Imezu Otu Mkpa Bụ́ Isi nke Mmadụ Site n’Ịja Mma
“NDEWO!” “I meela!” ma ọ bụ “I mere ya otú kasị mma; anyị ji gị eme ọnụ” si n’obi eziokwu na-enye aka nke ukwuu ịkwalite ùgwù onwe onye gị, karịsịa mgbe o sitere n’ọnụ onye ị na-akwanyere ùgwù. Ụmụ mmadụ na-enwe obi dị mma mgbe a jara ha mma. Site na ya, ha na-eme nke ọma karị, na-enwekwa obi ụtọ karị. N’ezie, ịja mma kwesịrị ekwesị dị oké mkpa nye uche na obi dị ka ezigbo nri dị nye ahụ.
Otu akwụkwọ ọkọwa okwu na-akọwa ịja mma dị ka “nnakwere nke mmadụ ịbụ onye kwesịrị nchebara echiche ma ọ bụ nlekwasị anya” na “nrịba ama ma ọ bụ nlekwasị anya pụrụ iche.” N’ụzọ chiri anya e jikọtara ya na nkwanye ùgwù, mmetụta nke ịdị ùgwù, nke mgbe e nyere ya na-enye echiche nke ọ̀tụ̀tụ̀ ma ọ bụ ntụle sitere n’iche echiche banyere mmadụ na ọ̀tụ̀tụ̀ nke ịja mma ruuru ya.
Ịja Mma—Mkpa Bụ́ Isi
Ịja mma n’ebe ịja mma kwesịrị ekwesị bụ ihe ezi uche na ezi ikpe. Jisọs setịpụrụ ụkpụrụ ya n’ihe atụ ya nke ndị ohu ndị onye nwe ha nyefere ihe nile o nwere. Ịnakwere nlekọta dị mma nke ihe onwunwe ya, ọ sịrị: “I mere nke ọma, ezi ohu nke kwesịrị ka a tụkwasị gị obi.” (Matiu 25:19-23) Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe nnọọ, a na-eleghara àgwà ọma nke a kwesịrị ekwesị anya. Ịda ada n’ịja mma na-abịada ịnụ ọkụ n’obi na mmụọ ịmalite ime ihe. Iona tinyere ya otú a: “Ịja mma na-eme ka i nwee mmetụta onye a chọrọ, onye e nwere mmasị na ya . . . Ọ na-enye gị mmụọ ịmalite ime ihe. Ọ bụrụ na a na-eleghara gị anya, ị ga-enwe mmetụta nke ịbụ onye a jụrụ ajụ ma leda anya.” Patrick gbakwụnyere, sị: “Mgbe ahụ o siri ike ịnọgide na-enwe ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke ọdịdị na ọnụ ọgụgụ ihe e mepụtara.” Ya mere, lee ka o si dị oké mkpa na anyị mụtara ụzọ na mgbe a ga-aja mmadụ mma. Anyị nile na-enwe oké ọchịchọ maka nchebe nke ịmata na anyị dabara adaba. Ọ bụ mkpa bụ́ isi nke mmadụ.
Okwu otuto, ibu ọrụ e tinyekwuru, ma ọ bụ ọbụna onyinye nkịtị na-akpali gị ịnọgide na-eme ihe kasị mma ị pụrụ ime. Nke a bụ eziokwu ma ị̀ bụ nne ma ọ bụ nna, di, nwunye, nwatakịrị, onye òtù ọgbakọ, ma ọ bụ onye nlekọta. “Mgbe a jara m mma,” ka Margaret na-ekwu, “obi na-adị m ụtọ, m nwee mmetụta nke onye a chọrọ, m na-enwekwa ọchịchọ siri ike ime nke ọma karị.” Andrew kwere, na-asị: “Mmụọ m na-arị elu, na-enye ihe mkpali iji ọbụna rụsikwuo ọrụ ike.” Otú ọ dị, ịja mmadụ mma na ịkwanyere ya ùgwù chọrọ iche echiche na ezi mkpebi site ná nlezianya.
Ṅomie Ụzọ Jehova n’Ịja Mma
Ihe nlereanya kasịnụ nke ịmata uru ndị ọzọ bụ Jehova Chineke. Ọ na-anabata ndị ruru eru ịja mma. Ọ rịbara ndị ikom dị ka Ebel, Ịnọk, na Noa ama. (Jenesis 4:4; 6:8; Jud 14) Jehova nabatara Devid n’ihi okwukwe ya pụrụ iche. (2 Samuel 7:16) Samuel, onye dị ka onye amụma sọpụụrụ Jehova ruo ọtụtụ afọ, bụkwa onye Chineke sọpụụrụ, onye zaghachiri ngwa ngwa n’ekpere Samuel maka enyemaka iji merie ndị Filistia. (1 Samuel 7:7-13) Ọ̀ bụ na ị gaghị enwe mmetụta nke onye a sọpụụrụ n’ịbụ onye Chineke jara mma otú ahụ?
E jikọrọ obi ekele na mmasị n’ụzọ chiri anya. Bible na-agba anyị ume ịdị “na-ekele ekele” na inwe obi ekele maka ihe e mere n’ihi anyị. (Ndị Kọlọsi 3:15; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:18) Ọ bụ ezie na nke a metụtara kpọmkwem obi ekele nye Jehova, otu ihe ahụ bụ eziokwu n’ihe ndị a na-eme ná ndụ kwa ụbọchị. Pọl onyeozi ghọtara nke a. Ọ jara Fibi mma dị ka “onye na-eguzoro ọtụtụ mmadụ ịzọ ha” nakwa Priska na Akwịla n’ihi ‘ịtọgbọ olu ha’ n’ihi ya na n’ihi ndị ọzọ. (Ndị Rom 16:1-4) Cheedị echiche otú ọ na-aghaghị ịdịworị ha mgbe ha natara ekele nke a e nyere ha n’ezoghị ọnụ. Ọ dịkwaara Pọl mma inwe obi ụtọ nke inye ịja mma, nsọpụrụ, na agbamume. Anyị onwe anyị kwa pụrụ iṅomi Jehova na ndị na-efe ya nwere ekele site n’inye ịja mma kwesịrị ekwesị maka ndị o ruuru.—Ọrụ 20:35.
Ịja Mma n’Ime Njikọ Ezinụlọ
“Ịja mma dị nta na-etinye ihe dị ukwuu n’ime ka ndụ na-atọ ụtọ,” ka Mitchell, bụ́ di na onye okenye ndị Kraịst, kwuru. “Ọ na-eme ka i kwesị ịhụ n’anya, ma eleghị anya ruo ebighị ebi, n’anya onye na-aja gị mma.” Dị ka ihe atụ, di bụ́ onye Kraịst nwere ibu ọrụ buru ibu ma na-eme mkpebi ndị dị mkpa ndị metụtara ọdịmma ezinụlọ. Ọ ghaghị igbo mkpa ime mmụọ, ihe onwunwe, na mmetụta uche nke ezinụlọ ya. (1 Timoti 5:8) Lee ka o si enwe obi ekele mgbe a jara ya mma kwesịrị ekwesị maka ọrụ Chineke kenyere ya dị ka isi ezinụlọ na mgbe nwunye ya gosiri ya ‘ịtụ egwu’!—Ndị Efesọs 5:33.
A gaghị eleghara ọrụ nke nwunye na-anọ n’ụlọ anya, bụ́ nke a na-arụ n’ebe ndị ọzọ na-adịghị ekiri. Echiche ndị e nwere ugbu a pụrụ ilelị ọrụ ndị dị otú ahụ anya ma napụ ya ịdị ùgwù na abamuru ya. Ma, ọ na-atọ Chineke ụtọ. (Taịtọs 2:4, 5) Lee ka o si na-enye ume ọhụrụ mgbe di nwere nghọta na-eto nwunye ya, karịsịa n’akụkụ nile nke ndụ ebe ọ na-eme nke ọma karịsịa, na-aja ya mma otú ahụ n’okpuru ịbụ isi ya! (Ilu 31:28) Rowena kwuru banyere di ya: “Mgbe ọ nabatara ihe m mere, ọ na-akara m mfe ido onwe m n’okpuru ya na ịsọpụrụ ya na ịkwanyere ya ùgwù.”
Onye nkụzi bụ́ onye America bụ́ Christian Bovee kwuru n’otu oge, sị: “Otuto kwesịrị ekwesị bụụrụ ụmụaka ihe anwụ bụụrụ okooko osisi.” Ee, ọbụna nwa dị nnọọ ntakịrị chọrọ mmesi obi ike mgbe mgbe nke na ya bụ onye òtù ezinụlọ e ji kpọrọ ihe. N’afọ ndụ iri na atọ ruo iri na itoolu ndị ahụ ọ na-aghọ mmadụ, ndị jupụtara ná mgbanwe ndị ọhụrụ ná mmetụta uche na anụ ahụ, a na-enwe nghọta onwe onye na-arị elu banyere ọdịdị onwe onye, ya na agụụ maka nnwere onwe na ịja mma. N’oge a karịsịa, onye nọ n’agbata afọ ndụ iri na atọ na iri na itoolu nwere mkpa mmetụta nke onye nne na nna ya hụrụ n’anya na ịbụ onye e mesoro ihe ná nghọta na obi ebere mmadụ. Ndị nne na nna na nne na nna ochie ndị na-emewanye okenye n’otu aka ahụ nwere mkpa nke mmesiwanye obi ike nke na ha ka bara uru, a hụkwa ha n’anya, na ha abụbeghị ndị ‘a tụfuru na mgbe agadi.’ (Abụ Ọma 71:9; Levitikọs 19:32; Ilu 23:22) Igbo mkpa maka ịja mma nke ọma na-eweta obi ụtọ na ọganihu ka ukwuu ná njikọ ezinụlọ.
Ịja Mma n’Ime Ọgbakọ Ndị Kraịst
E nwere uru dị ukwuu n’ịzụlite ezi mmasị ná ndị ọzọ n’ime ọgbakọ ndị Kraịst na ikwu okwu obi ekele n’ụba maka ọrụ na mgbalị ha nile. Ndị okenye ndị Kraịst kwesịrị ibute ụzọ site n’ịnabata ihe ndị ọzọ n’ime ọgbakọ rụzuru na mgbalị ha nile. “Ọ bụ nanị mgbe a bịawooro m nleta ọzụzụ atụrụ ugboro ugboro ka m ghọtara ụzọ ha si baa oké uru n’ihe banyere agbamume, afọ ojuju, na obi ụtọ,” ka Margaret kwuru. “M ghọtara ihe na-efunahụ mmadụ mgbe a na-enyeghị ịja mma n’ozuzu ya.” Lee aha ihe dị mma ọ bụ iji gosi ezigbo ịhụnanya onwe onye n’ebe mmadụ nile nọ n’ọgbakọ nọ! Jaa ọrụ ọma ha mma. Jaa ha mma n’ezoghị ọnụ ma gbaa ha ume. N’ọtụtụ ọgbakọ e nwere ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụlite nwa bụ́ ndị na-arụsi ọrụ ike iji kụbanye ụkpụrụ àgwà ime mmụọ dị iche iche n’ime ụmụ ha. Ndị dị otú ahụ kwesịrị otuto pụrụ iche. Mee ka akụkụ ndị dị mma ọ bụghị ndị na-adịghị mma pụta ìhè. Mee ka ndị ọzọ hụ ịhụnanya ụmụnna gị maka ha. Mee ka ha hụ na ị na-eche banyere ha. N’ụzọ dị otú a, ndị nlekọta na-ahụ n’anya na-arụ ọrụ iji wulite ọgbakọ. (2 Ndị Kọrint 10:8) Ndị òtù ya n’otu n’otu na-eme òkè nke ha site n’inye ịja mma na nkwanye ùgwù kwesịrị ekwesị maka ndị dị otú ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ndị na-arụsi ọrụ ike n’ihi ha.—1 Timoti 5:17; Ndị Hibru 13:17.
Ma e nwere akụkụ ọzọ n’okwu a. Ọ bụ eziokwu na ọchịchọ maka ịja mma siri nnọọ ike. N’ụbọchị Jisọs ọ ghọrọ ihe bụ́ isi a na-eche banyere ya n’etiti ndị ndú okpukpe. Jisọs aghaghị ịgbazi echiche na-ezighị ezi nke ndị na-eso ụzọ ya n’akụkụ a. (Mak 9:33-37; Luk 20:46) Ndị Kraịst nwere mkpa ezi uche na nhazi. A hapụ ya n’achịkwaghị ya, ọchịchọ ịja mma pụrụ ịbụ ihe ize ndụ n’ime mmụọ. (Jemes 3:14-16) Lee ka ọ ga-esi bụrụ ihe ọdachi, dị ka ihe atụ, ma ọ bụrụ na onye okenye adị mpako ma malite ịchọ n’ike ka ndị ọzọ nakwere ọ̀tụ̀tụ̀ e buliri elu nke onwe ya!—Ndị Rom 12:3.
Pọl onyeozi ji amamihe gwa ndị Kraịst ibe ya na Rom okwu ịdọ aka ná ntị, sị: “N’akụkụ ịhụnanya unu n’ebe ụmụnna unu nọ, ka ihe mmadụ ibe unu na-atọrịta unu ụtọ nke ukwuu; n’akụkụ nsọpụrụ unu, na-acharanụ ibe unu ụzọ.” (Ndị Rom 12:10) Okwu ndị a metụtara ndị okenye ndị Kraịst karịsịa, bụ́ ndị na-aghaghị mgbe nile ịmata Kraịst dị ka Isi nke ọgbakọ ahụ. Ịnọ n’okpuru aka nri ya nke ịbụ isi ka a na-egosipụta site n’ịchọ nduzi Kraịst site na mmụọ nsọ, ụkpụrụ Bible, na idu ndú nke Òtù Na-achị Isi nke “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-enye.—Matiu 24:45-47; lee Mkpughe 1:16, 20; 2:1.
Otú a, mgbe ndị okenye zukọrọ, ha kpeekwa ekpere maka nduzi Jehova iji zụọ ìgwè atụrụ Chineke, ha ga-agbalịsi ike ime mkpebi ndị dabeere nnọọ n’Akwụkwọ Nsọ. Imeru ihe n’ókè, ịdị obi umeala, na umeala n’obi nke ndị Kraịst ga-egbochi onye okenye ọ bụla ịnwa ibuli onwe ya elu, na-anọ n’isi ụmụnna ya, ma na-amanye ndị ọzọ ịnakwere echiche ya ná nzukọ ndị a. (Matiu 20:25-27; Ndị Kọlọsi 3:12) Mgbe ọ bụla o kwere omume, onye isi oche òtù ndị okenye ahụ ga-eme nke ọma ibu ụzọ nụta okwu n’ọnụ ndị okenye ibe ya ma wepụtazie ndepụta ihe ndị a ga-atụle ogologo oge tupu oge eruo iji nye ohere maka nchebara echiche site ná nlezianya na ekpere nke isi ihe ọ bụla e depụtara. N’oge nzukọ ndị okenye, ọ ga-agbalị, ọ bụghị ịkpụzi echiche nke ndị okenye, kama nke ahụ, ịgba ha ume iji “nkwuwa okwu” ha mee ihe n’okwu ndị a na-atụle. (1 Timoti 3:13) N’aka nke ha, ndị okenye ndị ọzọ kwesịrị iji nlezianya ṅaa ntị n’okwu ibe ha ma jiri ọṅụ rite uru site ná nghọta nke ndị okenye nweworo ọtụtụ afọ nke ahụmahụ ndị Kraịst.—Ọpụpụ 18:21, 22.
Otú ọ dị, ndị nlekọta ghọtara na Kraịst pụrụ iji onye okenye nke ọ bụla n’òtù ahụ nye ụkpụrụ Bible a chọrọ iji hụ maka otu ọnọdụ ma ọ bụ iji mee mkpebi dị mkpa. Mmụọ dị mma ga-ejupụta n’etiti òtù ahụ mgbe a jara onye okenye nke ọ bụla mma kwesịrị ekwesị n’ihi ihe o tinyere n’ilekọta ọdịmma ime mmụọ nke ọgbakọ.—Ọrụ 15:6-15; Ndị Filipaị 2:19, 20.
Rụọ Ọrụ Maka Inye na Ịnata Ịja Mma Ruru Eru
Ịja mma na-ewulite elu. Ọ na-agba ume, na-ewetakwa ịhụnanya. “Ọbụna ma anyị chee na anyị bụ ndị nkịtị,” ka Mary na-ekwu, “anyị nwere mkpa agbamume maka abamuru nke onwe anyị.” N’obi eziokwu nabata mgbalị ndị ọzọ na-etinye kwa ụbọchị. Ime otú ahụ na-eme ka ndụ bakwuoro ha uru ma dịkwuoro ha ụtọ. Ndị nne na nna, ụmụaka, ndị nlekọta, na ndị òtù ọgbakọ ndị Kraịst, unu pụrụ inweta ịja mma site n’ụzọ unu si ekwu okwu na ụzọ unu si eme ihe. Bible na-ekwu okwu ọma banyere ndị na-arụsi ọrụ ike, ndị na-emeru ihe n’ókè, na ndị dị umeala n’obi. (Ilu 11:2; 29:23; Ndị Hibru 6:1-12) Mụta iji amara nakwere abamuru ndị ọzọ. Chebara mmetụta nke ndị ọzọ echiche ka gị na ha na-arụkọ ọrụ. Pita onyeozi nyere okwu ịdọ aka ná ntị nke a: “Nwekọọnụ otu uche, unu nile, werenụ obi sorịta onwe unu hụkọọ ahụhụ, bụrụnụ ndị na-ahụ ụmụnna unu n’anya, ndị nwere obi ọmịiko, ndị nwere uche dị umeala.” (1 Pita 3:8) Nke a na-achọ ka a jaa ndị ọzọ mma, si otú a na-emezu otu mkpa bụ́ isi nke mmadụ.