98-100 na-agụ, sị: “Karị ndị nile na-ezi m ihe ka m nwere uche; n’ihi na ihe àmà Gị nile bụ ihe m na-atụgharị n’uche. Ana m aghọta ihe karịa ndị okenye, n’ihi na ihe ịrịba ama Gị nile ka m chebeworo.” N’Ilu 3:18, a kọwara amamihe dị ka “osisi na-enye ndụ.” Ọ bụrụ na anyị enweta amamihe ma jiri ya na-eme ihe, anyị ga-anata ihu ọma Chineke na ụgwọ ọrụ nke ndụ ebighị ebi.—Eklisiastis 7:12.
Gịnị banyere ikpe ziri ezi? N’ime ụwa ọjọọ nke a, ikpe ziri ezi bụ àgwà dị mkpa maka ndị ga-eme ihe Chineke na-achọ. Jisọs hụrụ ezi omume (ikpe ziri ezi) n’anya ma kpọọ ihe ọjọọ asị. (Ndị Hibru 1:9) Ndị Kraịst taa na-eme otu ihe ahụ. Ikpe ziri ezi na-akwali ha igosi mmasị n’àgwà ndị ziri ezi. Ha na-ezere ụzọ ọjọọ nile nke ụwa nke a ma na-eme ime uche Chineke ihe kasị mkpa ná ndụ ha.—1 Jọn 2:15-17.
N’ihe metụtara ike, anyị nile nwere ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nke a. Anyị nwere ike nkịtị na ike iche echiche ndị anyị bu pụta ụwa, ka anyị na-etokwa eto dị ka ndị Kraịst, anyị na-azụlite ike n’ụzọ ime mmụọ. Jehova na-eji mmụọ nsọ ya na-eme ka anyị nwewanye ike ruo n’ókè nke na anyị pụrụ imezu nzube Jehova n’agbanyeghị na anyị yiri ndị na-adịghị ike. Pọl sịrị: “Enwere m ike n’ihe nile n’ime Onye ahụ Nke na-eme m ka m dị ike.” (Ndị Filipaị 4:13) Anyị ga-enwekwa otu ume ahụ ma ọ bụrụ na anyị ekpee ekpere maka mmụọ Jehova.
Ikwusa Ozi Ọma Ahụ
A na-ahụta nke ọma ngosipụta anyị na-egosipụta àgwà anọ ndị ahụ bụ́ isi nke Chineke site n’anyị irube isi n’iwu ahụ bụ́: “Gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ: na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke m nyere unu n’iwu: ma lee, Mụ onwe m nọnyeere unu ụbọchị nile, ruo ọgwụgwụ oge a.” (Matiu 28:19, 20) Ụdị ọrụ izi ihe dị otú ahụ na-ewetara ndị ṅara ya ntị ndụ. Lee ngosipụta mara mma nke ịhụnanya ọ bụ nye ndị, n’akụkụ ka ukwuu, na-amalite site n’ịbụ ndị anyị na-amabughị ma ọlị!
Ọzọkwa, ozizi dị otú ahụ bụ ụzọ nke amamihe. Ọ na-eweta mkpụrụ nke na-adịgide. Banyere ọrụ ọzọ dị aṅaa ka a pụrụ ịsị: “N’ime nke a ị ga-azọpụta onwe gị zọpụtakwa ndị na-anụ olu gị”? (1 Timoti 4:16) E nweghị ndị ihe funahụrụ n’ọrụ ime ndị nkwusa. Ma ndị na-ege ntị ma ndị na-akụzi akụzi na-enweta ngọzi ebighị ebi.
Banyere ikpe ziri ezi, ndị Kraịst na-ezi ndị ha na-amụrụ Bible ụkpụrụ ezi omume na ndị nke ikpe ziri ezi. Anyị na-enyere ha aka ife Jehova ofufe, bụ́ ‘Chineke nke ikpe.’ (Malakaị 2:17) Taa, a na-ekwupụta ndị raara ndụ ha nye ijere Jehova ozi ma nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi dị ka ndị ezi omume, ndị ikpe na-amaghị, na-eduje ná nlanarị ha n’Amagedọn.—Ndị Rom 3:24; Jemes 2:24-26.
Lee ka ikwusa na izi ozi ọma gburugburu ụwa si bụrụ ngosipụta nke ike! (Matiu 24:14) Ọ na-ewe ntachi obi ịnọgide na-ekwusa n’ókèala ebe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ na-enweghị mmasị ịnụ. Ma Jehova, site ná mmụọ ya, na-enye ume dị mkpa iji tachie obi ruo ọgwụgwụ.—Aịsaịa 40:30, 31; Matiu 24:13; Luk 11:13.
N’ezie, dị ka ụmụ na-ezughị okè nke Adam, anyị apụghị igosipụta àgwà ọma ndị a n’ụzọ zuru okè. Ma, cheta, e kere mmadụ n’onyinyo Chineke, ọ bụrụkwa na anyị agbalịa ịdị ka Chineke karị, mgbe ahụ n’akụkụ ụfọdụ anyị na-emezu ihe kpatara anyị ji adị ndụ. (Eklisiastis 12:13) Ọ bụrụ na anyị onwe anyị agbalịsie ike ime ihe ọ bụla anyị pụrụ ime ma rịọ maka mgbaghara mgbe anyị na-erughị ihe a chọrọ, mgbe anyị pụrụ inwe olileanya ịlanarị wee baa n’ụwa ọhụrụ nke ezi omume Chineke, bụ́ ebe anyị ga-emesịa ruo izu okè. Mgbe ahụ, anyị ga-anọ na paradaịs elu ala nke mmadụ ndị zuru okè bijupụtara, ha nile na-egosipụta àgwà dị iche iche nke Jehova Chineke n’ụzọ zuru ezu. Lee ihe ọṅụ ọ bụ! N’ikpeazụ, n’echiche kasị zuo ezu nke okwu ahụ, ụmụ mmadụ ga-adị n’onyinyo Chineke.
[Foto dị na peeji nke 25]
Jisọs gosiri anyị ụzọ anyị ga-esi zụlite ọmarịcha àgwà dị iche iche nke Jehova Chineke
[Foto dị na peeji nke 26]
N’ikpeazụ, ụmụ mmadụ ga-adị n’onyinyo Chineke n’echiche kasị zuo ezu