Iso Ndị Na-atụ Egwu Chineke Gbakọọ
“NDỊ mmadụ n’ebe nile na-achọsi ike nnwere onwe pụọ n’egwu—egwu ime ihe ike, egwu enweghị ọrụ, na egwu nke ọrịa siri ike. Anyị nwekwara otu ọchịchọ ahụ. . . . Mgbe ahụ, n’ihi gịnị ka anyị ji na-atụle otú a ga-esi azụlite egwu?” Ajụjụ ahụ na-akpali ọchịchọ ịmata ihe bụ nke ọkà okwu kwuru okwu bụ́ isi welitere na nke ọ bụla n’ime Mgbakọ Distrikti “Egwu Chineke” nile, ndị malitere na June 1994.
Ọtụtụ nde mmadụ ndị gara ya—nke mbụ na North America, e mesịa na Europe, Central na South America, Africa, Esia, na àgwàetiti dị iche iche nke oké osimiri—nụrụ ọkụ n’obi ịmụta ịzụlite egwu dị otú ahụ. N’ihi gịnị? N’ihi na anyị ikere òkè ná ngọzi nile Jehova Chineke kwadebere maka ndị ya dabeere n’anyị inwe egwu Chineke. Ọ bụ iji mụta banyere egwu Chineke mere ndị ahụ gara mgbakọ ji zukọọ, n’oge usoro ihe omume ụbọchị atọ ahụkwa, ha mụtara ihe dị ukwuu banyere àgwà nke a dị mkpa nke ndị Kraịst.
“Tụọ Egwu Chineke, Debekwa Ihe Nile O Nyere n’Iwu”
Nke ahụ bụ isiokwu nke ụbọchị mbụ nke mgbakọ ahụ, na-adabere n’Eklisiastis 12:13. Gịnị ka ịtụ egwu Chineke pụtara? N’akụkụ mbụ kpọmkwem nke usoro ihe omume ahụ, onye isi oche mgbakọ kọwara na egwu Chineke na-egosipụta ụjọ na nsọpụrụ ofufe dị omimi maka Jehova nakwa egwu na-ewuli elu maka imejọ ya. Egwu Chineke dị otú ahụ adịghị akụnwụ ahụ; ọ bụ nke na-enye ahụ ike ma kwesị ekwesị.
Olee otú egwu nke a na-enye ahụ ike si abara anyị uru? Okwu nke na-esonụ, “Ike Agwụla Unu, Unu Wee Kwụsị,” kọwara na egwu Chineke ga-akwali anyị iji ọṅụ debe ihe nile Chineke nyere n’iwu. Tinyere ịhụnanya maka Chineke na ndị agbata obi, egwu dị otú ahụ ga-agbanye anyị ume ime mmụọ. Ee, egwu Chineke pụrụ inyere anyị aka ịghara ịkwụsịlata n’ọsọ nke ndụ ebighị ebi.
Ihe sochiri n’usoro ihe omume ahụ bụ ịgba ajụjụ ọnụ ndị wepụtara ihe nnwapụta a na-ahụ anya nke na egwu Chineke pụrụ ịkwagide anyị. Ndị a gbara ajụjụ ọnụ kọrọ otú egwu nsọpụrụ ofufe maka Chineke si kpalie ha ịnọgide n’ozi ahụ n’agbanyeghị enweghị mmasị, ma ọ bụ mkpagbu ma nyere ha aka inwe ntachi obi ọbụna mgbe a na-eche ule ndị siri ike nke onwe onye ihu.
Ma, gịnị mere ụfọdụ ndị ji enwe egwu Chineke ma ndị ọzọ adịghị enwe? N’okwu bụ́ “Ịzụlite na Irite Uru Site n’Egwu Chineke,” onye kwuru okwu bụ́ isi kọwara na na Jeremaịa 32:37-39, Jehova kwere nkwa na Ya ga-enye ndị Ya obi na-atụ egwu Chineke. Jehova na-akụnye egwu Chineke n’obi anyị. N’ụzọ dị aṅaa? Site na mmụọ nsọ ya na Okwu ya sitere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible. Otú ọ dị, o doro anya na anyị aghaghị itinye ezi mgbalị ịmụ Okwu Chineke na iji ihe ime mmụọ bara ụba ndị o nyeworo anyị mee ihe n’ụzọ zuru ezu. Ndị a gụnyere mgbakọ anyị na nzukọ ọgbakọ nile, ndị na-enyere anyị aka ịmụta ịtụ ya egwu.
Usoro ihe omume nke ehihie ji okwu ịdọ aka ná ntị maka ịtụkwasị Jehova na Okwu ya obi malite. Ihe sochiri nke a bụ ntụle nke ụzọ ndị bụ isi Alaeze ahụ kwesịrị isi metụta ndụ anyị dị ka ndị Kraịst.
Mgbe ahụ nke mbụ n’usoro isiokwu atọ e kwuru ná mgbakọ ahụ wee sochie. “Egwu Chineke Na-akpali Anyị Irube Isi n’Ihe Ndị Chineke Chọrọ” bụ isiokwu nke usoro isiokwu nke a, bụ́ nke lekwasịrị anya n’ezinụlọ. Ihe na-esonụ bụ ihe atụ nke okwu ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ—na ndị dị irè—e nyere.
□ Maka ndị bụ di: Egwu Chineke kwesịrị ịkwali nwoke ịhụ nwunye ya n’anya dị ka ahụ nke onwe ya. (Ndị Efesọs 5:28, 29) Nwoke adịghị ama ụma emerụ ahụ nke onwe ya ahụ, menye onwe ya ihere n’ihu ndị enyi ya, ma ọ bụ gbaa asịrị banyere amaghị eme ya dị iche iche. Ya mere, o kwesịrị imeso nwunye ya n’ụzọ ahụ dị ùgwù na nsọpụrụ nke ọ na-emeso onwe ya.
□ Maka ndị bụ nwunye: Egwu Chineke nke Jisọs kwaliri ya ‘ime ihe na-atọ Chineke ụtọ mgbe nile.’ (Jọn 8:29) Nke a bụ mmụọ dị mma ndị bụ nwunye ga-eṅomi n’ụzọ ha si emeso di ha ihe.
□ Maka ndị nne na nna: Ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst pụrụ igosipụta egwu Chineke site n’iji ibu ọrụ nile nke ndị bụ nne na nna kpọrọ ihe, na-ele ụmụ ha anya dị ka ihe nketa sitere n’aka Jehova. (Abụ Ọma 127:3) Ihe mgbaru ọsọ bụ isi nke ndị nne na nna kwesịrị ịbụ ịzụlite ụmụ ha ịghọ ezigbote ndị Kraịst.
□ Maka ụmụaka: Jehova na-enye ụmụaka ntụziaka ka ha ṅaa ntị ‘okwu ndị mụrụ ha n’ime Onyenwe anyị.’ (Ndị Efesọs 6:1) N’ihi ya, ha irubere ndị mụrụ ha isi bụ irubere Chineke isi.
Okwu mmechi nke ụbọchị ahụ metụrụ ndị mmadụ n’obi, n’ihi na ọ tụlere mmetụta ndị miri emi anyị nile na-enwe mgbe onye anyị hụrụ n’anya nwụnahụrụ anyị. Ma, n’ihe dị ka ná nkera nke okwu ahụ, e nwere ihe a na-atụghị anya ya. Ọkà okwu ahụ mere ka ndị na-ege ntị nwee obi ụtọ site n’ịma ọkwa mwepụta nke broshuọ ọhụrụ ahụ Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ. Akwụkwọ nke a dị 32 peji, dị n’àgwà àgwà na-ekwu ihe dị ukwuu pụrụ inyere ndị na-eru újú aka ịghọta na ime ihe banyere mmetụta ndị na-ebilite mgbe onye a hụrụ n’anya nwụrụ. Ọ̀ dịwo mgbe ị na-amaghị ihe ị ga-agwa onye mmadụ nwụnahụrụ? Otu akụkụ nke broshuọ a tụlere ụzọ anyị pụrụ isi nyere ndị na-eru újú aka. Ka ha na-ege ọkà okwu ahụ ntị, ọtụtụ ndị bịaranụ na-eche echiche banyere onye pụrụ irite uru site na broshuọ ọhụrụ nke a.
‘Were Egwu Chineke na Ụjọ Jee Ozi Dị Nsọ’
Nke ahụ bụ isiokwu nke ụbọchị nke abụọ, nke dabeere ná Ndị Hibru 12:28. N’oge usoro ihe omume nke ụtụtụ ka usoro isiokwu nke abụọ bịara, “Ọgbakọ Ndị Na-eje Ije n’Egwu Jehova.” Akụkụ nke mbụ kwuru maka ịga nzukọ. Anyị ịnọ ná nzukọ na-egosipụta nkwanye ùgwù anyị maka Chineke na ndokwa ihe ime mmụọ ya nile. Site n’ịga, anyị na-egosi na anyị na-atụ egwu aha ya ma na-anụ ọkụ n’obi ime ihe kwekọrọ n’uche ya. (Ndị Hibru 10:24, 25) Ọkà okwu nke abụọ kọwara na ka ọgbakọ n’ozuzu ya wee na-ejegharị n’egwu Jehova, onye nke ọ bụla aghaghị ime òkè nke ya n’ịnọgide na-enwe àgwà ọma. Ọkà okwu ikpeazụ kwuru banyere ihe ùgwù na ọrụ nke ndị Kraịst nile nwere—ikwusa ozi ọma ahụ n’esepụghị aka. Ogologo oge hà aṅaa ka anyị ga-anọgide na-ekwusa? Ruo mgbe Jehova sịrị na o zuwo.—Aịsaịa 6:11.
“Ọṅụ Jehova Bụ Ike Unu” bụ isiokwu nke okwu sochiri, dị ka a tụlere ya ugbu a n’isiokwu ndị dịịrị ọmụmụ nke magazin nke a. (Nehemaịa 8:10) N’ihi gịnị ka ndị Jehova ji bụrụ ndị nwere ọṅụ? Ọkà okwu wepụtara ọtụtụ ihe. Otu nke gbara nnọọ ọkpụrụkpụ bụ na mmekọrịta chiri anya n’ebe Chineke nọ na-eme ka anyị bụrụ ndị kasị nwee ọṅụ n’ụwa. Cheedị nnọọ echiche, ka ọkà okwu ahụ chetaara ndị bịara mgbakọ, anyị nwere ihe ùgwù nke iso ná ndị Jehova dọtaworo n’ebe Jisọs Kraịst nọ. (Jọn 6:44) Lee aha ihe dị ike ọ bụ iji nwee ọṅụ!
Otu ihe na-apụta ìhè ná mgbakọ ọ bụla bụ baptism, Mgbakọ “Egwu Chineke” apụghịkwa iche. N’okwu ahụ bụ́ “Nraranye na Baptism n’Egwu Jehova,” ọkà okwu kọwara na ibu ọrụ onwe onye nke ndị nile e mere baptism dị ụzọ anọ: (1) Anyị aghaghị ịmụ Okwu Chineke site n’enyemaka nke akwụkwọ ndị na-enyere anyị aka ịghọta na itinye ya n’ọrụ; (2) anyị aghaghị ikpe ekpere; (3) anyị aghaghị iso ndị kwere ekwe ibe anyị na-akpakọrịta ná nzukọ nile nke ọgbakọ; na (4) anyị aghaghị ịgba àmà banyere aha na Alaeze Jehova.
Usoro ihe omume nke ehihie Saturday malitere n’isiokwu ahụ na-emesighachi obi ike bụ́ “Ndị Jehova Na-agbahapụghị.” Narị afọ 35 gara aga, mgbe mba Israel chere oge ndị siri ike ihu, Jehova kwere nkwa site n’ọnụ Mosis, na-asị: “Jehova, bụ́ Chineke gị, . . . Ọ gaghị aha gị aka, Ọ gaghị ahapụkwa gị.” (Deuterọnọmi 31:6) Jehova mezuru nkwa ahụ site n’ichebe ndị Israel mgbe ha banyere n’Ala Nkwa ahụ ma weghara ya. Taa, mgbe a na-eche ule ndị siri ike ihu, anyị onwe anyị kwa pụrụ inwe nchekwube zuru ezu na Jehova agaghị agbahapụ anyị, ọ bụrụhaala na anyị anọgide ya nso ma na-aṅa ntị n’okwu ndụmọdụ nke Okwu ya.
Olee otú ị pụrụ isi nweta obi ụtọ n’ịgụ Bible? N’okwu bụ́ “Gụọ Okwu Chineke, Bụ́ Bible Nsọ, Kwa Ụbọchị,” ọkà okwu tụrụ aro iji uche nke na-agba ajụjụ na-agụ ma na-ajụ ajụjụ ndị dị ka ndị a: Gịnị ka ihe ndekọ nke a na-akụziri m banyere àgwà na ụzọ dị iche iche nke Jehova? Olee otú m pụrụ isi dịkwuo ka Jehova n’akụkụ ndị a? Ịgụ Bible n’ụzọ dị otú a bụ ihe obi ụtọ na ahụmahụ na-enyeghachi ụgwọ ọrụ.
E cheziri ihu n’usoro isiokwu nke atọ n’usoro ihe omume ahụ, “Ihe Ndị A Kwadebere Iji Nyere Ndị Na-atụ Egwu Jehova Aka.” Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na Jehova agaghị arụ ọrụ ebube n’ihi ndị ozi ya taa, ọ na-abịa inyere ndị na-atụ egwu ya aka n’ezie. (2 Pita 2:9) Usoro isiokwu nke a tụlere ndokwa anọ sitere n’aka Jehova iji nyere anyị aka n’oge ndị a dị oké egwu: (1) Site na mmụọ ya, Jehova na-enye anyị ike ịrụzu ọrụ ndị karịrị ike anyị nke ukwuu. (2) Site n’Okwu ya, ọ na-enye anyị ndụmọdụ na nduzi. (3) Site n’ihe mgbapụta ahụ, ọ na-enye anyị akọ na uche dị ọcha. (4) Site ná nzukọ ya, gụnyere ndị okenye, ọ na-enye anyị ntụzi na nchebe. (Luk 11:13; Ndị Efesọs 1:7; 2 Timoti 3:16; Ndị Hibru 13:17) Site n’iji ndokwa ndị a mee ihe n’ụzọ zuru ezu, anyị ga-enwe ike ịtachi obi wee si otú ahụ nweta nnwapụta Jehova.
A kpọrọ okwu ikpeazụ n’ehihie Saturday “Ụbọchị ahụ Dị Egwu nke Jehova Dị Nso,” bụ́ nke dabeere n’amụma Malakaị. E nwewo ụbọchị ndị dị egwu n’akụkọ ihe mere eme gara aga, dị ka mgbe e mezuru ihe e kpere n’ikpe n’isi Jerusalem na 70 O.A. Ma ụbọchị kasị dị egwu n’ahụmahụ nile nke mmadụ ga-abụ ụbọchị Jehova nke na-abịa abịa mgbe ‘a bọrọ ọ́bọ̀ n’ahụ ndị na-amataghị Chineke, ha na ndị na-aṅaghị ntị ozi ọma nke Onyenwe anyị Jisọs.’ (2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-8) Ruo ókè hà aṅaa ka nke ahụ dị nso? Ọkà okwu ahụ sịrị: “Ọgwụgwụ ahụ dị nso! Jehova maara ụbọchị na hour ahụ. Ọ gaghị agbanwe usoro ọgụgụ oge ya. A kpọkuwo anyị iji ndidi na-atachi obi.”
O siri ike ikweta na ụbọchị abụọ agabigaworị. Gịnị ka ụbọchị nke ikpeazụ ga-eweta?
“Tụọnụ Egwu Chineke, Nyekwa Ya Otuto”
Isiokwu nke ụbọchị nke atọ dabeere ná Mkpughe 14:7. N’oge usoro ihe omume ụtụtụ, usoro okwu dị iche iche mere ka nkụzi ozizi ụfọdụ na-esetịpụ Ndịàmà Jehova iche pụọ n’òtù okpukpe ndị ọzọ nile pụta ìhè.
N’okwu bụ́ “A Ga-enwe Mbilite n’Ọnwụ nke Ndị Ezi Omume,” ọkà okwu ya welitere otu ajụjụ na-akpali mmasị: “N’oge Ụbọchị Ikpe ahụ nke otu puku afọ, olee mgbe a ga-akpọlite ndị nwụrụ n’ikwesị ntụkwasị obi n’afọ ndị ikpeazụ ndị a nke usoro ihe Setan?” Gịnị bụ azịza ya? “Bible ekwughị,” ka ọkà okwu ahụ kọwara. “Otú ọ dị, ọ́ bụghị ihe ezi uche dị n’ime ya na a ga-akpọlite ndị nwụrụ n’oge anyị ná mmalite ka ha wee soro oké ìgwè mmadụ ahụ ndị lanarịrị Amagedọn kere òkè n’ọrụ nkụzi dị ukwuu nke a ga-arụ n’oge Ụbọchị Ikpe ahụ dum? Ee, n’ezie!” À ga-enwe ndị lanarịrị? Kpọmkwem a ga-enwe. Nkụzi na ihe atụ dị iche iche nke Bible ndị na-emesi anyị obi ike banyere nke a ka a kọwara n’ụzọ doro anya n’okwu nke sochiri, “Ndị E Chebere Ndụ Gabiga Mkpagbu Ukwu Ahụ.”
Ndịàmà Jehova aghọtawo eri ogologo oge gara aga na Bible na-esetịpụ ebe mgbaru ọsọ abụọ—ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs nye ọtụtụ nde mmadụ a na-apụghị ịgụta ọnụ na ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe nye ọnụ ọgụgụ a kpaara ókè ndị ga-eso Kraịst chịa n’Alaeze ya. A tụlere olileanya nke eluigwe ahụ n’okwu bụ́ “Atụla Egwu, Ìgwè Atụrụ Nta.” (Luk 12:32) N’ihi ọnọdụ ụwa e nwere ugbu a, ìgwè atụrụ nta ahụ aghaghị ịbụ ndị egwu na-adịghị atụ; nke ọ bụla n’ime ha aghaghị ịtachi obi kpọmkwem ruo ọgwụgwụ. (Luk 21:19) “Atụghị egwu ha,” ka ọkà okwu ahụ sịrị, “na-arụ ọrụ iji gbaa oké ìgwè mmadụ ahụ ume. Ha n’otu aka ahụ kwesịrị ịzụlite àgwà nke atụghị egwu ka ha na-atụ anya nzọpụta n’oge nsogbu kasị ukwuu nke ụwa na-amabeghị mbụ.”
Ná mmechi nke usoro ihe omume ụtụtụ ahụ, ndị bịaranụ ji obi ụtọ kirie ihe nkiri Bible ahụ bụ́ Nhọrọ Ndị Ị Na-eche Ihu. N’ụbọchị Joshua, nakwa na nke Elaịja onye amụma, ndị Israel nọ n’agbata ụzọ abụọ. A ghaghị ime nhọrọ. Elaịja sịrị: “Ruo ole mgbe ka unu onwe unu ga na-arụgharị n’etiti ụzọ abụọ ndị a? ọ bụrụ na Jehova bụ Chineke, jesoonụ Ya: ọ bụrụ Beal, jesoonụ ya.” (1 Ndị Eze 18:21) Taakwa, ihe a kpọrọ mmadụ nọ n’agbata ụzọ abụọ. Nke a abụghị oge ịrụgharị n’etiti ụzọ abụọ. Gịnị bụ nhọrọ nke ziri ezi? Otu ụdị ahụ nke Joshua oge ochie mere. Ọ sịrị: “Mụ onwe m na ụlọ m, anyị ga-efe Jehova ofufe.”—Joshua 24:15.
Na mberede, dị ka o yiri, ọ ghọọla ehihie Sunday na oge maka okwu ihu ọha nke a kpọrọ “Ihe Mere A Ga-eji Tụọ Ezi Chineke ahụ Egwu Ugbu A.” Ná Mkpughe 14:6, 7, a na-agba ihe nile a kpọrọ mmadụ ume, sị: “Tụọnụ egwu Chineke, nyekwa ya otuto.” N’ihi gịnị ka o ji dị ngwa ịtụ egwu Chineke ugbu a? N’ihi na, dị ka akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ gara n’ihu ikwu, “oge hour nke ikpe Ya abịawo.” Site n’Ọkpara ya, onye e meworo ka ọ nọkwasị n’oche ugbu a dị ka Eze nke Alaeze eluigwe Chineke, Jehova ga-eweta ọgwụgwụ nye usoro ihe dị ugbu a nke na-adịghị ọcha, nke nnupụisi. Ọkà okwu ahụ kọwara na nke a bụ ụzọ e nwere nanị ya isi nweta ahụ efè nye ndị na-atụ egwu Chineke nakwa iji napụta ma chebe ebe obibi anyị bụ́ ụwa. Ebe ndị a bụ ụbọchị ndị ikpeazụ nke usoro ihe nke a, ọ dị ngwa na anyị tụrụ egwu ezi Chineke ahụ ugbu a!
Mgbe nchịkọta ihe ọmụmụ Ụlọ Nche maka izu ahụ gasịrị, ọkà okwu ikpeazụ rịgotara. N’ihi usoro ihe omume mgbakọ ahụ, egwu Chineke nwekwuru ihe ka ukwuu ọ pụtara nye ndị bịara mgbakọ, ka ọ kọwara. O kwusiri okwu ike banyere ọtụtụ uru na-abịara ndị na-atụ egwu Chineke. Ọkà okwu ahụ mara ọkwa mwepụta nke vidio ọhụrụ—United by Divine Teaching. O gosipụtara akụkụ ndị pụrụ iche nke Mgbakọ Mba Nile nke “Izi Ihe Chineke” e mere na 1993-1994. Ka okwu ahụ na-agwụsị, ọtụtụ jụrụ, sị, ‘Gịnị ka anyị ga-atụ anya ya n’afọ na-abịanụ?’ Mgbakọ distrikti ụbọchị atọ n’ọtụtụ ebe.
Ná mmechi, ọkà okwu ahụ zoro aka na Malakaị 3:16, nke na-asị: “Mgbe ahụ ndị na-atụ egwu Jehova na-ekwurịta okwu, otu onye na ibe ya: Jehova wee ṅaa ntị, nụ, e wee deere ndị na-atụ egwu Jehova, ndị na-echekwa echiche aha Ya, akwụkwọ ncheta n’ihu Ya.” Ndị bịara mgbakọ lara na-enwe mkpebi siri ike nke doro anya iche echiche banyere aha Jehova na iji egwu Chineke na-efe ya ofufe.
[Foto dị na peeji nke 24]
Ọ dị ndị a na-eme baptism mkpa ịnọgide na-egosipụta egwu Chineke
[Foto dị na peeji nke 25]
Ihe nkiri bụ́ “Nhọrọ Ndị Ị Na-eche Ihu” mere ka mkpa iji mkpebi siri ike na-efe Jehova bamie n’obi ndị na-ege ntị
[Foto dị na peeji nke 26]
Obi tọrọ ndị bịara mgbakọ ụtọ ịnata broshuọ ọhụrụ bụ́ “Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ”