Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 12/1 p. 5-7
  • Ngọnarị Chineke na Narị Afọ nke 20

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ngọnarị Chineke na Narị Afọ nke 20
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịgọnarị Ịbụ Isi Chineke
  • Ngọnarị Krisendọm Na-agọnarị Chineke
  • È Nwere Ezi Ihe Kpatara Ekweghị na Chineke?
  • Ọdịiche nke Ezi Okpukpe
  • Mkpọrọgwụ Nile nke Ekweghị na Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Mmadụ Ò Nwere Ike Ịmalite Inwe Okwukwe n’Onye Okike?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Krisendọm Emechuwo Chineke na Bible Ihu
    Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 12/1 p. 5-7

Ngọnarị Chineke na Narị Afọ nke 20

“Ndị mmadụ na-anakwere echiche nke enweghị Chineke ma na-ahazi ndụ ha n’adabereghị na ya, ma ọ̀ dị mma ma ọ̀ dị njọ, n’atụgharịghị uche ma ọlị banyere Chineke.”​—⁠One Hundred Years of Debate Over God​—⁠The Sources of Modern Atheism.

ỌBỤ ezie na osisi toro oké ogologo na-ebu isi ná mmalite, a na-emesịa were ya dị ka ihe nkịtị. Ọdịdị ya bụ nke a maara nke ọma; ịdị elu ya abụkwaghị ihe na-akpalị ụjọ.

Otú ahụ ka ọ dị ekweghị na Chineke. Ọ bụ ezie na ọ kpaliri oké nrụrịta ụka n’ime narị afọ nke 19, ngọnarị nke ịdị adị Chineke abụghị nke na-akpata nkụja ma ọ bụ nke na-awụ ibubo n’ahụ taa. Ọgbọ nke ikwe ibe nọrọ enyewo ekweghị na Chineke ohere iso ikwere na Chineke na-adịkọ n’udo.

Ọ bụghị na ihe ka n’ụmụ mmadụ na-ajụ Chineke kpam kpam; n’ụzọ megidere nke ahụ, ihe sitere ná njụta echiche ọha site ná mba 11 gburugburu America dum, Europe, na Esia na-ekpughe na, ná nkezi, ihe na-erughị pasent 2 na-azọrọ ịbụ ndị na-ekweghị na Chineke. Ka o sina dị, mmụọ nke ekweghị na Chineke juru ebe nile​—⁠ọbụna n’etiti ọtụtụ ndị kwere na Chineke dị. Olee otú nke a pụrụ isi dị otú ahụ?

Ịgọnarị Ịbụ Isi Chineke

“Mgbe ụfọdụ ekweghị na Chineke na-ezo aka nanị n’ịjụ ma ọ bụ ilelị Chineke site n’omume,” ka akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia Americana na-ekwu. N’ihi nke a, akwụkwọ bụ́ The New Shorter Oxford English Dictionary na-enye nkọwa nke abụọ na-esonụ nke “ekweghị na Chineke”: “Onye na-agọnarị Chineke n’omume; onye na-adịghị asọpụrụ Chineke.”​—⁠Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.

Ee, ekweghị na Chineke pụrụ ịgụnye ngọnarị nke ịdị adị Chineke ma ọ bụ nke ịbụ isi ya ma ọ bụ ha abụọ. Bible zoro aka ná mmụọ nke a nke ekweghị na Chineke na Taịtọs 1:16: “Ha na-ekwu na ha matara Chineke, ma na-agọnarị ya site n’omume ha.”​—⁠The New English Bible; tụlee Abụ Ọma 14:1.

A pụrụ ịhụ ọjụjụ dị otú ahụ a na-ajụ ịbụ isi Chineke laa azụ ná mmadụ abụọ mbụ. Iv kwetara n’ịdị adị Chineke; ma, ọ chọrọ ‘ịdị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ.’ Echiche dị na ya bụ na ọ pụrụ ‘ịbụ onye isi onwe ya’ ma wepụta ụkpụrụ omume ndị nke ya. Adam mesịrị sonyere Iv ná ngọnarị nke a nke ịbụ isi Chineke.​—⁠Jenesis 3:​5, 6.

