Mkpọrọgwụ Nile nke Ekweghị na Chineke
ANYỊ bi ná mbara ụwa jupụtara n’ọgba aghara; ilebatu anya n’isiokwu ndị bụ́ isi nke akwụkwọ akụkọ na-anwapụta eziokwu ahụ kwa ụbọchị. Ọnọdụ dị oké njọ nke ụwa anyị emewo ka ọtụtụ mmadụ na-arụ ụka banyere ịdị adị nke Chineke. Ụfọdụ, ndị na-azọrọ ịbụ ndị na-ekweghị na Chineke, ọbụna na-agọnarị ịdị adị ya. Ọ̀ dị otú ahụ n’ebe ị nọ?
Nkwere ma ọ bụ ekweghị na Chineke pụrụ imetụta ụzọ i si ele ọdịnihu anya n’ụzọ miri emi. Ma Chineke adịghị, nlanarị nke agbụrụ mmadụ dị kpam kpam n’aka mmadụ—echiche olileanya na-adịghị ya, n’iburu n’uche ikike mbibi mmadụ nwere. Ọ bụrụ na i kwere na Chineke dị, mgbe ahụ o yikarịrị ka ị ga-anakwere na ndụ n’elu mbara ụwa a nwere nzube—nzube nke a ka pụrụ imezu.
Ọ bụ ezie na ngọnarị nke ịdị adị Chineke abụwo nke na-abụ a nọkata ọ dapụta n’akụkọ ihe mere eme nile, ọ bụ nanị na narị afọ ndị a ka iwu ewu nke ekweghị na Chineke gbasara. Ị̀ maara ihe kpatara ya?
Ịghọta Mkpọrọgwụ Ya Nile
Osisi toro oké ogologo bụ ihe nkiri na-ebu isi. Ma, nanị ihe anya na-ahụ bụ akwụkwọ ya, alaka, na ùkwù ya. Mkpọrọgwụ ya—isi iyi nke ndụ osisi ahụ—zoro ezo n’ime ime ala.
Ọ bụkwa nnọọ otú ahụ ka ekweghị na Chineke dị. Dị ka osisi gbara agba, ịgọnarị ịdị adị nke Chineke toruru ogo ọdịdị nke na-ebu isi ka ọ na-erule narị afọ nke 19. Ndụ na eluigwe na ala hà pụrụ ịdịworị ma e nweghị Ihe Mbụ Kpatara ha nke karịrị ike mmadụ? Ofufe nke Onye Okike dị otú ahụ ọ̀ bụ igbu oge? Azịza ndị sitere n’aka ndị isi ọkà ihe ọmụma ụwa nke oge ahụ na-ada ụda, dookwa anya. “Dị ka anyị na-enwekwaghị mkpa nke ụkpụrụ nduzi omume ọma, anyị enweghịkwa mkpa nke okpukpe,” ka Friedrich Nietzsche kwupụtara. “Okpukpe bụ nrọ nke uche mmadụ,” ka Ludwig Feuerbach kwusiri ike. Karl Marx kwa, onye ihe ndị o dere ga-enwe mmetụta miri emi n’iri afọ ndị sochiri, ji anyaike kwupụta, sị: “Achọrọ m iwelitekwu nnwere onwe nke uche pụọ n’agbụ nile nke okpukpe.”
Ọ masịrị ọtụtụ ìgwè mmadụ nke ukwuu. Otú ọ dị, ihe ha hụtara bụ nanị akwụkwọ, alaka, na ùkwù osisi nke ekweghị na Chineke. Mkpọrọgwụ ya nile anọwo n’ọnọdụ ha ma na-abasa ogologo oge tupu narị afọ nke 19 amalite. N’ụzọ na-eju anya, uto ọgbara ọhụrụ nke ekweghị na Chineke bụ nke okpukpe dị iche iche nke Krisendọm mesiwanyere ike! N’ụzọ dị aṅaa? N’ihi ịrụ arụ ha, òtù okpukpe ndị a kpalitere ókè dị ukwuu nke obi nkoropụ na ime mkpesa.
A Kụọ Mkpụrụ Ndị Ahụ
Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya, Chọọchị Katọlik jigidere ndị nọ n’okpuru ya aka ọjọọ. “Usoro ndị ọchịchị yiri ka ha ejikereghị ma ọlị ịhụ maka mkpa ime mmụọ nke ndị mmadụ,” ka akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia Americana na-arịba ama. “E si n’etiti ndị a ma ama na-enweta ndị ụkọchukwu nọ n’ọkwá ka elu, karịsịa ndị bishọp, ha lekwara ọkwá ha anya dị ka isi iyi nke nsọpụrụ na ike.”
Ụfọdụ, dị ka John Calvin na Martin Luther, gbalịrị ịgbanwe chọọchị ahụ. Otú ọ dị, ụzọ ihe omume ha eyighị mgbe nile nke Kraịst; ekweghị ibe nọrọ na mwụfu ọbara kara Mgbanwe ahụ akara. (Tụlee Matiu 26:52.) Mwakpo ụfọdụ bụ nnọọ nke oké obi ọjọọ nke na na narị afọ atọ n’ihu Thomas Jefferson, onye isi ala nke atọ nke United States, dere, sị: “Ọ ga-abụ ihe kwesịrị mgbaghara karị ịhapụ ikwere na chi ọ bụla ma ọlị, karịa ikwulu ya site n’àgwà arụrụala nile nke Calvin.”a
N’ụzọ doro anya, Mgbanwe ahụ eweghachighị ofufe dị ọcha. Ma, o belatara ike Chọọchị Katọlik. Vatican abụkwaghị nanị ya nwere ikike nke okwukwe okpukpe. Ọtụtụ sonyeere ịrọ òtù dị iche iche nke Protestant ndị e hiwere ọhụrụ. Ndị ọzọ, n’ịbụ ndị ike okpukpe gwụrụ, mere uche mmadụ ihe ha na-efe ofufe. Àgwà nke ime otú masịrị onye malitere, na-enye ohere maka echiche ndị dịwagasịrị iche banyere Chineke.
Inwe Obi Abụọ Epulite
Ka ọ na-erule narị afọ nke 18, ọha mmadụ na-akwado oké ntụgharị uche dị ka ihe ngwọta nye nsogbu nile nke ụwa. Ọkà ihe ọmụma ụwa bụ́ onye Germany bụ́ Immanuel Kant kwusiri ike na ọganihu mmadụ bụ nke a na-adọghachi azụ site ná ndabere ya ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị na okpukpe maka nduzi. “Kaa anya ịmata ihe na-aga!” ka ọ gbara ume ya. “Nwee obi ike iji ọgụgụ isi nke gị mee ihe!”
Àgwà nke a ghọrọ njimara nke Mmepeanya ahụ, nke a makwaara dị ka Ọgbọ nke Echiche. Na-adịgide gabiga narị afọ nke 18, nchụso ara ara maka ihe ọmụma kara ogologo oge nke a akara. “Inwe obi abụọ nọchiri okwukwe kpuru ìsì,” ka akwụkwọ bụ́ Milestones of History na-ekwu. “A gbaghara ụkpụrụ okwukwe na omume ochie nile.”
Otu “ụkpụrụ okwukwe na omume ochie” e nyochara bụ okpukpe. “Ụmụ mmadụ gbanwere ụzọ ha si ele okpukpe anya,” ka akwụkwọ bụ́ The Universal History of the World na-ekwu. “Afọ ejukwaghị ha ọzọ ná nkwa nke ụgwọ ọrụ n’eluigwe; ha na-achọsi ndụ ka mma n’elu ụwa ike. Ha malitere ịtụfu okwukwe ha nwere n’ike karịrị nke mmadụ.” N’ezie, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ndị ọkà ihe ọmụma ụwa n’oge Mmepeanya ahụ lelịrị okpukpe. Karịsịa, ha tara ndị ndú Chọọchị Katọlik nwere oké agụụ maka ike ụta idebe ụmụ mmadụ n’ìsì.
N’ịbụ ndị okpukpe na-ejughị afọ, ọtụtụ ndị ọkà ihe ọmụma ụwa ndị a ghọrọ ndị okwere n’okike; ha kwere na Chineke ma na-ekwu na o nweghị mmasị n’ebe mmadụ nọ.b Ole na ole ghọrọ ndị na-ekweghị na Chineke na-ekwuwa ọnụ, dị ka ọkà ihe ọmụma ụwa bụ́ Paul Henri Thiry Holbach, onye zọọrọ na okpukpe bụ “isi iyi nke nkewa, ara ọgbụgba, na mpụ dị iche iche.” Ka ọtụtụ afọ na-agafe, ike Krisendọm gwụkwuru ọtụtụ ndị ọzọ, ha kwenyekwa n’echiche Holbach.
Lee ka o si ghara ikwekọ ekwekọ na Krisendọm kpalitere uto nke ekweghị na Chineke! “Chọọchị dị iche iche bụ ala ebe ekweghị na Chineke nọ puo,” ka prọfesọ nkà mmụta okpukpe bụ́ Michael J. Buckley na-ede. “Akọ na uche ndị Ebe Ọdịda Anyanwụ bụ nke okpukpe ndị a haziri ahazi tighasịrị, ọ naasọkwa ha oyi. Chọọchị na ịrọ òtù ndị ahụ etijasịwo Europe, kpalite mgbukpọ ndị mmadụ, chọọ nguzogide ma ọ bụ mgbanwe okpukpe, nwaa ikewapụ ma ọ bụ ịkwatusị ndị eze.”
Ekweghị na Chineke Eruo Ọ̀tụ̀tụ̀ Ya Kasị Elu
Ka ọ na-erule narị afọ nke 19, ngọnarị Chineke apụtawo èzí ma na-ewu ewu. Ndị ọkà ihe ọmụma ụwa na ndị sayensị enweghị ịla azụ ọ bụla banyere ikwupụta echiche ha n’ihu ọha. “Onye iro anyị bụ Chineke,” ka otu onye na-ekweghị na Chineke na-ekwuwa ọnụ kwupụtara. “Mkpọrọmasị maka Chineke bụ mmalite nke amamihe. Ọ bụrụ na ihe a kpọrọ mmadụ ga-enwe ezi ọganihu, ọ ghaghị ịbụ ná ndabere nke ekweghị na Chineke.”
Otú ọ dị, nchegharị ihu dị aghụghọ weere ọnọdụ na narị afọ nke 20. Ngọnarị Chineke abụkwaghị nke oké okwu; ụdị ọzọ nke ekweghị na Chineke malitere ịgbasa, na-emetụta ọbụna ndị na-azọrọ na ha kwere na Chineke.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ịrọ òtù Protestant dị iche iche bilitere site ná Mgbanwe ahụ jigidere ọtụtụ ozizi Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị. Lee mbipụta Teta! nke September 8, 1991, peji nke 12-16, na October 8, 1991, peji nke 17-21.
b Ndị okwere n’okike zọọrọ na, dị nnọọ ka onye na-arụ mgbaaka elekere, Chineke maliteere ihe ndị o kere ọrụ ma chee ha azụ ya, ghara inwe mmasị ọ bụla n’ọnọdụ ha. Dị ka akwụkwọ bụ́ The Modern Heritage na-ekwu, ndị okwere n’okike “kwetara na ekweghị na Chineke bụ ihie ụzọ nke sitere n’obi nkoropụ ma na ụkpụrụ inwe ikike nke Chọọchị Katọlik na ikwesi olu ike na ekweghị ibe nọrọ nke ozizi ya nile na-asọ oyi ọbụna karị.”
[Foto dị na peeji nke 3]
Karl Marx
[Foto dị na peeji nke 3]
Ludwig Feuerbach
[Foto dị na peeji nke 3]
Friedrich Nietzsche
[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 2]
IHU AKWỤKWỌ: Ụwa: Site n’ikike British Library; Nietzsche: British Museum nwe ike mbipụta (leekwa peji nke 3); Calvin: Musée Historique de la Réformation, Genève (Foto F. Martin); Marx: Foto U.S. National Archives (leekwa peji nke 3); Mbara igwe dị iche iche, ngwá ọrụ, ndị mkpọsa, ụgbọ okporo ígwè: The Complete Encyclopedia of Illustration/J. G. Heck; Feuerbach: The Bettmann Archive (leekwa peji nke 3)