Ahụrụ M “Onye Dịkarịsịrị Nta” Ka Ọ Ghọrọ “Mba Nwere Ume”
DỊ KA WILLIAM DINGMAN SI KỌỌ
Afọ Ahụ Bụ 1936; Ebe Ahụ, Salem, Oregon, U.S.A. M Gara Nzukọ Ndịàmà Jehova. A Jụrụ Ajụjụ Bụ́: “Olee Ebe Oké Ìgwè Mmadụ Ahụ Nọ?” (Mkpughe 7:9, King James Version) Ọ Bụ Nanị M Bụ Onye Ọhụrụ, Ya Mere Ha Nile Tụrụ M Aka Sị, “Lee Ya Ebe Ahụ!”
N’ETITI afọ ndị 1930, e nwere nnọọ ole na ole n’ime Ndịàmà Jehova nwere olileanya Bible nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs n’elu ala. (Abụ Ọma 37:29; Luk 23:43) Ihe agbanwewo n’ụzọ dị ịrịba ama kemgbe ahụ. Ma ka m kọọ ihe ndị dugara m n’ịnọ ná nzukọ ahụ na Salem, Oregon.
Nna m bụ onye na-atụ ụtụ The Golden Age, bụ́ aha e nweburu maka magazin Teta! Mgbe m nọ n’afọ iri na ụma, m na-enwe mmasị ịgụ ya, ekwenyere m na o nwere eziokwu Bible dị mkpa. Ya mere otu ụbọchị m zigara mpempe akwụkwọ ụtụ nke dị n’azụ Golden Age. O nyere onye na-agụ ya akwụkwọ nta 20, otu akwụkwọ, na aha ọgbakọ Ndịàmà Jehova dịkarịsịrị nso. Ka m natara akwụkwọ ndị ahụ, m jere site n’ụlọ ruo n’ụlọ ma tinye akwukwọ nta nile ahụ nakwa akwụkwọ ahụ.
N’oge ahụ o nwebeghị onye mụụrụ m Bible. N’ezie, ọ dịbeghị mgbe mụ na otu n’ime Ndịàmà Jehova kwurịtara okwu. Ma ugbu a ebe m nwere adres Ụlọ Nzukọ Alaeze, m ji ụgbọala gaa ihe dị ka kilomita 40 banye Salem, Oregon, iji nọrọ ná nzukọ. Ọ bụ n’ebe ahụ, mgbe m ka dị nanị afọ 18, ka a kpọrọ m aha kpọmkwem dị ka “oké ìgwè mmadụ ahụ.”
Ọ bụ ezie na emechaghị m nkwadebe maka ozi ahụ, amalitere m isoro Ọgbakọ Salem na-eme nkwusa. A gbara m ume itinye isi ihe atọ n’ịgba àmà m. Nke mbụ, na Jehova bụ Chineke; nke abụọ, na Jisọs Kraịst bụ Eze ya ọ họpụtara; na nke atọ, na Alaeze ahụ bụ nanị olileanya dịịrị ụwa. Agbalịrị m ikerịta ozi ahụ n’ọnụ ụzọ ọ bụla.
Mgbe m sonyesịịrị Ndịàmà Jehova na Salem ruo afọ abụọ, e mere m baptism n’April 3, 1938. Ndịàmà nọ na Salem nwere obi ụtọ ịhụ ka ọtụtụ n’ime anyị bụ́ “oké ìgwè mmadụ ahụ” na-eme baptism. Na February 1939, aghọrọ m onye ọsụ ụzọ, ma ọ bụ onye ozi oge nile. Na December nke afọ ahụ, anakweere m ịkpọ okú ịga Arizona, ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze.
Ịsụ Ụzọ n’Arizona
Ọrụ Ndịàmà Jehova dị ọhụrụ n’Arizona, e nwekwara ọtụtụ nghọtahie banyere anyị, ya mere mgbe United States banyere n’Agha Ụwa nke Abụọ, anyị nwetara mkpagbu dị ukwuu. Dị ka ihe atụ, ka m nọ na-eje ozi na Stafford, Arizona, na 1942, òtù ndị Mormon nọ na-ekwu banyere iji ìgwè na-eme ihe ike wakpo anyị. Ọ dabara na mụ na ndị ọsụ ụzọ ibe m bi nso n’ụlọ otu bishọp onye Mormon bụ́ onye na-akwanyere anyị ùgwù ma sị: “Ọ bụrụ na ndị ozi ala ọzọ nke Mormon na-arụsi ọrụ ike dị ka Ndịàmà, mgbe ahụ chọọchị Mormon ga-amụba.” Ya mere na Chọọchị o kwuru okwu ma sị: “Anụrụ m na a na-ekwu okwu iji ìgwè na-eme ihe ike wakpo ụmụ okoro Ndịàmà. Ebidewere m ụmụ okoro ahụ, ọ bụrụ na e mee mwakpo, égbè ga-ekwu kpọmkwem n’ofe nke ọzọ nke ogige ahụ. A ga-eji égbè ahụ mee ihe—ma ọ bụghị megide Ndịàmà ahụ. A ga-eji ya mee ihe megide ìgwè ahụ na-eme ihe ike. Ya mere ọ bụrụ na unu chọrọ ime mwakpo, unu maara ihe unu ga-atụ anya ya.” Ìgwè ahụ na-eme ihe ike abịaghị ma ọlị.
N’ime afọ atọ m nọrọ n’Arizona, e jidere anyị ma tụnye anyị n’ụlọ nga ọtụtụ ugboro. Otu ugbo a kpọchiri m ụbọchị 30. Iji lụsoo iyi egwu ndị uwe ojii na-eyi ozi anyị ọgụ, anyị haziri ihe anyị kpọrọ ìgwè na-efe efe. Onyeàmà na-ahụ maka ya gwara anyị, sị: “Dị nnọọ ka aha anyị si dị, otú ahụ ka anyị dị. Anyị na-amalite n’elekere anya ise ma ọ bụ isii n’ụtụtụ, hapụ otu traktị ma ọ bụ akwụkwọ nta n’ọnụ ụzọ ọ bụla, mgbe ahụkwa anyị efepụ.” “Ìgwè na-efe efe” anyị gazuru akụkụ butụrụ ibu na steeti Arizona. Otú ọ dị, e kposara ya n’ikpeazụ n’ihi na ụdị ime nkwusa ahụ enyeghị anyị ohere inyere ndị nwere mmasị aka.
Ụlọ Akwụkwọ Gilead na Ozi Pụrụ Iche
Na December 1942, eso m n’ime ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ n’Arizona ndị natara akwụkwọ ozi ịkpọ òkù ịbịa ụlọ akwụkwọ ndị ozi ala ọzọ nke Ndịàmà Jehova na-eguzobe. Na mbụ a kpọrọ ụlọ akwụkwọ ahụ Watchtower Bible College of Gilead. Ka e mesịrị a gbanwere aha ahụ ịbụ Watchtower Bible School of Gilead. Ogige ụlọ akwụkwọ ahụ dị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kilomita 4,800 site n’ebe ahụ n’ebe dị nso n’obodo Ithaca na steeti ebe ugwu New York.
Ka anyị mesịrị nleta dị mkpirikpi n’Oregon, na January 1943, ọtụtụ n’ime anyị bụ́ ndị ọsụ ụzọ hapụrụ okpomọkụ nke Ọzara Arizona n’otu bọs Greyhound. Ọtụtụ ụbọchị ka e mesịrị anyị rutere ebe anyị na-aga ma hụ snow oge oyi nke steeti ebe ugwu New York. Ụlọ akwụkwọ ahụ meghere na February 1, 1943, mgbe onye isi oche ya, Nathan H. Knorr, kwuru n’okwu mmalite ya gwa otu narị ụmụ akwụkwọ ahụ, sị: “Ọ BỤGHỊ nzube nke kọleji a ịkwadebe unu ịbụ ndị ozi a họpụtara ahọpụta. Unu abụrụworị ndị ozi, jechiekwa ozi anya eri ọtụtụ afọ. . . . Usoro ọmụmụ ihe na kọleji ahụ bụ nanị maka iji kwadebe unu ịbụ ndị ozi nwekwuru nkà karị n’ókèala ndị unu ga-eje.”
Ebe ọ bụ na m nwere agụmakwụkwọ ụwa dị nta, na mbụ ahụ erughị m ala na Gilead. Ma ndị nkụzi ahụ gosiri m nghọta, anụkwara m ụtọ ọmụmụ ihe m nke ukwuu. Klas anyị gụsịrị akwụkwọ ka ọnwa ise nke ọzụzụ kpụ ọkụ n’ọnụ gasịrị. E mesịa, e zigara ole na ole n’ime anyị n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn, New York, bụ ebe anyị natakwuru ọzụzụ iji kwadebe anyị ije ozi n’ọrụ ime njegharị dị ka ndị nlekọta sekit. Ebe mbụ e kenyere m ọrụ bụ n’Ugwu na Ndịda Carolina.
N’ụbọchị ndị mbụ ahụ, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na onye nlekọta sekit na-ejegharị mgbe nile. Anyị na-anọnyere obere ọgbakọ otu ụbọchị ma ọ bụ ụbọchị abụọ ma ọ bụrụ nke buru ibu. Ihe ka ọtụtụ n’ọgbakọ n’oge ahụ dị obere. Ya mere mgbe m nọsịrị otu ụbọchị zuru ezu, bụrụkwa onye e mere ka ọ mụrụ anya mgbe mgbe ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’etiti abalị na-eme nleta ma na-aza ajụjụ, m ga-ebili n’ihe dị ka elekere anya ise nke ụtụtụ echi ya iji gaa n’ọgbakọ ọzọ. Arụrụ m ọrụ sekit ruo ihe dị ka otu afọ, mgbe e mesịkwara asụrụ m ụzọ ruo obere oge na Tennessee na New York.
Ịga Cuba na Ịgaru Puerto Rico
Na May 1945, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ, e zigara m n’ọrụ ozi ala ọzọ mbụ m, bụ́ Cuba! N’abalị ahụ anyị rutere Havana, isi obodo Cuba, anyị gara ọrụ magazin. Anyị nọrọ na Havana ruo mgbe anyị nwere ike ịchọta ebe obibi na Santa Clara. Ego mmachi akpa anyị kwa ọnwa bụ nanị $25 maka otu onye maka ihe nile dị mkpa, gụnyere nri na ụgwọ ụlọ. Anyị ji ihe ndị e nwere rụọ àkwà na arịa dị iche iche ma jiri igbe apple mere igbe nwere drọwa.
N’afọ na-esonụ e kenyere m ọrụ sekit. N’oge ahụ Cuba nile bụ otu sekit. N’ihi na onye nlekọta sekit nke bu m ụzọ nwere ụkwụ ogologo, nweekwa mmasị n’ịga ije, ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị na-adị agba nnọọ ọsọ iji chụkwuru ya. Ihe àmà na-egosi na ha chere na m ga-adị otú ahụ, ya mere ha dokwara ihe nile maka nleta m. Ha nile agaghị ozi n’otu ụbọchị ahụ kama ha kewasịrị n’ìgwè n’ìgwè, na-emekwa onye soro m rụtụ ibe ya arụtụ. N’ụbọchị mbụ otu ìgwè kpọọrọ m gaa n’ókèala dị anya; n’ụbọchị nke ọzọ ìgwè ọzọ kpọọrọ m gaa n’ókèala ọzọ dịkwa otú ahụ, na ebe ndị ọzọ. Ike gwụrụ m ná ngwụsị nke nleta ahụ, ma ọ tọrọ m ụtọ. E nwere ihe ndị m na-echeta banyere ọgbakọ ahụ.
Ka ọ na-erule 1950 anyị nwere ihe karịrị ndị nkwusa Alaeze 7,000 na Cuba, nke fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ọnụ ọgụgụ ahụ Mexico nwere. Na July nke afọ ahụ, agara m mgbakọ mba nile nke Mmụba Ọchịchị Chineke n’Ámá Egwuregwu Yankee dị na New York City. Ka nke ahụ gasịrị, anatara m ọrụ ozi ala ọzọ ọhụrụ, ịga Puerto Rico. Ndị so ná ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ sitere na klas nke 12 nke Gilead bụ Estelle na Thelma Weakley, ndị sonyeere m n’ụgbọelu gaa Puerto Rico.
Afọ asatọ ka e mesịrị mụ na Estelle lụrụ n’ememe dị mfe na Bayamón, Puerto Rico, nke e mere n’ikpo okwu n’oge nkwụsịtụ ná mgbakọ sekit anyị. Ma tupu ma mgbe anyị lụsịrị, arụrụ m ọrụ sekit. N’ime afọ iri anyị nọrọ na Puerto Rico, mụ na Estelle hụrụ mmụba ndị dị ukwuu—site n’ihe na-erughị ndị nkwusa 500 ruo n’ihe karịrị 2,000. Anyị nyeere ọtụtụ aka ruo n’ókè nke nraranye na baptism, anyị kerekwaara òkè n’ihiwe ọtụtụ ọgbakọ ndị ọhụrụ.
Na December 1960, Milton Henschel sitere n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn, New York, letara Puerto Rico ma gwa ndị ozi ala ọzọ ahụ okwu. Ọ jụrụ ma ụfọdụ hà ga-ewepụta onwe ha maka ọrụ dị iche. Ndị so ná ndị wepụtara onwe ha bụ mụ na Estelle.
Ebe Obibi Anyị na Dominican Republic
Ebe ọhụrụ e kenyere anyị ọrụ bụ Dominican Republic, anyị setịpụkwara June 1, 1961, dị ka ụbọchị nkwafe anyị. Na May 30, e gburu onye ọchịchị aka ike bụ́ onye Dominican Republic, bụ́ Rafael Trujillo, a kagbukwara njem ụgbọelu na-aga mba ahụ. Otú ọ dị, a maliteghachiri njem ụgbọelu n’oge na-adịghị anya, anyị nwekwara ike ifega Dominican Republic na June 1 dị ka anyị mere atụmatụ ya.
Mba ahụ nọ n’ọgba aghara mgbe anyị rutere, e nwetụkwara ihe omume ndị agha. A tụrụ ụjọ na a ga-enwe mgbanwe ọchịchị, ndị agha nọkwa na-enyocha onye ọ bụla n’okporo ụzọ. A kwụsịrị anyị n’ọtụtụ ebe nnyocha, n’ebe nke ọ bụlakwa e nyochara ibu anyị. E wepụtara ihe ọ bụla site n’ime akpati anyị, ọbụna ihe ndị kasị nta. Nke ahụ bụ otú anyị si rute Dominican Republic.
Anyị nọrọ n’isi obodo bụ́ Santo Domingo, ruo ọtụtụ izu tupu anyị agaa n’ebe mbụ e kenyere anyị ọrụ na La Romana. N’oge ọchịchị aka ike nke Trujillo, a gwawo ọha mmadụ na Ndịàmà Jehova bụ Ndị Ọchịchị Kọmunist nakwa na ha bụ ụdị mmadụ ndị kasị njọ. N’ihi ya, e sogbuwo Ndịàmà n’ụzọ dị njọ. Otú ọ dị, nke nta nke nta, anyị nwere ike ibibi ajọ mbunobi.
Mgbe anyị rụsịrị ọrụ na La Romana ruo nwa oge, anyị bidoghachikwara ọrụ sekit. Mgbe ahụ, na 1964, e kenyere anyị ọrụ dị ka ndị ozi ala ọzọ n’obodo Santiago. N’afọ na-esochi a gbanwere ọchịchị na Dominican Republic, mba ahụ banyekwara n’oké ọgba aghara ọzọ. N’oge nsogbu ahụ e zigara anyị na San Francisco de Macorís, obodo e ji ihe omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị mara. Ka o sina dị, anyị mere nkwusa n’enweghị ihe mgbochi. N’agbanyeghị nsogbu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ, anyị guzobere ọbụna ọgbakọ ọhụrụ. N’ime afọ ndị sochiri, a gbanwekwuru ebe e kenyere anyị ọrụ tupu e kenyeghachi anyị ọrụ n’ebe obibi anyị ugbu a na Santiago.
Anyị ahụwo nnọọ ngọzi Jehova n’ọrụ anyị n’ebe a na Dominican Republic. Mgbe anyị rutere na 1961, e nwere ihe dị ka Ndịàmà 600 na ọgbakọ 20. Ugbu a e nwere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị nkwusa 20,000 na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke n’ihe karịrị ọgbakọ 300. E nwere atụmanya dị egwu maka uto ka ukwuu, dị ka 81,277 bịara n’Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst na 1997 gosipụtara. Nke ahụ bụ ihe dị ka okpukpu atọ na ọkara nke ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa!
Mba Nwere Ume Ugbu A
Ọ bụ ezie na ụwa nke a ka e si ahụ ya anya anọgidewo na-agbanwe, ozi Bible nke Ndịàmà Jehova na-ekwusa ka bụ otu ihe ahụ. (1 Ndị Kọrint 7:31) Jehova ka bụ Chineke, Kraịst ka bụ Eze, o dokwara anya karịa ka ọ dịworo mgbe ọ bụla na Alaeze ahụ bụ nanị olileanya dịịrị ụwa.
N’otu oge ahụ, e nwewo mgbanwe dị ebube n’etiti ndị Jehova kemgbe m jere nzukọ ahụ na Salem, Oregon, ihe dị ka afọ 60 gara aga. Oké ìgwè mmadụ ahụ, adịwo ukwuu n’ezie, na-eru ọnụ ọgụgụ karịrị nde ise. Ọ bụ dị ka Jehova buru n’amụma banyere ndị ya, sị: “Onye nta n’etiti ha ga-aghọ [otu puku], onye dịkarịsịrị nta ga-aghọkwa mba nwere ume: Mụ onwe m, Jehova, ga-eme ka ọ bịa ọsọ ọsọ na mgbe ya.”—Aịsaịa 60:22.
Mgbe ihe dị ka afọ 60 gasịrị n’ozi oge nile, enwere m obi ụtọ inwe ọṅụ nke ịnọgide na-eme nkwusa, na-ezikwa ihe n’ọrụ ozi ala ọzọ m. Lee oké ihe ùgwù ọ bụ ikere òkè n’ọrụ ahụ na ịhụworị “onye dịkarịsịrị nta” ka ọ ghọrọ “mba nwere ume”!
[Foto dị na peeji nke 21]
Mụ na nwunye m, na Dominican Republic