Àgwà nke a ò juru eju ebe nile taa? Ee. A na-egosipụta ekweghị na Chineke n’ụzọ dị aghụghọ n’ọchịchọ maka nnwere onwe. “Ike ịdị ndụ n’okpuru nleruanya Chineke agwụwo ndị mmadụ taa,” ka akwụkwọ bụ́ One Hundred Years of Debate Over God​—⁠The Sources of Modern Atheism na-ekwu. “Ha . . . na-ahọrọ ibi ná nnwere onwe.” A na-akatọ ụkpụrụ omume nke Bible dị ka nke a na-apụghị ịgbaso agbaso, nke na-adịghị irè. Echiche nke ọtụtụ ndị yiri nnọọ nke Fero Ijipt onye ji anyaike kwupụta, sị: “Ònye bụ Jehova, na m ga-ege ntị n’olu Ya . . . ? Amaghị m Jehova.” Ọ jụrụ ịbụ isi Jehova.​—⁠Ọpụpụ 5:2.

Ngọnarị Krisendọm Na-agọnarị Chineke

Ngọnarị Chineke nke kasị na-akpata nkụja na-esite n’aka ndị ụkọchukwu Krisendọm, ndị jiworo omenala ụmụ mmadụ hiwere dochie eziokwu nile dị ọcha nke Bible. (Tụlee Matiu 15:9.) Ọzọkwa, ha akwadowo agha ndị a kasị wụfuo ọbara na ha na narị afọ nke 20 nke a, si otú ahụ na-ajụ ihe Bible nyere n’iwu ka e gosipụta ezi ịhụnanya.​—⁠Jọn 13:35.

Ndị ụkọchukwu ajụwokwa Chineke site n’iche ụkpụrụ omume ya nile azụ​—⁠dị ka a na-enye ihe àmà ya, iji maa atụ, site ná njupụta nke ịgba akwụkwọ n’ụlọ ikpe megide ndị ụkọchukwu na-emetọ ụmụaka. Ọnọdụ Krisendọm yiri nke Israel na Juda oge ochie. “Ala ha jupụtakwara n’ọbara, obodo a jupụtakwara ná mwezụga ikpe,” ka a gwara Ezikiel onye amụma, “n’ihi na ha sịrị, Jehova ahapụwo ala nke a, ọ dịghịkwa Jehova na-ahụ ihe.” (Ezikiel 9:9; tụlee Aịsaịa 29:15.) Ka a sịkwa ihe mere na ọtụtụ ndị agbahapụwo chọọchị dị iche iche nke Krisendọm kpam kpam! Ma ọ̀ bụ iwu na ha ga-agbahapụ nkwere ha kwere na Chineke?

È Nwere Ezi Ihe Kpatara Ekweghị na Chineke?

Ma hà hụtara ihu abụọ nke okpukpe ma ọ bụ na ha ahụghị ya, ọtụtụ ndị na-ekweghị na Chineke apụghị ijikọ ikwere na Chineke na ahụhụ dị n’ụwa. Simone de Beauvoir kwuru n’otu oge, sị: “Ọ kaara m mfe mbụ iche banyere ụwa na-enweghị onye okike karịa onye okike e ji ihe ndị na-ekwekọghị ekwekọ jupụtara n’ụwa bogbuo.”

Ikpe na-ezighị ezi nile nke ụwa​—⁠gụnyere ndị ahụ ndị okpukpe ihu abụọ kpalitere⁠—​hà na-anwapụta na e nweghị Chineke? Tụlee: Ọ bụrụ na e ji mma yie onye na-enweghị ihe o mere egwu, merụọ ya ahụ, ma ọ bụ ọbụna gbuo ya, nke a ọ̀ na-anwapụta na mma ahụ enweghị onye mere ya? Ọ̀ bụ na ọ dịghị egosi na kama nke ahụ e tinyere ihe ahụ n’ọrụ na-ezighị ezi? N’otu aka ahụ, ihe ka ukwuu n’iru újú mmadụ na-enye ihe àmà nke na ụmụ mmadụ na-eji ikike ndị Chineke nyere ha nakwa ụwa n’onwe ya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi.

