Iyi Egwu Nuklia Ò Mesịwo Gafere?
“UDO n’elu Ụwa yiri ihe ga-ekwe omume ugbu a karịa oge ọ bụla ọzọ eri Agha Ụwa nke Abụọ.” Echiche na-enye olileanya nke a nke otu onye nta akụkọ ná ngwụsị nke afọ ndị 1980 dabeere n’eziokwu bụ na nkwekọrịta nkwasa ngwá agha ndị dị ịrịba ama na oké mgbanwe dị iche iche a na-atụghị anya ha n’ọchịchị emesịwo weta Agha Nzuzo ahụ ná njedebe. Ma iyi egwu nuklia ahụ, nke e ji mara nnọọ nsọrịta mpi nke mba ndị bụ dike n’oge mbụ, ọ̀ gafewokwa? Udo na ntụkwasị obi na-adịgide adịgide hà na-achọ iru anyị aka n’ezie?
Ihe Mgbu Nile nke Mmụba
N’oge Agha Nzuzo ahụ, ka a na-adabere ná nhata nke iyi egwu iji debe udo, mba ndị bụ dike kwekọrịtara ikwe ka a na-emepụta nkà nuklia iji chụsoo udo na igbochi iji ya eme ihe n’imepụta ngwá agha nuklia. Na 1970 Nkwekọrịta Igbochi Mmụba nke Nuklia malitere ịdị irè; ihe dị ka 140 mba mesịrị nabata ya. Ma, mba ndị pụrụ inweta ike nuklia, dị ka Argentina, Brazil, India, na Israel, ajụwo ịbịanye aka na ya ọbụna ruo taa.
Otú ọ dị, na 1985, mba ọzọ pụrụ inweta ike nuklia, bụ́ North Korea, bịanyere aka. Ya mere mgbe ọ mara ọkwa nsepụ aka ya na March 12, 1993, ụwa dum mara nnọọ jijiji n’ahụ erughị ala. Magazin akụkọ ndị Germany bụ́ Der Spiegel rịbara ama, sị: “Ọkwa nke nsepụ aka site ná Nkwekọrịta Igbochi Mmụba nke Nuklia na-eguzobe ụkpụrụ: E nwere ugbu a iyi egwu nke ịsọ mpi ngwá agha nuklia, na-amalite n’Esia, bụ́ nke pụrụ ịdị ize ndụ karịa ịma aka bọmbụ n’etiti mba ndị bụ dike.”
Ka ịhụ mba n’anya na-amụpụta mba ndị ọzọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ na-atụ n’anya, ọnụ ọgụgụ mba ndị nwere ike nuklia nwere ike ịrị elu. (Lee igbe.) Odeakụkọ bụ́ Charles Krauthammer na-adọ aka ná ntị, sị: “Ngwụsị nke iyi egwu Soviet apụtaghị ngwụsị nke ihe ize ndụ nuklia. Ihe ize ndụ dị n’ezie bụ mmụba, mmụba ka malitekwara nnọọ amalite.”
Bọmbụ Maka Orure
Ndị gaje inweta ike nuklia na-achọsi ike inweta ùgwù na ike nke ngwá agha ndị a na-enye. A sịrị na otu mba zụtara ma ọ dịkarịa ala isi bọmbụ nuklia abụọ site n’aka Kazakhstan. Mba a bụbu nke Soviet dekọrọ isi bọmbụ ndị a n’akwụkwọ ndị ọchịchị dị ka ndị “na-efu efu.”
N’October 1992 e jidere ụfọdụ ndị ikom na Frankfurt, Germany, ka ha ji 200 gram nke nsí cesium na-ewepụta ụzarị na-egbu egbu bụ́ nke zuru ezu ime mmiri dum nke otu obodo nsí. Otu izu n’ihu, e jidere ndị ahịa iwu asaa na Munich ka ha ji 2.2 kilogram nke uranium. Nchọpụta nke òtù abụọ ji ihe nuklia azụ ahịa iwu n’ime izu abụọ mere ka ndị ọchịchị kụja, ebe ọ bụ na nanị ọnọdụ ise dị otú ahụ ka a kọworo akụkọ ha gburugburu ụwa n’ime afọ dum bu ụzọ.
Ma ndị a hà bu n’uche iresị ha òtù ndị na-emenye mmadụ ụjọ ma ọ bụ gọọmenti mba dị iche iche bụ ihe a na-amaghị ama. Ka o sina dị, ohere nke inwe iyi egwu ike nuklia na-arị elu. Dr. David Lowry nke ụlọ ọrụ European Proliferation Information Centre na-akọwa ihe ize ndụ ahụ: “Ihe onye na-emenye ndị ọzọ ụjọ nwere ime agwụla izigara ndị ọchịchị a na-akwanyere ùgwù uranium bụ nnọọ ezigbo ya maka nnwale, na-asị na anyị nwere ya nnukwu, nke a bụkwa ihe nnwapụta ya. Ọ bụ dị ka onye na-atọrọ mmadụ iziga ntị onye ọ tọọrọ.”
“Bọmbụ Ndị Na-echere Oge” na “Ọnyà Ọnwụ” bụ́ Ndị nke Udo
Mgbe 1992 malitere, 420 ígwè ọrụ mwụpụ ike nuklia nọ n’ọrụ ná nchụso udo nke imepụta ike eletrik; a ka na-ewu 76 ọzọ ewu. Ma n’afọ ndị na-agafenụ, ihe ọghọm ụlọ ọrụ nuklia edubawo ná mkpesa nke mmụba nke ọrịa, ime ọpụpụ, na nke nkwarụ site n’ọmụmụ. Otu akụkọ na-asị na ka ọ na-erule 1967 ihe mere n’otu ụlọ ọrụ Soviet na-emepụta plutonium akpatawo mwepụta nke ụzarị na-egbu egbu okpukpu atọ karịa nke ọdachi Chernobyl.
Otú ọ dị, ihe nke a mesịrị mee na Chernobyl, Ukraine, n’April 1986 bụ nke ghọrọ oké ihe akụkọ. Grigori Medwedew, osote onye isi injinia ike nuklia n’ụlọ ọrụ Chernobyl n’afọ ndị 1970, na-akọwa na “mkpokọba buru oké ibu nke mwepụta ụzarị na-egbu egbu n’ogologo oge” wụbara n’ime ikuku “ruru bọmbụ iri nke Hiroshima ma e kwuwe banyere mmetụta e nwere n’ime ogologo oge.”
N’akwụkwọ ya bụ́ Tschernobylskaja chronika, Medwedew depụtara ihe ọghọm 11 ndị dị oké njọ n’ụlọ ọrụ nuklia na Soviet Union oge mbụ n’etiti afọ ndị 1980 na 12 ọzọ n’ime United States. Nke ikpeazụ gụnyere ihe ọghọm ahụ na-awụ ibubo n’ahụ na 1979 mere na Three Mile Island. Banyere ihe ahụ merenụ, Medwedew na-ekwu, sị: “Ọ kpara ike ọjọọ mbụ siri ike megide ike nuklia ma wepụ ihe ijuanya nile banyere adịghị ize ndụ nke ụlọ ọrụ mmepụta ike nuklia n’uche ọtụtụ ndị—ma ọ bụghị n’uche mmadụ nile.”
Nke a na-akọwa ihe mere a ka ji na-enwe ihe ọghọm. N’ime 1992 ha ji ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 20 pasent rịa elu na Russia. Mgbe otu n’ime ihe ndị a merenụ gasịrị, na March afọ ahụ n’ụlọ ọrụ Sosnovy Bore dị na St. Petersburg, Russia, ọ̀tụ̀tụ̀ ụzarị na-egbu egbu ji 50 pasent rịa elu n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ England ma ruo okpukpu abụọ nke ọ̀tụ̀tụ̀ a na-anakwere n’Estonia na ebe ndịda nke Finland. Professor John Urquhart nke Newcastle University kwetara, sị: “Apụghị m ịnwapụta na ọ bụ Sosnovy Bore bụ nke kpatara ịrị elu ahụ—ma ọ bụrụ na ọ bụghị Sosnovy Bore, olee ihe ọ bụ?”
Ụfọdụ ndị ọchịchị na-azọrọ na ụfọdụ ígwè ọrụ mwụpụ ike yiri nke Chernobyl gbara ọrụ n’ụzọ e si rụọ ha, ha dịkwa nnọọ ize ndụ nke ukwuu ịrụ ọrụ na ha. Ka o sina dị, a ka ji ihe karịrị 12 n’ime ha eme ihe iji gboo oké mkpa e nwere maka ike eletrik. E bowo ụfọdụ ndị ọrụ ebubo ịgbachi usoro nchekwa na-egbochi ọghọm iji kwalite ike a na-emepụta. Mkpesa ndị yiri nke a na-emenye mba ndị dị ka France egwu, bụ́ nke na-eji ụlọ ọrụ nuklia dị iche iche emepụta 70 pasent nke ike eletrik ya. “Chernobyl” ọzọ mee, a pụrụ ịmanye ọtụtụ n’ime ụlọ ọrụ ndị dị na France ịkwachi kpam kpam.
O doro anya na ọbụna ígwè ọrụ mwụpụ ike bụ́ ndị “na-adịghị ize ndụ” na-aghọ ndị dị ize ndụ ka ha na-adịte aka. Ná mmalite 1993, n’oge nnyocha maka adịghị ize ndụ a na-eme mgbe mgbe, a hụrụ ihe karịrị otu narị mgbawa n’okporo paịpụ ígwè n’ígwè ọrụ mwụpụ ike dị na Brunsbüttel, otu n’ime ndị kasị ochie nke Germany. A chọpụtawo mgbawa ndị dị otú ahụ n’ụlọ ọrụ ndị dị na France na Switzerland. Ihe ọghọm mbụ dị oké njọ n’ụlọ ọrụ Japan mere na 1991, ịka nká bụrụ otu ihe pụrụ isowo kpata ya. Nke a na-enye olileanya na-adịghị mma maka United States, ebe ihe dị ka ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke ígwè ọrụ mwụpụ ike ndị e ji akpa ego dịworo ihe karịrị iri afọ.
Ihe ọghọm ígwè ọrụ mwụpụ ike nuklia pụrụ ime n’ebe ọ bụla n’oge ọ bụla. Ka a na-enwekwu ígwè ọrụ ndị ahụ, otú ahụ ka iyi egwu ya na-arị elu; ka ígwè ọrụ mwụpụ ike ahụ na-emewanye ochie, otú ahụ ka ihe ize ndụ ya na-arịwanye elu. Ọ bụghị ná nkịtị ka otu akwụkwọ akụkọ ji tuo ha aha bụ bọmbụ ndị na-echere oge na ọnyà ọnwụ nke na-ewepụta ụzarị na-egbu egbu.
Ebee Ka Ha Kwesịrị Ịwụsa Ihe Mkpofu Ya?
N’oge na-adịbeghị anya gara aga o juru ndị mmadụ anya ịhụ ka ndị uwe ojii gechiri ma na-eche nche n’otu ebe ntụrụndụ dị n’ebe Ugwu France. Akwụkwọ akụkọ The European kọwara, sị: “Nnyocha a na-eme mgbe mgbe nke e nyere iwu ya mgbe ọnwụ otu nwanyị bi n’ebe ahụ site ná nsí beryllium ọnwa abụọ gara aga kpughere ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ụzarị na-egbu egbu n’ala ntụrụndụ ahụ bụ́ nke ji 100 okpukpu karịa nke e nwere n’ebe ndị dị ya gburugburu.”
Beryllium, ígwè na-adịghị nnọọ arọ nke a na-emepụta site n’usoro dị iche iche, bụ́ nke e ji eme ihe n’ụlọ ọrụ ụgbọ elu, mgbe e kpughepụkwara ya nye ụzarị na-egbu egbu, a na-eji ya eme ihe n’ụlọ ọrụ ike nuklia. Ihe àmà na-egosi na otu ụlọ ọrụ na-emepụta beryllium awụsawo ihe mkpofu sitere n’usoro mkpughepụ nye ụzarị na-egbu egbu n’ebe ntụrụndụ ahụ ma ọ bụ nso ya. “Ntụ beryllium, ọbụna mgbe a na-ekpughepụghị ya nye ụzarị na-egbu egbu,” ka The European rịbara ama kwuo, “bụ otu n’ime ụdị ihe mkpofu ụlọ ọrụ mmepụta ihe bụ́ ndị kasị bụrụ nsí a ma ama.”
Ka ọ dị ugbu a, ihe dị ka 17,000 nke ihe mkpofu na-ewepụta ụzarị na-egbu egbu ka e kwuru na a wụnyere n’ime mmiri ná mpụga ụsọ osimiri Novaya Zemlya n’ime ogologo oge dị 30 afọ, bụ́ nke ndị Soviet ji mee ihe dị ka ebe nnwale ike nuklia ná mmalite afọ ndị 1950. Ọzọkwa, a wụnyere ma ọ dịkarịa ala akụkụ ebe ndị e nwere ụzarị na-egbu egbu nke ụgbọ nuklia ndị na-aga n’okpuru mmiri na akụkụ nke ọ dịkarịa ala ígwè ọrụ mwụpụ ike 12 n’ime ebe a dị mma maka mkpofu ihe.
Ma a ma ụma ma ọ bụ na a maghị ụma, mmetọ nuklia dị ize ndụ. Banyere otu ụgbọ okpuru mmiri miri n’ụsọ osimiri dị na Norway na 1989, akwụkwọ akụkọ Time dọrọ aka ná ntị, sị: “Ụgbọ ahụ amaliteworị iwepụta cesium-137, ụdị atọm na-akpata ọrịa cancer. Ka ọ dị ugbu a a na-ele nke e wepụtaworo anya dị ka nke dị nta nke ukwuu imetụta ihe ndị dị ndụ n’ime mmiri ma ọ bụ ahụ ike mmadụ. Ma ụgbọ mmiri Komsomolets ahụ bukwa ngwá agha nuklia e ji ekpu ụgbọ nke bu plutonium dị kilogram 13 nke nwere 24,000 afọ dị ka ọkara ndụ ya na nke nsí ya dị elu nke ukwuu nke na otu mpekere ya pụrụ igbu mmadụ. Ndị ọkachamara Russia dọrọ aka ná ntị na plutonium ahụ pụrụ ịwụbanye n’ime mmiri ma merụọ ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke oké osimiri n’oge na-adịghị anya dị ka na 1994.”
Otú ọ dị, ikpofu ihe ndị na-ewepụta ụzarị na-egbu egbu abụghị nsogbu dịịrị nanị France na Russia. United States nwere “ọtụtụ ùkwù ihe mkpofu na-anụ ọkụ, ha enweghịkwa ebe a na-adọba ha nke na-adịgide adịgide,” ka Time na-akọ. Ọ na-asị na ọtụtụ nde drọm nke ihe ndị na-egbu egbu dị n’ebe ndọba ihe nwa oge, na-enwe “ihe ize ndụ na-adịgide adịgide nke ifu efu, ịbụ nke e zuuru na mbibi gburugburu ebe obibi site ná nlekọta na-adịghị mma.”
Dị ka ọ bụ iji maa atụ ihe ize ndụ a, otu tankị a wụnyere ihe mkpofu nuklia n’ụlọ ọrụ ebe a na-emepụtabu ngwá agha na Tomsk, Siberia, gbọwara n’April 1993, na-ewelite onyinyo dị ụjọ nke Chernobyl.
N’ụzọ doro anya, mkpu ọ bụla a na-eti maka udo na ntụkwasị obi ná ndabere nke ihe a sị na ọ bụ ọgwụgwụ nke iyi egwu nuklia enweghị ezi ndabere. Ma udo na ịnọ ná ntụkwasị obi dịkwa nso. Olee otú anyị si mara?
[Igbe dị na peeji nke 4]
NDỊ NWERE IKE NUKLIA
12 ma Ka Nọgide Na-agụ
NDỊ A KPỌSARA ma ọ bụ NDỊ DỊ ADỊ N’EZIE: Belarus, Britain, China, France, India, Israel, Kazakhstan, Pakistan, Russia, South Africa, Ukraine, United States
NDỊ PỤRỤ ỊBỤ: Algeria, Argentina, Brazil, Iran, Iraq, Libya, North Korea, South Korea, Syria, Taiwan
[Foto dị na peeji nke 5]
Ọbụna iji ike nuklia mee ihe n’ụzọ udo pụrụ ịdị ize ndụ
[Ebe e si nweta foto]
Gburugburu: Foto U.S. National Archives
[Ebe e si nweta foto Dị na peeji 2]
Ihu akwụkwọ: Stockman/International Stock
[Ebe e si nweta foto Dị na peeji 3]
Foto U.S. National Archives