“Nwoke na Nwanyị Ka O Kere Ha”
“Chineke wee kee mmadụ n’onyinyo Ya, n’onyinyo Chineke ka O kere ya: nwoke na nwanyị ka O kere ha.”—JENESIS 1:27.
1. Olee otú eziokwu ahụ si bụrụ ngọzi nye ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị Kraịst?
LEE ka o si dị ụtọ ịnọ n’etiti ndị Jehova na iso ndị ikom na ndị inyom na-akpakọrịta, tinyekwara ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ, ndị ihe mbụ ná ndụ ha bụ ịhụ Chineke n’anya na irubere ya isi! Eziokwu ahụ na-atọhapụkwa anyị n’omume na àgwà ndị na-adịghị atọ Jehova Chineke ụtọ, ọ na-ezikwa anyị otú anyị ga-esi ebi obi dị ka ndị Kraịst kwesịrị. (Jọn 8:32; Ndị Kọlọsi 3:8-10) Dị ka ihe atụ, ndị mmadụ n’ebe nile nwere ọdịnala ma ọ bụ echiche banyere ụzọ ndị ikom kwesịrị isi gosi ịbụ nwoke ha, na ndị inyom ịbụ nwanyị ha. Ọ̀ bụ nanị na a mụrụ ndị ikom ịbụ nwoke na ndị inyom ịbụ nwanyị? Ka è nwere ihe ndị ọzọ a na-aghaghị ịtụle?
2. (a) Gịnị kwesịrị ikpebi echiche anyị banyere ịbụ nwoke na ịbụ nwanyị? (b) Gịnị meworo echiche banyere nwoke na nwanyị?
2 Nye ndị Kraịst, Okwu Chineke bụ ikike anyị na-erubere isi, n’agbanyeghị echiche onwe onye, ọdịbendị, ma ọ bụ ọdịnala ndị anyị pụrụ inweworị. (Matiu 15:1-9) Bible ekwughị okwu n’ụzọ sara mbara n’akụkụ nile nke ịbụ nwoke na ịbụ nwanyị. Kama nke ahụ, ọ na-enye ohere maka ịgwa ọgwa, dị ka anyị na-ahụta n’ọdịbendị dị iche iche. Iji bụrụ ihe Chineke kere ha ịbụ, ndị ikom aghaghị inwe njimara nwoke, ndị inyom aghaghịkwa inwe njimara nwanyị. N’ihi gịnị? N’ihi na tinyere ndị ikom na ndị inyom ịbụ ndị e mere ikwesị ibe ha n’ụzọ anụ ahụ, e mere ha ikwesị ibe ha site n’àgwà ịbụ nwoke na àgwà ịbụ nwanyị. (Jenesis 2:18, 23, 24; Matiu 19:4, 5) Ma, a gbagọwo ma ọ bụ gwagbuo echiche banyere nwoke na nwanyị. Ọtụtụ chere na ịbụ nwoke pụtara ọchịchị obi ọjọọ, ịdị aka ike, ma ọ bụ ike ọkpụkpụ aka nke ndị ikom. N’ọdịbendị ụfọdụ ọ na-adị ụkọ, ọbụna bụrụ ihe ihere, ka nwoke bee ákwá, n’ihu ọha ma ọ bụ ná nzuzo. Ma, n’etiti ìgwè mmadụ n’èzí ili Lazarọs, “anya mmiri pụrụ n’anya Jisọs.” (Jọn 11:35) Nke ahụ abụghị ihe na-ekwesịghị ekwesị nye Jisọs, onye ịbụ nwoke ya zuru okè. Taa ọtụtụ na-enwe echiche na-eguzozighị eguzozi banyere ịbụ nwanyị, na-ele ya anya ịbụ nanị ndọrọ nke anụ ahụ na nke mmekọahụ.
Ezi Ịbụ Nwoke na Ezi Ịbụ Nwanyị
3. Olee otú ndị ikom na ndị inyom si dị iche?
3 Gịnị bụ ezi ịbụ nwoke, gịnịkwa bụ ezi ịbụ nwanyị? Akwụkwọ The World Book Encyclopedia na-ekwu: “Ihe ka ọtụtụ ná ndị ikom na ndị inyom dị iche n’ebe ibe ha nọ ọ bụghị nanị n’ọdịdị ahụ, kama n’akparamàgwà nakwa n’ihe ndị na-amasị ha. Ihe e bu pụta ụwa na-ekpebi ụfọdụ ọdịiche ndị a. . . . Ma ọtụtụ ọdịiche ndị na-emetụtaghị ọdịdị ahụ yiri ka ha na-adabere n’àgwà mmekọahụ nke onye ọ bụla mụtara. A na-amụ ndị mmadụ ịbụ ikom ma ọ bụ inyom, ma ha na-amụta ịbụ nwoke ma ọ bụ ịbụ nwanyị.” Ọdịdị anyị bu pụta ụwa pụrụ ịkpata ọtụtụ ihe, nzụlite nke ịbụ nwoke ma ọ bụ ịbụ nwanyị kwesịrị ekwesị dabeere n’anyị ịmụta ihe Chineke chọrọ anyị n’aka na ihe anyị họọrọ n’otu n’otu ịchụso ná ndụ.
4. Gịnị ka Bible na-ekpughe banyere ibu ọrụ nke nwoke na nwanyị?
4 Akụkọ ihe mere eme nke Bible na-ekpughe na ibu ọrụ Adam bụ ibute ụzọ dị ka isi nke nwunye na ụmụ ya. Ọ ga-ekwekọkwa n’uche Chineke ijupụta ụwa na ibuda ya n’okpuru na inwe ike n’ahụ ihe nile e kere eke dị ala n’elu ụwa. (Jenesis 1:28) Ibu ọrụ nwanyị n’ezinụlọ maka Iv ga-abụ “onye inyeaka,” na onye ‘kwesịrị’ Adam, na-edo onwe ya n’okpuru ịchịisi ya, na-eso ya arụkọ ọrụ ná mmezu nke nzube Chineke kwupụtara maka ha.—Jenesis 2:18; 1 Ndị Kọrint 11:3.
5. Olee otú e siri mebie mmekọrịta dị n’etiti nwoke na nwanyị?
5 Ma Adam emezughị ibu ọrụ ya, Iv jikwa ịbụ nwanyị ya mee ihe n’ụzọ nrụgide iji rara Adam gaa n’isonyere ya n’inupụrụ Chineke isi. (Jenesis 3:6) Site n’ịhapụ onwe ya ime ihe ọ ma na ọ dị njọ, Adam egosipụtaghị ezi ịbụ nwoke. O ji adịghị ike họrọ ịnakwere okwu nwunye ya e duhiere eduhie kama ihe Nna na Onye Okike ya kwuworo. (Jenesis 2:16, 17) N’oge na-adịghị anya di na nwunye mbụ ahụ malitere inwe ahụmahụ nke ihe Chineke hụwororịị na ọ ga-esi ná nnupụisi pụta. Adam, bụ́ onye jiri okwu ọma, ndị nke abụ uri kọwaa nwunye ya na mbụ, zoro aka n’ebe ọ nọ ugbu a n’ụzọ na-adịghị ekpo ọkụ dị ka “nwanyị ahụ nke I nyere m.” Ezughị okè ya mebiri ma duhie ịbụ nwoke ya ugbu a, na-akpata ya ‘ịchị nwunye ya.’ Iv, n’aka nke ya, ga-enwe “ọchịchọ” maka di ya, ma eleghị anya n’ụzọ gabigara ókè ma ọ bụ n’ụzọ na-eguzozighị eguzozi.—Jenesis 3:12, 16.
6, 7. (a) Olee ngwagbu nke ịbụ nwoke biliterenụ tupu Iju Mmiri ahụ? (b) Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ọnọdụ dị tupu Iju Mmiri ahụ?
6 Iji ịbụ nwoke na ịbụ nwanyị eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi pụtara ìhè nke ọjọọ ya n’oge bu Iju Mmiri ahụ ụzọ. Ndị mmụọ ozi hapụrụ ọnọdụ mbụ ha n’eluigwe nwoghatara anụ ahụ mmadụ iji nụrụ ụtọ mmekọahụ ha na ndị inyom. (Jenesis 6:1, 2) Ihe ndekọ ahụ na-ezo aka nanị ná ndị ikom a mụrụ site ná njikọ mmekọahụ ndị ahụ megidere okike. O yikwara ka ụmụ ha bụ ndị gwara ọgwa, ndị na-enweghị ike ịmụ ụmụ. A bịara mara ha dị ka ndị dike, Nefilim, ma ọ bụ Ndị Ntigbu, ebe ọ bụ na ha na-eme ka ndị ọzọ daa. (Jenesis 6:4; nkọwa ala ala peji nke NW) Ihe àmà na-egosi na ha na-eme ihe ike, nwee obi ọjọọ, ghara ịdị na-egosipụta ọmịiko dị nro.
7 N’ụzọ doro anya, mma elu ahụ, ọdịdị ahụ, ibu, ma ọ bụ ume adịghị eme n’onwe ha ka mmadụ bụrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị a pụrụ ịnakwere. Ọ ghaghị ịbụ na ndị mmụọ ozi ahụ nwoghara onwe ha mara mma ile anya. Ndị Nefilim gbakwara agba ma nwee ume, ma echiche uche ha gbagọrọ agbagọ. Ndị mmụọ ozi ahụ na-enupụ isi na ụmụ ha jiri mmekọahụ rụrụ arụ na ime ihe ike mejupụta ụwa. N’ihi ya, Jehova wetara ụwa ahụ ná njedebe. (Jenesis 6:5-7) Otú ọ dị, Iju Mmiri ahụ ewepụsịghị mmetụta ndị mmụọ ọjọọ, o wepụghịkwa ihe mmehie Adam rụpụtara. Echiche na-ezighị ezi nke ịbụ nwoke na ịbụ nwanyị bilitekwara ọzọ mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị, e nwekwara ihe atụ ndị dị na Bible, ma ndị dị mma ma ndị dị njọ, ndị anyị pụrụ ịmụta ihe na ha.
8. Ihe nlereanya ọma dị aṅaa nke ịbụ nwoke kwesịrị ekwesị ka Josef setịpụrụ?
8 Josef na nwunye Pọtifa na-enye ọdịiche dị ike nke ịbụ nwoke kwesịrị ekwesị megide ịbụ nwanyị nke ụwa. Nwunye Pọtifa, n’ịghọ onye nwere ịhụnanya nzuzu n’ebe Josef ahụ mara mma ile anya nọ, nwara ịra ya ụra. N’oge ahụ, ọ dịghị iwu ọ bụla e dere ede sitere n’aka Chineke nke na-amachibido ịkwa iko nile iwu. Ma, Josef gbapụrụ n’ebe nwanyị ahụ rụrụ arụ nọ ma gosipụta onwe ya ịbụ nwoke nke Chineke n’ezie, onye na-egosi ịbụ nwoke nke nwere nnwapụta Chineke.—Jenesis 39:7-9, 12.
9, 10. (a) Olee otú Nwunye Eze Vashti siri jiri ịbụ nwanyị ya mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi? (b) Ihe nlereanya ọma dị aṅaa nke ịbụ nwanyị ka Esta nyere anyị?
9 Esta na Nwunye Eze bụ́ Vashti nyere ihe atụ dị ịrịba ama dịrịtara iche maka ndị inyom. Dị ka ihe ama na-egosi, Vashti chere na ọ mara mma nke ukwuu nke na Eze Ahasuerọs ga-ekwenye mgbe nile n’ihe ọ chọrọ. Ma ịma mma ya abaghị n’ime karịa ọtụtụ mmanụ otite ndị a na-ere taa. O nweghị obi umeala na ịbụ nwanyị, n’ihi na o gosipụtaghị ịnọ n’okpuru nye di na eze ya. Eze ahụ jụrụ ya ma họrọ inyom bụ nwanyị n’ezie onye, n’eziokwu, tụrụ egwu Jehova ịbụ nwunye ya.—Esta 1:10-12; 2:15-17.
10 Esta bụ ihe nlereanya magburu onwe ya maka ndị inyom bụ́ ndị Kraịst. Ọ “mara mma n’ahụ, dịkwa mma ile anya,” ma o gosipụtara ịchọ mma nke “mmadụ zoro ezo nke mkpụrụ obi, n’uwe a na-apụghị imebi nke bụ mmụọ dị nwayọọ dịkwa udo, nke dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke.” (Esta 2:7; 1 Pita 3:4) Ọ gụghị ngosipụta nke ihe ịchọ mma ịbụ ihe bụ isi. Esta gosiri akọ na njide onwe onye, na-edo onwe ya n’okpuru di ya, bụ́ Ahasuerọs, ọbụna mgbe ndụ nke ndị ya nọ n’ihe ize ndụ. Esta deere duu mgbe ọ bụ ihe amamihe ime otú ahụ ma jiri nkwuwa okwu na atụghị egwu kwuo okwu mgbe ọ dị mkpa na n’oge ziri ezi. (Esta 2:10; 7:3-6) Ọ nabatara ndụmọdụ site n’aka nwa nwanne nna ya tozuru okè, bụ́ Mọdekaị. (Esta 4:12-16) O gosipụtara ịhụnanya na iguzosi ike n’ihe n’ebe ndị ya nọ.
Ọdịdị Elu Ahụ
11. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’uche banyere ọdịdị elu ahụ?
11 Gịnị bụ isi ihe dị n’ịbụ nwanyị kwesịrị ekwesị? Otu nne kwuru, sị: “Amara bụ ụgha, ịma mma bụkwa ihe efu: ma nwanyị nke na-atụ egwu Jehova, nwanyị ahụ ga-enwe otuto.” (Ilu 31:30) Ya mere egwu nsọpụrụ maka Chineke dị mkpa, ebere ịhụnanya, ịdị mma, obi umeala, na ire dị nwayọọ na-atụnyekwa ụtụ ka ukwuu n’ịbụ nwanyị karịa ka mma elu ahụ na-atụnye.—Ilu 31:26.
12, 13. (a) N’ụzọ dị mwute, gịnị na-aka okwu nke ọtụtụ ndị akara? (b) Gịnị ka Ilu 11:22 pụtara?
12 N’ụzọ dị mwute, ọtụtụ ndị ikom na ndị inyom adịghị asaghe ọnụ ha n’amamihe, ebere adịghịkwa n’ire ha. Okwu ha na-abụ nke mkparị, akaje, nzuzu, rere ure, na nke echebaraghị ndị ọzọ echiche. Ụfọdụ ndị ikom na-eche na okwu na-adịghị ọcha bụ akara nke ịbụ nwoke, ụfọdụ ndị inyom na-ezuzurukwa na-eṅomi ha. Ma, ọ bụrụ na nwanyị mara mma ma ezi uche akọọ ya, ọ bụrụkwa onye na-arụkarị ụka, na-eme akaje, ma ọ bụ dị mpako, ọ̀ pụrụ n’ezie ịma mma n’ezi echiche nke okwu ahụ, bụrụ nwanyị n’eziokwu? “Dị ka mgbaaka ọlaedo n’imi ezì, otú a ka nwanyị mara mma nke na-esi n’ezi uche wezụga onwe ya dị.”—Ilu 11:22.
13 Ịma mma ya na okwu na-adịghị ọcha, akaje, ma ọ bụ enweghị ezi uche agaghị ekwekọ n’ọdịdị ọ bụla nke ịbụ nwanyị nke mmadụ pụrụ igosipụta. N’eziokwu, omume asọpụrụghị Chineke dị otú ahụ pụrụ ọbụna ime ka onye na-adọrọ adọrọ n’ụzọ anụ ahụ jọọ njọ ile anya. Anyị pụrụ ịghọta n’ụzọ dị mfe na ọdịdị elu ahụ nke nwoke ma ọ bụ nwanyị apụghị n’onwe ya ịkwụ ụgwọ maka ma ọ bụ mee ka ntiwapụ nke iwe, iti mkpu, ma ọ bụ okwu na-adịghị mma zie ezie. Ndị Kraịst nile pụrụ ma kwesị ime onwe ha ndị na-adọrọ adọrọ n’ebe Chineke na ndị mmadụ ibe ha nọ site n’okwu na àgwà ha dabeere na Bible.—Ndị Efesọs 4:31.
14. Ụdị ihe ịchọ mma dị aṅaa ka e toro na 1 Pita 3:3-5, gịnịkwa ka i chere banyere nke ahụ?
14 Ọ bụ ezie na ịbụ nwanyị na ịbụ nwoke ziri ezi dabeere n’àgwà ime mmụọ, anyị aghaghị ịmara na omume na ọdịdị elu ahụ, tinyere uwe anyị yi na ụzọ anyị si yiri ya, na-ekwu okwu banyere anyị. Obi abụọ adịghị ya na Pita onyeozi bu n’uche ụdị dị iche iche nke uwe na ejiji nke narị afọ mbụ mgbe o nyere ndị inyom bụ́ ndị Kraịst ndụmọdụ, sị: “Ndị ịchọ mma ha ka ọ ghara ịbụ ịchọ mma ahụ nke ahụ nke bụ ịkpa isi, na iyikwasị ihe ọlaedo, ma ọ bụ iyikwasị ọtụtụ uwe; kama ka ọ bụrụ mmadụ zoro ezo nke mkpụrụ obi, n’uwe a na-apụghị imebi nke bụ mmụọ dị nwayọọ dịkwa udo, nke dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke. N’ihi na otú a ka ndị inyom ahụ ndị dị nsọ, ndị na-ele anya Chineke, na-achọkwa onwe ha mma n’oge gara aga, na-edo onwe ha n’okpuru di nke aka ha.”—1 Pita 3:3-5.
15. Gịnị ka ndị inyom bụ́ ndị Kraịst kwesịrị ịgbalị igosipụta n’uwe ha?
15 Na 1 Timoti 2:9, 10, anyị na-ahụ okwu Pọl banyere uwe nwanyị: “Ezubere m ka ndị inyom were ihe ịchọ mma kwesịrị ekwesị chọọ onwe ha mma, ya na nsọpụrụ na uche zuru okè . . . (nke kwesịrị ndị inyom na-ekwupụta egwu Chineke) ka ha sitere n’ezi ọrụ chọọ onwe ha mma.” N’ebe ahụ o mesiri ike mkpa maka imeru ihe n’ókè ma gbakwụnye ịdị ọcha na ịchọ mma kwesịri ekwesị nke na-egosipụta uche zuru okè.
16, 17. (a) Olee otú ọtụtụ ndị ikom na ndị inyom siworo jiri uwe mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi taa? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ikwubi site na ndụmọdụ dị na Deuterọnọmi 22:5?
16 Nye nwoke ma ọ bụ nwanyị, nwata nwoke ma ọ bụ nwata nwanyị, ime omume ma ọ bụ iji ejiji n’ụzọ na-akpali agụụ mmekọahụ agaghị akwalite ezi ịbụ nwoke ma ọ bụ ịbụ nwanyị, ọ dịghịkwa asọpụrụ Chineke ma ọlị. Ọtụtụ ndị nọ n’ụwa na-emebiga ihe ókè iji gosipụta ikike mmekọahụ nke nwoke ma ọ bụ nwanyị n’uwe na n’àgwà. Ndị ọzọ na-eme ka a ghara ịma ọdịiche dị n’etiti onye bụ nwoke na onye bụ nwanyị n’ihi nzube omume rụrụ arụ. Lee ka anyị bụ́ ndị Kraịst pụrụ isi nwee ekele na Bible na-ekpughe echiche Chineke! Jehova kwupụtaara Israel oge ochie, sị: “Ihe dịịrị nwoke agaghị adịkwasị n’ahụ nwanyị, nwoke agaghị eyirikwa uwe mgbokwasị nwanyị: n’ihi na ihe arụ nke Jehova, bụ́ Chineke gị, ka onye ọ bụla bụ nke na-eme ihe ndị a.”—Deuterọnọmi 22:5.
17 N’akụkụ nke a, eleghị anya ọ ga-amasị gị ịtụleghachi ihe Ụlọ Nche nke August 15, 1988, kwuru na peji nke 17: “Ihe bụ nsogbu abụghị ma otú e si kwaa ya ọ bụ nke na-ewu ewu kpọmkwem kama ọ bụ ma ò kwesịkwara onye nke na-asị na ya bụ onyeozi Chineke. (Ndị Rom 12:2; 2 Ndị Kọrint 6:3) Uwe ndị na-adịchaghị mma n’anya ma ọ bụ nke kpadoro akpado pụrụ ịdọpụ uche n’ozi anyị. Ụdị uwe ndị e leziri nnọọ anya mee otú ha ga na-eme ka ụmụ nwoke yie ụmụ nwanyị ma ọ bụ mee ka ụmụ nwanyị yie ụmụ nwoke n’ụzọ dị ukwuu ekwesịghị ekwesị ma ọlị. (Tụlee Deuterọnọmi 22:5.) Otú ọ dị, omenala ógbè dị iche iche pụrụ ịdị iche, na-adabere n’ihu igwe, ọrụ e ji ya arụ, na ihe ndị ọzọ, nke mere na ọgbakọ ndị Kraịst adịghị eguzobe iwu siri ike nke ga-emetụta òtù ụmụnna n’ụwa nile.”
18. Nzọụkwụ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ iwere n’itinye ndụmọdụ Bible banyere uwe na ejiji n’ọrụ?
18 Lee ndụmọdụ guzoziri eguzozi ma daba adaba ọ bụ! N’ụzọ dị mwute, ụfọdụ ndị Kraịst, ndị nwoke na ndị nwanyị, na-asọrọ ìsì na-agbaso ihe ọ bụla nke ụwa na-akwalite n’uwe na ejiji n’atụleghị ụzọ ọ pụrụ isi metụta Jehova na ọgbakọ ndị Kraịst. Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ime nnyocha onwe onye ụfọdụ iji hụ ma ànyị abụrụwo ndị echiche ụwa metụtara. Ma ọ bụ anyị pụrụ ijekwu nwanna nwoke ma ọ bụ nwanyị nke nweworo ahụmahụ, onye a na-akwanyere ùgwù ma jụọ maka ihe ndị ọ chọpụtaworo dị ka mgbanwe ọ bụla anyị kwesịrị ime n’ụdị uwe anyị, mgbe ahụkwa tụlesie aro ndị ahụ ike.
Ndị Ikom na Ndị Inyom Bụ́ Ndị Kraịst—Ndị Ikom na Ndị Ikom n’Ezie
19. Mmetụta dị aṅaa na-adịghị mma ka ọ dị anyị mkpa ịlụso ọgụ?
19 Chi nke ụwa a bụ Setan, a pụkwara ịhụ mmetụta ya ná mgbagwoju anya n’ihe banyere ndị nwoke na nwanyị, nke ahụ gafekwara iyi ákwà. (2 Ndị Kọrint 4:4) N’ụfọdụ ala ọtụtụ ndị inyom na-eso ndị ikom asọrịta mpi n’ihe banyere ịbụisi, na-eleghara ụkpụrụ Bible anya. N’aka nke ọzọ, ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị ikom na-agbahapụ nnọọ ibu ọrụ nke ịbụisi ha, dị ka Adam mere. E nwekwara ndị na-agbalị ọbụna ịgbanwe òkè nke mmekọahụ ha ná ndụ site n’otu ụdị gaa n’ọzọ. (Ndị Rom 1:26, 27) Bible adịghị esetịpụ ụdị ụzọ ndụ ọzọ ndị Chineke nwapụtara. Ndị ọ bụlakwa bụ́ ndị, tupu ha aghọọ ndị Kraịst, nwekwara mgbagwoju anya banyere onye ha bụ ma ọ bụ nhọrọ mmekọahụ ha pụrụ ịtụkwasị obi na ọ ga-abụ maka ọdịmma ebighị ebi ha ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke, ụkpụrụ nke ndị nile ga-eru izu okè nke mmadụ ga-enwe obi ekele maka ya.
20. Mmetụta dị aṅaa ka Ndị Galetia 5:22, 23 kwesịrị inwe n’echiche anyị banyere ịbụ nwoke na ịbụ nwanyị?
20 Akwụkwọ Nsọ na-egosi na ọ dị ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị Kraịst mkpa ịzụlite na igosipụta mkpụrụ nke mmụọ Chineke—ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obi ọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ, na imeru ihe n’ókè. (Ndị Galetia 5:22, 23) Chineke, n’oké amamihe ya, mere ka ndị ikom nwee ike ịkwalite ịbụ nwoke ha, na ndị inyom ịbụ nwanyị ha, site n’ịzụlite àgwà ndị ahụ. Ọ dị mfe ịkwanyere nwoke na-egosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ ùgwù, ọ dịkwa mfe ịhụ nwanyị na-eme otú ahụ n’anya.
21, 22. (a) Ụkpụrụ dị aṅaa ka Jisọs setịpụrụ n’ihe metụtara ụzọ ibi ndụ? (b) Olee otú Jisọs si gosipụta ịbụ nwoke ya?
21 Nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ bụ Jisọs Kraịst, ọ bụkwa ụzọ ndụ ya ka ndị Kraịst kwesịrị iṅomi. (1 Pita 2:21-23) Dị ka Jisọs mere, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwanyị kwesịrị iguzosi ike n’ihe nye Chineke ma rubere Okwu Ya isi. Jisọs gosipụtara àgwà ndị dị ebube nke ịhụnanya, ịdị nro, na obi ebere. Dị ka ezi ndị Kraịst, a na-atụ anyị anya iṅomi ya iji gosipụta na anyị bụ ndị na-eso ụzọ ya.—Jọn 13:35.
22 Jisọs Kraịst bụ nwoke n’ezie, anyị pụkwara ịhụ àgwà ịbụ nwoke ya nke ọma ka anyị na-amụ ihe ndekọ ndụ ya dị ka e setịpụrụ ya n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ lụghị nwanyị ma ọlị, ma Bible na-egosi na ọ nụrụ ụtọ nke mkpakọrịta guzoziri eguzozi nke ndị inyom. (Luk 10:38, 39) Mmekọrịta ya na ndị ikom na ndị inyom bụ nke dị ọcha na nke kwesịrị nsọpụrụ mgbe nile. Ọ bụ ihe nlereanya zuru okè nke ịbụ nwoke. O kweghị onye ọ bụla—nwoke, nwanyị, ma ọ bụ mmụọ ozi na-enupụ isi—ịnapụ ya ịbụ nwoke ya n’ụzọ nsọpụrụ Chineke na ikwesị ntụkwasị obi ya nye Jehova. Ọ laghị azụ ịnara ibu ọrụ ya, o mekwara nke ahụ n’emeghị mkpesa.—Matiu 26:39.
23. Banyere ibu ọrụ nke ma nwoke ma nwanyị, olee otú e si gọzie ezi ndị Kraịst n’ụzọ dị iche?
23 Lee ihe obi ụtọ ọ bụ ịnọ n’etiti ndị Jehova na isoro ndị ikom na ndị inyom na-akpakọrịta, tinyekwara ụmụ okoro na agbọghọ, ndị ịhụ Jehova Chineke n’anya na irubere ya isi bụ ihe mbụ ná ndụ ha! Irubere Okwu Chineke isi akpachigideghị anyị. Kama nke ahụ, a na-atọhapụ anyị n’ụwa nke a na ụzọ ya ndị na-eweda ịma mma, nzube, na ibu ọrụ dịgasị iche nke ndị ikom na ndị inyom n’ala. Anyị pụrụ inwe ezi obi ụtọ nke na-abịa site n’imezu ọnọdụ Chineke nyere anyị ná ndụ, ma ànyị bụ nwoke ma anyị bụ nwanyị. Ee, lee aha obi ekele anyị nwere maka Jehova Chineke, Onye Okike anyị, n’ihi ndokwa ịhụnanya ya nile n’ihi anyị na maka ikeworị anyị nwoke na nwanyị!
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ Ibu ọrụ kwesịrị ekwesị ndị dị aṅaa maka ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị ka Bible na-akọwa?
◻ Olee otú e si gwagbuo ịbụ nwoke tupu Iju Mmiri ahụ, oleekwa otú e siworo gbagọọ ya na ịbụ nwanyị n’oge anyị?
◻ Ndụmọdụ Bible dị aṅaa banyere ọdịdị ka ị ga-achọ itinye n’ọrụ?
◻ Olee otú ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị Kraịst pụrụ isi gosipụta onwe ha ịbụ ndị ikom na ndị inyom n’ezie?
[Foto dị na peeji nke 17]
Ọ bụ ezie na ọ mara mma, a na-echeta Esta karịsịa maka obi umeala ya na mmụọ ya dị nwayọọ, dịkwa udo
[Foto dị na peeji nke 18]
Lebara ejiji gị anya nke ọma ka ị na-etinye uche karị n’ịma mma nke dị n’ime