Otú ọ dị, ụfọdụ na-eche na ezi uche adịghị n’ikwere na Chineke, ebe ọ bụ na anyị apụghị ịhụ ya anya. Ma gịnị banyere ikuku, ụzarị ụzụ, na ísìsì? Anyị apụghị ịhụ nke ọ bụla n’ihe ndị a, ma anyị matara na ha dị. Akpa ume, ntị, na imi anyị na-agwa anyị otú ahụ. N’ezie, anyị na-ekwere n’ihe anyị na-apụghị ịhụ anya ma ọ bụrụ na anyị nwere ihe àmà.

Mgbe ọ tụlesịrị ihe àmà ndị a na-ahụ anya​—⁠gụnyere electron, proton, atọm, amino acid dị iche iche, na ụbụrụ na-eju anya​—⁠a kpaliri ọkà mmụta sayensị nke ihe ndị dị n’okike bụ́ Irving William Knobloch ikwu, sị: “Ekwere m na Chineke n’ihi na nye m ịdị adị nke Ịbụ Chi Ya bụ nkọwa nanị ya nwere ezi echiche maka ihe nile dị otú ha dị.” (Tụlee Abụ Ọma 104:24.) N’otu aka ahụ, ọkà mmụta ahụ mmadụ bụ́ Marlin Books Kreider na-asị: “Ma dị ka mmadụ nkịtị, nakwa dị ka mmadụ nke na-emikpu ndụ ya ná mmụta sayensị na ime nnyocha, enweghị m ịrụ ụka ọ bụla banyere ịdị adị Chineke.”

Ndị ikom ndị a anọghị nanị ha. Dị ka prọfesọ mmụta physics bụ́ Henry Margenau kwuru, “ọ bụrụ na ị tụlee ndị ọkà mmụta sayensị a kasị mara amara, ị ga-achọta nnọọ ole na ole ndị na-ekweghị na Chineke n’etiti ha.” Ma ọganihu sayensị ma ọdịda nke okpukpe enweghị nke ọ bụ iwu na ọ ga-amanye anyị n’ịgbahapụ okwukwe n’Onye Okike. Ka anyị tụlee ihe kpatara ya.

Ọdịiche nke Ezi Okpukpe

Na 1803, onye isi ala United States bụ́ Thomas Jefferson dere, sị: “Mmegide m bụ, n’ezie, n’ebe ịrụ arụ nile nke Iso Ụzọ Kraịst dị; ma ọ bụghị n’ebe ezigbo ụkpụrụ nile nke Jisọs n’onwe ya dị.” Ee, e nwere ọdịiche dị n’etiti Krisendọm na Iso Ụzọ Kraịst. Ọtụtụ ụkpụrụ akparamàgwà nke Krisendọm dabeere n’ọdịnala dị iche iche nke mmadụ. N’ụzọ dị iche, ezi Iso Ụzọ Kraịst na-adabere nkwenkwe ya nile nanị na Bible. Otú a, Pọl degaara ndị Kọlọsi narị afọ mbụ na ha kwesịrị inweta “mmazu,” “amamihe,” na “nghọta nile nke Mmụọ Nsọ.”​—⁠Ndị Kọlọsi 1:​9, 10.

Nke a bụ ihe anyị ga-atụ anya ya n’aka ezigbo ndị Kraịst, n’ihi na Jisọs nyere ụmụazụ ya iwu, sị: “Mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism . . . : na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke M nyere unu n’iwu.”​—⁠Matiu 28:​19, 20.

Taa, Ndịàmà Jehova na-emezu ihe nke a e nyere n’iwu na 231 ala gburugburu ụwa. Ha asụgharịwo Bible gaa na 12 asụsụ, biekwa ihe karịrị 74,000,000 nke ukwuu. E wezụga nke ahụ, site n’usoro ihe omume nke ọmụmụ Bible ebe obibi, ha na-enyere ihe karịrị 4,500,000 mmadụ aka ugbu a ‘idebe ihe nile Jisọs nyere n’iwu.’

Usoro ihe omume nkụzi nke a na-arụpụta ihe ndị na-adịru ogologo oge. Ọ na-eweta ezi mmepeanya, n’ihi na ọ dabeere, ọ bụghị n’echiche ụmụ mmadụ, kama n’amamihe Chineke. (Ilu 4:18) Ọzọkwa, ọ na-enyere ndị sitere ná mba nile na ebo nile aka ime ihe “Mmepeanya” mmadụ na-apụghị ịrụzu mgbe ọ bụla​—⁠iyikwasị “mmadụ ọhụrụ” nke na-enyere ha aka ịzụlite ezi ịhụnanya maka ibe ha.​—⁠Ndị Kọlọsi 3:​9, 10.

Ezi okpukpe na-enwe mmeri na narị afọ nke 20 anyị. Ọ dịghị agọnarị Chineke​—⁠ma ọ̀ bụ ịdị adị ya ma ọ̀ bụ ịbụ isi ya. Anyị na-akpọ gị òkù ịhụ nke a n’onwe gị site n’ileta Ndịàmà Jehova n’otu n’ime Ụlọ Nzukọ Alaeze ha nile.

[Igbe dị na peeji nke 6]

IME KA MKPỌRỌGWỤ NILE NKE EKWEGHỊ NA CHINEKE SIE IKE

N’etiti narị afọ nke 18, e nyere ọkà ihe ọmụma ụwa bụ́ Denis Diderot ọrụ ịsụgharị akwụkwọ nkà ihe ọmụma nwere nanị otu mpịakọta site na Bekee gaa na French. Otú ọ dị, o mere ihe gabigara atụmanya ndị were ya n’ọrụ. Diderot ji ihe dị ka iri afọ atọ chịkọta Encyclopédie nke ya, akwụkwọ nwere 28 mpịakọta nke kwusiri okwu ike banyere mmụọ nke ọgbọ ahụ.

Ọ bụ ezie na Encyclopédie ahụ nwere ihe ọmụma dị ukwuu bara uru, ihe o lekwasịrị anya bụ amamihe mmadụ. Dị ka nchịkọta akwụkwọ a na-akpọ Great Ages of Man si kwuo, ọ “kara anya ikwusa ụkpụrụ okwukwe dịwaga nnọọ iche [nke ndị ọkà ihe ọmụma ụwa ahụ] nke na mmadụ ga-eme ka ọnọdụ ya kawanye mma ma o jiri echiche dochie okwukwe dị ka ụkpụrụ na-eduzi ya.” O doro anya na a kpọtụghị Chineke aha. “Site ná nhọrọ nke isiokwu dị iche iche,” ka akwụkwọ bụ́ The Modern Heritage na-ekwu, “ndị editọ ya mere ka o doo anya na okpukpe abụghị otu n’ime ihe ndị dị ụmụ mmadụ mkpa ịmara.” Ọ bụghị ihe ijuanya na chọọchị nwara ikpuchi Encyclopédie ahụ. Ọkà ikpe ukwu katọrọ ya dị ka nke na-agba ndọrọ ndọrọ ọchịchị, omume ọma, na okpukpe mgba okpuru.

N’agbanyeghị ndị iro ya, ihe dị ka 4,000 mmadụ tinyere akwụkwọ maka Encyclopédie nke Diderot​—⁠ọnụ ọgụgụ dị ịtụnanya, n’iburu n’uche ịdị oké ọnụ ahịa ya. Ọ bụ nanị ka oge ụfọdụ gatụ tupu echiche nke a zoro ezo nke ekweghị na Chineke etiwapụ ịghọ ngọnarị Chineke n’ụzọ pụtara ìhè.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya