Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 7/15 p. 29-31
  • Tatiọs—Odeakwụkwọ Pọl Nke Kwesịrị Ntụkwasị Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Tatiọs—Odeakwụkwọ Pọl Nke Kwesịrị Ntụkwasị Obi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Odeakwụkwọ n’Oge Ochie
  • ‘Mụ Onwe M, Bụ́ Tatiọs, Na-ekele Unu’
  • Idegara Ndị Rom Akwụkwọ
  • Ndị Nlekọta Na-ebute Ụzọ—Odeakwụkwọ
    Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Ndị Ha na Pọl Rụkọrọ Ọrụ—Hà Bụ Ole Ndị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ị̀ Maara?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 7/15 p. 29-31

Tatiọs—Odeakwụkwọ Pọl Nke Kwesịrị Ntụkwasị Obi

TATIỌS chere otu ihe ịma aka ihu. Pọl onyeozi chọrọ iji ya mee ihe dị ka odeakwụkwọ ya mgbe ọ na-ede otu ogologo akwụkwọ ozi nye ndị Kraịst ibe ya nọ na Rom. Nke a ga-abụ ọrụ siri ike.

N’ihi gịnị ka o ji sie nnọọ ike ịbụ odeakwụkwọ na narị afọ mbụ O.A.? Olee otú e siri rụọ ọrụ dị otú ahụ? Ihe ndị dị aṅaa e ji ede ihe ka e jiri mee ihe mgbe ahụ?

Ndị Odeakwụkwọ n’Oge Ochie

N’ọha mmadụ Gris na Rom nke oge ochie, e nwere ụdị odeakwụkwọ dị iche iche. Ụfọdụ ndị ikom jere ozi dị ka ndị odeakwụkwọ gọọmenti—ndị ọrụ ọha bụ́ ndị rụrụ ọrụ n’ọfịs ndị isi obodo. E nwekwara ndị odeakwụkwọ ọha na-edere ụmụ amaala ihe n’ọma ahịa. Ndị aka ji akụ̀ na-akpọghara ndị odeakwụkwọ mmadụ nwe enwe (ha na-abụkarị ndị ohu). Ọzọkwa, e nwekwara ndị enyi nwere mmasị bụ́ ndị ọ na-eme obi ụtọ idere ndị ọzọ akwụkwọ ozi. Dị ka ọkà mmụta bụ́ E. Randolph Richards si kwuo, nkà nke odeakwụkwọ ndị a na-abụghị nke ndị ọchịchị “pụrụ isite n’ịmara asụsụ ahụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị nta na/ma ọ bụ usoro e ji ede ya gaa n’inwe nkà n’ide akwụkwọ ozi ziri ezi, kwesịrị ekwesị, na nke dị ụtọ ngwa ngwa n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu.”

Ndị ole ga-eji ndị odeakwụkwọ eme ihe? Nke mbụ, ndị na-amaghị ka e si agụ ihe na ka e si ede ihe. Ọtụtụ nkwekọrịta na akwụkwọ azụmahịa mgbe ochie bụ ndị e ji ihe odide mechie, ebe odeakwụkwọ ahụ gbara akaebe na ya dere ihe ahụ n’ihi na onye nyefeworo ya ọrụ ahụ enweghị ike ide ya. Ihe nke abụọ mere e ji ego odeakwụkwọ ọrụ ka otu akwụkwọ ozi ochie sitere Thebes, Ijipt, na-egosipụta. N’ịbụ nke e deere otu onye a kpọrọ Asklepiades, o kwuru ná mmechi, sị: “Eumelus, nwa Herma nke nwoke, deere ya . . . n’ihi na ọ na-edetụ ihe nwayọọ nwayọọ.”

Ma, ịmara ka e si agụ ihe na ka e si ede ihe eyighị ka ọ bụ ihe na-ekpebi ojiji a na-eji odeakwụkwọ eme ihe. Dị ka onye na-akọwa Bible bụ́ John L. McKenzie si kwuo, “ikekwe ọ bụghịdị nchegbu maka ide ihe a ga-agụta, kama nke ahụ nchegbu maka ịma mma, ma ọ bụ ọ dịkarịa nta maka ịdị ọcha” kpaliri ndị mmadụ ịhọrọ ọrụ nke odeakwụkwọ. Ọbụna nye ndị gụrụ akwụkwọ, ide ihe na-agwụ ike, karịsịa ma ọ bụrụ na a na-ede ihe toro ogologo ma metụta ọtụtụ ihe. Ọkà mmụta bụ́ J. A. Eschlimann na-ekwu na onye ọ bụla pụrụ ime nke ahụ “na-eji obi ụtọ ezere ọrụ a, na-enyefe ya n’aka ndị ohu, ndị ji ide akwụkwọ mere ọrụ.” Ọzọkwa, ọ dị mfe ịghọta ihe mere ndị mmadụ adịghị edekarị akwụkwọ ozi nke ha ma a tụlee ihe ndị a na-ejikarị ede ihe na ọnọdụ a na-anọ arụ ọrụ.

Ihe a na-ejikarị ede ihe na narị afọ mbụ O.A. bụ papyrus. A na-enweta iberibe ndị dị tịga tịga site n’ịkpọwasị etiti ogwe ya ogologo ogologo. A na-atụkọta iberibe dị iche iche. A na-edebe ibe ọzọ ná nkuku nke ibe nke mbụ. A na-eji ike anyakọta ha abụọ, na-emepụta ibe “akwụkwọ.”

Ọ dịghị mfe ide ihe n’ihu akwụkwọ a. Ọ dịghị mụrụ mụrụ, ọ dịkwa eriri eriri. Dị ka ọkà mmụta bụ́ Angelo Penna si kwuo, “eriri papyrus nke nwere oghere na-eme ka ink basaa abasa, karịsịa n’ohere ntakịrị ndị ahụ dị n’etiti iberibe dịcha tịga tịga.” Odeakwụkwọ ahụ nwere ike ịnọdụ n’ala tụkọta ụkwụ ma jiri otu aka jigide ibe akwụkwọ n’elu bọọdụ wee na-arụ ọrụ. Ọ bụrụ na o nweghị ahụmahụ ma ọ bụ ihe ndị o ji ede ihe abụghị ndị kasị mma, mkpịsị akwụkwọ ya, ma ọ bụ mkpịsị akwụkwọ ahụ e ji ahịhịa mee, pụrụ ịfabanye na papyrus, ibe akwụkwọ ahụ pụrụ ịdọka, ma ọ bụ ihe odide ahụ pụrụ ịbụ nke a na-agaghị agụta.

E mere ink ya site n’ịgwakọta unyi anwụrụ ọkụ na gọm. N’ịbụ nke a na-ere n’ụdị dịcha ka ogbè, a ghaghị ịgwa ya mmiri n’ime ihe a na-agbanye ink tupu e nwee ike iji ya ede ihe. N’ime ngwá ọrụ ndị ọzọ nke odeakwụkwọ dị ka Tatiọs pụrụ inwe ma eleghị anya bụ mma iji pịa mkpịsị akwụkwọ ahụ e ji ahịhịa mee na nchicha dị mmiri mmiri iji ehicha ihe ndị o dehiere. A ghaghị ijiri nlezianya dee mkpụrụ akwụkwọ ọ bụla. Ya mere ide ihe na-aga nwayọọ nwayọọ, na-enwekwa ụfọdụ ihe isi ike.

‘Mụ Onwe M, Bụ́ Tatiọs, Na-ekele Unu’

N’ime ekele e tinyere ná mmechi akwụkwọ ozi ahụ e degaara ndị Rom bụ nke odeakwụkwọ Pọl, bụ́ onye dere, sị: “Mụ onwe m, bụ́ Tatiọs, onye na-ede akwụkwọ ozi a, na-ekele unu n’ime Onyenwe anyị.” (Ndị Rom 16:22) Nke a bụ nanị oge ebe a kpọrọ otu n’ime odeakwụkwọ ya aha kpọmkwem n’ihe odide Pọl.

Anyị maara ihe dị nta banyere Tatiọs. Site na ya ikele “n’ime Onyenwe anyị,” anyị pụrụ ikwubi na ọ bụ onye Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi. Eleghị anya ọ bụ onye òtù nke ọgbakọ dị na Kọrint, ọ pụkwara ịma ọtụtụ ndị Kraịst nọ na Rom. Ọkà mmụta Bible bụ́ Giuseppe Barbaglio na-ekwu na Tatiọs pụrụ ịbụ ohu ma ọ bụ onye a tọhapụworo. N’ihi gịnị? Nke mbụ, n’ihi na “n’ozuzu ya ndị odeakwụkwọ nọ n’òtù a; ọzọ, n’ihi na aha Latin ya . . . bụ nke ndị ohu ma ọ bụ ndị a tọhapụworo na-azakarị.” “Ya mere,” ka Barbaglio na-ekwu, “ọ bụghị onye ji ide ihe mere ọrụ nke ‘na-enweghị ebe ọ kwụ,’ ọ bụ onye ya na mmadụ na-arụkọ ọrụ bụ́ onye sitere n’ụzọ dị otú a nyere Pọl aka idekọ ihe odide ya kasị ogologo, nke a kasị jiri nkà dee: ọrụ dị oké ọnụ ahịa, na-eme ka Pọl ghara ịtụfu oge na ume.”

Ọrụ a Tatiọs rụrụ dị oké ọnụ ahịa n’ezie. Beruk rụụrụ Jeremaịa otu ụdị ọrụ ahụ, ọbụna dị ka Silvenọs rụụrụ Pita. (Jeremaịa 36:4; 1 Pita 5:12) Lee ihe ùgwù ndị dị otú ahụ ha na mmadụ rụkọrọ ọrụ nwere!

Idegara Ndị Rom Akwụkwọ

E dere akwụkwọ ozi e degaara ndị Rom mgbe Pọl bụ ọbịa nke Gaịọs, eleghị anya na Kọrint. Nke ahụ bụ ihe dị ka 56 O.A., n’oge njem ozi ala ọzọ nke atọ nke onyeozi ahụ. (Ndị Rom 16:23) Ọ bụ ezie na anyị maara n’ezie na Pọl jiri Tatiọs mere odeakwụkwọ ya ide akwụkwọ ozi a, anyị amaghị kpọmkwem otú o si jiri ya mee ihe. Ụzọ ọ bụla ọ masịrị ya jiri, a pụghị ịrụwo ọrụ ahụ n’ụzọ dị mfe. Ma anyị pụrụ ijide nke a n’aka: Dị ka akụkụ ndị ọzọ nke Bible, akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Rom “si n’obi Chineke pụta.”—2 Timoti 3:16, 17.

Mgbe e desịrị akwụkwọ ozi a, Tatiọs na Pọl edeworị ọtụtụ puku okwu, na-eji ọtụtụ ibe akwụkwọ papyrus eme ihe. Mgbe a nyadosịrị otu na ibe ya n’akụkụ, ibe akwụkwọ ndị a ghọrọ akwụkwọ mpịakọta, eleghị anya ihe dị ka mita 3 ruo 4 n’ogologo. E ji nlezianya fụkọtaa akwụkwọ ozi ahụ ma mechie ya. Mgbe ahụ o yiri ka Pọl nyere ya Fibi, nwanna nwanyị sitere Kenkrii, bụ́ onye na-aga ịmalite njem ịga Rom.—Ndị Rom 16:1, 2.

Kemgbe narị afọ mbụ, ụzọ a na-eji emepụta ihe a na-eji ede ihe agbanwewo nke ukwuu. Ma n’ime ọtụtụ narị afọ, Chineke echekwawo akwụkwọ ozi ahụ e degaara ndị Kraịst bụ́ ndị Rom. Lee ekele anyị pụrụ inwe maka akụkụ a nke Okwu Jehova, nke e dere n’enyemaka nke odeakwụkwọ Pọl kwesịrị ntụkwasị obi ma na-arụsi ọrụ ike bụ́ Tatiọs!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya